ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 7
Mee Ka Baịbụl Ị Na-agụ Na-abakwuru Gị Uru
“Gịnị ka ị gụtara?”—LUK 10:26.
ABỤ NKE 97 Okwu Chineke Na-enye Ndụ
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe ndị gosiri na Jizọs ji Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe?
WEREGODỊ ya na ị na-ege Jizọs ntị mgbe ọ na-akụzi ihe. Jizọs na-ekwukarị ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ o bu n’isi. N’eziokwu, okwu ndị mbụ Jizọs kwuru mgbe e mechara ya baptizim nakwa okwu ụfọdụ o kwuru tupu ya anwụọ si n’Akwụkwọ Nsọ. b (Diut. 8:3; Ọma 31:5; Luk 4:4; 23:46) N’ime afọ atọ na ọkara ahụ ihe ndị a mere, Jizọs gụpụtara Okwu Chineke n’ihu ọha, kwuokwa ihe ndị dị na ya, ma kọwaa ha.—Mat. 5:17, 18, 21, 22, 27, 28; Luk 4:16-20.
N’oge niile Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na o ji Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe, na-emekwa ihe ọ mụtara (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)
2. Ka Jizọs na-etolite, gịnị nyeere ya aka ịma Akwụkwọ Nsọ nke ọma? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
2 Ọtụtụ afọ tupu Jizọs amalite ozi ya, ọ gụrụ Okwu Chineke ma nụ ka a na-agụpụta ya ugboro ugboro. O doro anya na ọ nụrụ ka Meri na Josef na-ekwu gbasara ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ha na-akparịta ụka n’ezinụlọ ha kwa ụbọchị. c (Diut. 6:6, 7) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jizọs na ndị ezinụlọ ha na-aga n’ụlọ nzukọ n’Ụbọchị Izu Ike ọ bụla. (Luk 4:16) Ha ruo, ọ ga-abụrịrị na ọ na-ege ntị nke ọma mgbe a na-agụpụta Akwụkwọ Nsọ. Ka oge na-aga, Jizọs mụtara ịgụ Okwu Chineke n’onwe ya. Ihe a mere ka Jizọs mara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, jiri ya kpọrọ ihe, na-emekwa ihe ndị ọ na-amụta na ya. Dị ka ihe atụ, ì chetara ihe mere n’ụlọ nsọ mgbe Jizọs dị naanị afọ iri na abụọ? “Otú o si aghọta ihe na ihe ọ na-aza” ndị nkụzi ma Iwu Mosis nke ọma juru ha anya.—Luk 2:46, 47, 52.
3. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
3 Anyịnwa nwekwara ike ịmata ihe dị n’Okwu Chineke, jirikwa ya kpọrọ ihe ma anyị na-agụ ya mgbe niile. Ma, olee ihe anyị ga-eme ka ihe anyị na-agụ na Baịbụl baara anyị ezigbo uru? Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe Jizọs gwara ndị ma Iwu, ya bụ, ndị odeakwụkwọ, ndị Farisii, na ndị Sadusii. Ndị isi okpukpe a na-agụ Akwụkwọ Nsọ ọtụtụ ugboro, ma, ihe ha na-agụ anaghị abara ha uru. Jizọs kwuru ụzọ ihe atọ ha gaara eme ka Akwụkwọ Nsọ bakwuoro ha uru. Ihe Jizọs gwara ha ga-enyere anyị aka (1) ịna-aghọta ihe anyị na-agụ, (2) ịchọpụta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na Baịbụl, nakwa (3) ikwe ka Okwu Chineke gbanwee anyị.
NA-AGỤ BAỊBỤL OTÚ Ị GA-AGHỌTA YA
4. Gịnị ka Luk 10:25-29 na-akụziri anyị gbasara ịgụ Okwu Chineke?
4 Anyị chọrọ ịna-aghọta ihe ndị anyị na-agụ na Baịbụl. Ma ọ́ bụghị ya, ihe anyị na-agụ agaghị abachara anyị uru. Dị ka ihe atụ, chee gbasara ihe Jizọs zara “otu nwoke ma Iwu.” (Gụọ Luk 10:25-29.) Mgbe nwoke ahụ jụrụ Jizọs ihe ọ ga-eme ka o nweta ndụ ebighị ebi, Jizọs nyeere ya aka ịmata azịza ya na Baịbụl. Ọ jụrụ nwoke ahụ, sị: “Gịnị ka e dere n’Iwu? Gịnị ka ị gụtara?” Nwoke ahụ kwuru ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ banyere ịhụ Chineke na ndị agbata obi n’anya iji zaa ajụjụ ahụ. Ọ zatakwara ya. (Lev. 19:18; Diut. 6:5) N’agbanyeghị ya, ọ jụziri Jizọs, sị: “Ònye n’eziokwu bụ onye agbata obi m?” Ihe a nwoke a jụrụ gosiri na ọ ghọtaghị ihe ihe ọ gụrụ pụtara. N’ihi ya, ọ maghị otú ọ ga-esi na-eme ihe ebe ahụ ọ gụrụ kwuru.
Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị na-aghọta ihe anyị na-agụ
5. Olee otú ikpe ekpere na iji nwayọọ na-agụ ihe ga-esi enyere anyị aka?
5 Anyị nwere ike ịghọta Okwu Chineke nke ọma ma anyị na-agụ ihe nke ọma. Lee ihe ụfọdụ nwere ike inyere gị aka. Kpee ekpere tupu gị amalite ịgụ ya. Ọ bụ Jehova ga-enyere anyị aka ịghọta Baịbụl. N’ihi ya, anyị nwere ike ịrịọ ya ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ka o mee ka uche anyị dịrị n’ihe anyị na-agụ. Jirizie nwayọọ na-agụ ya. Ọ ga-eme ka ị ghọta ihe ị na-agụ. O nwere ike ịbakwuru gị uru ịna-agụpụta ya agụpụta ma ọ bụ gị akpọnye Baịbụl nke a na-egere egere. Ọ bụrụ na ị na-anụ okwu ndị ahụ ma na-ahụ ya na Baịbụl gị, o nwere ike ime ka ị na-aghọta ihe ị na-agụ, na-echeta ya, mụtakwuokwa ihe na ya. (Josh. 1:8) Ị gụchaa, kpee ekpere ọzọ ma kelee Jehova maka Baịbụl o nyere anyị, rịọkwa ya ka o nyere gị aka ime ihe ndị ị gụtara.
Gịnị mere idetu ihe ụfọdụ ga-eji enyere gị aka ịghọta ihe ị na-agụ na icheta ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)
6. Olee otú ịjụ onwe gị ajụjụ ụfọdụ na idetu ihe ga-esi enyere gị aka ma ị gụwa Baịbụl? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
6 Lee ihe abụọ ọzọ ga-eme ka ị na-aghọtakwu Baịbụl. Jụọ onwe gị ajụjụ gbasara ihe ị na-agụ. Ị gụwa banyere otu akụkọ Baịbụl, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ndị a na-ekwu okwu ha ebe a? Ònye na-ekwu? Ònye ka ọ na-agwa? Maka gịnị? Olee ebe na oge ihe a na-eme?’ Ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ichebara ihe ị na-agụ echiche, meekwa ka ị ghọtakwuo ihe ị na-agụ. Na-edetukwa ihe ma ị gụwa Baịbụl. Idetu ihe ị gụtara ga-enyere gị aka ichebakwuru ya echiche, mee ka ị ghọtakwuo ya, nyekwara gị aka icheta ihe ị gụrụ. I nwere ike idetu ajụjụ ndị i nwere, ihe ndị ị chọpụtara mgbe i mere nchọnchọ, isi ihe ndị ị mụtara, otú i nwere ike isi eme ihe ndị ị mụtara, nakwa otú obi dị gị gbasara ihe ị gụrụ. Ide ihe ndị a ga-enyere gị aka iwere Baịbụl ka okwu Chineke na-agwa gị.
7. Gịnị ga-enyere anyị aka ma anyị na-agụ Baịbụl? Maka gịnị? (Matiu 24:15)
7 Jizọs kwuru otu ihe ga-enyere anyị aka ma anyị gụwa Okwu Chineke. Ọ bụ ịghọta ihe anyị na-agụ. (Gụọ Matiu 24:15.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta ihe anyị na-agụ, anyị kwesịrị ịchọpụta otú ihe anyị na-agụ si gbasa ihe ọzọ nakwa otú o si dị iche na ya, gbalịakwa mata ihe a na-ekwughị hoo haa gbasara ya. Ihe Jizọs kwuru gosikwara na anyị kwesịrị ịghọta ihe ndị na-egosi na amụma Baịbụl na-emezu. Ịghọta ihe ndị anyị na-agụ ga-emekwa ka ihe niile anyị na-agụta na Baịbụl baara anyị ezigbo uru.
8. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-aghọta ihe anyị na-agụ?
8 Jehova na-enyere ndị ohu ya aka ịghọta ihe ha na-agụ. N’ihi ya, kpee ekpere rịọ ya ka o nyere gị aka ịghọta ihe ị na-agụ. (Ilu 2:6) Olee otú ị ga-esi gosi na ekpere ahụ si gị n’obi? Na-echebara ihe ị na-agụ echiche nke ọma. Gbalịakwa chọpụta otú o si gbasa ihe ndị ọzọ ị ma. Ihe ga-enyere gị aka bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, dị ka Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Akwụkwọ ndị a ga-enyere gị aka ịghọta amaokwu Baịbụl nakwa ịhụ otú ị ga-esi na-eme ya eme ná ndụ gị. (Hib. 5:14) Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ na-aghọta ihe anyị na-agụ, ọ ga-eme ka anyị matakwuo Akwụkwọ Nsọ.
GBALỊA NA-ACHỌPỤTA EZIOKWU NDỊ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ
9. Olee eziokwu dị ezigbo mkpa ndị Sadusii leghaara anya?
9 Ndị Sadusii ma akwụkwọ ise mbụ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. Ma, ha na-eleghara eziokwu ndị dị mkpa dị na ha anya. Dị ka ihe atụ, legodị ihe Jizọs kwuru mgbe ndị Sadusii jụrụ ya gbasara mbilite n’ọnwụ. Ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị akụkọ osisi ogwu ahụ n’akwụkwọ Mosis? Chineke na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ mgbe ọ gwara Mosis, sị: ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’ ” (Mak 12:18, 26) Ọ bụ eziokwu na ndị Sadusii ahụ agụọla amaokwu Baịbụl ahụ ọtụtụ ugboro, ihe Jizọs jụrụ ha gosiri na ha leghaara otu eziokwu dị ezigbo mkpa Akwụkwọ Nsọ na-akụzi anya, ya bụ na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ.—Mak 12:27; Luk 20:38. d
10. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ma anyị na-agụ Baịbụl?
10 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na anyị agụwa Baịbụl, ka anyị gbalịa mata ihe niile amaokwu Baịbụl ahụ ma ọ bụ akụkọ Baịbụl ahụ na-akụziri anyị. Ihe anyị kwesịrị ịghọta abụghị naanị ihe amaokwu Baịbụl ahụ kwuru hoo haa. Anyị kwesịkwara ịghọta ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ amaokwu ahụ na-akụzi a na-ekwughị hoo haa.
11. Dị ka e kwuru na 2 Timoti 3:16, 17, olee otú ị ga-esi chọta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ma ị gụwa Baịbụl?
11 Olee otú i nwere ike isi chọta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ma ị na-agụ Baịbụl? Legodị ihe 2 Timoti 3:16, 17 kwuru. (Gụọ ya.) Ebe a kwuru na ‘ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ bara uru’ (1) iji ha akụzi ihe, (2) iji ha adọ mmadụ aka ná ntị, (3) iji ha agbazi mmadụ, (4) nakwa iji ha azụ mmadụ. Akwụkwọ Baịbụl ndị anyị na-anaghị agụkarị nwekwara ike imere anyị ihe anọ ndị a. Chebara ebe ị na-agụ echiche ka ị hụ ihe ọ na-akụziri gị gbasara Jehova, nzube ya ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ná ndụ. Chee otú o nwere ike isi nye aka n’ịdọ mmadụ aka ná ntị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchọpụta otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi nyere gị aka ịmata àgwà ndị na-adịghị mma i kwesịrị izere nakwa otú ị ga-esi zere ha ka gị na Jehova nwee ike ịdị ná mma. Cheekwa gbasara otú e nwere ike isi jiri amaokwu Baịbụl ahụ gbazie mmadụ, ya bụ, ịgbazi echiche na-adịghị mma i nwere ma ọ bụ nke onye ị hụrụ n’ozi ọma nwere. Chọpụtakwa otú amaokwu Baịbụl ahụ ga-esi zụọ gị ka i nwee ike ịna-ele ihe anya otú Jehova si ele ya. Ọ bụrụ na ị na-eche gbasara uru anọ ndị a Baịbụl na-abara anyị, ị ga-enwe ike ịchọpụta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ma ị na-agụ Baịbụl.
KWE KA IHE Ị NA-AGỤ GBANWEE GỊ
12. Gịnị mere Jizọs ji jụọ ndị Farisii, sị, “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị?”
12 Jizọs jụkwara ndị Farisii, sị, “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị?” iji gosi na otú ha si ele ihe ha gụtara na Baịbụl anya adịghị mma. (Mat. 12:1-7) e Mgbe ọ jụrụ ndị Farisii ajụjụ a bụ mgbe ha kwuru na ndị na-eso ụzọ ya dara iwu Ụbọchị Izu Ike. Mgbe Jizọs na-azaghachi ha, o kwuru gbasara akụkọ abụọ dị na Baịbụl, kwuokwa ihe dị n’otu amaokwu n’akwụkwọ Hosia iji gosi na ndị Farisii ahụ aghọtaghị ihe mere e ji mee iwu Ụbọchị Izu Ike, nakwa na ha anaghị eme ebere. Gịnị mere ndị Farisii ahụ anaghị ekwe ka ihe ha na-agụta n’Okwu Chineke gbanwee ha? Ọ bụ n’ihi na ha dị mpako, ha ejighịkwa ezigbo obi na-agụ ya. Mpako ahụ mere ka ha ghara ịna-aghọta ihe ha na-agụ.—Mat. 23:23; Jọn 5:39, 40.
13. Olee ihe anyị kwesịrị ibu n’obi na-agụ Baịbụl? Maka gịnị?
13 Ihe anyị na-amụta n’ihe a Jizọs kwuru bụ na anyị kwesịrị ibu ezigbo ihe n’obi na-agụ Baịbụl. Anyị ekwesịghị ịdị ka ndị Farisii. Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi, dịkwa njikere ịna-amụta ihe. Anyị kwesịrị ‘ịdị umeala n’obi, kwerekwa ka Chineke kụọ okwu ya dị ka mkpụrụ n’ime anyị.’ (Jems 1:21) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-ekwe ka Okwu Chineke gbanwee ụdị ndị anyị bụ. Naanị ihe ga-eme ka ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl banyere obi ebere, ọmịiko, na ịhụnanya gbanwee ndụ anyị bụ ma anyị zere ịdị mpako.
Olee otú anyị ga-esi mata ma ànyị na-ekwe ka Okwu Chineke na-agbanwe anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) f
14. Olee otú anyị nwere ike isi mata ma ànyị na-ekwe ka Baịbụl na-agbanwe anyị? (Kọwaakwa ihe ndị e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
14 Otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe nwere ike igosi ma ànyị na-ekwe ka Okwu Chineke gbanwee anyị. Ndị Farisii ekweghị ka Okwu Chineke gbanwee ha. Ọ bụ ya mere ha ji “ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.” (Mat. 12:7) Ihe anyị na-eche gbasara ndị ọzọ na otú anyị si emeso ha ihe ga-egosikwa ma ànyị na-ekwe ka Okwu Chineke gbanwee anyị. Dị ka ihe atụ, ànyị na-ekwukarị gbasara ihe ọma ndị ọzọ na-eme, ka ọ̀ bụ naanị ihe ọjọọ ha na-eme ka anyị na-ekwu gbasara ya? Ànyị na-emere ndị ọzọ ebere, dịrịkwa njikere ịgbaghara ha, ka ànyị na-akatọkarị ha, na-ebukwara ha iwe n’obi? Ihe anyị zara n’ajụjụ ndị a nwere ike igosi ma ànyị na-ekwe ka ihe ndị anyị na-agụta na Baịbụl na-agbanwe echiche anyị na ihe ndị anyị na-eme.—1 Tim. 4:12, 15; Hib. 4:12.
ỊGỤ BAỊBỤL GA-EME KA ANYỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ
15. Olee otú obi dị Jizọs gbasara Akwụkwọ Nsọ?
15 Jizọs ji Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe. Abụ Ọma 40:8 buru amụma otú obi ga-adị Jizọs gbasara Okwu Chineke. Ebe ahụ sịrị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime ime obi m.” Otú Jizọs si jiri Baịbụl kpọrọ ihe mere ka ọ na-enwe obi ụtọ, gharakwa ịkwụsị ife Jehova. Ọ bụrụkwa na anyịnwa ana-agụ Okwu Chineke ma jiri ya kpọrọ ihe, ọ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ, meekwa ka ike ghara ịgwụ anyị ife Chineke.—Ọma 1:1-3.
16. Gịnị ka i kwesịrị ime ka ịgụ Baịbụl na-abakwuru gị uru? (Kọwaa ihe e dere n’igbe bụ́ “ Ihe Jizọs Kwuru Ga-enyere Gị Aka Ịna-aghọta Ihe Ị Na-agụ.”)
16 Ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere gosiri na anyị kwesịrị ịgbalị na-agụkwu Baịbụl nke ọma. Ihe ga-enyere anyị aka ịna-aghọtakwu Baịbụl bụ ikpe ekpere, iji nwayọọ na-agụ ya, ịna-ajụ onwe anyị ajụjụ, na idetu ihe ndị anyị na-agụta. Anyị ga na-aghọtakwu Baịbụl ma ọ bụrụ na anyị ejiri akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl na-eme nchọnchọ n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ichebara ihe anyị na-agụ echiche. Anyị nwere ike ịmụtakwu otú e si eji Baịbụl akụzi ihe nke ọma, ya ana-abakwara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ na-achọpụta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’ebe anyị gụrụ, ma n’amaokwu Baịbụl ndị anyị na-anaghị agụkarị. Anyị nwekwara ike ikwe ka Okwu Chineke gbanwee anyị ma ọ bụrụ na anyị eburu ezigbo ihe n’obi na-agụ ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a niile, ịgụ Baịbụl ga na-abakwuru anyị uru, anyị na Jehova ana-adịkwukwa ná mma.—Ọma 119:17, 18; Jems 4:8.
ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike
a Anyị niile bụ́ ndị na-efe Jehova na-agbalịsi ike ịgụ Okwu ya kwa ụbọchị. Ọtụtụ ndị ọzọ na-agụkwa Baịbụl, ma ha anaghị aghọta ihe ha na-agụ. Ọ bụ ihe mere ụfọdụ ndị n’oge Jizọs. Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’ihe Jizọs gwara ndị na-agụ Okwu Chineke, anyị ga-amụta ihe ndị ga-enyere anyị aka ka Baịbụl anyị na-agụ bakwuoro anyị uru.
b N’oge e mere Jizọs baptizim, jirikwa mmụọ nsọ tee ya mmanụ, ọ ga-abụ na e mere ka o cheta ihe ndị mere ná ndụ ya tupu ya abịa n’ụwa.—Mat. 3:16.
c Meri ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma, na-ekwukwa ihe dị na ya. (Luk 1:46-55) Ọ ga-abụ na Josef na Meri enwechaghị ego ha ga-eji zụta Akwụkwọ Nsọ nke ha. Ma, ha na-ege ntị nke ọma mgbe a na-agụpụta Okwu Chineke n’ụlọ nsọ ka ha nwee ike ịna-echeta ya.
d Gụọ isiokwu bụ́ “Bịaruo Chineke Nso—‘Ọ Bụ Chineke nke Ndị Dị Ndụ.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 1, 2013.
e I nwere ike ịgụ Matiu 19:4-6. N’ebe ahụ, Jizọs jụkwara ndị Farisii, “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị?” Ọ bụ eziokwu na ha agụọla otú Chineke si kee ihe, ha leghaara ihe akụkọ ahụ na-akụzi gbasara otú Chineke si were alụmdi na nwunye anya.
f NKỌWA FOTO: N’oge a na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, nwanna na-akpa aka n’ígwè mejọrọ ọtụtụ ihe. Ma, mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, ụmụnna jara ya mma maka mbọ ọ gbara kama ilekwasị anya n’ihe ndị ahụ ọ na-emetaghị.