Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Niile Bụ Otu Ezinụlọ

Anyị Niile Bụ Otu Ezinụlọ

Anyị Niile Bụ Otu Ezinụlọ

OLEE otú i si ewere ndị akpụkpọ ahụ́ ha na-anaghị acha ka nke gị, ma ọ bụ ndị agbụrụ ha dị iche na nke gị? Ị̀ na-ewere na gị na ha hà otu? Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị na-ewere na agbụrụ ha ka nke ndị ọzọ mma. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na “ịkpa ókè agbụrụ” bụ ikwenye na ọ bụ agbụrụ mmadụ na-ekpebi otú àgwà onye ahụ ga-adị nakwa ihe onye ahụ ga-emeli, kwerekwa na otú a e si nwee agbụrụ dị iche iche na-egosi na e nwere agbụrụ ndị e kere ka ha kara agbụrụ ibe ha.”

Ụdị echiche a akpatala ọtụtụ nsogbu. N’otu akwụkwọ a kpọrọ Handbook of Cultural Psychiatry nke Prọfesọ Wan-Shiṅ Jaṅ dere, o kwuru na mmadụ iche na agbụrụ ya ka nke ndị ọzọ mma “emeela ka e chee na ọ dịghị njọ ma mba ndị siri ike na-emegbu ndị nke na-esighị ike nakwa na iji ndị mmadụ mere ohu adịghị njọ.” O kwukwara na ndị mmadụ ejirila agbụrụ mmadụ si “kpebie ndị kwesịrị ịnọ n’isi, ndị kwesịrị ịka ndị ọzọ nwee ego na ndị kwesịrị ịchị ibe ha.” Taakwa, a na-akpa ókè agbụrụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ma ihe a ndị mmadụ kweere, nke kpatarala ọtụtụ nsogbu, ọ̀ bụ́ eziokwu? Gịnị ka sayensị na Baịbụl kwuru?

Gịnị Ka Sayensị Kwuru?

Ihe ndị sayensị chọpụtarala n’ọbara ụmụ mmadụ na-egosi na ihe ndị mmadụ kwuru na ọ bụ ya mere ha ji akpa ókè agbụrụ abụghị eziokwu. Ndị na-eme nnyocha, bụ́ ndị ji ndị si ná mba dị iche iche mee nnyocha, achọpụtala na ọ bụ obere ọdịiche ka e nwere n’ọbara mmadụ abụọ si n’ebe dị iche iche n’ụwa. * E lebakwanụ anya n’obere ọdịiche ahụ e nwere, a chọpụtara na ọ bụ mmadụ abụọ si n’otu agbụrụ ka a kacha nwee ọdịiche n’ọbara ha. Ọ pụtaziri na ọdịiche e nwere n’ọbara mmadụ abụọ si n’agbụrụ dị iche iche enweghị otú ọ hà aha.

Akwụkwọ bụ́ Nature kwuru na ebe ọ bụ na “ụmụ mmadụ niile si n’otu nne na nna pụta, ihe ndị a chọpụtara n’ọbara nwere ike inyere ụmụ mmadụ aka ịghọta na ịkpa ókè agbụrụ adịghị mma, o kwesịkwara inyere ha aka ịkwụsị ya.”

Ọ bụghị taa ka ụmụ mmadụ chewere echiche otú ahụ. Ọ bụ n’afọ 1950 ka Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara akwụkwọ ha bu n’obi na ọ ga-enye aka kwụsị ịkpa ókè agbụrụ. Ndị kwuru ihe e bipụtara n’akwụkwọ ahụ bụ ndị ọkà mmụta n’ihe banyere otú mmadụ si malite, ndị ọkà mmụta n’ihe banyere ọbara na ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọhaneze. Ma, ịkpa ókè agbụrụ ka dịkwa. O doro anya na ịmara eziokwu ndị a abụghị ebe okwu biri. Eziokwu ahụ ga-erurịrị n’obi, ma ọ bụ n’ime ime mmadụ. Jizọs Kraịst sịrị: “N’obi ka echiche ọjọọ . . . si apụta.”—Matiu 15:19, 20.

Ihe Baịbụl Kwuru

E dere Baịbụl otú ọ ga-eru ụmụ mmadụ n’obi. Dị ka ihe atụ, e wezụga ihe a ndị sayensị chọpụtarala, nke Baịbụl bu ụzọ kwuo na “[Chineke] sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum,” Baịbụl kwukwara, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35; 17:26) Ihe ndị a Baịbụl kwuru ọ́ naghị eme ka ị hụ Jehova n’anya?—Diuterọnọmi 32:4.

Jehova Chineke chọrọ ka anyị na-eme otú o si eme iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya. Ndị Efesọs 5:1, 2, sịrị, “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya.” Ịhụ ndị ọzọ n’anya otú Chineke si hụ ha, n’agbanyeghị otú ha si acha ma ọ bụ agbụrụ ha si, so n’otú anyị si ‘eje ije n’ịhụnanya.’—Mak 12:31.

Onye Chineke na-akpọ ohu ya abụghị onye ihe ọjọọ, ndị dị ka ịkpọasị na ịkpa ókè agbụrụ, juru n’obi. (1 Jọn 3:15) N’eziokwu, oge Chineke ga-ekpochapụ ndị ọjọọ niile nọ n’ụwa dị ezigbo nso. Naanị ndị ga-afọ bụ ndị na-eṅomi àgwà ya. Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-abụ otu ezinụlọ n’ezie, ya bụ, anyị ga-abụ otu ma n’anụ ahụ́ ma n’otú anyị si efe ezi Chineke ahụ ofufe.—Abụ Ọma 37:29, 34, 38.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 O nwere ike ịbụ n’ihe gbasara ọrịa ka a na-aka ahụ obere ọdịiche ahụ e nwere n’ọbara ụmụ mmadụ, n’ihi na e nwere ọrịa ụfọdụ a na-esi n’ọbara ebute.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

“Mmadụ niile si n’otu nne na nna pụta” ma ọ bụ e nwere ike ikwu na anyị niile bụ otu