Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe nke Anọ: Ịkwanyere Ibe Ha Ùgwù

Ihe nke Anọ: Ịkwanyere Ibe Ha Ùgwù

Ihe nke Anọ: Ịkwanyere Ibe Ha Ùgwù

“Wepụnụ . . . iti mkpu na okwu mkparị . . . niile.” —Ndị Efesọs 4:31.

Gịnị ka ọ pụtara? Ma n’ezinụlọ ndị na-enwe nsogbu ma ná ndị nke na-enwe obi ụtọ, a na-enwecha nghọtahie. Ma e nwee nghọtahie n’ezinụlọ ndị na-enwe obi ụtọ, di na nwunye anaghị agwawa ibe ha okwu ọjọọ, kpọwa ibe ha iyi, ma ọ bụ kparịwa ibe ha. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ahụ na-emeso ibe ya otú ọ ga-achọ ka e si mesoo ya.—Matiu 7:12.

Gịnị mere o ji dị mkpa? E nwere ike iji ọnụ merụọ mmadụ ahụ́. Otu ilu dị na Baịbụl sịrị: “Ọ dị mma mmadụ ibi n’ala ịkpa karịa ya na nwaanyị na-ese okwu, nke na-akpasukwa mmadụ iwe, ibi.” (Ilu 21:19) E nwekwara ike ikwu otu ihe ahụ gbasara nwoke na-ese okwu. A bịakwa n’okwu ịzụ ụmụ, Baịbụl kwuru, sị: “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Ụmụaka ndị a na-abakarịrị mba nwere ike chewe na o nweghị ihe ha mere meta ndị mụrụ ha. Ha nwedịrị ike kwụsịchaa ịna-agba mbọ ime ihe ga-amasị ha.

Megodị ihe a. Jiri ajụjụ ndị a na-esonụ chọpụta ma ùnu na-akwanyere ibe unu ùgwù n’ezinụlọ unu.

Ọ̀ na-abụkarị anyị nwee nghọtahie n’ezinụlọ anyị, otu onye ewere iwe pụọ?

Ọ̀ na-abụ m gwawa di m ma ọ bụ nwunye m ma ọ bụkwanụ ụmụ m okwu, mụ agwa ha okwu ọjọọ ndị dị ka “onye iberiibe,” “anụ ọhịa,” ma ọ bụ ihe ndị yiri ha?

Ebe m nọ too ọ̀ bụ ebe a na-agwakarị mmadụ okwu ọjọọ?

Kpebie ihe ị ga-eme. Cheta otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ i nwere ike ime iji gosi na ị na-akwanyere mmadụ ùgwù mgbe ị na-agwa ya okwu. (Ihe ga-enyere gị aka: Kpebie na ị ga na-ekwu otú ihe mmadụ mere gị dị gị n’obi kama ịtawa onye ahụ ụta. Dị ka ihe atụ, kama ịsị, “Ị na-emekarị ihe dị otú a ma ọ bụ otú a,” sị, “O wutere m mgbe i mere ihe dị otú a ma ọ bụ otú a.)

Ọ́ gaghị adị mma ma ị gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe a i kpebiri ime? Ọnwa atọ gaa, jụọ ya otú ị gbaruru ná mbọ.

Chee ihe ụfọdụ ị ga-eme ka ị ghara ịna-agwa ụmụ gị okwu ọjọọ mgbe ị na-agwa ha okwu.

Ọ́ gaghị adị mma ma ị rịọ ụmụ gị mgbaghara maka oge ndị i ji iwe gwa ha okwu ma ọ bụ oge ndị ị gwara ha okwu ọjọọ?

[Foto dị na peeji nke 6]

Otú ahụ ebili mmiri si n’oké osimiri nwere ike ịkwapụ oké nkume, ọ bụkwa otú ahụ ka okwu ọjọọ nwere ike ime ka ezinụlọ daa