Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Ọ Bụla Nọ n’Ụwa Chọrọ Ezi Ahụ́ Ike!

Onye Ọ Bụla Nọ n’Ụwa Chọrọ Ezi Ahụ́ Ike!

Onye Ọ Bụla Nọ n’Ụwa Chọrọ Ezi Ahụ́ Ike!

IHE karịrị puku afọ abụọ na narị asaa gara aga, otu onye amụma kwuru banyere oge ọrịa na-agaghịzi adị. E chebewo amụma a ruo n’oge anyị a, ọ dịkwa n’akwụkwọ Aịzaịa dere n’oge ochie. O dere banyere oge onye bi n’ụwa na-agaghị asị, “Ana m arịa ọrịa,” o kwukwara, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6) Amụma ndị ọzọ e dekọrọ na Bible kwukwara banyere ọdịnihu dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, kwuru banyere oge Chineke ga-eme ka a gharazie inwe ihe mgbu.—Mkpughe 21:4.

Nkwa ndị a hà ga-emezu? Ọ̀ dị mgbe mmadụ nile nọ n’ụwa ga-enwe ezigbo ahụ́ ike, na mgbe ọrịa na-agaghịzi adị? N’eziokwu, ahụ́ dị ọtụtụ mmadụ mma taa karịa ka ọ dị n’ọgbọ ndị gara aga. Ma, na ahụ́ dị mmadụ mma apụtaghị na onye ahụ agaghịzi arịa ọrịa. Ọrịa ka na-echi ọtụtụ mmadụ ọnụ n’ala. Nanị ichetụ ịrịa ọrịa n’echiche na-akpata oké nchegbu. N’ụzọ dị mwute, nke bụ́ eziokwu bụ na, ọbụna n’oge a, ọ dịghị onye pụrụ ịgbata ọrịa n’ọsọ.

Ihe Ọ Na-efu Gị

E nwere ọtụtụ ụzọ ọrịa si efu anyị ihe. Nke kachasị eche ndị mmadụ uche taa bụ oké ego ọ na-efu. Dị ka ihe atụ, n’ime otu afọ na-adịbeghị anya, ọ bụrụ na a gbakọta ụbọchị nile ndị mmadụ na-arụghị ọrụ na Europe n’ihi ọrịa, ọ dị narị nde ise. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ndị ọzọ. Mbelata ihe ndị a na-arụpụta na-ebelata n’ihi ọrịa, tinyere oké ego ọrịa na-efu, na-eme ka ego mmadụ nile na-emefu na-amụbakwu. Ọ na-efu ụlọ ọrụ dị iche iche ihe, na-efukwa gọọmenti. Iji nwetaghachi ego ndị a ọ na-efu ha, ụlọ ọrụ dị iche iche na-ebuli ọnụ ahịa nke ngwa ahịa ha, gọọmenti ana-ebulikwa ụgwọ ụtụ isi. Ònye na-akwụ ya? N’ikpeazụ, ọ bụ gị na-akwụ ya!

N’ụzọ dị mwute, ọ na-esikarịrị ndị ogbenye ike inweta ọgwụgwọ dị mma, ma ọ bụrụkwarị na ha ga na-enwetadị ya enweta. Nke ahụ bụ ahụhụ ọtụtụ nde mmadụ bi ná mba ndị ka na-emepe emepe na-ata n’ihi ejighị ego ha ga-eji gakwuru ndị dọkịta ma nke a na-akọ. Ọbụna ná mba ndị bara ọgaranya, ụfọdụ ndị aghaghị ịgbasi mbọ ike iji nweta ọgwụgwọ n’ezigbo ụlọ ọgwụ ndị e nwere. Otú a ka ọ dị ọtụtụ n’ime nde mmadụ iri anọ na isii bi na United States, bụ́ ndị na-adịghị akwụ ụgwọ inshọransị maka ahụ́ ike ha.

Ọ bụghị nanị ego ka ọrịa na-efu. Nke ka njọ bụ obi mgbawa anyị na-enwe mgbe anyị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala, anya anyị na-ahụsi mgbe anyị na-edi ahụ́ mgbu na-adịghị akwụsị akwụsị, mwute anyị na-enwe mgbe anyị na-ahụ ka ọrịa ji ndị ọzọ aka ọjọọ, na obi nkoropụ anyị na-enwe mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụnahụrụ anyị.

Ọ bụ ihe na-enye nnọọ obi ụtọ ịtụwa anya na otu ụbọchị, anyị ga-emesị biri n’ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya. Onye ọ bụla nọ n’ụwa chọrọ ezi ahụ́ ike! Ọtụtụ mmadụ kweere na ihe a ha na-atụ anya ya ga-emezu n’agbanyeghị otú o si yie ihe na-agaghị ekwe omume. E nwere ndị kwenyesiri ike na ka oge na-aga, ụmụ mmadụ ga-eji nkà na ụzụ ha kpochapụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrịa nile. N’aka nke ọzọ, ndị kwenyere n’ihe Bible na-ekwu kweere na Chineke ga-emezu amụma ndị o buru n’oge ochie banyere ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya. Ụmụ mmadụ hà ga-eme ka e nwee ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya? Ka ọ̀ bụ Chineke ga-eme ya? Gịnị ka ọdịnihu ga-abụ?