Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?

Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?

“Iwu ndị mụrụ m nyere m banyere oge m ga na-alọta n’abalị na-adị agbakasị m ahụ́! Obi anaghị adị m mma ma a gwa m ka m lọta n’oge ma hapụ ndị ọzọ ka ha nọtee aka.”—Allen.

“Ọ dịghị ihe na-ewe m iwe ka ịdị na-elere m oge ma m na-akpọ fon. Ọ na-adị m ka à na-ewere m na m ka bụ nwatakịrị!”—Elizabeth.

Ọ̀ NA-ADỊ gị ka iwu ndị mụrụ gị na-enye gị ọ̀ karịrị akarị? Ọ̀ dịtụla mgbe obi gị gwara gị ka i zoro ezoro pụọ n’ụlọ unu ma ọ bụ ghaara ndị mụrụ gị ụgha banyere ihe i mere? Ya bụrụ otú ahụ, mmetụta ị na-enwe pụrụ iyi nke otu onye na-eto eto, bụ́ onye kọwara ndị mụrụ ya dị ka ndị na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́, ma kwuo, sị: ‘Ha kwesịrị ikwe ka m kurutụ ume ndụ!’

Ọ pụrụ ịbụ na ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị na-azụ gị enyela gị iwu banyere ihe ndị ha chọrọ ka ị na-eme na ndị ha chọrọ ka ị ghara ịdị na-eme. Iwu ndị a pụrụ ịgụnye ihe ndị a chọrọ gị n’aka ma a bịa n’ihe omume ụlọ akwụkwọ a sị gị mee n’ụlọ, ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ n’ụlọ, oge ị ga na-alọta n’abalị, tinyere ókè ị ga na-akpọru fon, ókè ị ga na-eleru TV, ma ọ bụ ókè ị ga na-anọru na kọmputa. Ha nwedịrị ike ịgwakwu gị ụdị àgwà ha chọrọ ka ị na-akpa n’ụlọ akwụkwọ na ụdị ndị ha chọrọ ka gị na ha na-akpakọrịta.

Ọtụtụ ụmụaka na-adakarị iwu ndị mụrụ ha nyere ha. N’otu nnyocha e mere, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ abụọ n’ime ndị ntorobịa atọ ọ bụla a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha anatala ntaramahụhụ n’ihi ịda iwu ndị e nyere ha n’ụlọ, na-eme ka nke a bụrụ ihe a kasị eji maka ya ata ha ahụhụ.

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-eto eto kwetara na e kwesịrị inwe ụfọdụ iwu n’ụlọ iji gbochie ọgba aghara. Ma, ọ bụrụ na iwu ndị a na-enye n’ụlọ dị ezigbo mkpa, olee ihe mere ụfọdụ n’ime ha ji akpasu iwe? Ọ bụrụkwa na ọ na-adị gị ka iwu ndị mụrụ gị na-enye gị adịghị ekwe gị megharịa ahụ́, olee otú ị pụrụ isi nwetatụ ahụ́ efe?

“Abụghịzi M Nwata”!

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Emily jụrụ, sị, “Olee otú m ga-esi mee ka ndị mụrụ m ghọta na abụghịzi m nwata nakwa na ha kwesịrị ikwe m megharịa ahụ́?” Ò nweela mgbe ị jụrụ ụdị ajụjụ ahụ? Dị ka ọ dị Emily, iwu ndị ahụ pụrụ ịdị na-ewe gị iwe n’ihi na ọ na-adị gị ka à na-ewere na ị ka bụ nwa e ku n’aka. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na otú i si ele ọnọdụ ahụ anya dị iche n’otú ndị mụrụ gị si ele ya. Ma eleghị anya, ha na-ele iwu ndị ha na-enye gị anya dị ka ihe dị mkpa iji chebe gị ma kwadebe gị ibu ibu ọrụ ndị dịịrị gị mgbe i toruru ogo mmadụ.

Ọ bụrụgodị na a na-ekwetụ gị megharịa ahụ́, o nwere ike ịdị gị ka à ka na-enye gị iwu ndị i toferela. Nke a na-akacha ewute ewute ma ọ bụrụ na o yiri ka iwu a na-enye gị ọ̀ karịrị nke a na-enye ụmụnne gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Marcy kwuru, sị: “Adị m afọ 17, ndị mụrụ m nyere m iwu ịdị na-alọta n’oge n’abalị. A naghị ekwe ka m si n’ụlọ pụọ mgbe ọ bụla m mejọrọ ihe. Ma, mgbe nwanne m nwoke hà ka m, e nyeghị ya iwu banyere oge ọ ga na-alọta n’abalị, ọ dịghịkwa mgbe a gwara ya ka ọ ghara isi n’ụlọ pụọ n’ihi ihe o mejọrọ.” Ka Matthew na-akọ ihe mere n’oge ọ dị afọ iri na ụma, o kwuru banyere ụmụnne ya nwanyị ndị ọ tọrọ na ụmụ nwanne papa ya, sị, “Ihe ọ sọkwara ha ha mee, ọ dịghị ihe a na-eme ha.”

Ọ̀ Ka Mma Ka A Ghara Inye Gị Iwu?

O kwere nghọta na ọ pụrụ ịmasị gị i nwere onwe gị pụọ n’ịbụisi nke ndị mụrụ gị. Ma, ọ̀ ga-akara gị mma n’ezie ma ọ bụrụ na o nweghị iwu ọ bụla ha na-enye gị? O nwere ike ịbụ na o nwere ndị na-eto eto ibe gị ị maara, bụ́ ndị pụrụ ịlọta mgbe ọ bụla ọ sọrọ ha n’abalị, ndị pụrụ iji ụdị ejiji ọ bụla masịrị ha, ndị pụkwara iso ndị enyi ha gaa ebe ọ bụla masịrị ha, n’oge ọ bụla masịrị ha. Ma eleghị anya, ndị mụrụ ha ji nnọọ ọrụ n’aka nke na ha adịghị ama ihe ụmụ ha na-eme. Otú o sina dị, isi otú a zụlite ụmụaka emebeghị ka ha nwee ihe ịga nke ọma. (Ilu 29:15) Na ịhụnanya adịghị n’ụwa taa bụ nnọọ n’ihi na ụwa jupụtara ná ndị na-eche nanị maka onwe ha, ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị a zụlitere n’ezinụlọ ndị mụrụ ụmụ na-adịghị enye ụmụ ha iwu.—2 Timoti 3:1-5.

Otu ụbọchị, ụzọ i si ele ezinụlọ ndị nne na nna ha na-adịghị enye ụmụ ha iwu anya ga-adị iche. Tụlee ihe a chọpụtara n’otu nnyocha e ji ụmụ nwanyị ndị a zụlitere n’ezinụlọ ndị mụrụ ha na-enwechaghị iwu ha nyere ha nakwa ndị ndị mụrụ ha na-elebaghịrị anya nke ọma, mee. Mgbe ha na-ekwu banyere otú e si zụlite ha, o nweghị onye ọ bụla n’ime ha kwuru na ọ dị mma ka ndị mụrụ ụmụ hapụ ụmụ ha ka ha mere otú o si masị ha. Kama nke ahụ, ha lere ya anya dị ka ihe na-egosi na ndị mụrụ ha echebaraghị ha echiche ma ọ bụ ihe na-egosi na ha hapụrụ ịrụ ọrụ dịịrị ha.

Kama ịdịwa gị ka ị bụrụ ndị ntorobịa a na-ahapụ ka ha mewe ihe masịrị ha, gbalịa ịdị na-ele iwu ndị mụrụ gị na-enye gị anya dị ka ihe na-egosi na ha hụrụ gị n’anya ma na-eche banyere gị. Site n’iji ezi uche na-agwa gị ebe ị ga-emedebe ihe, ndị mụrụ gị na-eṅomi Jehova Chineke, bụ́ onye gwara ndị ya, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.”—Ọma 32:8.

Ka ọ dị ugbu a, iwu ndị ahụ pụrụ ịdị gị ka hà karịrị gị akarị. Ya bụrụ otú ahụ, tụlee ihe ndị ị pụrụ ime iji nwekwuo obi ụtọ n’ụlọ unu.

Ụdị Nkwurịta Okwu nke Na-arụpụta Ihe Dị Mma

Ka i wee nwerekwuo onwe gị, ma ọ bụ ka e wee kwe ka ị na-emegharịkwu ahụ́, ọ dị mkpa na gị na ndị mụrụ gị ga-enwe ezigbo nkwurịta okwu. Ma ụfọdụ pụrụ ikwu, sị, ‘Ma esorowo m ndị mụrụ m kwurịta ya, ihe nile ka dịkwa otú ha dị!’ Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ pụrụ imeziwanye otú mụ na ndị mụrụ m si ekwurịta okwu?’ Nkwurịta okwu bụ ihe bara uru nke pụrụ inyere gị aka (1) inweta ihe ị chọrọ ma ọ bụ (2) ịghọtakwu ihe mere e ji jụ i mere gị ihe ị chọrọ. N’ezie, ọ bụrụ na ị chọrọ ka a na-emeso gị ihe dị ka onye toruworo ogo mmadụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya na ị ga-eme ka otú i si na-eso ndị mụrụ gị ekwurịta okwu bụrụ otú onye toruworo ogo mmadụ si eme.

Mụta ịchịkwa mmetụta gị. Bible kwuru, sị: “Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.” (Ilu 29:11) Ezi nkwurịta okwu apụtaghị ime nanị mkpesa. Ime otú ahụ pụrụ ime nanị ka a bakwuoro gị mba! Ya mere, zere iji ákwá eme mkpesa, iji iwe agbachi ndị mụrụ gị nkịtị, na iwebiga iwe ókè. N’agbanyeghị otú i si kwachie ụzọ n’ike ma ọ bụ jiri iwe na-aga ike ike mgbe ndị mụrụ gị gbochiri gị ime ihe ị chọrọ ime, omume dị otú ahụ ga-eme ma eleghị anya ka ha nyekwuo gị iwu—ọ bụghị ka i nwerekwuo onwe gị.

Gbalịa ile ihe anya otú ndị mụrụ gị si ele ya. Tracy bụ́ nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst nke ọ bụ nanị nne ya na-azụ, chọpụtara na nke a na-enye aka. O kwuru, sị: “Ajụrụ m onwe m sị, ‘Olee ihe mere nne m ji enye m iwu ndị a?’ Ọ chọrọ inyere m aka ka m ghọọ ezigbo mmadụ.” (Ilu 3:1, 2) Ịghọta nchegbu ndị mụrụ gị na-enwe pụrụ inyere gị aka ịma otú ị ga-esi soro ha kwurịta echiche gị. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ha achọghị ka ị gaa otu nnọkọ oriri. Kama ịrụwa ha ụka, ị pụrụ ịjụ ha, sị, “Ọ bụrụkwanụ na mụ na otu enyi m toruworo ogo mmadụ, nke a pụrụ ịtụkwasị obi, esoro jee?” O nwere ike ọ bụghị mgbe nile ka ndị mụrụ gị ga-ekwe ime ihe ị rịọrọ ha; ma ọ bụrụ na ị ghọta nchegbu ha na-enwe, ọ ga-aka adịrị gị mfe ịtụ aro ha pụrụ ịnabata.

Mee ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi. Ime ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi yiri itinye ego gị n’ụlọ akụ̀. Nanị ego ị pụrụ ịdọrọ bụ nke i tinyerela n’ụlọ akụ̀ ahụ. A ga-eri gị iwu ma ị dọrọ ihe karịrị ego ole i nwere n’ụlọ akụ̀, ọ bụrụkwa na i mee ya ugboro ugboro, a pụrụ imechi ihe ndekọ ego i nwere n’ụlọ akụ̀ ahụ. Inyekwu gị ohere ime ihe ụfọdụ n’onwe gị yiri ịdọrọ ego i tinyere n’ụlọ akụ̀; a ga-enyekwu gị ohere ahụ ma ọ bụrụ na a hụla na omume gị na-egosi na i toruola ka enye gị ụdị ohere ahụ.

Tụọ anya ihe ị pụrụ inweta enweta. Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị mụrụ gị iji ezi uche na-achịkwa omume gị. N’ihi ya, Bible kwuru banyere “ihe nna gị nyere n’iwu” na “iwu nne gị.” (Ilu 6:20) Otú ọ dị, i kwesịghị iche na iwu ndị mụrụ gị na-enye gị ga-ala ndụ gị n’iyi. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na ị na-erubere ndị mụrụ gị isi mgbe nile, Jehova kwere nkwa na n’ikpeazụ, ‘ị ga-enwe ihe ịga nke ọma’!—Ndị Efesọs 6:1-3.

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ypa

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee iwu ndị kachasị esiri gị ike idebe?

▪ Olee ihe ndị ị gụtara n’isiokwu a ga-enyere gị aka idebe iwu ndị mụrụ gị nyere gị?

▪ Olee otú ị pụrụ isi mee ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]

Mgbe Ị Dara Iwu E Nyere Gị

Ọnọdụ a anyị na-aga ikwu banyere ya ugbu a pụrụ ịbụ ihe ị na-ahụkebe: Ị lọtara mgbe oge a gwara gị lọta n’abalị gaferela, ị rụghị ọrụ a gwara gị rụọ n’ụlọ, ma ọ bụ ị kpọfere oge a gwara gị akpọfela na fon. Ndị mụrụ gị abịala ugbu a na-ajụ gị maka ya! Olee otú ị pụrụ isi mee ka ihe ghara ịka njọ?

Gwa ha eziokwu. Ihe a abụghị oge ịghọ ha aghụghọ; gwa ha kpọmkwem otú ihe nile si mee. (Ilu 28:13) Ịkọrọ ha ogologo akụkọ pụrụ ime ka ha kwụsịchaa ịtụkwasị gị obi. Zere ime ka à ga-asị na ihe i mere ziri ezi ma ọ bụ na o nwechaghị ihe ọ bụ. Na-echeta mgbe nile na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.”—Ilu 15:1.

Rịọ mgbaghara. O kwesịrị ekwesị ka i gosi mwute maka nchekasị na mmechu ihu iwu ahụ ị dara kpatara ma ọ bụkwanụ maka ọrụ ọ tụkwasịịrị ndị ọzọ, nke a pụkwara ime ka ntaramahụhụ a ga-enye gị belata. (1 Samuel 25:24) Otú ọ dị, mwute ị na-enwe aghaghị isi gị n’obi.

Nakwere ihe ọ bụla si na ya pụta. Ihe mbụ obi gị ga-agwa gị mee pụrụ ịbụ ịjụ ntaramahụhụ a chọrọ inye gị, karịsịa mgbe ọ dị gị ka e kwesịghị inye gị ụdị ntaramahụhụ ahụ. (Ilu 20:3) Otú ọ dị, mmadụ ịnakwere ihe si n’ihe o mere pụta, bụ otu ihe na-egosi na o tozuru okè. (Ndị Galeshia 6:7) Ihe ga-akasị mma ka i mee pụrụ ịbụ nanị ịgba mbọ hụ na ndị mụrụ gị tụkwasighachiri gị obi.

[Foto dị na peeji nke 21]

Gbalịa ghọta nchegbu ndị mụrụ gị na-enwe