Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Irikọ Nri Ọnụ Mere Ka Mmekọrịta Anyị Chikwuo Anya”

“Irikọ Nri Ọnụ Mere Ka Mmekọrịta Anyị Chikwuo Anya”

“Irikọ Nri Ọnụ Mere Ka Mmekọrịta Anyị Chikwuo Anya”

ÙNU na-erikọ nri ọnụ n’ezinụlọ unu, ọ dịkarịa ala, otu ugboro n’ụbọchị? Ọ dị mwute ikwu na n’ihi ndụ gbalụ gbalụ a na-ebi n’ụwa taa, ọtụtụ ezinụlọ adịghị erikọ nri ọnụ, onye ọ bụla na-eri nri mgbe o ji masị ya. Ma, ezinụlọ irikọ nri ọnụ adịghị egbo nanị mkpa anụ ahụ́, kama, ọ pụkwara igbo ọbụna mkpa ndị karịrị nke ahụ—ọ pụrụ ime ka a na-enwe ezigbo nkwurịta okwu na mmekọrịta chiri anya n’ezinụlọ.

E nwere otu nwoke a na-akpọ Algirdas. Ya na nwunye ya bụ́ Rima na ụmụ ha ndị nwanyị atọ bi n’obodo Lithuania nke dị n’Ebe Ugwu Europe. Algirdas kwuru, sị: “N’agbanyeghị na m na-arụ ọrụ, ụmụ m ana-agakwa akwụkwọ, anyị na-ahazi oge anyị iji hụ na anyị na-erikọ nri abalị ọnụ. N’oge anyị na-erikọ nri ọnụ, onye ọ bụla n’ime anyị na-akọ otú ụbọchị ya si gaa nakwa nsogbu ndị o nwere, kwuokwa ihe bụ́ echiche ya banyere ihe ụfọdụ, atụmatụ ndị ọ na-eme, ihe ndị na-amasị ya, na ihe ndị na-adịghị amasị ya. Anyị na-ejikwa oge a ekwurịta ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Obi abụọ adịghị ya na irikọ nri ọnụ mere ka mmekọrịta anyị chikwuo anya.”

Rima kwukwara, sị: “Anyị na ụmụ anyị iso na-esi nri na-emekwa ka anyị nwee ohere ikwurịta ihe ndị dị anyị n’obi. Ụmụ anyị na-enwe mmasị n’imekọ ihe ọnụ na kichin, n’otu mgbe ahụ kwa, ha na-amụta ihe ndị bara uru. N’ụzọ dị otú a, anyị na-eme ka ọrụ isi nri bụrụ ihe na-enye anyị obi ụtọ.”

Algirdas, Rima, na ụmụ ha na-erite ọtụtụ uru n’ihi na ha na-ewepụta oge iji na-erikọ nri ọnụ. Ọ bụrụ na ezinụlọ gị amalitebeghị irikọ nri ọnụ, gịnị ma unu mee ndokwa ịdị na-eme ya, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu ugboro n’ụbọchị, n’agbanyeghị ma ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ. Uru unu ga-erite na ya ga-akarị nnọọ àjà ọ bụla unu chụrụ maka ya.