Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Onye Ọ Bụla Kwesịrị Ịgụ Akwụkwọ A”

“Onye Ọ Bụla Kwesịrị Ịgụ Akwụkwọ A”

“Onye Ọ Bụla Kwesịrị Ịgụ Akwụkwọ A”

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA POLAND

Malite n’oge okpomọkụ nke afọ 2003, e wepụtara akwụkwọ ahụ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ n’ọtụtụ asụsụ ná mgbakọ ndị e nwere n’ụwa nile. Dị ka ọ dị n’ebe ndị ọzọ, otú ndị mmadụ si meghachi omume na Poland ná nnata ha natara akwụkwọ a nwere ihe osise ndị mara mma, dị nnọọ ịrịba ama. Ọ bụ ezie na e dere ya karịsịa maka ụmụaka, akwụkwọ ozi ndị a natara site n’aka ndị dị afọ iri na ụma na ndị toruworo ogo mmadụ na-egosi na ọ na-amasị ndị nọ n’afọ ndụ nile. Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị e dere na ha.

“Aha m bụ Agata, adịkwa m afọ asatọ. Mgbe m natara akwụkwọ a, amatara m ozugbo otú ịhụnanya Jehova nwere n’ebe m nọ haruru. Isiakwụkwọ nke kasị amasị m bụ nke 7, ‘Nrubeisi Na-echebe Gị.’ Ọ bụghị mgbe nile ka m nabu erubere ndị mụrụ m isi, ma ugbu a, amaara m na aghaghị m ịgbanwe n’ihi na Jehova hụrụ ụmụaka na-erube isi n’anya.”

Marlena, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 13 ji obi ụtọ dee, sị: “Amaara m na e dere akwụkwọ a maka ụmụaka ndị dị obere, ma ekweere m na ọ na-amasị onye ọ bụla. Ịgụ ya na-eme ka okwukwe m nwere n’ebe Jehova na Jizọs nọ sikwuo ike. Ọbụna a kọwara ihe ndị siri ike nkọwa, n’ụzọ dị mfe. Apụghị m nnọọ ịtọgbọ ya atọgbọ. Legodị ihe osise ndị dị n’ime ya! Ajụjụ ndị na-eso ha ga-akpali ụmụaka ịchọ ịmata ihe! Akwụkwọ a amaka, n’ihi ya eji m nlezianya na-agụ ya. Ana m ekele unu nke ukwuu.”

Justyna, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 15, na-ekwu otú o siworo hụta akwụkwọ a dị ka ihe na-adọrọ mmasị, sị: “Isiakwụkwọ ndị m gụrụla masịrị m nke ukwuu nke na m ji obi m nile na-ekele unu maka onyinye a mara mma ma na-akụzi ihe. Echere m na onye ọ bụla kwesịrị ịgụ akwụkwọ a—ọbụna ndị meworo okenye. N’anya m, ihe atụ ndị dị na ya dị nnọọ mfe nghọta, ọbụna nwa dị otu afọ ga-aghọta ha. Ihe osise ndị dị na ya na-enyekwa ihe ọmụma n’onwe ha. N’eziokwu, amaghị m otú m ga-esi akọwa mmetụta m na-enwe mgbe m na-agụ akwụkwọ a.”

Eunika n’onwe ya gosikwara ekele o nwere maka akwụkwọ a. Ọ bụ ezie na ọ dị afọ 19, o ji ịnụ ọkụ n’obi gụọ akwụkwọ ọhụrụ a ma kwuo na ya chọpụtara na “ọ baara ndị dị afọ iri na ụma uru.” O dekwara, sị: “O nwere ndụmọdụ ndị bara uru maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị—n’ụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’ọgbakọ. Ana m ekele unu maka onyinye a.”

Mgbe Maria, bụ́ nne na-enwe obi ụtọ nke nwere nwa dị otu afọ, bụ́ Oliwia, hụrụ otú nwa ya nwanyị si meghachi omume ka o kirisiri ihe osise ndị mara mma dị n’akwụkwọ ahụ, o kwuru, sị: “Ana m enye unu ekele sitere n’ala ala obi m maka akwụkwọ a pụrụ iche e ji akụziri ụmụaka ihe. Anya nwa anyị bụ́ Oliwia na-adị n’akwụkwọ ahụ mgbe nile. Ọ na-anọdụ n’apata ụkwụ anyị ma na-achọ ka anyị kọọrọ ya ihe dị n’isiakwụkwọ nke a ma ọ bụ nke ọzọ. Ihe osise kasị amasị ya bụ nke dị na peeji nke 83, bụ́ nke na-egosi ụmụaka nwanyị abụọ ụcha akpụkpọ ahụ́ ha na-abụghị otu, ka ha konyere onwe ha aka. Ihe osise ndị ọzọ na-eyi ka ha dị ndụ n’anya ya nke na ọ na-emetụ ha aka, na-amakụ ha, ma na-amụmụrụ ha ọnụ ọchị.”

Maria mekwara ka uru akwụkwọ a bara n’izi ihe pụta ìhè, sị: “Ọ kọwara isi ihe ndị dị mkpa banyere mmekọahụ (peeji nke 58-60) na mmetọ ụmụaka (peeji nke 170-171). Ọ bụ ezi ihe enyemaka nye ndị nne na nna chọrọ iji amamihe zụlite ụmụ ha n’ajọ ụwa nke oge a bụ́ ebe e nwere ọtụtụ ihe ndị dị ize ndụ.”

Ọ bụ olileanya nke ndị dere akwụkwọ a bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ na akwụkwọ a ga-enyekwara ma gị ma ụmụ gị aka irite uru n’ihe Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, kụziiri ihe a kpọrọ mmadụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga.

[Foto dị na peeji nke 21]

Agata

[Foto dị na peeji nke 21]

Marlena

[Foto dị na peeji nke 21]

Eunika

[Foto dị na peeji nke 21]

Maria na Oliwia

[Foto dị na peeji nke 21]

Justyna