Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Ndị Enyi—Ajọ Ndị Enyi

Ezi Ndị Enyi—Ajọ Ndị Enyi

 Ezi Ndị Enyi—Ajọ Ndị Enyi

OTU nwa agbọghọ anyị ga-akpọ Sarah ji obi ilu kwupụta obi ya. Otu nwoke o weere na ọ bụ enyi ya ka a chọpụtara na ọ bụ ogbu mmadụ. ‘Ọ bụrụ na onye m tụkwasịrị obi pụrụ ime ihe dị otú ahụ, oleezi onye m pụrụ ịtụkwasị obi?’ ka ọ jụrụ. Onye Sarah na-akọsara jụrụ ya ma ọ̀ maara ụdị ụkpụrụ nwoke ahụ nwere. Sarah zaghachiri, sị, “Gịnị ka ị na-ekwu?” Sarah amaghịdị ihe a na-ekwu mgbe a sịrị “ụkpụrụ.” Gịnị banyere gị? Ị̀ maara ụkpụrụ ndị enyi gị na-agbaso?

Azịza nke ajụjụ ahụ pụrụ n’ezie ịpụtara mmadụ ọnwụ ma ọ bụ ndụ, dị ka ahụmahụ Sarah na-egosi. Otu ilu Bible si otú a kwuo ya: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ma, dị ka Sarah, ihe ọtụtụ ndị na-adabere na ya ahọrọ ndị enyi na-abụ nanị ma ihe ọ̀ na-adabara ha na ndị ahụ ma ọ bụ na ọ dịghị adaba—mmetụta ha na-enwe mgbe ha na ha nọ. Dị ka o kwesịrị ịdị, ọ na-amasị anyị iso ndị na-eme ka obi na-adị anyị mma na-akpakọrịta. Ma, ọ bụrụ na nke ahụ bụ nanị ihe anyị na-agbakwasị ụkwụ na ya eme nhọrọ anyị, n’echebacharaghị ma ọ bụ n’echebaratụghị omume onye ahụ echiche, anyị pụrụ ịbụ ndị e mechuru ihu n’ikpeazụ. Ị̀ pụrụ isi aṅaa mara ma mmadụ ò nwere ụkpụrụ ọma?

 Mkpa Ụkpụrụ Omume Ọma Dị

Nke mbụ, anyị onwe anyị aghaghị inwe ụkpụrụ ọma. Ọ dị anyị mkpa ịma ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, ihe ọma na ihe ọjọọ, ma rapagidesie ike n’ụkpụrụ omume ọma mgbe nile. Ilu ọzọ dị na Bible na-ekwu, sị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” (Ilu 27:17) Mgbe mmadụ abụọ webatara ụkpụrụ omume ọma n’ọbụbụenyi ha, ha pụrụ inyerịtara ibe ha aka ito eto, nkekọ nke ọbụbụenyi ha ga-esikwa ike karị.

Pacôme, bụ́ onye si France, na-ekwu, sị, “Onye bụ́ ezigbo enyi m bụ onye na-ege m ntị ma jiri obiọma na-agwa m okwu, onye nwekwara ike ịbara m mba mgbe m mere ihe nzuzu.” Ee, ezi ndị enyi anyị—ma hà bụ ụmụaka ma hà bụ ndị agadi—bụ ndị na-enyere anyị aka iche ihu n’ụzọ ziri ezi, ndị na-agbazikwa anyị mgbe anyị chọrọ ime ihe ndị amamihe na-adịghị na ha. Bible na-ekwu, sị: “Nsogbu si n’aka enyi gị ka mma.” (Ilu 27:6, Baịbụl Nsọ nke Nhazi Katọlik) Iji wusikwuo onwe anyị ike n’omume na n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị anyị mkpa iso ndị hụkwara Chineke na ụkpụrụ ya n’anya na-akpakọrịta. “Mgbe ọ na-adịghị onye ọzọ n’ụlọ akwụkwọ anyị nke nwere ụkpụrụ na nkwenkwe Ndị Kraịst m nwere,” ka Céline, bụ́ onye si France na-ekwu, “abịara m mata mkpa ọ dị inwe ezi ndị enyi n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ha enyeworo m aka nke ukwuu iguzosi ike.”

Inyocha Ndị Ị Chọrọ Imete Enyi

Ọ bụrụ na i nwere mmasị n’imete onye i zuteworo enyi, ọ pụrụ ịdị mma ka ị jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ndị bụ́ enyi ya?’ Ụdị ndị ha na mmadụ na-akpachi anya na-egosi ụdị mmadụ onye ahụ bụ. Ọzọkwa, olee otú ndị tozuru okè na ndị a na-akwanyere ùgwù n’ógbè ahụ si ele ya anya? Tụkwasị na nke a, ọ dị mma ịtụle ọ bụghị nanị otú ndị anyị chọrọ imete enyi si emeso anyị ihe kamakwa, otú ha si emeso ndị ọzọ ihe, karịsịa ndị ha na-agajeghị irite ihe ọ bụla n’aka ha. Ọ bụrụ na mmadụ adịghị akpaso mmadụ nile àgwà ọma mgbe nile—dị ka ime ihe n’eziokwu, iguzosi ike n’ezi ihe, inwe ndidi, na ichebara ndị ọzọ echiche—olee ihe mere obi ga-eji kaa gị na ọ ga-akpaso gị àgwà ọma mgbe nile?

Iji mata ezigbo àgwà mmadụ, ọ na-achọ ndidi na nkà, tinyekwara oge iji chọpụta ụdị mmadụ onye ahụ bụ n’ezie. Bible na-ekwu, sị: “Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ; ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” (Ilu 20:5) Ọ dị anyị mkpa iso ndị anyị chọrọ imete enyi kwurịta ihe ndị dị mkpa—ihe ndị ga-ekpughe ụdị ndị ha bụ, ebumnobi ha, ee, ụkpụrụ ndị ha na-agbaso. Olee ụdị mmadụ ha bụ? Hà bụ ndị obiọma ka hà bụ ndị obi ọjọọ? Hà bụ ndị e ji inwe nchekwube na mgbasapụ ihu mara ka hà bụ ndị na-adịghị enwe nchekwube ma na-atụchakarị mmadụ? Hà bụ ndị na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị ka hà bụ ndị na-eche nanị banyere onwe ha?  Hà bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi ka hà bụ ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe? Ọ bụrụ na mmadụ na-akatọkarị ndị ọzọ n’ihu gị, olee ihe ga-egbochi ya ịkatọ gị n’azụ gị? Jizọs kwuru, sị: “Site n’ihe jupụtara n’obi ka ọnụ na-ekwu.” (Matiu 12:34) Mgbe ọ dị otú ahụ, anyị kwesịrị ịsa anya mmiri.

Ihe Ndị Kasị Mkpa Inwekọ Ọnụ

Ụfọdụ na-eche na ndị enyi ha aghaghị inwe mmasị kpọmkwem n’ihe ha onwe ha nwere mmasị na ha. Otu nwatakịrị nwoke kwuru, sị, “Apụtụghị m imete onye na-adịghị ata ụdị biskiiti m na-ata enyi.” Ọ bụ eziokwu na ọ dị ndị enyi mkpa inwekọ ihe ụfọdụ ọnụ ruo n’ókè kwesịrị ekwesị iji nwee ike ịghọta ibe ha, ọ kasịkwa mma ma ọ bụrụ na ha nwere, n’ụzọ bụ́ isi, otu ụkpụrụ ime mmụọ na nke omume. Ma, ọ dịghị mkpa na àgwà ha ma ọ bụ otú e si zụlite ha ga-abụrịrị otu. N’ezie, ndị enyi inwe ahụmahụ dịrịtara iche ná ndụ pụrụ ime ka ọbụbụenyi ha bụrụ nke rijuru afọ na nke ga-abara ha abụọ uru.

Ihe atụ abụọ e nwere na Bible banyere ọbụbụenyi kwesịrị nṅomi—nke Jonatan na Devid nakwa nke Rut na Naomi—dabeere n’ofufe ha fekọrọ Chineke ọnụ nakwa ná mgbaso ha gbasokọrọ ụkpụrụ ya. * N’ụzọ dị ịrịba ama, ndị nke ọ bụla n’ime ha nọgidere na-abụ enyi n’agbanyeghị nnukwu ọdịiche e nwere n’afọ ndụ ha nakwa ná nzụlite ha. Ha si otú a na-akụziri anyị otu ihe banyere ọbụbụenyi: Ụmụaka na ndị merela okenye bụ́ enyi nwere uru dị ukwuu ha ga-erite n’aka ibe ha.

Irite Uru ná Ndịrịta Iche E Nwere n’Afọ Ndụ

Inwe ndị enyi tọrọ anyị ma ọ bụ ndị nke anyị tọrọ pụrụ ịbarịta uru. Tụlee okwu ndị na-esonụ ndị na-eto eto kwuru bụ́ ndị dabeere n’ahụmahụ ha nwere n’onwe ha.

Manuela (Ịtali): “Emetere m otu di na nwunye kataworo ahụ́ enyi n’oge na-adịbeghị anya. Akọọrọ m ha obi m, ihe nyekwara m obi ụtọ bụ na ha kọọrọ m obi ha. Ha eledaghị m anya n’ihi na m dị obere. Nke a kpaliri m ịbịaru ha nso. Enyi mụ na ha na-abara m nnọọ uru ma m nwee nsogbu. Achọpụtara m na ọ na-abụ m kọọrọ ndị ọgbọ m nsogbu m, mgbe ụfọdụ ndị enyi m nwanyị na-enye m azịza ndị a na-echebaraghị echiche nke ọma. Ma ndị enyi m ndị nke merela okenye enwewo ahụmahụ, nghọta, na echiche ziri  ezi bụ́ ndị anyị bụ́ ndị na-eto eto na-enwebeghị. Site n’enyemaka ha, enwewo m ike ime mkpebi ndị ka mma.”

Zuleica (Ịtali): “Anyị nwee nnọkọ, anyị na-akpọ, ọ bụghị nanị ndị na-eto eto kamakwa ndị merela okenye. Achọpụtara m n’onwe m na mgbe ndị na-eto eto na ndị okenye nọkọrọ ọnụ, anyị na-enweta agbamume n’ezie n’abalị ahụ. Anyị na-ekpori ndụ n’ihi na echiche onye ọ bụla dị iche.”

Ndị merela okenye, unu onwe unu pụkwara imete ndị na-eto eto enyi. Dị ka ihe ndị e kwuru n’elu na-egosi, ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mmasị dị ukwuu n’ókè ahụmahụ ndị unu nwere haruru, ọ na-atọkwa ha ụtọ iso unu na-akpakọrịta. Amelia, bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke dị afọ 80 na ụma, na-ekwu, sị: “Ana m ebute ụzọ n’ịkpọtụrụ ndị na-eto eto. Ike na ume ha na-enye m aṅụrị!” Ezi ihe na-esi ná mgbarịta ume dị otú ahụ apụta pụrụ ịdị ukwuu. Ọtụtụ ndị torurula ogo mmadụ obi dị ụtọ na-ekwu na ihe mere ha ji nwee ihe ịga nke ọma bụ ndị enyi ha nwere mgbe ha na-eto eto, bụ́ ndị ji, ọ dịkarịa ala, afọ ole na ole tọọ ha, ndị setịpụkwaara ha ezi ihe nlereanya ma nye ha ezi ndụmọdụ.

Ime Ka Ọbụbụenyi Gị Ka Mma

Iji nwee ezi ndị enyi, ọ dịchaghị gị mkpa imete ndị enyi ọhụrụ. Ọ bụrụ na ị dịla mbụ nwee ndị dị mma gị na ha na-akpakọrịta, gịnị ma ị chọọ ụzọ ị ga-esi mee ka enyi gị na ha sikwuo ike? Ndị enyi anyị na ha kpateworo aka bụ akụ̀ dị nnọọ oké ọnụ ahịa, anyị kwesịkwara iwere ha otú ahụ. Ya adịla mgbe ị ga-eji nguzosi ike n’ihe ha gwurie egwu.

Karịsịa, cheta na ezi obi ụtọ—na ezi ọbụbụenyi—na-abịa site n’iwepụta onwe gị, oge gị, na ihe onwunwe gị. Ụgwọ ọrụ ị ga-enweta karịrị nnọọ mgbalị na àjà ị chụrụ maka ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị na-eche nanị banyere onwe gị mgbe ị na-ahọrọ ndị enyi, ị gaghị enweta ha ma ọlị. Ya mere, mgbe ị na-atụle banyere ndị ị ga-emete enyi, elekwasịla anya nanị n’ebe ndị i nwere mmasị n’ebe ha nọ ma ọ bụ ndị ị ga-erite ihe n’aka ha nọ. Gakwuru ndị ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ na-eleghara anya ma ọ bụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha na-enwe ihe isi ike n’imete enyi. Gaëlle, bụ́ onye si France, na-ekwu, sị: “Mgbe anyị na-achọ inwe nnọkọ maka ime ihe ụfọdụ ma mara banyere ndị na-eto eto na-enweghị ndị ha na ha na-akpakọ, anyị na-akpọ ha. Anyị na-asị: ‘Ọ dịghị mma ka nanị gị nọrọ n’ụlọ. Bịa soro anyị. Ka anyị mata onwe anyị.’”—Luk 14:12-14.

N’aka nke ọzọ, mgbe ndị bụ́ ezigbo mmadụ rịọrọ gị enyi, ejila ọsọ ajụ ya. Elisa, bụ́ onye nọ n’Ịtali, na-ekwu, sị: “Ikekwe, iwe pụrụ iwetụ gị mgbe i chere na a gbahapụrụ gị n’oge gara aga. Ị pụrụ ịmalite iche, sị, ‘E kwuwerị, ndị enyi adịchaghị m mkpa.’ N’ihi ya, gị akwụsị ịtụpụrụ mmadụ ọnụ, gị amalite ịnọrọ onwe gị, na-echekwa nanị banyere onwe gị. Kama ịchọ ndị ị ga-eme enyi, gị ana-agbara onye ọ bụla ọsọ.” Kama ikwe ka ụjọ na-enweghị isi ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị mee ka ị na-eze imete ndị enyi ọhụrụ, na-eme ka ndị ọzọ mara obi gị. Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwe ekele dị ukwuu mgbe ndị ọzọ chetara anyị ruo n’ókè nke ịchọ ka anyị na ha bụrụ enyi.

Ị Pụrụ Inwe Ezi Ndị Enyi

Iji nweta ezi ndị enyi, mmadụ kwesịrị ime ihe karịrị inwe ọchịchọ maka ya, ịnọ na-echere ka ha bịa, na ịgụ isiokwu ndị dị ka nke a. Ịmụ ime enyi dị ka ịmụ ịgba ígwè. Anyị apụghị ịmụta ihe abụọ ahụ nanị site n’ịgụ banyere ha n’akwụkwọ. Anyị aghaghị ịga mụọ ha amụ, ọbụna ma a sị na anyị ga-ada mgbe ụfọdụ. Bible na-egosi na ka ọbụbụenyi wee sie ike karịsịa, mmadụ abụọ ahụ aghaghị ịbụ ndị enyi Chineke. Ma Chineke apụghị ịgọzi mgbalị anyị na-eme imete ndị enyi ma ọ bụrụ na anyị adịghị eme mgbalị ọ bụla. Ì kpebisiri ike inweta ezi ndị enyi? Adala mbà! Kpekuo Chineke ekpere maka enyemaka, na-ebute ụzọ n’achọghị ọdịmma onwe gị nanị, ma bụrụ enyi n’onwe gị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ị pụrụ ịgụ banyere ọbụbụenyi ndị a n’akwụkwọ Bible bụ́ Rut, Samuel nke Mbụ, na Samuel nke Abụọ.

 [Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

Aro A Tụụrụ Ndị Nne na Nna

Dị ka ihe ndị ọzọ a na-amụ amụ, ịmụta ime enyi na-amalite n’ezinụlọ. N’ụzọ dị otú kwesịrị, obere nwa na-anọ n’ụlọ ha nweta ihe ka ukwuu ná mkpakọrịta dị ya mkpa. Ọbụna n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, mkpakọrịta nwatakịrị so ndị ọzọ enwe na-emetụta echiche, mmetụta, na àgwà ya n’ụzọ dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, tụlee otú ọtụtụ ụmụ nke ndị kwagara mba ọzọ si amụta asụsụ obodo ahụ ngwa ngwa nanị site n’iso ụmụaka ndị ọzọ na-akpakọrịta.

Dị ka ndị nne na nna, unu nwere ihe ùgwù nke inyere ụmụ unu aka ịhọrọ ndị enyi n’ụzọ amamihe dị na ya. Ụmụaka na ndị nọ n’oge uto etorubeghị ime mkpebi ndị dị otú ahụ n’enwetaghị enyemaka nke ndị mụrụ ha. Otú ọ dị, nsogbu dị. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-eso ndị na-eto eto ibe ha akpachi anya karịa ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị ọ bụla merela okenye.

Ụfọdụ ndị ọkachamara kweere na otu ihe mere ndị nọ n’afọ iri na ụma ji agakwuru ndị ọgbọ ha kama ịgakwuru ndị mụrụ ha bụ na ọtụtụ ndị nne na nna na-enwe obi abụọ n’ikike ha nwere ịkụziri ụmụ ha ụkpụrụ omume ọma. Ndị nne na nna aghaghị ibu ibu ọrụ Chineke nyere ha site n’ibute ụzọ n’inye ụmụ ha ọzụzụ na inwe mmasị n’ebe ha nọ. (Ndị Efesọs 6:1-4) Ma, olee otú ha ga-esi mee ya? Ọkà n’idozi nsogbu ezinụlọ bụ́ Dr. Ron Taffel na-agakwuru ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị na-amaghị otú ha ga-esi mesoo ụmụ ha ndị nọ n’oge uto ihe. Ọ na-ede na kama inye ụmụ ha ọzụzụ n’ezie, ihe ọtụtụ na-eme bụ “ịgbaso ọtụtụ ihe ndị na-ewu ewu banyere ịzụ ụmụ bụ́ ndị a na-akpọsakarị n’usoro mgbasa ozi.” Gịnị mere ha ji agbaso ihe ndị a? “Ha amaghị ụmụ ha ruo n’ókè ga-eme ka ha na ha na-akpachi anya.”

O kwesịghị ịdị otú ahụ. Ndị nne na nna aghaghị ịghọta na ụmụ ha ga-agakwuru ndị enyi ha ma ọ bụrụ na ha adịghị enweta ihe dị ha mkpa n’ime ezinụlọ ha. Olee ihe ọ bụ? “Ihe dị ha mkpa bụ ihe dịwarala ndị na-eto eto mkpa kemgbe ụwa: ọzụzụ, nkwado, nchebe, iwu na atụmanya ndị doro anya na mmetụta nke ịbụ ndị so biri,” ka Taffel na-ekwu. “Nsogbu e nwere n’oge anyị bụ na ndị okenye adịghị egboro ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’oge ụtọ mkpa ndị a bụ́ isi, ahụ́ adịghịkwa ‘eru ha ala’ n’ezie n’ime ezinụlọ ha.”

Olee otú ị pụrụ isi nyere ụmụ gị aka ma a bịa n’ihe banyere inwe ezi ndị enyi? Nzọụkwụ mbụ bụ ịtụle ụzọ ndụ gị na nke ndị enyi gị. Ihe mgbaru ọsọ na ụzọ ndụ nke gị na ndị enyi gị hà bụ ndị ziri ezi na ndị na-egosi na unu adịghị achọ nanị ọdịmma onwe unu? Hà bụ nke ime mmụọ na nke na-egosi na unu ahụghị ihe onwunwe n’anya? “Omume ka okwu ọnụ ike, ụmụ gị aghaghịkwa ịmụta àgwà na omume ndị ha hụrụ n’ahụ́ gị, n’ahụ́ ndị enyi gị, nakwa n’ahụ́ ụmụ ndị enyi gị,” ka Douglas, bụ́ Onye Kraịst bụ́ okenye, bụrụkwa nna, na-ekwu.

Ọbụna ọtụtụ anụmanụ, dị ka e si kee ha, na-ejikarị anya ọkụ echebe ụmụ ha pụọ n’ebe anụmanụ ndị ọzọ dị ize ndụ nọ. Otu ọkachamara n’ilekọta anụ ọhịa bea na-akọ, sị: “A ma nne anụ ọhịa bea ama maka ichebe ụmụ ha pụọ n’ihe ọ bụla ha lere anya dị ka ihe na-eyi egwu.” Ọ̀ bụ na ndị nne na nna ekwesịghị ime otu ihe ahụ? Ruben, bụ́ onye si Ịtali, na-ekwu, sị: “Ndị mụrụ m sooro m tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ. Ha nyeere m aka ịghọta na ọ ka mma izere ụdị mkpakọrịta ụfọdụ. Ihe mbụ m kwuru n’uche m bụ: ‘Lekwanụ m anya o! Ọ̀ pụtaziri na agaghị m enwe ndị enyi?’ Ma ka oge na-aga, achọpụtara m na ihe ha kwuru bụ eziokwu, ọ bụkwa n’ihi ndidi ha nwere n’ebe m nọ ka m ji bụrụ onye e chebere.”

Ọzọkwa, mee ka ụmụ gị soro ndị bụ́ ezi ihe nlereanya na ndị ga-enyere ha aka isetịpụ ezi ihe mgbaru ọsọ na-akpachi anya. Otu nwoke na-enwe obi ụtọ na ihe ịga nke ọma nke aha ya bụ Francis na-echeta, sị: “Nne m chọpụtara na anyị bụ́ ụmụaka na-anọrọ onwe anyị, n’ihi ya, o nyeere anyị aka site n’ịdị na-akpọ ndị na-ejesi ozi oge nile nke Ndị Kraịst ike, òkù ịbịa n’ụlọ anyị. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị bịara nọrọ kpọmkwem n’ebe obibi anyị mata ha ma mete ha enyi.” Ọ bụrụ na unu emee mgbalị ndị dị otú ahụ, ndụ ụmụ unu na-ebi n’ime ezinụlọ pụrụ inyere ha aka inweta ezi ndị enyi.

[Foto dị na peeji nke 9]

Chọpụta otú ndị ị na-achọ imete enyi si akpa àgwà

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị enyi na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị na-anọgide na-abụ enyi n’agbanyeghị afọ ndụ na nzụlite ha