Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imejụ Agụụ Anyị Na-enwe Maka Ndị Enyi

Imejụ Agụụ Anyị Na-enwe Maka Ndị Enyi

 Imejụ Agụụ Anyị Na-enwe Maka Ndị Enyi

“O WU ỌMỤMA abụghị ọrịa,” ka akwụkwọ bụ́ In Search of Intimacy na-ekwu. “Owu ọmụma bụ agụụ kwesịrị ekwesị . . . , ihe àmà e bu pụta ụwa nke na-egosi na anyị enweghị ndị anyị na ha na-akpakọrịta.” Dị nnọọ ka agụụ na-akpali anyị iri nri na-edozi ahụ́, owu ọmụma kwesịrị ịkpali anyị ịchọ ezi ndị enyi.

Ma, dị ka Yaël, bụ́ nwa agbọghọ nọ na France, si kwuo, “ụfọdụ na-ezere iso ndị ọzọ enwe ụdị mkpakọrịta ọ bụla.” Ma ikewapụ onwe anyị iche, ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya kpatara ya, adịghị egbo mkpa ọ bụla, ọ ga-emerịrị ka owu mawakwuo anyị. Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” (Ilu 18:1) N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ ghọta mkpa ọ dị anyị inwe ndị enyi ma kpebisie ike ime ihe banyere ya.

Mee Ihe Ndị Kwesịrị Ekwesị Iji Nweta Ndị Enyi

Kama imetewere onwe gị ebere ma ọ bụ nwewe anyaụfụ n’ebe ndị yiri ka hà ka gị nwee ndị enyi ma ọ bụkwanụ yie ka ndị enyi ha hà ka ndị nke gị mma nọ, gịnị ma i nwee àgwà kwesịrị ekwesị, dị ka Manuela, bụ́ onye si Ịtali, mere? Ọ na-ekwu, sị: “Karịsịa, n’oge m dị afọ iri na ụma, ọ dị m ka ndị mmadụ hà na-agbara m ọsọ. Iji mee ka mmetụta a kwụsị, eleruru m ndị nwere ezi ndị enyi anya. Mgbe ahụ, agbalịrị m ịzụlite àgwà ọma ndị ha nwere, gbalịa ịbụ ezigbo mmadụ karị.”

Otu nzọụkwụ dị irè bụ ilekọta onwe gị n’ụzọ anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ ndị ọzọ. Iri nri na-edozi ahụ́, izu ike na imega ahụ́ otú kwesịrịnụ, ga-enyere gị aka ịdị mma n’anya na inwe ezi ahụ́ ike ruo ókè o kwere mee. Ịdị mma n’anya, ịdị ọcha, na iji ejiji dị mma abụghị nanị na ọ na-eme ka ndị mmadụ nwekwuo mmasị ịnọ gị nso kamakwa ọ na-eme ka i nwee nnọọ ùgwù onwe onye. Otú ọ dị, adabala n’ọnyà nke ịdị na-echegbubiga onwe gị ókè banyere ọdịdị ahụ́ gị. “Iyi uwe ndị na-ewu ewu abụghị ya ga-eme ka i nweta ezi ndị enyi,” ka Gaëlle, nke si France, na-ekwu. “Ihe ndị bụ́ ezigbo mmadụ na-ele bụ àgwà mmadụ.”

E kwuwerị, echiche na mmetụta ndị anyị na-enwe na-emetụta ihe anyị na-ekwu banyere ya na ọbụna otú anyị na-adị n’anya. Ị̀ na-enwe obi ike ná ndụ? Nke a ga-enyere gị aka inwe ihu ọchị. Ezigbo ihu ọchị bụ ihe na-adọrọ nnọọ mmasị. Ọkachamara n’ihe banyere ọdịdị ahụ́ bụ́ Roger E. Axtell na-akọwakwa na “o zuru ụwa ọnụ n’ezie” nakwa na “a dịkebeghị aghọtahie ya.” * Ị bịakwuo bụrụ onye ma nnọọ ka e si akpa ọchị, ọ ga-adịrị ndị mmadụ mfe ịbịa gị nso.

 Cheta na àgwà ọma ndị dị otú ahụ na-esi n’obi apụta. Ya mere, na-eji echiche na mmetụta ndị dị mma emeju uche na obi gị mgbe nile. Na-agụ banyere ihe ndị na-adọrọ mmasị na ndị bara uru—okwu ndị a kpụ n’ọnụ, ọdịbendị dị iche iche, na ihe ndị e kere eke. Na-ege egwú ndị na-ewuli elu. Ma ekwela ka TV, vidio, na akwụkwọ ọgụgụ mee ka ihe ga-ejupụta n’uche na n’obi gị bụrụ echiche efu. Mmekọrịta ndị a na-egosikarị n’ihe nkiri vidio emeghị eme, ndị ahụ abụghị enyi n’ezie, kama ihe nkiri ndị ahụ bụ ihe mmadụ chepụtara echepụta.

Na-ekwupụta Obi Gị!

Zuleica, bụ́ onye bi n’Ịtali, na-echeta, sị: “Mgbe m dị obere, ana m eme ihere, o sikwaara m ike inwe ndị enyi. Ma amaara m na ị chọọ inwe ndị enyi, ị ghaghị ibute ụzọ, mee ka a mara gị, gị amarakwa ndị ọzọ.” Ee, iji nwee ezi ndị enyi, anyị aghaghị ịdị na-akọsara ndị ọzọ obi anyị—mee ka ha mara ndị anyị bụ n’ezie. Ikwurịta okwu na ikwupụta obi n’ụzọ dị otú ahụ dị oké mkpa iji bụrụ ezi ndị enyi karịa otú ịbụ onye mara mma na onye nwere ọdịdị na-adọrọ adọrọ si dịrị. “Ndị bụ́ ezigbo enyi nwere ike ịbụ ndị ihere, ndị nwere omume enyi, ụmụaka, ndị agadi, ndị na-eme nwayọọ nwayọọ, ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ, ndị na-amaghị mma, ndị mara mma; ma otu àgwà ha nile nwechara bụ na ha na-ekwupụta obi ha mgbe nile,” ka onye ndụmọdụ bụ́ Dr. Alan Loy McGinnis na-ekwu. “Ha na-ekwe ka ndị mmadụ mara ihe dị ha n’obi.”

Nke a adịghị apụta na ị ga na-akọrọ ụwa nile obi gị ma ọ bụ na-akọrọ ndị ahụ́ na-adịghị eru gị ala n’ebe ha nọ izu nzuzo gị. Kama ọ pụtara na ị ga na-eji nke nta nke nta akọrọ ndị ị họọrọ, echiche na mmetụta ndị ị na-enwe n’ezie. Michela, bụ́ onye si Ịtali, na-ekwu, sị: “Na mbụ, enwere m nsogbu nke izochi mmetụta m na-enwe. Abịara m mee mgbanwe, agbalịrị m ịdị na-egosipụtakwu mmetụta m ka ndị enyi m wee nwee ike ịghọta mmetụta m na-enwe, ka mụ na ha wee dịkwuo ná mma.”

Otú ọ dị, ọ bụrụgodị na i bu omume enyi pụta ụwa, ọ ka ga-ewe oge ma chọọ imekọ ihe ọnụ tupu gị na ndị enyi gị enwee ike ịtụkwasịrịta ibe unu obi. Ka ọ dịgodị, gbalịa ịghara ichegbubiga onwe gị ókè banyere ihe ndị ọzọ pụrụ iche banyere gị. Elisa, bụ́ onye nọ n’Ịtali, na-echeta, sị: “Nsogbu m bụ na, mgbe ọ bụla m chọrọ ikwu okwu, ana m atụ ụjọ na m ga-ekwuhie ọnụ. Ma m bịara chee, sị, ‘Ọ bụrụ na ndị mmadụ bụ ndị enyi m n’ezie, ha ga-aghọta.’ N’ihi ya, m kwuhie ọnụ, ihe m na-eme bụ ịchị nnọọ onwe m ọchị, onye ọ bụla na-esokwa m chịa ọchị.”

Ya mere, wetuo obi! Na-eme nnọọ ihe otú i si eme. Ime ka onye ọzọ adịghị enye aka. “Ọ dịghị ihe pụrụ ime ka mmadụ bụrụkwuo onye na-adọrọ mmasị karịa mmadụ ime ihe otú o si eme,” ka onye ndụmọdụ ezinụlọ bụ́ F. Alexander Magoun dere. Ọ dịghị ndị na-enwe ezi obi ụtọ mkpa imewe ihe otú ha na-esighị eme ma ọ bụ ịnwa ime ka ndị ọzọ jawa ha. Nanị site n’ime ihe otú anyị si eme ka ọbụbụenyi anyị pụrụ isi bụrụ nke ezigbo ya. N’otu aka ahụ, ọ dị anyị mkpa ikwe ka ndị ọzọ na-eme ihe otú ha si eme. Ndị obi ụtọ na-ewere ndị ọzọ otú ha dị, ha adịghị ewesa ha iwe n’ihi obere ọrụ ha gbara. Ọ naghị adị ha ka ha kegharịa ndị enyi ha iji dị otú ha chọrọ ka ha dị. Gbalịsie ike ịbụ ụdị mmadụ ahụ nke na-enwe obi ụtọ, nke na-adịghịkwa akatọ ndị mmadụ.

Iji Nwee Enyi, Bụrụ Enyi

E nwedịrị ihe ka mkpa—nke bụ́ isi sekpụ ntị. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga,  Jizọs gosiri na isi ihe na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma ná mmekọrịta nile nke mmadụ bụ ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị. Ọ kụziri, sị: “Dị nnọọ ka unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emeso ha n’otu ụzọ ahụ.” (Luk 6:31) Ee, nanị ụzọ ị ga-esi nwee ezi ndị enyi bụ gị onwe gị ịbụ enyi na-enye ihe, nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, iji nwee enyi, bụrụ enyi. Ka ọbụbụenyi wee na-aga nke ọma, a ghaghị igosipụta ya site n’inye enye karịa n’ịnara anara. Anyị aghaghị ịdị njikere igbo mkpa nke enyi anyị tupu nke anyị.

Manuela, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu, sị: “Dị nnọọ ka Jizọs kwuru, ezi obi ụtọ na-abịa site n’inye ihe. Onye na-anara anara na-enwe obi ụtọ, ma onye na-enye enye na-enwe obi ụtọ ọbụna karị. Anyị pụrụ inye ihe site n’iji nnọọ *ezi obi na-ajụ ndị enyi anyị otú ha mere, site n’ịgbalị ịghọta nsogbu ha, nakwa site n’ime ihe nile anyị pụrụ ime n’echereghị ka ha gwa anyị agwa.” Ya mere, na-ebute ụzọ n’igosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, gụnyere ndị enyi i nwerela enwe. Mee ka mmekọrịta unu sikwuo ike. Emebila ọbụbụenyi unu n’ihi ịchụso ihe ndị na-adịchaghị mkpa na ndị na-adịchaghị enye afọ ojuju. Ndị enyi chọrọ oge na nlebara anya. Ruben, bụ́ onye nọ n’Ịtali, na-ekwu, sị: “Iwepụta oge iji nọkọọ dị oké mkpa n’inweta na ịnọgide na-enwe ndị enyi. Nke mbụ, ọ na-ewe oge iji bụrụ onye na-ege ntị nke ọma. Anyị nile pụrụ imeziwanye ihe n’ige ntị nakwa n’igosi mmasị n’ihe ndị ọzọ na-ekwu site n’ịghara ịdị na-anapụ ha okwu n’ọnụ.”

Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

Isi ihe ọzọ na-eme ka ọbụbụenyi bụrụ ihe na-enye obi ụtọ ma na-adịte aka bụ nkwanyerịta ùgwù. Nke a na-agụnye ichebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche. Ị na-achọ ka ndị enyi gị jiri akọ na ezi uche na-eme ihe mgbe ihe ndị na-amasị ha na echiche ha dị iche na nke gị, ị́ dịghị achọ? Ọ̀ bụ na i kwesịghị imeso ha ihe n’otu ụzọ ahụ?—Ndị Rom 12:10.

Ụzọ ọzọ anyị si egosi nkwanye ùgwù bụ site n’ikwe ndị enyi anyị megharịa ahụ́. Ezi ndị enyi adịghị ekwo ekworo ma ọ bụ na-ejichi ibe ha. Ná 1 Ndị Kọrint 13:4, Bible na-ekwu, sị: “Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” Ya mere, nọrọ na nche megide ọchịchọ nke ịchọ ka ọ bụrụ nanị gị ga-enwe ndị enyi gị. Ọ bụrụ na ha akọsara ndị ọzọ obi ha, ekwela ka iwe wee gị, ikekwe gị akwụsị ọbụna ịtụpụrụ ha ọnụ. Mụta na ọ dị anyị nile mkpa ịdị na-agbasapụ n’ọbụbụenyi anyị. Nye ndị enyi gị ohere imete ndị ọzọ enyi.

Tụleekwa mkpa ndị enyi gị nwere maka ịnọrọ onwe ha. Ọ dị ndị mmadụ n’otu n’otu, nakwa ndị di na nwunye, mkpa inwe oge ha ji anọrọ onwe ha. Ọ bụ ezie na i kwesịghị ịla azụ n’iso ndị ọzọ na-akpakọrịta, na-emeru ihe n’ókè ma na-echebara ihe echiche, abịakarịkwala na nke ndị enyi gị. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Mee ka ụkwụ gị kọọ ụkọ n’ụlọ mmadụ ibe gị; ka ihe gị wee ghara iju ya afọ, o wee kpọọ gị asị.”—Ilu 25:17.

 Achọla Izu Okè

N’ezie, mgbe ndị mmadụ matara ibe ha, ha na-abịa marakwuo banyere ebe ndị ha na-adịghị ike nakwa ebe ndị ha dị ike. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka nke a gbochie anyị imete enyi. “Ụfọdụ na-atụ anya ihe karịrị akarị n’aka ndị ha chọrọ ka ha bụrụ enyi ha,” ka Pacôme, bụ́ onye nọ France, na-ekwu. “Ha chọrọ ka ha nwee nanị àgwà ọma, ma nke ahụ agaghị ekwe omume.” Ọ dịghị onye n’ime anyị zuru okè, anyị ekwesịghịkwa ịchọ ya n’aka ndị ọzọ. Anyị na-atụ anya ka ndị enyi anyị were anyị otú anyị dị n’agbanyeghị ezughị okè anyị ma nabata anyị n’agbanyeghị amaghị eme anyị. Ọ̀ bụ na anyị onwe anyị ekwesịghị ịgbalị ileghara amaghị eme nke ndị enyi anyị anya site n’ịghara ịdị na-echepụta ya n’obi anyị ma ọ bụ ghara ịdị na-ekwukarị banyere ya? Onye edemede bụ́ Dennis Prager na-echetara anyị, sị: “Ihe a maara dị ka ndị enyi na-enweghị ntụpọ (ya bụ, ndị na-emetụbeghị mkpesa, ndị na-ahụ n’anya mgbe nile, ndị na-ewetụbeghị iwe, ndị na-elegide anyị anya, na ndị na-emechutụbeghị anyị ihu) bụ anụmanụ ndị e ji mere enyi.” Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ọ bụrụ nanị anụmanụ ga-abụ ezi ndị enyi anyị, ọ dị anyị mkpa ịṅa ntị na ndụmọdụ Pita onyeozi bụ́ ikwe ka ‘ịhụnanya kpuchie ọtụtụ mmehie.’—1 Pita 4:8.

 E kwuwo na ndị enyi na-eme ka anyị nwekwuo ọṅụ, na-emekwa ka újú anyị na-eru belata. Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na anyị apụghị ịtụ anya ka ndị enyi anyị gboo mkpa anyị nile ma ọ bụ dozie nsogbu anyị nile. Nke ahụ bụ ile ọbụbụenyi anya n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị.

Ndị Na-anọgide Na-abụ Enyi Ma n’Anwụ Ma ná Mmiri

Ozugbo anyị metere mmadụ enyi, anyị ekwesịghị iji ya gwurie egwu. Mgbe ndị enyi na-anọghị nso, ha na-echeta ibe ha, na-ekpe ekpere maka ibe ha. Ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị ugboro ole na ole ka ha na-anọkọrịta, ha na-aghọta ibe ha ngwa ngwa. Ọ dị anyị mkpa inyere ndị enyi anyị aka karịsịa n’oge ihe na-esiri ha ike ma ọ bụ n’oge ha nọ ná mkpa. Anyị ekwesịtụghị ịgbara ndị enyi anyị ọsọ mgbe ha nwere nsogbu. Ọ pụrụ ịbụ mgbe ahụ ka enyemaka anyị kasị dị ha mkpa. “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” (Ilu 17:17) Mgbe ezi ndị enyi nwere nghọtahie, ha na-ekpezi ngwa ngwa, ha na-agbagharakwa ibe ha. Ezi ndị enyi adịghị ahapụ ibe ha nanị n’ihi na ihe esiela ike.

Site n’inwe ebumnobi nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị nakwa site n’inwe ezi àgwà, ị pụrụ inweta ndị enyi. Ma ụdị ndị enyi i nwere dịkwa mkpa. Olee otú ị pụrụ isi họta ezi ndị enyi? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Leekwa isiokwu bụ́ “Mụmụọ Ọnụ Ọchị—Ọ Baara Gị Uru!” ná mbipụta Teta! nke July 8, 2000.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

Nwoke na Nwanyị Hà Pụrụ Ịbụ “Enyi Nkịtị”?

Nwoke na nwanyị na-abụghị di na nwunye hà pụrụ ịbụ enyi? Nke ahụ dabeere n’ihe anyị bu n’uche n’okwu ahụ bụ́ “enyi.” Jizọs bụ ezigbo enyi Meri na Mata nke Betani—ha abụọ bụ ndị inyom na-alụghị di. (Jọn 11:1, 5) Pọl onyeozi bụ enyi Prisila na di ya, bụ́ Akwịla. (Ọrụ 18:2, 3) Anyị pụrụ ijide n’aka na mmadụ ndị a hụrụ ibe ha n’anya. N’otu mgbe ahụ, anyị apụghị ichetụ n’echiche na Jizọs ma ọ bụ Pọl kwere mgbe ọ bụla ka mmekọrịta ahụ ruo na nke ndọrọ mmekọahụ.

Ụwa nke oge a na-emezi ka ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-emekọ ihe karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ nọwokwa na-adịwanye mkpa ka ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị mara otú ha ga-esi na-abụrịta enyi n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị di na nwunye na-esokwa ndị ọzọ bụ́ di na nwunye nakwa ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, enwe mmekọrịta dị mma.

“Otú ọ dị, ọ pụrụ isigbu onwe ya n’ike ịmata ọdịiche dị n’etiti mmetụta ịhụnanya nkịtị na nke ndọrọ mmekọahụ,” ka magazin bụ́ Psychology Today na-adọ aka ná ntị. “Nke bụ́ eziokwu bụ na nwoke na nwanyị bụ́ enyi pụrụ na mberede ịghọ ndị nwere ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ n’etiti onwe ha, n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe ha bu n’obi ná mmalite. Ibi ọmà nkịtị pụrụ na mberede ịghọwazi nke ndọrọ mmekọahụ.”

Iji ezi uche eme ihe dị mkpa karịsịa nye ndị bụ́ di na nwunye. “Ụdị mkpachi anya ọ bụla gị na ndị ọzọ na-enwe pụrụ itinye alụmdi na nwunye unu n’ihe ize ndụ,” ka onye edemede bụ́ Dennis Prager dere n’akwụkwọ ya bụ́ Happiness Is a Serious Problem. “Ọ bụghị nanị ma gị na mmadụ ùnu na-enwe mmekọahụ bụ na unu na-akpachi anya, ọ bụkwa ihe ruuru di ma ọ bụ nwunye gị ịtụ anya ka ọ bụrụ nanị ya bụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nke gị na ya ga na-akpachi anya.” Jizọs mere ka ọ pụta ìhè na iji nọgide na-adị ọcha n’omume, mmadụ aghaghị ịchịkwa obi ya. (Matiu 5:28) Ya mere, nwee omume enyi ma chebe obi gị, na-ejikwa nlezianya ezere ọnọdụ ndị pụrụ iduba gị n’iche echiche, n’inwe mmetụta, ma ọ bụ n’ime omume ndị na-ekwesịghị ekwesị n’ebe onye ọ bụla na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ilekọta ahụ́ gị na uche gị na-eme ka ị bụrụ onye na-adọrọ mmasị karị

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị enyi na-akọrọ ibe ha obi ha