Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 28. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Mgbe Samsin na-achọ “ụzọ Ọ ga-esi megide ndị Filistia,” ònye ka ọ họọrọ ịbụ nwunye ya? (Ndị Ikpe 14:1-4)

2. Dị ka Jizọs kọwara, ọ bụrụ na mmadụ bụ ohu Chineke, olee ihe ọ na-agaghị abụ ohu ya n’otu oge ahụ? (Luk 16:13)

3. Olee nna nna Mezaịa ahụ nke ghọrọ di Rut? (Rut 4:13)

4. Olee ụzọ isi kpọọ aha Chineke nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọkà mmụta Hibru kwadoro karịsịa?

5. N’ihi ajọ omume gabigara ókè nke Jezibel, gịnị ka Jehova buru n’amụma ga-eme ya? (1 Ndị Eze 21:23)

6. N’ihi gịnị ka Ebreham ji zụrụ ọgba dị n’ọhịa Makpila n’aka “ụmụ Het”? (Jenesis 23:19, 20)

7. Okwu dị aṅaa nke pụtara ịchịkọta ọnụ ọnụ uwe mwụda iji nwee ike ịrụ ọrụ chọrọ ike ọkpụkpụ aka n’asụsụ mbụ e ji dee Bible ka e ji mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ iji gosi ime nkwadebe maka ọrụ siri ike a ga-eji ụbụrụ rụọ ma ọ bụ ọrụ ime mmụọ siri ike? (Job 38:3)

8. Olee nwa Adam na Iv nke a mụrụ mgbe Adam dị afọ 130? (Jenesis 5:3)

9. N’ihi mmehie ònye ka e ji merie ụmụ Izrel na Aị? (Joshua 7:20)

10. Ebe ọ bụ na Meri enweghị ego ịzụta ebule maka iji chụọ àjà mgbe a mụsịrị Jizọs, gịnị ka Iwu ahụ nyere ya ohere iji chụọ àjà n’ọnọdụ ebule? (Luk 2:24)

11. Olee otú Pọl si kọwaa onwe ya n’ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ ndị o dere? (Ndị Efesọs 1:1)

12. Mgbe Eze Senakerib nke Asiria na-anwa ime ka ndị Juu chịlie aka, n’ihi gịnị karịsịa ka Hezekaịa ji lee ịkwa emo ya anya dị ka nleda anya? (Aịsaịa 36:14, 15, 18-20)

13. Olee ebe Pọl onyeozi nọ mgbe a kpọrọ ya òkù, sị: “Gafeta na Masedonia nyere anyị aka”? (Ọrụ 16:8, 9)

14. N’ihi gịnị ka Hanani, bụ́ onye ọhụụ, ji baara Eze Esa nke Juda bụ́ ezigbo mmadụ mba mgbe ọ chịworo n’ikwesị ntụkwasị obi ruo afọ 35? (2 Ihe E Mere 16:7)

15. Dị ka Jizọs si kwuo, ruo ogologo oge hà aṅaa ka mmadụ kwesịrị iji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi iji bụrụ onye a ga-azọpụta? (Mak 13:13)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Otu nwanyị Filistia nke si Timna

2. Akụ̀

3. Boaz

4. Yahweh

5. “Nkịta ga-eri Jezibel”

6. Ka o lie nwunye ya bụ́ Sera na ya

7. “Kee ihe okike n’úkwù gị”

8. Set

9. Ekan

10. “Nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ”

11. Dị ka onyeozi nke Kraịst Jizọs

12. Ọ bụ n’ihi na Senakerib turu ọnụ na Jehova agaghị emeli ihe ọ bụla, dị nnọọ ka chi nke ala ndị ha meriworo na-emelighị ihe ọ bụla

13. Na Troas, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri dị n’Asia Minor

14. N’ihi na n’oge ahụ, n’ihi ihe a na-amaghị ihe kpatara ya, Eze Esa sooro eze Siria jikọọ aka kama ịdabere n’ebe Jehova nọ

15. “Ruo ọgwụgwụ”