Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụkpụrụ Omume Gbanwere Agbanwe—Ị̀ Na-enwe Mmetụta Na Ọ Dị Ihe Na-efunahụ Anyị?

Ụkpụrụ Omume Gbanwere Agbanwe—Ị̀ Na-enwe Mmetụta Na Ọ Dị Ihe Na-efunahụ Anyị?

 Ụkpụrụ Omume Gbanwere Agbanwe—Ị̀ Na-enwe Mmetụta Na Ọ Dị Ihe Na-efunahụ Anyị?

“OLEE nsogbu kasị sie ike nke na-eche mba a ihu?” Mgbe a jụrụ ajụjụ a, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a jụrụ ya na United States kwuru na ndakpọ nke ezinụlọ na omume bụ ma ọ bụ so ná nchegbu ndị bụ́ isi ha nwere. A bịa na nke a, ọ bụghị nanị ha ka ọ dị otú ahụ.

Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ Paris a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ International Herald Tribune kwuru, sị: “E nwere ọchịchọ pụtara ìhè, karịsịa n’etiti ndị na-eto eto, maka ụdị ụfọdụ nke ime atụmatụ ga-eme ka a dị n’otu, echiche ndị doro anya a ga-eji gwọta ma belata mmetụta nke anyaukwu, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, nke enweghị mmụọ mkpakọrịta, bụ́ ndị yiri ka ha na-ejupụta ụwa nile. . . . Arụmụka a na-arị elu banyere mkpa ọ dị inwe ụkpụrụ omume zuru ụwa ọnụ bụ ịnakwere na e nwere ihe a na-emebeghị.”

Ì chere na gọọmenti dị iche iche na ndị ndú ụwa, gụnyere ndị isi achụmnta ego, nwere ụkpụrụ omume ndị dị mkpa ga-eduga anyị n’ọdịnihu na-enye obi ụtọ karị, nke na-adịchaghị ize ndụ, nke dị nchebe karị? Ị̀ na-enwe mmetụta na ọ dị ihe na-efunahụ anyị, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ruo n’ókè ụfọdụ, n’ihi mgbanwe nke ụkpụrụ omume ị na-ahụ gburugburu gị?

Otu ihe ga-akpatara gị nchegbu dị ukwuu pụrụ ịbụ nchebe onwe onye. Ì bi n’ebe ọ na-adịghị ize ndụ ịhapụ ụlọ gị n’akpọchighị ya akpọchi? Ị̀ na-aga n’okporo ámá dị n’ógbè unu n’abalị n’enweghị nchegbu ọ bụla? Ọ bụrụ na ọ dabaara gị ibi n’ebe a na-enweghị agha, ọgba aghara agbụrụ, ma ọ bụ ajọ mwakpo nke òtù ndị omempụ, ị ka pụrụ ịdị na-atụ egwu ịbụ onye e merụrụ ahụ́, onye a pụnaara ihe, onye e tikara ụlọ ya, ma ọ bụ onye e zuru ihe ya. N’ụzọ kwere nghọta, nke a pụrụ ime ka mmadụ nwee obi erughị ala na mmetụta nke mfu.

Tụkwasị na nke a, ọ pụrụ ịbụ na i nwekwaghị—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ—mmetụta nke ịtụkwasị ndị ọzọ obi bụ́ nke i nweburu. Site n’ahụmahụ, ikekwe ma n’ọrụ gị ma ná ndụ nke onwe gị, ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo ọnọdụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ ịchọ ime gị ihe ọjọọ ma ọ bụrụhaala na ha ga-erite uru na ya, ọbụnadị uru dị nta.

 A Chọrọ Ka Gọọmenti Setịpụ Ihe Nlereanya

Kemgbe ụwa, e nwewo nnọọ njikọ doro anya n’etiti ụkpụrụ omume obodo na-egosipụta na ụkpụrụ omume ndị gọọmenti ha na-egosipụta. Calvin Coolidge, bụ́ onye mesịrị bụrụ president United States, kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ekwu banyere ihe ndị ruuru mmadụ site n’okike, ma ana m ama onye ọ bụla aka igosi ebe e nwetụworo ihe ndị ruuru mmadụ n’ụwa a ma ọ bụ ebe a nabatatụworo ha tupu e guzobe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, iwu ndị ha na ha kwekọrọ, iji kwupụta ma chebe ha.”

Mee elu mee ala, ọ bụ gọọmenti nke na-achị achị—n’agbanyeghị otú o si nweta ọchịchị—pụrụ ịkwalite ma ọ bụ igbochi ihe ndị ruuru mmadụ dị ka nnwere onwe ịgbasa akụkọ, nnwere onwe inwe mgbakọ, nnwere onwe ikpe okpukpe, na nnwere onwe ikwu okwu n’ihu ọha, nnwere onwe pụọ n’ịbụ onye e jidere n’ụzọ iwu na-akwadoghị ma ọ bụ pụọ ná mwakpo, na inweta ikpe ziri ezi.

Abraham Lincoln, bụ́ onye mesịrị bụrụ president United States, kwuru otu mgbe, sị: “Nzube ziri ezi nke gọọmenti bụ imere ndị mmadụ ihe ọ bụla ha chọrọ ka e meere ha, bụ́ nke ha na-enweghị ike ime n’onwe ha, ma ọ bụ nke ha na-apụghị ime nke ọma—n’ikike nke onwe ha n’otu n’otu.” Mgbe gọọmenti dị iche iche tinyere mgbalị iji mezuo nzube ndị dị elu otú ahụ, ndị mmadụ na-atụkwasịkarị ndị na-achị achị obi.

Otú ọ dị, enweghị nchekwube na ntụkwasị obi yiri ka ọ nọchiwo anya obi ike na ntụkwasị obi dị otú ahụ taa. Otu nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya na United States gosiri na pasent 68 nke ndị a jụtara echiche ha kwuru na omume ndị ọrụ gọọmenti etiti adịchaghị mma ma ọ bụ ọbụna na ọ dịghị mma. N’ọtụtụ mba, iri ngo na nrụrụ aka dị egwu nke ndị nọ n’isi ọchịchị emewo ka otú ndị mmadụ si ele ha anya gbanwee. N’ụzọ kwere nghọta, nke a emewo ka ọnụ ọgụgụ mmadụ na-arịwanye elu nwee mmetụta nke mfu.

 Ihe Nlereanya Ọma nke Eze Solomọn

Otu ihe nlereanya nke mgbe ochie na-egosi nnọọ ókè ụkpụrụ omume nke ndị na-achị achị pụrụ inweru mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ. Eze Solomọn chịrị ebo 12 nke Izrel malite na 1037 ruo 998 T.O.A. Nna ya, bụ́ Eze Devid, abụwo otu n’ime ndị eze a ma ama n’Izrel. Bible kọwara Devid dị ka onye hụrụ eziokwu na ezi omume n’anya na, karịsịa ihe nile, dị ka nwoke tụkwasịrị Chineke ya, bụ́ Jehova, obi kpam kpam. Devid kụziiri Solomọn otu ụkpụrụ omume ahụ.

Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile gosiri Solomọn onwe ya ná nrọ ma gwa ya sị: “Rịọ ihe M ga-enye gị?” (2 Ihe E Mere 1:7) Kama ịrịọ nnukwu akụ̀ na ụba, otuto onwe onye, ma ọ bụ inwe mmeri n’ọchịchị ya, Solomọn kpughere ụkpụrụ ndị o jiri kpọrọ ihe site n’ịrịọ ka e nye ya obi maara ihe, nke na-aghọta ihe, na nke na-erube isi, ka o wee nwee ike ịchị mba Izrel nke ọma.

Olee otú ọchịchị Solomọn si metụta ndị ahụ? Chineke jiri amamihe, ebube, na akụ̀ na ụba onwe onye gọzie ya—ogologo oge nile ọ nọgidere na-agbaso ụkpụrụ ime mmụọ nke mba ahụ. Nchọpụta ndị e mere n’ihe ndị mgbe ochie na-egosi na e nwere ọganihu ihe onwunwe n’oge ọchịchị Solomọn. Akwụkwọ bụ́ The Archaeology of the Land of Israel na-ekwu, sị: “Akụ̀ na ụba ndị nubatara n’obí eze site n’akụkụ nile, na azụmahịa ndị na-aga nke ọma . . . wetara mgbanwe dị ngwa na nke dị ịrịba ama n’akụkụ nile nke ọnọdụ ihe onwunwe nke mba ahụ.”

N’ezie, ọchịchị ọma nke Solomọn wetaara ndị ọ na-achị udo, mee ka ha nọrọ ná nchebe, meekwa ka ha nwee obi ụtọ. “Juda na [Izrel] wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi [vaịn] ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo na [Bia-shiba], ụbọchị nile nke Solomọn.”—1 Eze 4:20, 25.

Ihe Nlereanya Ọjọọ nke Eze Solomọn

Otú ọ dị, ọ dị mwute na ụkpụrụ omume nke Solomọn mesịrị gbanwee dị ka ụkpụrụ omume nke ọtụtụ ndị ndú taa. Ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “O wee nwee [narị ndị inyom asaa], bụ́ ụmụ ndị isi, na [narị ndị iko nwanyị atọ]: ndị inyom ya wee wezụga obi ya. O ruo, na mgbe agadi Solomọn, na ndị inyom ya wezụgara obi ya ka o soo chi ọzọ: obi ya ezughịkwa okè n’ebe Jehova, bú Chineke ya, nọ, dị ka obi Devid, bụ́ nna ya.”—1 Ndị Eze 11:3, 4.

Mmetụta dị aṅaa ka ụkpụrụ omume gbanwere agbanwe nke Eze Solomọn nwere n’ahụ́ ndị ya? N’agbanyeghị ikike na amamihe ya dị ukwuu, Solomọn ghọrọ onye ọchịchị nchịgbu ná ngwụsị nke ọchịchị ya. Oké mmefu nke ọchịchị ya mere ka akụ̀ na ụba mba ahụ gwụsịa. Ndị ọrụ enweghịzi afọ ojuju. Ndị na-emegide ọchịchị eze ahụ guzogidere ya ma chọọ iweghara ọchịchị. Ịdị n’otu e nwere ná mba ahụ belatara nke ukwuu. Lee ihe na-emegide onwe ya ọ bụ na Solomọn n’onwe ya dere, sị: “Mgbe ndị ezi omume na-aba ụba karị, ndị ala ha na-aṅụrị: ma mgbe onye na-emebi iwu na-achị achị, ndị ala ya na-eze ume.”—Ilu 29:2.

Nwa obere oge mgbe Solomọn nwụsịrị, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na enweghị ntụkwasị obi mere ka e kewaa mba ahụ, nke ahụ kpatakwara oge ihe isi ike, adịghị n’otu, na ịla azụ. Ndị Izrel nwere mmetụta dị ukwuu nke mfu. Ọchịchị ha agbanwewo ụkpụrụ omume ya, na-eleghara ọdịmma kasịnụ nke ndị ọ na-achị anya. Ihe bụ́ isi nke a na-emezighị bụ na ndị ndú ha leghaara Jehova na iwu ya anya. N’ihi ya, mba ahụ dum tara ahụhụ ya.

Enweghị Ntụkwasị Obi nke Zuru Ebe Nile Taa

N’ọchịchị, achụmnta ego, nakwa n’òtù okpukpe taa, ọtụtụ ndị adịghị etinye uche nke ọma n’ịgbaso ụkpụrụ omume ọma. Nke a, n’aka nke ya, emewo ka e nwee mmetụta nke mfu n’uche nakwa n’obi nke ndị mmadụ n’ozuzu ya. N’ụzọ na-arịwanye elu, gọọmenti dị iche iche na ndị ndú ndị ọzọ enweghị ike idozi nsogbu ndị bụ́ isi nke mba ha.

Dị ka ihe atụ, ha enwebeghị ike ịkwụsị agha ma ọ bụ ibelata ịdị oké ọnụ nke inweta nlekọta ahụ́ ike ma ọ bụ mmetụta ọjọọ nke ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ. E nwewokwa ndakpọ nke usoro agụmakwụkwọ. Ọbụna ọtụtụ gọọmenti na-akwado ịgba chaa chaa a haziri ahazi. Ọtụtụ ndị achụmnta ego na ndị ndú okpukpe akụwokwa afọ n’ala n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’ihi nrụrụ aka ha na omume ha rụrụ arụ. Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ n’ebe nile ji gharazie ịtụkwasị omume nke ndị ha na-elekwasị anya maka idu ndú obi.

Ọ̀ ga-ekwe omume gọọmenti ọ bụla ichebe na ọbụna ibute ụzọ n’ịkwado ihe ndị bụ́ isi ruuru mmadụ na ụkpụrụ omume ọma? Ee, ọ ga-ekwe omume. Isiokwu ikpeazụ anyị ga-akọwa otú ọ ga-esi kwe omume.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

‘Anyaukwu, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, na enwekwaghị mmụọ mkpakọrịta yiri ka hà na-ejupụta ụwa nile.’—INTERNATIONAL HERALD TRIBUNE

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Mgbe Eze Solomọn rubeere iwu Chineke isi, ọ kụnyere ụkpụrụ omume ọma n’ime ndị ọ na-achị