Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkà Mmụta Ihe Ochie—Ò Dị Mkpa Iji Nwee Okwukwe?

Nkà Mmụta Ihe Ochie—Ò Dị Mkpa Iji Nwee Okwukwe?

Echiche nke Bible

Nkà Mmụta Ihe Ochie—Ò Dị Mkpa Iji Nwee Okwukwe?

Na 1873, ụkọchukwu England bụ́ Samuel Manning dere banyere Jeruselem, sị: “N’ịbụ ndị oké ịma mma ya dọtara, ndị njem ala nsọ si n’akụkụ nile nke ụwa na-enute n’ebe ahụ. Ọtụtụ nde ihe a kpọrọ mmadụ na-enye mgbidi ndị ahụ na-ada ada, okporo ámá ndị ahụ jupụtara n’unyi, mkpọmkpọ ebe ndị ahụ na-adakasị adakasị oké nsọpụrụ ofufe, nke ọ na-adịghị ebe ọzọ n’ụwa a pụrụ inye nsọpụrụ dị otú ahụ.”

ALA Nsọ ahụ anọwo na-adọrọ mmasị ndị mmadụ ma ọ dịkarịa ala kemgbe oge Eze Ukwu Rom bụ́ Constantine. * Ruo ihe dị ka afọ 1,500, ndị njem ala nsọ na-abịa ma na-ala, na-achọ ịga n‘Ala Nsọ ahụ n’onwe ha n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe. Ma, n’ụzọ na-eju anya, ọ bụ nanị ná mmalite nke narị afọ 19 ka ndị ọkà mmụta malitere iso ndị njem ala nsọ ahụ na-aga, si otú ahụ malite ọgbọ nkà mmụta ihe ochie nke Bible—ịmụ banyere arịa dị iche iche, ndị mmadụ, ebe dị iche iche, na asụsụ nke Ala Nsọ oge ochie ahụ.

Ihe ndị ọkà mmụta ihe ochie chọpụtara emewo ka a ghọtakwuo ọtụtụ ihe ndị mere n’oge Bible. Ọzọkwa, ihe ndekọ nke nkà mmụta ihe ochie ekwekọwo n’akụkọ Bible ọtụtụ ugboro. Ma, ụdị ihe ọmụma ahụ ọ̀ dị mkpa maka okwukwe nke Onye Kraịst? Iji zaa nke a, ka anyị lekwasị anya n’ebe e gwupụtaworo ọtụtụ ihe mgbe ochie—obodo Jeruselem na ụlọ nsọ ya.

“A Gaghị Ahapụ Otu Nkume n’Elu Nkume Ibe Ya”

Jizọs Kraịst na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem nke ikpeazụ ya na Naịsan 11, n’oge opupu ihe ubi nke 33 O.A., na kalenda ndị Juu. Ka ha nọ na-aga n’Ugwu Oliv, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya kwuru, sị: “Onye Ozizi, lee! ụdị nkume na ụdị ihe owuwu ndị a bụ!”—Mak 13:1.

Ndị Juu a kwesịrị ntụkwasị obi nwere ịhụnanya miri emi maka Chineke na ụlọ nsọ ya. Ha nwere oké obi ụtọ banyere ihe owuwu ndị a magburu onwe ha na ọdịnala dịruworo narị afọ 15 nke ha na-anọchite anya ya. Ihe Jizọs zara onye na-eso ụzọ ya bụ ihe na-eju anya: “Ị̀ na-ahụ nnukwu ihe owuwu ndị a? A gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya ma ọlị n’ebe a, ma ghara ịkwatu ya.”—Mak 13:2.

Ugbu a Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa bịaworo, olee otú Chineke ga-esi kwe ka e bibie ụlọ nsọ ya? Ọ bụ nanị site n’enyemaka nke mmụọ nsọ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-eji nke nta nke nta ghọta ihe okwu ya pụtara n’ụzọ zuru ezu. Otú ọ dị, olee ihe jikọrọ ihe Jizọs kwuru na nkà mmụta ihe ochie nke Bible?

“Obodo” Ọhụrụ

Na Pentikọst 33 O.A., ihu ọma Chineke nke mba ndị Juu ahụ nwere funahụrụ ha. (Matiu 21:43) Nke a meghere ụzọ maka ihe ka nnọọ ukwuu—ọchịchị eluigwe nke ga-ewetara ihe nile a kpọrọ mmadụ ngọzi. (Matiu 10:7) N’ikwekọ n’amụma Jizọs, e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya na 70 O.A. Nkà mmụta ihe ochie na-akwado ihe ndekọ Bible banyere ihe omume dị otú ahụ. Ma, nye Ndị Kraịst, okwukwe adabereghị na ma à chọtawo mkpọmkpọ ebe nke ụlọ nsọ ochie ahụ. Okwukwe ha dabeere na Jeruselem ọzọ, ma nke a bụ ụdị obodo dị nnọọ iche.

N’afọ 96 O.A., e gosiri Jọn onyeozi, bụ́ onye nụrụ amụma Jizọs banyere mbibi nke Jeruselem na ụlọ nsọ ya ma dịrị ndụ hụ mmezu ya, ọhụụ na-esonụ: “Ahụkwara m obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ka o si n’eluigwe na-agbadata site n’ebe Chineke nọ.” Otu olu nke sitere n’ocheeze ahụ kwuru, sị: “Ya na [ihe a kpọrọ mmadụ] ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:2-4.

Ihe mejupụtara “obodo” a bụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ga-eso Kraịst jee ozi dị ka ndị eze n’eluigwe. Ha jikọtara ọnụ mejupụta ọchịchị eluigwe ahụ—Alaeze Chineke—nke ga-achị ụwa, na-eweghachi agbụrụ ụmụ mmadụ n’izu okè n’oge Narị Afọ Iri ahụ. (Matiu 6:10; 2 Pita 3:13) Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị Juu, bụ́ ndị gaje iso n’ìgwè ahụ, ghọtara na ọ dịghị ihe ha nwere n’usoro ihe ndị Juu, nke a pụrụ iji tụnyere ihe ùgwù nke iso Kraịst chịa n’eluigwe.

Pọl onyeozi, mgbe ọ na-ede banyere ọkwá dị mkpa ọ nọbu na ya n’okpukpe ndị Juu, kwuchiteere ha nile, na-asị: “Ihe ndị bụụrụ m uru, ihe ndị a ka m gụrụ dị ka mfu n’ihi Kraịst ahụ. N’ihi nke ahụ, ana m agụkwa ihe nile n’ezie dị ka mfu n’ihi abamuru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m.”—Ndị Filipaị 3:7, 8.

Ebe ọ bụ na Pọl onyeozi na-akwanyere Iwu Chineke na ndokwa nke ụlọ nsọ ahụ ùgwù nke ukwuu, o doro anya na ihe ndị o kwuru apụtaghị na e kwesịrị ileda ndokwa ndị a nke Chineke anya. * (Ọrụ 21:20-24) Ihe Pọl na-eme bụ nanị igosi na ndokwa nke Ndị Kraịst ka usoro ihe ndị Juu mma.

Obi abụọ adịghị ya na Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ na narị afọ mbụ bụ́ ndị Juu maara kpọmkwem ọtụtụ n’ime ụmụ irighiri ihe na-adọrọ mmasị ndị dị n’usoro ihe ndị Juu. Ebe nkà mmụta ihe ochie na-emekwa ka a ghọtakwuo ihe ndị mere n’oge gara aga, Ndị Kraịst pụrụ ịghọta ụfọdụ n’ime ụmụ irighiri ihe ndị ahụ ugbu a. Ma, rịba ama ebe Pọl gwara nwa okorobịa bụ́ Timoti ka o tụkwasị uche ya: “Na-echebara ihe ndị a echiche [ihe ndị metụtara ọgbakọ Ndị Kraịst]; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè nye mmadụ nile.”—1 Timoti 4:15.

N’ụzọ kwesịrị ịja mma, nkà mmụta ihe ochie nke Bible emewo ka anyị ghọtakwuo ọnọdụ ndị dịnụ n’oge e dere Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst na-aghọta na okwukwe ha adịghị adabere n’ihe àmà ụmụ mmadụ gwupụtara n’ala, kama n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13; 2 Timoti 3:16, 17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ma Constantine ma nne ya, bụ́ Helena, nwere mmasị ịchọta ebe ndị bụgasị ebe nsọ na Jeruselem. Nne ya gara Jeruselem n’onwe ya. Ọtụtụ ndị ọzọ mekwara otú ahụ ruo ọtụtụ narị afọ n’ihu.

^ par. 15 Ruo oge ụfọdụ, Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị Juu nọ na Jeruselem nọ na-edebe akụkụ dịgasị iche iche nke Iwu Mozis, ma eleghị anya n’ihi ihe ndị na-esonụ. Ọ bụ Jehova nyere Iwu ahụ. (Ndị Rom 7:12, 14) Ọ ghọọla omume ndị Juu. (Ọrụ 21:20) Ọ bụ iwu na-achị ala ahụ, imebi ya n’ụzọ ọ bụla gaara eme ka e megide ozi Ndị Kraịst n’ụzọ na-enweghị isi.

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

N’elu: Jeruselem na 1920; mkpụrụ ego ndị Rom nke ndị Juu ji mee ihe, 43 O.A.; osisi “pomegranate” e ji ọdụ́ mee nke mara okooko, ikekwe nke sitere n’ụlọ nsọ Solomọn wuru, narị afọ nke asatọ T.O.A.

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Peeji nke 2 na 14: Mkpụrụ ego: Photograph © Israel Museum, Jerusalem; site n’ikike nke Israel Antiquities Authority; pomegranate: Site n’ikike nke Israel Museum, Jerusalem