Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Atụmanya Na-akpata Egwu”

“Atụmanya Na-akpata Egwu”

 “Atụmanya Na-akpata Egwu”

CHEEDỊ banyere ọnọdụ a. Ndị na-eyi ọha egwu agbaa nje na-akpata kịtịkpa n’ụlọ azụmahịa atọ dị na United States. Ndị bịara ịzụ ihe bụ́ ndị na-amaghị ihe na-aganụ ebute nje ahụ. N’oge na-adịghị anya—mgbe ọ gafetụrụ otu izu—ndị dọkịta achọpụta ọrịa ahụ n’ahụ́ mmadụ 20. N’ime ụbọchị ndị na-esonụ, nje ahụ agbasaruo ndị ọzọ. Egwu ejide ndị mmadụ. E nwee ọgba aghara na-ekweghị nchịkwa. Ọrụ ndị nlekọta ahụ́ ike akarịa ha aka. E mechie ókè nile. Ọnọdụ akụ̀ na ụba adakpọwa. N’ime ụbọchị 21 a gbapụsịrị nje ahụ, ọrịa ahụ agbasaruo steeti 25 na mba 10 ọzọ. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, mmadụ 16,000 ebutewo ya, 1,000 mmadụ anwụwokwa. Ndị dọkịta emee atụmatụ na n’ime izu atọ ọzọ, ọnụ ọgụgụ ndị ga-ebute ya ga-eru 300,000. Otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha ga-anwụ.

Ihe a abụghị akụkọ dị n’ihe nkiri ndị ọkà mmụta sayensị chepụtara. Ọ bụ ihe omume e ji nkà tinye na kọmputa, na-egosi ihe ga-emenụ ma eleghị anya ma ọ bụrụ na ọrịa dị otú ahụ etiwapụ. Ihe omume ahụ, bụ́ nke otu ìgwè nke ndị ọkachamara a na-akwanyere ùgwù duziri, weere ọnọdụ na June 2001. A kpọrọ ya “Atụmanya Na-akpata Egwu.”

Nye ọtụtụ ndị, “atụmanya na-akpata egwu” bịaziri nye echiche ọzọ na-akpata nchegbu mgbe ihe ike ahụ mere na September 11, 2001 gasịrị. Mwakpo ahụ a wakporo Ebe Azụmahịa Ụwa dị na New York City nakwa Pentagon dị na Washington, D.C., gosiri n’ụzọ dị ịrịba ama na e nwere ndị nwere obi ọjọọ, ndị ịkpọasị na-akwalikwa bụ́ ndị kpebisiworo ike ibibi ndụ ndị mmadụ n’ìgwè. Ọzọkwa, Ihe ahụ merenụ gosiri na a pụrụ ịwakpo United  States nakwa, n’ụzọ sara mbara, mba ọ bụla ọzọ ụdị mwakpo ahụ. Anyị bi n’ụwa ebe ndị na-eyi ọha egwu kpọrọ ekwo nkụ, pụrụ igbu ọtụtụ puku mmadụ n’otu ntabi anya.

Ozugbo mwakpo ahụ e mere na September 11 gasịrị, a malitere izitere ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke United States na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi akwụkwọ ozi ndị e tinyere anthrax, bụ́ nje na-egbu egbu. Egwu jidere ndị mmadụ. N’ịkpalikwu egwu ahụ, usoro mgbasa ozi na ndị ọkachamara kọrọ na ndị na-eyi ọha egwu pụrụ iji nje ndị na-egbu egbu karịa anthrax mee mwakpo—dị ka ndị na-akpata ọnwụ ojii ma ọ bụ kịtịkpa. Ikekwe ụfọdụ “mba ndị dị njọ” amalitelarị imepụta ihe dị otú ahụ n’ụba n’ụlọ ime nnyocha ndị zoro ezo. Tụlee ihe ụfọdụ e deworo n’oge na-adịbeghị anya:

“Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike Ụwa maara na a pụrụ iji ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa mee ihe iji kpata ntiwapụ nke ọrịa ndị pụrụ ịgbasaru ụwa nile, bụ́ ihe iyi egwu na-arịwanye elu. Mba nile pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Ịgbapụ nje ndị na-akpata ọrịa dị ka kịtịkpa, ọnwụ ojii, na anthrax pụrụ iweta ọdachi n’ihi ọrịa na ọnwụ ọ ga-akpata, tinyere egwu a ga-enwe n’ihi ntiwapụ nke ọrịa dị otú ahụ, bụ́ nke ga-eme ka ọdachi ahụ ka njọ.”—Òtù Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke America.

“N’adịghị ka ogbunigwe na ikuku gas na-emetụta akwara, a dịghị achọpụta mmetụta nke ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa n’oge: oge ọ na-ewe ọrịa ahụ iji pụta ìhè na-eme ka o jiri nke nta gbasaa ma sie ike nchọpụta. Ná mmalite mmadụ ole na ole ga-aga ụlọ ọgwụ. Mgbaàmà ha pụrụ ịgbagwoju ndị dọkịta anya ma ọ bụ ọ pụrụ iyi mgbaàmà nke ọrịa ndị ọzọ a na-arịakarị. Mgbe ndị nlekọta ahụ́ ike na-amatala ihe na-emenụ, mmadụ dum nọ n’obodo pụrụ ibute ọrịa ahụ.”—magazin bụ́ Scientific American.

“Ọ bụrụ na a gbapụ nje na-akpata kịtịkpa taa, ọ ga-emetụta ihe ka ukwuu ná ndị bi n’ụwa, n’ihi eziokwu ahụ bụ́kwa na pasent 30 nke ndị butere ya na-anwụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ abụọ pụrụ ịnwụ.”—magazin bụ́ Foreign Affairs.

‘Mba nile pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Mmadụ dum nọ n’obodo pụrụ ibute ọrịa ahụ. Ijeri mmadụ abụọ pụrụ ịnwụ.’ Okwu ndị a na-emenye egwu. Ma, ruo ókè hà aṅaa ka o yiri ka à pụrụ iji nje ndị na-akpata ọrịa mee mwakpo ga-akpata ọdachi? Ndị ọkachamara na-atụgharị uche n’ajụjụ a. Isiokwu na-esonụ ga-enyere gị aka ịghọta ụfọdụ n’ime ihe ndị o metụtara.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ndị agha emee ihe banyere mwakpo e chepụtara echepụta nke e ji nje ndị na-akpata ọrịa mee

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto DoD nke Cpl. Branden P. O’Brien, U.S. Marine Corps sere