Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 16. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-ezighị ezi mmadụ ịnwa ịbọrọ onwe ya ma ọ bụ ndị ọzọ ọbọ? (Ndị Rom 12:19)

2. Gịnị mere Jehova ji machibido ife ihe oyiyi ofufe? (Aịsaịa 42:8)

3. Olee otú Jizọs si lee ọrụ Chineke nyere ya n’ụwa anya? (Jọn 4:34)

4. Olee ebe a nọ tee Devid mmanụ dị ka eze, bụ́ ebe o nwere isi obodo ya tupu ọ kwaga Jeruselem? (2 Samuel 2:1-4)

5. Dị ka Jọn si kwuo, nkume dị aṅaa dị oké ọnụ ahịa ka eke na ogwurugwu ahụ dị gburugburu ocheeze Jehova yiri? (Mkpughe 4:3)

6. Olee otu ebe ihe àmà na-egosi na Pọl kwụsịrị mgbe a kpụụrụ ya na-aga Rom dị ka onye mkpọrọ? (Ọrụ 28:13)

7. Olee nkebi ahịrịokwu yiri uri nke Jeremaịa ji zoo aka na Jerusalem mgbe ọ na-akwa arịrị maka mbibi ya? (Abụ Ákwá 2:2)

8. Olee onye ọchịchị ọ bụ ụjọ ya mere Devid ji mee ka a ga-asị na ọ na-awị ara? (1 Samuel 21:12-15)

9. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ịda iwu na-akpata ọnwụ bụ́ mmadụ imepụta ma ọ bụ ite mmanụ otite ahụ Jehova gwara Mozis ka ọ kwadebe? (Ọpụpụ 30:31-38)

10. Olee onye na-eso ụzọ nke Pọl na Banabas ji maka ya nwee “oké ntiwapụ nke iwe” bụ́ nke mere ka ha gaa iche iche? (Ọrụ 15:36-41)

11. Dị ka Jọn 3:16 si kwuo, n’ihe ndabere dị aṅaa ka mmadụ ga-eji nweta ndụ ebighị ebi?

12. Olee ihe Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na-akpọ ndị kwere ekwe ibe ha? (3 Jọn 14)

13. Olee onye e ji ụzọ o si agba ọsọ mgbe ọ na-ewetara Devid ozi mata? (2 Samuel 18:27)

14. Gịnị mere na e kweghị ka Mozis banye n’Ala Nkwa ahụ? (Ọnụ Ọgụgụ 20:7-12)

15. Ònye ka e ji idu “ịnyịnya dị ka onye na-awị ara” mara? (2 Ndị Eze 9:20)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ọ bụ n’ihi na Jehova kwupụtara, sị: “Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi”

2. Ọ bụ nanị ya ka ofufe, na otuto kwesịrị ịgara

3. Ọ dị ka nri nye ya

4. Hibrọn

5. Emerad

6. Putiolaị

7. “Ada Juda”

8. Ekish, bụ́ eze Gat

9. E lere ya anya dị ka ihe dị nsọ, nke na-egosi ịdị mkpa na ịdị nsọ nke ihe ndị Jehova haziri

10. Mak

11. Igosipụta okwukwe na Jizọs

12. Ndị enyi

13. Ahimaaz

14. N’ihi na o mere omume n’echeghị echiche ma ghara ibuli aha Jehova elu mgbe ọ na-enye ụmụ Izrel mmiri

15. Jihu