Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnu—Ihe Bara Oké Uru

Nnu—Ihe Bara Oké Uru

 Nnu—Ihe Bara Oké Uru

“UNU bụ nnu nke ụwa,” ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 5:13) Ndị Arab na-ekwu, sị, “E nwere nnu n’etiti anyị,” ndị Peasia na-ekwukwa banyere onye “na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye nnu” (eguzosighị ike n’ihe ma ọ bụ enweghị ekele). N’ihi ike nchekwa ihe ya, okwu ahụ bụ́ “nnu” bịara na-enye echiche nke ihe e ji kpọrọ oké ihe na ihe a na-akwanyere ùgwù ma n’asụsụ ndị oge ochie ma na nke oge a.

Nnu ghọkwara ihe atụ nke ịkwụsi ike na ịdịgide adịgide. Ya mere, n’ime Bible, a kpọrọ ọgbụgba ndụ na-adịgide adịgide “ọgbụgba ndụ nnu,” ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ahụ na-ejikarị nnu erikọ nri, iji kachie ọgbụgba ndụ ahụ akara. (Ọnụ Ọgụgụ 18:19) N’okpuru Iwu Mozis, a ga-etinye nnu n’àjà ndị a chụrụ n’ebe ịchụàjà, obi abụọ adịghị ya na ọ na-egosipụta nnwere onwe pụọ n’ire ure ma ọ bụ mbibi.

Akụkọ Ihe Mere Eme Ndị Na-akpali Mmasị

N’akụkọ ihe mere eme nile, nnu (soldium chloride) abụwo nnọọ ihe bara oké uru nke na ọbụna a lụrụ agha maka ya. Otu n’ime ihe so kpata Mgbanwe Ọchịchị France bụ n’ihi ụtụ isi dị elu nke Louis nke Iri na Isii kwuru na a ga na-akwụ maka nnu. E jikwa nnu mee ihe dị ka ihe bara uru e ji agbanwere ihe. Ndị Moor na-azụ ahịa ji nnu na-agbanwere ọlaedo, otu gram nnu maka otu gram ọlaedo, ebo ụfọdụ dị n’ebe etiti Africa jiri mbadamba nnu kpụkọrọ akpụkọ mere ego. Ndị Grik ji nnu na-azụrụ ohu, bụ́ nke wetara okwu bụ́ “o rughị nnu a kwụrụ maka ya.”

N’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, e nwere ọtụtụ nkwenkwe ụgha banyere nnu. A na-ele mwụfu nnu anya dị ka ihe àmà nke ọdachi. Dị ka ihe atụ, n’ihe osise “Nri Anyasị Ikpeazụ” ahụ bụ́ nke Leonardo da Vinci sere, e sere Judas Iskariọt ebe mkpọ̀ nnu kpuru ihu n’ala n’ihu ya. * N’aka nke ọzọ, ruo na narị afọ nke 18, ịnọdụ ala n’ebe dị elu ma ọ bụ n’ebe dị ala karịa ebe e debere nnu na tebụl na-egosi ọkwá mmadụ n’obodo, ọnọdụ dị nsọpụrụ bụ n’ebe dị elu karịa ebe e debere mkpọ̀ nnu ahụ, na nso isi tebụl.

Malite n’oge ndị mbụ, mmadụ mụtara isi na mmiri nnu, mmiri oké osimiri, na mkpụkọ nnu n’ime ala enweta nnu. Otu ihe ndekọ zuru ezu nke China oge ochie banyere nkà mmụta ọgwụ kwuru banyere ihe karịrị ụdị nnu 40 ma kọwaa ụzọ abụọ e si enweta nnu bụ́ ndị yiri, n’ụzọ dị nnọọ ịtụnanya, ụzọ ndị e si enweta ya taa. Dị ka ihe atụ, n’ụlọ ọrụ na-eji ikike anyanwụ emepụta nnu bụ́ nke kasị ukwuu n’ụwa, nke dị n’ikperé mmiri Bahía Sebastián Vizcaíno dị na Baja California Sur, Mexico, a na-eji ike sitere n’anwụ enweta nnu site na mmiri oké osimiri.

N’ụzọ na-akpali mmasị, e mewo atụmatụ na ọ bụrụ na oké osimiri nile dị n’ụwa atakọọ, “a ga-enweta ma ọ dịkarịa ala nde kubik kilomita 19 nke nnu kpụkọrọ akpụkọ, ma ọ bụ ihe ji ihe dị ka okpukpu 14.5 karịa kọntinent nile nke Europe bụ́ nke ga-adị elu karịa elu oké osimiri,” dị ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica si kwuo. Osimiri Nwụrụ Anwụ jikwa okpukpu itoolu na-atọ nnu nnu karịa oké osimiri!

Otú E Si Eji Nnu Eme Ihe n’Oge A

Taa, nnu anọgidewo na-abụ ihe bara oké uru, a na-eji ya eme ka nri tọkwuo ụtọ, na-eji ya echekwa anụ, na-eji ya emepụta ncha na ugegbe, tinyere ihe ndị ọzọ. Ma ebe e ji ya eme ihe n’ụzọ na-adọrọ mmasị karịsịa bụ n’ihe banyere ahụ́ ike ọha na eze. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ mba nke ụwa, a na-etinye iodine n’ime nnu iji lụsoo ụkọ nke iodine n’ógbè ụfọdụ ọgụ, bụ́ nke a na-eji akpịrị koro eko nakwa n’ọnọdụ ndị ka njọ isi mmebi, amara. Ọzọkwa, mba ụfọdụ na-etinye fluoride n’ime nnu iji gbochie ezé ure.

Ọ bụ ezie na nnu dị oké mkpa maka ezi ahụ́ ike—ịchịkwa ókè ọbara haruru na ọ̀tụ̀tụ̀ o ji erugharị n’ahụ́—gịnịkwanụ banyere njikọ a na-arụrụ ụka bụ́ nke a na-ejikọ iri nnu na ọbara mgbali elu? Mgbe mgbe, ndị dọkịta agwawo ndị na-arịa ọbara mgbali elu iri nnu na soldium ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara ókè. Ahụ́ nke ihe dị ka pasent 30 ruo 50 nke ndị na-arịa ọbara mgbali elu na-asọ nnu. N’ọnọdụ a, e gosiwo na iri obere nnu belatara ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́.

N’ezie, nnu na-eme ka a nụkwuo ụtọ nri, dị ka Job gosiri mgbe ọ jụrụ, sị: “À na-eri ihe nke na-adịghị ụtọ n’ire, ma nnu adịghị ya?” (Job 6:6) N’ezie anyị pụrụ inwe ekele n’ebe Onye Okike anyị nọ, bụ́ “onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ,” gụnyere ihe ahụ bara oké uru, bụ́ nnu.—1 Timoti 6:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Mkpọ̀ nnu bụ efere ma ọ bụ arịa a wụnyere nnu na ya.

 [Foto dị na peeji nke 27]

Ụfọdụ n’ime nnu ndị dịgasị iche iche (malite n’elu site n’aka ekpe gaa n’aka nri): (1) Nnu Alaea nke oké osimiri, Hawaii; (2) “fleur de sel,” France; (3) nnu oké osimiri a na-agwaghị agwa; (4) “sel gris” (nnu na-acha ntụ ntụ), France; (5) nnu ezé nke oké osimiri; (6) nnu ojii e nwetara n’ime ala, India