Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ka Sayensị na Okpukpe Kwekọọ

Ime Ka Sayensị na Okpukpe Kwekọọ

 Ime Ka Sayensị na Okpukpe Kwekọọ

“A dịghịzi ele sayensị na okpukpe anya dị ka ihe ndị na-enweghị nkwekọ.”Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph, London, May 26, 1999.

MA SAYENSỊ ma okpukpe, n’ụdị ha kasị zie ezie n’ụzọ omume, gụnyere ịchọ eziokwu. Sayensị na-achọpụta ụwa a haziri n’ụzọ magburu onwe ya, eluigwe na ala nke nwere ihe àmà ndị pụrụ iche na-egosi na e ji ọgụgụ isi mee ha. Ezi okpukpe na-eme ka nchọpụta ndị a dị ịrịba ama site n’izi na nkà pụtara ìhè n’ihe ndị a na-ahụ anya sitere n’ọgụgụ isi nke Onye Okike.

“Ana m achọpụta na okpukpe na-eme ka m ghọtakwuo sayensị nke ọma,” ka Francis Collins, bụ́ ọkà mmụta banyere ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ, kwuru. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla m chọpụtara ihe banyere chromosome mmadụ, ịdị omimi nke ndụ na-eju m anya, m na-ekwuzi n’obi m, sị: ‘Chei, ọ bụ nanị Chineke mabu nke a.’ Ọ bụ mmetụta na-enye nnọọ obi ụtọ nakwa nke na-akpali nnọọ akpali, bụ́ nke na-enyere m aka ịghọta onye Chineke bụ ma mee ka sayensị bụrụ nke na-akwụghachi ụgwọ nye m ọbụna karị.”

Gịnị ga-enyere mmadụ aka ime ka sayensị na okpukpe kwekọọ?

Ọchịchọ Na-aga n’Ihu

Kwere na ị pụghị ịmatacha ihe nile: Anyị eruwebeghị njedebe nke ọchịchọ anyị na-achọ azịza banyere eluigwe na ala na-enweghị nsọtụ, mbara igwe, na oge. Ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Lewis Thomas, kwuru, sị: “Usoro a agaghị akwụsị akwụsị, ebe  ọ bụ na anyị bụ́ ụmụ mmadụ nwere ọchịchọ a na-apụghị imeju emeju nke ịmata ihe, na-eme nchọpụta, na-elegharị anya ma na-agbalị ịghọta ihe dị iche iche. Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị ga-aza ajụjụ ndị ahụ. Apụghị m ichetụ n’echiche mgbe mmadụ nile ga-ekuda ume ma sị, ‘Ugbu a anyị amatachawo ya.’ Ọ ga-anọgide na-akarị ikike nghọta anyị.”

N’otu aka ahụ, a bịa n’ihe banyere eziokwu okpukpe, ọchịchọ maka ihe ọmụma enweghị ọgwụgwụ. Otu n’ime ndị dere Bible, bụ́ Pọl, kwuru, sị: “Ugbu a anyị na-ahụ nanị ihe ndị na-eju anya n’enyo . . . A kpaara ihe ọmụma m ókè ugbu a.”—1 Ndị Kọrint 13:12, The New English Bible.

Otú ọ dị, inwe ihe ọmụma a kpaara ókè banyere ajụjụ ndị metụtara ma sayensị ma okpukpe adịghị egbochi anyị iru ná nkwubi okwu ezi uche dị na ya bụ́ ndị dabeere n’ihe ndị a anyị maara bụ́ eziokwu. Ọ dịghị mkpa na anyị ga-enweta ihe ọmụma zuru ezu banyere mmalite nke anyanwụ iji jide nnọọ n’aka na ọ ga-awa echi.

 Tụlee ihe ndị a maara bụ́ eziokwu: N’ọchịchọ anyị na-achọ azịza, ọ dị mkpa ka ụkpụrụ ndị ziri ezi na-eduzi anyị. Ọ gwụla ma ànyị dabeere n’ụkpụrụ ndị kasị elu e nwere banyere ihe àmà, a pụrụ iduhie anyị n’ụzọ dị mfe n’ọchịchọ anyị na-achọ eziokwu banyere sayensị na okpukpe. N’ikwu eziokwu, ọ dịtụghị onye n’ime anyị pụrụ ịtụle ihe ọmụma ma ọ bụ echiche sayensị nile, bụ́ ndị jupụtara ná nnukwute ọ́bá akwụkwọ dị iche iche. N’aka nke ọzọ, Bible nwere nchịkọta nke ozizi ime mmụọ dị mfe nnyocha, bụ́ nke anyị ga na-atụle. Ihe ndị a maara na ha bụ eziokwu na-akwadosi Bible ike. *

Otú ọ dị, banyere ihe ọmụma n’ozuzu ya, ọ dị mkpa itinye mgbalị siri ike iji mata ọdịiche dị n’etiti eziokwu na ịkọ nkọ, n’etiti ihe bụ́ eziokwu na nke bụ́ ụgha—ma na sayensị ma n’okpukpe. Dị ka onye so dee Bible bụ́ Pọl dụrụ ọdụ ya, ọ dị anyị mkpa ịjụ “ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha.” (1 Timoti 6:20) Iji mee ka sayensị na Bible kwekọọ, anyị aghaghị ịtụle ihe ndị bụ́ eziokwu, si otú a zere ịkọ nkọ, ma nyochaa otú eziokwu nke ọ bụla si akwado ma na-ewusikwu nke ọzọ ike.

Dị ka ihe atụ, mgbe anyị ghọtara na Bible na-eji okwu ahụ bụ́ “ụbọchị” eme ihe n’ihe banyere ogologo oge dịgasị iche iche, anyị na-ahụ na ihe ndekọ banyere ụbọchị isii nke okike ahụ dị na Jenesis ekwesịghị imegide nkwubi okwu nke sayensị bụ́ na ụwa agbawo ihe dị ka ijeri afọ anọ na ọkara. Dị ka Bible si kwuo, ụwa dịruru ogologo oge a na-ekwughị ókè ọ ha tupu ụbọchị okike ahụ amalite. (Lee igbe bụ́ “Ụbọchị Okike Ndị ahụ—Nke Ọ Bụla Ọ̀ Dị Awa 24?”) Ọ bụrụgodị na sayensị agbazie onwe ya olu ma kwuo afọ ole ọzọ mbara ụwa  anyị gbaworo, ihe Bible kwuru ka bụ eziokwu. Kama imegide Bible, na nke a nakwa n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ, sayensị na-enye anyị ọtụtụ ihe ọmụma ntụkwasị banyere ụwa a na-ahụ anya, ma n’oge a ma n’oge gara aga.

Inwe okwukwe abụghị ikwere ihe n’ajụghị ase: Bible na-enye anyị ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya bụ́ nke anyị na-apụghị inweta ebe ọ bụla ọzọ. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji tụkwasị ya obi? Bible n’onwe ya na-agwa anyị ka anyị nwalee izi ezi ya. Cheedị echiche banyere ịbụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme ya, ịdị irè ya, ezoghị ọnụ nke ndị dere ya, na ịkwesị ndabere ya. Site n’inyocha izi ezi nke Bible, gụnyere okwu ndị metụtara ụkpụrụ sayensị na, ọbụna nke ka eme ka e kwenye, mmezu na-ehieghị ụzọ nke ọtụtụ narị amụma mezuru n’ọgbọ nile nakwa n’oge anyị a, mmadụ pụrụ inwe okwukwe siri ike na ya dị ka Okwu Chineke. Inwe okwukwe na Bible abụghị ikwere ihe n’ajụghị ase kama ọ bụ ntụkwasị obi a nwapụtara anwapụta n’izi ezi nke ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru.

Kwanyere sayensị ùgwù; ghọta na nkwenkwe okpukpe bara uru: Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị nwere obi eziokwu òkù, ma ndị ji sayensị ma ndị ji okpukpe kpọrọ ihe, ịbịa kere òkè n’ọchịchọ e ji ezi obi achọ eziokwu n’akụkụ abụọ a. N’ọgbakọ ha dị iche iche, Ndịàmà na-akwalite nkwanye ùgwù dị mma maka sayensị na ihe ndị ọ chọpụtara bụ́ ndị a nwapụtara anwapụta nakwa nkwenkwe siri ike bụ́ na a pụrụ ịchọta eziokwu okpukpe nanị na Bible, bụ́ nke na-ekwu n’onwe ya site n’igosi ọtụtụ ihe àmà na ya bụ Okwu Chineke. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe unu natara okwu Chineke, bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nakweere ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ, kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

N’eziokwu, dị nnọọ ka ọ dị na sayensị, ụgha na omume ndị na-ebibi ihe abatawo n’okpukpe. N’ihi ya, e nwere ezi okpukpe na okpukpe ụgha. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji hapụ òtù okpukpe ndị bụ́ isi iji ghọọ ndị òtù nke ọgbakọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova. Ha enwewo ndakpọ olileanya n’ihi ọjụjụ okpukpe mbụ ha jụrụ ịhapụ ọdịnala mmadụ na echiche ụgha iji nabata eziokwu a chọpụtara achọpụta ma ọ bụ nke e kpughere ekpughe.

Ọzọkwa, ezi Ndị Kraịst na-achọta ezi nzube ná ndụ, bụ́ nke dabeere n’ihe ọmụma miri emi banyere Onye Okike, dị ka e kpughere ya na Bible, na banyere nzube ya ndị o kwupụtara ekwupụta maka ihe a kpọrọ mmadụ nakwa maka mbara ụwa anyị bi na ya. Ndịàmà Jehova enwewo afọ ojuju n’azịza ndị ezi uche dị na ha, bụ́ ndị dabeere na Bible, maka ajụjụ ndị dị ka, N’ihi gịnị ka anyị ji nọrọ n’ebe a? Olee ebe anyị na-aga? Obi ga-adị ha nnọọ ụtọ isoro gị kerịta ihe ọmụma ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Lee Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 10]

Ụbọchị Okike Ndị Ahụ—Nke Ọ Bụla Ọ̀ Dị Awa 24?

Ụfọdụ n’ime ndị so n’òtù ndị kwenyere ná nkọwa nkịtị nke Bible na-azọrọ na ọ bụ ozizi nke okike na-akọwa ihe ndị merenụ tupu e kee mmadụ, ọ bụghị evolushọn. Ha na-azọrọ na e mere ihe nile e kere eke a na-ahụ anya n’ime nanị ụbọchị isii ndị nke ọ bụla n’ime ha dị awa 24 n’ihe dị ka n’agbata afọ 6,000 na afọ 10,000 gara aga. Ma site n’ikwu otú ahụ, ha na-akwalite ozizi Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị bụ́ nke meworo ka ọtụtụ ndị kwaa Bible emo.

Otu ụbọchị na Bible ọ̀ na-adịkarị awa 24 nkịtị n’ogologo? Jenesis 2:4 na-ekwu banyere ‘ụbọchị ahụ mgbe Jehova, bụ́ Chineke, mere ụwa na eluigwe.’ Otu ụbọchị a gụnyere ụbọchị okike isii ahụ nile e kwuru okwu ya na Jenesis Isi 1. Dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible, otu ụbọchị bụ oge a pụrụ ịgụkọ agụkọ, ọ pụkwara ịbụ otu puku afọ ma ọ bụ ọtụtụ puku afọ. Ụbọchị okike nke Bible kwadoro iwere otu ụbọchị dị ka ọtụtụ puku afọ. Ọzọkwa, ụwa dịlarị adị tupu ụbọchị okike ndị ahụ amalite. (Jenesis 1:1) N’ihi ya, na nke a, ihe ndekọ Bible na sayensị nke bụ́ eziokwu kwekọrọ.—2 Pita 3:8.

N’ikwu okwu banyere nzọrọ bụ́ na ụbọchị okike ndị ahụ dị nanị awa 24 nkịtị n’ogologo, ọkà mmụta ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ bụ́ Francis Collins kwuru, sị: “Ozizi nke okike emebiwo ihe dị ukwuu n’echiche ndị na-eche echiche nwere banyere okwukwe karịa ka ihe ọ bụla ọzọ meworo n’akụkọ ihe mere eme nke oge a.”

[Igbe dị na peeji nke 11]

Sayensị Ò Wegharawo Ọnọdụ Dị Elu nke Omume Ọma?

N’ụzọ kwere nghọta, ọtụtụ ndị na-eji sayensị akpọrọ ihe ajụwo okpukpe n’ihi nguzogide ọ na-eguzogide ọganihu nke sayensị, n’ihi aha ọjọọ o nweworo, na ihu abụọ na obi ọjọọ ya. Prọfesọ nkà mmụta ihe ndị dị ndụ anya nkịtị na-adịghị ahụ, bụ́ John Postgate kọwara, sị: “Okpukpe ndị dị n’ụwa . . . akpatawo ihe ndị dị egwu bụ́ iji mmadụ achụ àjà, agha ntụte, mgbukpọ na njụta okwukwe. N’ụwa nke oge a, akụkụ a dị njọ nke okpukpe dịzi ize ndụ. N’ihi na, n’adịghị ka sayensị, okpukpe anọpụghị iche.”

N’iji nke ahụ tụnyere ihe e chere na ọ bụ inwe ezi uche, inwe echiche ziri ezi, inwe njide onwe onye nke sayensị, Postgate kwuru na “sayensị abịawo weghara ọnọdụ dị elu nke omume ọma.”

Sayensị ò wegharawo ọnọdụ dị elu nke omume ọma n’ezie? Azịza ya bụ ee e. Postgate n’onwe ya kwetara na “ndị sayensị na-enwekwa ekworo, anyaukwu, ajọ mbunobi na anyaụfụ.” O kwukwara na “ndị ọkà mmụta sayensị ole na ole egosiwo onwe ha dị ka ndị pụrụ igbu ọchụ n’aha nnyocha sayensị, dị ka e mere n’ogige ụlọ mkpọrọ nke Nazi Germany na nke Japan.” Mgbe National Geographic kenyere onye nta akụkọ na-eme nnyocha ọrụ ịchọpụta otú e si kwuo na ihe àmà e gwutere n’ala nke bụ́ adịgboroja bụ eziokwu na magazin ya, onye nta akụkọ ahụ kwuru banyere “izo ihe a na-ekwesịghị izo ezo na inwe ntụkwasị obi n’ihe na-ekwesịghị, esemokwu dị egwu n’etiti ndị kwesiri olu ike n’echiche ha, ịfụli onwe onye elu, nrọ efu, echiche iberibe, ngahie mmadụ, ịdị isi ike, ịgwagbu ihe, nkwutọ, ịgha ụgha, [na] nrụrụ aka.”

Otú ọ dị, ọ bụ sayensị nyekwara ụmụ mmadụ ajọ ngwá agha, ndị dị ka ngwá agha nwere nje ndị na-akpata ọrịa, ikuku gas na-egbu egbu, mgbọ ogbunìgwè, bọmbụ ndị a na-eji ngwá ọrụ electronic eduzi, na bọmbụ nuklia.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ụyọkọ kpakpando bụ́ Ant Nebula (Menzel 3), nke e si na Teliskop Mbara Igwe nke Hubble hụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

NASA, ESA na Hubble Heritage Team (STScI/AURA)

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Sayensị achọpụtawo ụwa nke jupụtara n’ihe àmà ndị pụrụ iche na-egosi na e ji ọgụgụ isi mee ya

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndịàmà Jehova na-akwalite nkwanye ùgwù maka sayensị nke bụ́ eziokwu na nkwenye na Bible