Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Nọ n’Ọrụ

Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Nọ n’Ọrụ

Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Nọ n’Ọrụ

EHIHIE Friday nile, Sirley, bụ́ onye nkụzi katatụrụ ahụ nọ na Brazil, na-eji palọ ya emere ọnụ ụlọ klas. Amélia, bụ́ otu n’ime ụmụ akwụkwọ ya, na-abịarute n’ihe dị ka elekere anya abụọ. Ihe ọmụmụ ọ bụla adịghị akwa ya, ọ na-agụkwa ihe nke ọma ka ọ dị ugbu a karịa ọtụtụ n’ime ndị na-eto eto na-aga kọleji. Amélia dị afọ 82.

Amélia na-agbaso ihe nlereanya nke ihe karịrị ndị agadi 60 bụ́ ndị gụsịworo akwụkwọ na klas ịmụ ịgụ na ide bụ́ nke Sirley na-eduzi n’obodo ha n’anaghị ego. Na nso nso a, ọrụ afọ ofufo nke Sirley na-arụ gbara n’akwụkwọ akụkọ ndị Brazil bụ́ Jornal do Sudoeste. Mgbe o kwusịrị na Sirley “enwewo mmetụta dị nnọọ mma ná ndụ nke ndị obodo ahụ,” isiokwu akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na usoro Sirley ji akụziri ndị agadi ahụ ihe dị nnọọ irè nke na “mgbe ha mụsịrị ihe ruo nanị awa 120, ha na-ede akwụkwọ ozi, na-agụ akwụkwọ akụkọ, na-eme mgbakọ na mwepụ, na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ a na-arụ n’ụbọchị.” Akwụkwọ ọgụgụ Sirley na-eji eme ihe, ka isiokwu ahụ na-ekwu, bụ akwụkwọ nta ahụ bụ́ Learn to Read and Write, nke Ndịàmà Jehova dere. *

Site n’Ime Ihere Gaa n’Inwe Ùgwù

Onye ọzọ so n’ụmụ akwụkwọ Sirley, bụ́ Dona Luzia nke dị afọ 68, na-akọ na tupu ya amụta ịgụ na ide ihe, na ya na-eme ihere ịgwa ndị ọzọ okwu. Ọbụna ịga ahịa na-abụrụ ya ihe ịma aka. “Ugbu a, ana m edegara ndị ikwu m nọ n’obodo ọzọ akwụkwọ ozi, ana m ejizikwa ego m ejizi. Ọ dịghịzi onye na-enye m ụfọ ego na-ezughị ezu,” ka o ji mmụmụ ọnụ ọchị na-ekwu. Maria, bụ́ onye dịkwa afọ 68, na-echeta otú ihere sibu eme ya iji isi aka ya abịanye aka n’akwụkwọ ndọrọ ego ezumike nká ya. “Ọ na-adị m ka m bụ onye nwere ọrụsị,” ka ọ na-ekwu. Ma n’ihi klas ịmụ ịgụ na ide ahụ, Maria na-ejizi obi ụtọ edenye aha ya n’akwụkwọ.

Otuto ụmụ akwụkwọ na ndị gụsịworo akwụkwọ na-enye usoro ọmụmụ ihe Sirley na-enye n’anaghị ego emewo ka ọ bụrụ nnọọ nke a ma ama nke na ndị mmadụ na-ejubiga ókè na palọ ya. N’oge na-adịghị anya klas ahụ ga-agafe n’ebe ọzọ ga-aba aba karị.

Usoro Ihe Ọmụmụ nke Nwetara Ihe Nrite

Sirley bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Obi abụọ adịghị ya na ị maara nke ọma banyere ọrụ nkụzi Bible nke Ndịàmà Jehova na-arụ dị ka ọrụ afọ ofufo. Otú ọ dị, ihe ịga nke ọma Sirley abụghị ọpụrụiche. Klas ịmụ ịgụ na ide bụ́ ndị a na-eduzi n’ọtụtụ narị Ụlọ Nzukọ Alaeze na Brazil nile, enyewororị ihe karịrị mmadụ 22,000 nọ ná mba ahụ aka ịmụta ịgụ na ide ihe.

Usoro mmụta ndị yiri nke ahụ nke Ndịàmà Jehova na-enwe agawo nke ọma n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Dị ka ihe atụ, ná mba Africa bụ́ Burundi, Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ịkụziri Ndị Okenye Ịgụ na Ide Ihe (ngalaba nke Ministrị Mmụta) nwere nnọọ obi ụtọ maka ihe ndị si n’usoro ịmụ ide na ịgụ nke Ndịàmà pụta nke na o nyere mmadụ anọ n’ime ndị nkụzi nke usoro mmụta ahụ ihe nrite maka “nrụsi ọrụ ike n’ịkụziri ndị ọzọ ka e si agụ ihe.” Ọ masịrị ndị ọrụ ọchịchị karịsịa na pasent 75 nke ndị mụtara ịgụ na ide ihe bụ ndị inyom meworo okenye—ìgwè ndị na-adịghị enwekarị mmasị ịga usoro mmụta ndị dị otú ahụ.

Na Mozambique, ụmụ akwụkwọ 4,000 edenyewo aha na klas ịmụ ịgụ na ide nke Ndịàmà, ihe karịkwara ụmụ akwụkwọ 5,000 amụtawo ịgụ na ide ihe n’ime afọ anọ gara aga. Otu onye bụbu nwa akwụkwọ dere, sị: “Ọ ga-amasị m ikwupụta ekele si n’ezi obi m nwere. N’ihi ụlọ akwụkwọ ahụ, apụrụ m ịgụ na ide ihe.”

Ihe Enyemaka nke “Bara Uru Kama Ịbụ nke Mmezu Iwu”

Ọrụ enyemaka bụ ụdị ọzọ nke ozi afọ ofufo nke Ndịàmà Jehova na-eje. N’oge na-adịbeghị anya gara aga, a nọ na-arụ ọrụ dị ukwuu n’otu ụlọ nkwakọba ihe dị nso na Paris, France. Ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo 400 ji ngwụsị izu ha na-akwaju nri, ákwà, na ọgwụ n’ime katọn dị iche iche. Ka ngwụsị izu ahụ na-erule ná njedebe, a kwadebewo nnukwu igbe itoolu e ji ebulata ngwá ahịa, ndị ihe enyemaka jupụtara na ha bụ́ ndị fọrọ nke nta ka ọnụ ahịa ha ruo $1 nde (U.S.) maka ịbụ ndị a ga-eburu. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, e burutere ihe enyemaka ahụ n’ebe Etiti Africa bụ́ ebe agha tisasịrị, bụ́ ebe ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ kesara ihe ndị ahụ ngwa ngwa. Ọ bụkwa Ndịàmà nyere ihe ka ukwuu n’onyinye ndị ahụ.

Otu akwụkwọ akụkọ dị na Congo (Kinshasa) toro ọrụ ịkwalite ọdịmma ndị mmadụ nke Ndịàmà Jehova na-arụ dị ka nke “bara uru kama ịbụ nke mmezu iwu.” Ndị ọrụ nke Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ (UNHCR) egosipụtawokwa nkwado ha. Otu onye ọrụ UNHCR nọ na Democratic Republic of Congo nwere nnọọ obi ụtọ banyere ịdị n’usoro nke ọrụ enyemaka Ndịàmà na-arụ nke na o wepụtara ụgbọala ya ka ndị ọrụ afọ ofufo ahụ jiri ya na-arụ ọrụ. A kpalikwara mmasị nke ndị bi n’ógbè ahụ. Mgbe ndị na-ekiri ihe na-emenụ hụrụ otú ihe enyemaka si ruo ndị nile nọ ná mkpa aka ngwa ngwa, ụfọdụ jụrụ n’ijuanya, sị: “Olee otú unu si ahazi onwe unu nke na unu nwere ike iru onye ọ bụla?”

Ọrụ enyemaka nke Ndịàmà Jehova na-arụ na usoro ha nke ịmụ ịgụ na ide bụ nanị ihe atụ abụọ n’ime ozi Ndịàmà nọworo na-eje gburugburu ụwa kemgbe ọtụtụ iri afọ. Otú ọ dị, Ndịàmà na-arụkwa ụdị ọrụ afọ ofufo ọzọ—ozi nke nwere abamuru na-adịte aka n’ezie. Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ nta ahụ bụ́ Learn to Read and Write (nke dị n’asụsụ 6) nakwa akwụkwọ nta ka ọhụrụ bụ́ Apply Yourself to Reading and Writing (nke dị n’asụsụ 29). Iji nweta otu n’efu, gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè gị ma ọ bụ kpọtụrụ ndị na-ebipụta magazin a.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20, 21]

Mgbanwe A Na-enwe n’Irụ Ọrụ Afọ Ofufo

Ka Julie na-agbagharị n’ụwa nile ná njem azụmahịa, ọ na-agbalịkwarị iwepụtatụ oge iji rụtụ ọrụ afọ ofufo—n’otu ebe ma ọ bụ ọzọ. Na nso nso a, ka ọ nọ n’Ebe Ndịda America, o ji otu ehihie mee ihe n’inye aka n’otu ogige ụmụ mgbei dị nso na Santiago, Chile. Ọ na-ekwu na ime njem na-eme ka “nhọrọ ndị magburu onwe ha” dịịrị ndị ọrụ afọ ofufo.

Dị ka Julie, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ọrụ afọ ofufo na-enye oge ha—ma ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị na-adịwanye nta. “Ọ malitere ọhụrụ,” ka Sara Meléndez, bụ́ onyeisi oche nke otu òtù nnyocha nke na-edekọta ọnụ ọgụgụ banyere ọrụ afọ ofufo, na-ekwu. “Ndị mmadụ na-enye onwe ha n’afọ ofufo, ma mgbe ha mere otú ahụ, ọ na-abụkarị n’ụzọ na-echighị anya nakwa n’ọrụ ga-ewe mkpirikpi oge.” N’ihi ya, ndị nhazi ọrụ na-echegbu onwe ha n’ihi ụkọ nke ndị ọrụ afọ ofufo, ha na-agbalịsikwa ike inweta ndị ọrụ maka ihe omume ha.

“Ọrụ Afọ Ofufo Na-agbanwe Agbanwe”

Ụfọdụ ndị nhazi ọrụ afọ ofufo na-eche na ihe kpatara ọnọdụ ọhụrụ a—iwepụta oge dị nta maka ọrụ afọ ofufo—bụ mgbanwe e nwere n’àgwà ndị ọrụ afọ ofufo. “A dịghịzi anụ ka ndị ọrụ afọ ofufo na-asị: ‘M ga arụ ọrụ ebe a ruo mgbe m na-adịkwaghị unu mkpa,’” ka Susan Ellis, onye ndụmọdụ nke òtù ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo na-ekwu. “Ndị mmadụ adịghị ekwe ịbanye ná nkwekọrịta ime ihe.” Odeakụkọ bụ́ Eileen Daspin kwenyeere nke ahụ. Mgbe ọ gbasịrị ụfọdụ ndị ntụzi ọrụ nke ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo dị iche iche ajụjụ ọnụ banyere ụkọ nke ndị ọrụ afọ ofufo, o kwubiri na “ụjọ ịbanye ná nkwekọrịta ime ihe na-emetụta ọrụ afọ ofufo nke ukwuu.”

Otú ọ dị, onye ntụzi ọrụ nke New York Cares, bụ́ Kathleen Behrens, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ n’usoro isiokwu a, chere na ndị na-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ afọ ofufo ná mkpirikpi oge na-eme otú ahụ, ọ bụghị n’ihi na ha enweghị mkpali ime ihe, kama n’ihi na ha enweghị oge. Ndị mmadụ bụ́ ndị na-arụ ọrụ awa 50 na ụma n’izu tinyere ilekọta ụmụaka ma ọ bụ nne na nna ha meworo agadi apụghị nnọọ iwepụta onwe ha n’afọ ofufo n’ụzọ chiri anya. “Ma, eziokwu ahụ bụ́ nnọọ na ndị a ji ọrụ n’aka ka na-eme ka ọrụ obodo bụrụ akụkụ nke ndụ ha,” ka ọ na-ekwu, “na-egosi na ha ka na-enwe mkpali siri nnọọ ike ime ihe.”

Nye ndị ọrụ afọ ofufo dị otú ahụ na-enweghị oge, ka Behrens na-ekwu, “ọrụ afọ ofufo na-agbanwe agbanwe” bụ ihe ngwọta ya. Ọtụtụ òtù ọrụ afọ ofufo na-enyezi ọrụ ndị na-ewe nanị otu ụbọchị. “Nke a na-eme ka ndị mmadụ nwee ike ịrụ ọrụ afọ ofufo n’ụzọ ndị bara uru ma ka nwee ike na-eme mgbanwe dị ha mkpa iji na-emechi ya anya ruo n’ókè ụfọdụ.”

Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ na-arụ ọrụ afọ ofufo site na kọmputa dị n’ebe obibi ha, na-etinye ihe ọmụma na kọmputa ma na-eme nnyocha. “Ịrụ ọrụ afọ ofufo na kọmputa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-ekwu, “bụ ma eleghị anya ihe kasị bụrụ nke a na-adịghị ahụkebe, ụfọdụ na-asịkwa na ọ bụ nke kasị bụrụ nke nwere ike ịrụpụta ihe dị mma, n’ihe a kpọworo ‘ọrụ afọ ofufo na-agbanwe agbanwe.’”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ịgbaga Ọsọ Enyemaka na Kobe!

Mgbe ala ọma jijiji mere n’obodo ukwu ahụ nwere ọdụ ụgbọ mmiri ma na-enwe ọganihu bụ́ Kobe, Japan, na January 1995, mbibi ọ kpatara dị egwu. N’ịbụ nke gburu ihe karịrị mmadụ 5,000, ọ bụ ala ọma jijiji kasị gbuo ndị mmadụ nke metụrụla na Japan kemgbe 1923. Ndịàmà Jehova nọ na Japan nakwa na gburugburu ụwa malitere ozugbo iwetara ndị o metụtara ihe enyemaka. Mgbe e guzobere ụtụ ego enyemaka, a tụkọtara ihe karịrị otu nde dollar n’ime ụbọchị ọrụ atọ. Ihe enyemaka dịgasị iche iche nọ na-enubata na Kobe.

Otu onye Kraịst bụ́ okenye nke keere òkè n’ọrụ enyemaka ahụ chọpụtara na n’oge na-adịghị anya, Ụlọ Nzukọ Alaeze ha jupụtara n’ihe enyemaka karịa ka a pụrụ iji mee ihe. Gịnị ka a ga-eji nke fọdụrụnụ mee? Ọ tụrụ aro ka e nye otu ụlọ ọgwụ dị nso ụfọdụ n’ime ihe enyemaka ndị ahụ. Ndịàmà ahụ kwakọjuru ihe n’otu ụgbọala ma gbara gaa n’ebe ahụ ihe bibisịrị. Njem ahụ were ọtụtụ awa kama ịbụ minit ole na ole ọ na-ewekarị. N’ụlọ ọgwụ ahụ, ha nyere onyeisi ndị dọkịta ihe ndị ahụ—gụnyere blanket, matarasị, ákwà nhicha ahụ, mkpụrụ osisi a ghọtara ọhụrụ, na ọgwụ ndị mmadụ na-azụrụ n’onwe ya. N’ịbụ onye nwere obi ụtọ, dọkịta ahụ sịrị na ụlọ ọgwụ ahụ ga-eji ọṅụ nakwere ihe ọ bụla Ndịàmà ahụ pụrụ inye. A nabatara mkpụrụ osisi ahụ karịsịa, ebe ọ bụ na e nweghị nri zuru ezu e siri ọhụrụ maka ndị ọrịa nile.

Ka Ndịàmà ahụ na-akwapụta ihe ndị ahụ, dọkịta ahụ guzoro jụụ n’ebe ahụ na-ekiri ha—n’agbanyeghị na ọrụ ya bụ nke na-achọ ime ihe ngwa ngwa. E mesịa, o ji obi umeala hulata isi ma kelee ha. Ka ha na-akwọpụ ụgbọala ha, o guzogidere n’ebe ahụ iji gosipụta otú o nweruru ekele. Onye okenye ahụ keere òkè kwuru na ụlọ ọgwụ a mesịrị ghọọ nke na-ekwenyere ndị ọrịa bụ́ Ndịàmà Jehova.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọrụ Afọ Ofufo—Mgbalị Na-eweta Abamuru

Mgbe otu ìgwè nke ndị ọrụ afọ ofufo nọ na Kabezi, bụ́ otu ógbè nta dị na Burundi, chọrọ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, onye ọchịchị ime obodo ahụ rịọrọ otu arịrịọ a na-adịghị arịọkebe. Ọ rịọrọ ma Ndịàmà ahụ hà pụrụ ịrụzi ụzọ nke gafere ebe ahụ ha chọrọ iwu ihe owuwu ahụ. Ndịàmà ahụ ji obi ụtọ kweta ịrụzi ụzọ ahụ mebiri emebi, jiri aka rụọ ọrụ ahụ nile. Ndị ọrụ afọ ofufo ahụ rụrụ nnọọ ọrụ ahụ nke ọma nke na ndị ọrụ ime obodo kwupụtara ekele ha maka nrụsi ọrụ ike ha na ọchịchọ ha nwere ime ihe. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ọrụ afọ ofufo ahụ gara n’ihu iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, nke foto ya dị n’elu. Ugbu a, ha nwere ụlọ mara mma nke ga-enye aka ịkwalite mmụta Bible ruo ọtụtụ afọ n’ihu. N’ezie, ọrụ afọ ofufo n’ụdị ya dị iche iche pụrụ inwe abamuru na-adịte aka.

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Sirley na-enweta afọ ojuju n’ịkụziri ndị ọzọ ịgụ ihe

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nelson P. Duarte-Jornal do Sudoeste