Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Oké Ọdachi

Ịnagide Oké Ọdachi

Ịnagide Oké Ọdachi

DỊ KA JAMES GIARRANO SI KỌỌ

Ịbụ nne na nna ochie bụ otu n’ime ihe ndị na-enye obi ụtọ dị ukwuu ná ndụ. Mụ na nwunye m, bụ́ Vicki, ji oké atụmanya na-eche ọmụmụ nke nwa nwa mbụ anyị. Nwa anyị nwanyị, bụ́ Theresa, na di ya, Jonathan, nọ na-atụ anya nwa ọhụrụ ná mmalite October 2000. Anyị echetụdịghị n’echiche na anyị na-aga iche oké ọdachi ihu.

MỤ NA nwunye m, tinyere nwa anyị nwoke na nwunye ya, gawara ezumike na Saturday, September 23. Anyị na-aga ịhụ ndị ikwu anyị ndị ọzọ na ịnọ otu izu na Outer Banks nke North Carolina. Theresa na Jonathan ekpebiwo na ha agaghị eso anyị gaa ezumike n’ihi na afọ ime Theresa nọ n’ọnwa nke itoolu ya, ije ahụ dịkwa anya n’iji ụgbọala aga ya—ihe dị ka awa 11 site n’ụlọ anyị n’Ohio.

Anyị chọrọ iyigharị ịga ezumike ahụ, ma Theresa siri ọnwụ ka anyị gawa. O mesiri anyị obi ike na o nweghị ihe ga-eme ya. E wezụga nke ahụ, dọkịta ya chere na ma eleghị anya afọ ime ya ga-anọzu oge ya, o kwesịkwara ịmụ nwa n’ime izu ole na ole n’ihu.

Wednesday, September 27, 2000, bụ ụbọchị ọma nke chetaara m ihe mere ezinụlọ anyị ji họrọ ịdị na-abịa ezumike n’ógbè a kemgbe ọtụtụ afọ. Anyị amaghị na tupu ụbọchị ahụ agafee, ndụ anyị ga-agbanwe nke ukwuu.

“Theresa Na-efu Efu!”

Ná mgbede ahụ, nwanne m nwoke nọrịị n’Ohio kpọrọ m na fon. Ahụ na-ama ya jijiji nke ukwuu, okwu ekweghịkwa ya okwukwu. N’ikpeazụ, o jisiri ike sị: “Theresa na-efu efu!” A kpọrọ ndị uwe ojii n’ihi na a na-enyo otú o siri fuo enyo. Mgbe Jonathan lọtara n’ehihie ahụ, ọ hụrụ na a kpọchighị ọnụ ụzọ ihu ụlọ akpọchi. Nri ụtụtụ Theresa ka dọrọ n’elu tebụl, o jighịkwa pọọsụ ya pụwa. Otu ihe ọzọkwa dị ịtụnanya: Akpụkpọ ụkwụ ya—nanị nke na-aba ya ụkwụ n’ọnwa nke itoolu ya—ka chịsara n’akụkụ ụzọ.

Jonathan ji fon kpọọ ụlọ n’ihe dị ka elekere 9:30 nke ụtụtụ. Theresa gwara ya na otu nwanyị kpọrọ ya wee kwuo na ya chọrọ ịbịa lee obere ụgbọala ha na-ere ere. Mgbe nke ahụ gasịrị, Theresa gaje ịga ozi ụfọdụ. Jonathan jiri fon kpọọ ụlọ ha n’oge nri ehihie, ma o nwetaghị Theresa. N’ehihie, ọ nọgidere na-akpọ, ma o nweghịkwa onye zara. Mgbe o ruru ụlọ n’elekere 4:15 nke uhuruchi, ọ chọpụtara na obere ụgbọala ahụ adịkwaghị. O ji fon kpọọ ụlọ ọgwụ n’ihi na o chere na ikekwe ime amalitewo ime Theresa. Ọ nọghị ebe ahụ. Ọ kpọkwara ndị òtù ezinụlọ ha ụfọdụ, ma ọ dịghị onye hụrụ Theresa. Ọ makwaghị ihe ọ ga-eme, n’ihi ya ọ kpọrọ ndị uwe ojii. N’ihe dị ka n’elekere 6:00 nke uhuruchi, ndị uwe ojii chọtara obere ụgbọala ahụ n’ebe dịdewere ụlọ ha. Ma a hụbeghị Theresa.

Laa azụ na North Carolina, ozi ahụ wụrụ anyị akpata oyi n’ahụ. Mụ na nwunye m, tinyere nwa anyị nwoke na nwunye ya, kwakọrọ akpa anyị lawa. Ọ bụ njem dị ogologo, nke obi erughị ala, nke anyị ji ụgbọala mee. Anyị nọgidere na njem abalị ahụ nile ma lọta Ohio n’ụtụtụ echi ya.

E Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Okwu Ahụ

Ka ọ dịgodị, Jonathan na ụfọdụ ndị ikwu anyị, ezi ndị enyi, na ndị ọzọ kwadoro ndị uwe ojii n’ịchọ Theresa, na-arụ ọrụ n’abali nile. A chọgidere ya ruo ụbọchị ise. N’ikpeazụ, na Monday, October 2, e nwere ihe ịga nke ọma n’okwu ahụ. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, ndị uwe ojii achọpụtawo ebe òkù fon ahụ a kpọrọ Theresa n’ụtụtụ Wednesday sitere. Otu nwanyị bidewere ha ji fon cellular (telifon na-enweghị eriri njikọ) kpọọ òkù ahụ.

Mgbe ha gbasịrị nwanyị ahụ ajụjụ ọnụ, ndị uwe ojii malitere inyo ya enyo. Mgbe e mesịrị n’uhuruchi ahụ, ndị uwe ojii gaghachiri n’ụlọ nwanyị ahụ. Ma ka ha na-erute n’ọnụ ụzọ, ha nụrụ ụda égbè. N’ịwabanye n’ụlọ ahụ, ha hụrụ na nwanyị ahụ anwụọla. Ọ gbara onwe ya égbè. N’ụzọ juru ha anya, ha hụrụ nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ n’otu ọnụ ụlọ dị n’okpukpu ụlọ nke abụọ. N’ụzọ na-atụ n’anya, ọ nọ na-ehi ụra n’oge ụzụ ahụ nile nọ na-eme!

Ma, a hụbeghịkwa Theresa. Ruo awa ole na ole n’ihu, ndị uwe ojii ahụ chọgharịrị n’ime ụlọ ahụ ma ò nwere ihe àmà ọ bụla na-egosi na ọ nọrọ ebe ahụ. Ọchịchọ ahụ a na-achọ ya bịara ná njedebe n’isi ụtụtụ Tuesday n’ime ebe ndọba ụgbọala. A hụrụ ozu Theresa n’ili na-emichaghị emi dị n’ebe ahụ. Onye na-ahụ maka ime nnyocha banyere ndị nwụrụ n’ike mesịrị kwubie na e mere ka ọ ghara ịmakwa onwe ya, wee gbaa ya égbè n’azụ. Ọ nwụrụ ozugbo, mgbe ahụ e sikwa n’akpa nwa ya bọpụta nwa ya. N’iche echiche laa azụ, obi rutụrụ anyị ala ịmata na ọ taghị ahụhụ.

A kpọgara nwa ọhụrụ ahụ n’ụlọ ọgwụ, bụ́ ebe a chọpụtara na ahụ siri ya nnọọ ike—o nweghị ntụpọ ọ bụla! Nnyocha DNA nke a na-aghaghị ime gosiri n’ezie na ọ bụ nwa nwa anyị. Jonathan gụrụ ya aha ya na Theresa kpebiburu—Oscar Gavin. Ka ọ nọsịrị ntakịrị oge n’ụlọ ọgwụ, na Thursday, October 5, e kunyere nna ya nwa nwa anyị dị kilogram anọ n’arọ. Obi tọrọ anyị ụtọ ikuru nwa nwa anyị, ma a pụghị iji ọnụ kọwaa oké mwute anyị nwere na Theresa anọghị ya ikuru ya.

Mmeghachi Omume Ọha

Nkwado dị ukwuu e nyere mụ na ezinụlọ m—ọtụtụ mgbe site n’aka ndị anyị na-ahụtụbeghị kpaliri anyị ibe ákwá. N’oge ahụ a na-achọgharị Theresa, ọtụtụ narị mmadụ wepụtara onwe ha inye aka n’ịchọ ya. Ọtụtụ nyere ego. Ọtụtụ ụlọ ahịa na-ere ngwongwo ọfịs biere anyị ọtụtụ puku ibé akwụkwọ mkpọsa ozi n’efu. Ndị ọrụ afọ ofufo kesakwara akwụkwọ mkpọsa ozi ndị ahụ ruo ọtụtụ ebe gburugburu ebe obibi Theresa.

Otu n’ime ụmụnna anyị ndị nwanyị na-arụrụ otu onye ọkàikpe ọrụ, mgbe ọ gwara ya banyere ọnọdụ anyị, ọkàikpe ahụ kwere nkwa inye aka. Anyị nabatara enyemaka ya, nke a ghọkwara ngọzi dị ukwuu. O nyeere anyị aka ịhụ maka ụlọ ọrụ mgbasa ozi, tinyere okwu iwu ụfọdụ ndị biliterenụ. Tụkwasị na nke ahụ, ọ tụrụ aro ka anyị kpọọ ndị ọrụ ime nchọpụta abụọ nọọrọ onwe ha bụ́ ndị mere ihe dị ukwuu iji nye aka n’okwu ahụ. Ezi nchegbu ha maka anyị metụrụ anyị n’obi n’ezie.

Mgbe anyị hụrụ nwa nwa anyị, nkwado ahụ rịwanyere elu. Ụlọ ahịa dị iche iche na-ere ihe e ji esi nri zitere ihe oriri na ngwá ụlọ. Ọtụtụ ndị nyere Oscar uwe oyiyi gụnyere ákwà a na-awa nanị otu ugboro, nri ụmụaka, na ihe e ji egwuri egwu. Anyị nwetara ihe karịrị ihe Oscar pụrụ iji mee ihe, n’ihi ya, anyị weere ndị mapụtaranụ nye ngalaba na-ahụ maka ndị dị ime na ndị mụrụ nwa na ụmụ ọhụrụ nke otu ụlọ ọgwụ. N’ihi na ụlọ ọrụ mgbasa ozi akọsawo akụkọ ahụ, anyị natara ọtụtụ kaadị na akwụkwọ ozi—ọ bụghị nanị site n’ógbè anyị kamakwa site gburugburu ụwa.

Oké nkwado ahụ pụtara ìhè karịsịa n’ememe olili ozu Theresa, nke e mere na Sunday, October 8. Anyị maara na ọtụtụ ndị chọrọ ịbịa, ma mmeghachi omume anyị nwetara gafere otú anyị tụrụ anya ya. E mere ndokwa iji ụlọ mgbakọ nke otu kọleji dị n’ógbè anyị mee ihe, o jukwara n’ọnụ, na-enwe ihe karịrị mmadụ 1,400. Ndị bịaranụ bụ ndị òtù ezinụlọ anyị, ndị enyi, ndị uwe ojii, onyeisi obodo, na ndị ọzọ sitere n’ógbè anyị. Ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi bịakwara, ụlọ ọrụ telivishọn ndị dị n’ógbè anyị tinyere okwu ahụ na teepu ha, nke a nọkwa na-egosi ozugbo n’Internet. Ọzọkwa, ọtụtụ narị mmadụ guzo n’ebe nnabata ndị ọbịa nke ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọ bụ nọkọta ọnụ n’èzí n’okpuru nche anwụ ná mmiri na-ezonụ nke jụrụ oyi, na-ege ntị n’ígwè okwu ndị a kwụnyere. Okwu ahụ gbara àmà dị ukwuu banyere nkwenkwe anyị dabeere na Bible.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ọtụtụ narị ndị mmadụ jiri ndidi chere n’ahịrị iji bịa kelee anyị. Anyị nọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ awa atọ, na-amakụ ndị nile bịaranụ, na-egosikwa ekele anyị maka ọbịbịa ha. Mgbe ememe ahụ gasịrị, otu họtel dị n’ógbè anyị ji obiọma nye ihe karịrị mmadụ 300 bụ́ ndị ezinụlọ anyị, ezigbo ndị enyi anyị, nakwa ndị ọzọ bụ́ ndị nyere aka n’ịchọta nwa nwa anyị, nri.

Anyị apụghị ikwupụtacha n’ụzọ zuru ezu ekele anyị nwere maka ihe ndị mmadụ—karịsịa ndị anyị na-amabughị—mere iji nyere anyị aka. Ahụmahụ a emewo ka anyị kpebisikwuo ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ikere òkè zuru ezu n’ozi ndị Kraịst, n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị nwere obiọma anyị chọrọ iwegara ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.

Otú Ọgbakọ Si Meghachi Omume

Site ná mmalite nke ahụmahụ ọjọọ a, anyị nwetara enyemaka dị nnọọ ukwuu site n’aka ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị. Enyemaka a yiri nke na-adịghị agwụ agwụ sitere n’ọgbakọ nke anyị nke Ndịàmà Jehova, tinyekwara ọgbakọ ndị ọzọ gbara anyị gburugburu.

Ọbụna tupu anyị esi North Carolina lọta, ndị okenye ọgbakọ anyị enyewo aka mee ndokwa iji chọta Theresa. Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị naara ikike n’ebe ọrụ ha iji sonye n’ịchọ ya. Ụfọdụ gwara ndị were ha n’ọrụ na ha dị njikere ịhapụ ụgwọ ọnwa ha, ma n’ọnọdụ ụfọdụ, ndị were ha n’ọrụ nyere ha ohere ịhapụ ọrụ ma kwụọkwa ha ụgwọ ọnwa ha. N’oge ahụ a nọ na-achọgharị Theresa, ụfọdụ n’ime ụmụnna ime mmụọ anyị nọnyeere Jonathan ka ọ ghara ịnọ nanị ya. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị bịara nnọọ idebe ebe obibi anyị ọcha. Ndị ọzọ nyere aka n’inye ndị ọrụ afọ ofufo nri na ịza fon.

Ihe dị ka izu isii mgbe Theresa nwụsịrị, nwunye m na Jonathan chere otu ihe ịma aka siri nnọọ ike ihu—ikpopụtasị ngwongwo Theresa na ikpochasị ụlọ ya. Jonathan chere na ya agaghị ebilikwa n’ụlọ ahụ ya na Theresa bibu, n’ihi ya o kpebiri ire ya. Ileru anya ná ngwongwo Theresa bụ ọrụ na-egbu mgbu n’obi—ihe ọ bụla chetaara ha Theresa na otú o si na-ewute ha na ọ nọkwaghị ya. Ma na nke a kwa, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nyeere anyị aka. Ha nyere aka tinyesịa ngwongwo ya n’igbe na ọbụna rụzie ihe ụfọdụ dị mkpa n’ụlọ ahụ iji dozie ya maka orire.

Nke kachasị mkpa, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nyere ezinụlọ anyị nkwado ime mmụọ na nke mmetụta uche. Ha na-akpọ anyị na fon ma na-eletakwa anyị iji nye anyị agbamume. Ọtụtụ ziteere anyị kaadị na akwụkwọ ozi ndị na-emetụ n’obi. Nkwado ịhụnanya a dịgidere ruo ọ bụghị nanị ụbọchị na izu ole na ole ndị mbụ kamakwa ruo ọtụtụ ọnwa.

Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị gwara anyị ka anyị gwa ha mgbe anyị chọrọ ka mmadụ gee anyị ntị, anyị nabatakwara enyemaka obiọma ha. Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi isoro ndị enyi ị hụrụ n’anya ma tụkwasị obi kwurịta mmetụta gị! N’ezie, ha egosipụtawo ịbụ eziokwu nke okwu ilu Bible bụ́: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17; 18:24.

Mmetụta O Nwere n’Ezinụlọ Anyị

Aghaghị m ikwu na idi ogbugbu e gburu Theresa adịghịrị mụ na ezinụlọ m mfe. N’ezie ọ gbanwewo ndụ anyị. Ọ dị oge ụfọdụ ọ na-ewe m iwe na mụ na ya anọghị ebe a. Mmakụ ọ na-amakụ m na ọnụ ọ na-esutụ m na-agụsi m agụụ ike.

Nwunye m na Theresa nwere nnọọ mmekọrịta chiri anya. Ọ dịghị ụbọchị ha na-agwarịtaghị ibe ha okwu ma ọ dịghị ihe ọzọ. Ha na-ekwu okwu ruo ọtụtụ awa banyere afọ ime Theresa. Ha jikọrọ aka ọnụ dozie ọnụ ụlọ nwa ọhụrụ ahụ ga-anọ.

Vicki na-akọ mmetụta ndị o nwere: “Ọ dị ọtụtụ ihe na-efunahụ m. Ọ na-ewute m na mụ na ya adịkwaghị eso n’ọrụ nkwusa. Ọ na-ewute m na mụ na ya adịkwaghị aga ahịa. Ihe kasị egbu m mgbu n’obi bụ ahụghị ya ka ya na nwa ya nọ—ọ na-agbari m nnọọ obi. Amaara m otú ọ hụruru Oscar n’anya ọbụna tupu a mụọ ya. Ọ maara na ọ gaje ịmụ nwa nwoke. Mgbe m kpachaara nwa ọhụrụ ahụ otu blanket ma chịnye ya Theresa, o deere m kaadị a:

‘Ezigbo Nne M,

I meela nke ukwuu maka blanket ụmụaka ahụ mara mma. Enwere m ekele maka ahụhụ nile ị tara iji kpaa ya. Achọkwara m ikele gị ọzọ n’ihi enyemaka na agbamume nile ị nyeworo m iji merie oge ụfọdụ ndị siri nnọọ ike ná ndụ m. Aga m anọgide na-echeta ma na-ekele gị maka ya. Anụwo m na otu ụbọchị ị ga-etolite ma ghọta na onye kasị bụrụ enyi gị bụ nne gị. Otú ọ dị, ana m ekele Jehova kwa ụbọchị na o weghị m ogologo oge iji chọpụta nke ahụ. Aga m anọgide na-ahụ gị n’anya.’”

O wutekwara anyị ịhụ ahụhụ nile ọgọ anyị nwoke tara. Mgbe Oscar nọ n’ụlọ ọgwụ, Jonathan chere otu n’ime ihe ndị kasị sie ike o metụrụla ihu. Ebe o kpebiri ịbịa binyere anyị ruo nwa oge, ọ ghaghịkwa ịkwagharị ihe ndị dị n’ụlọ ahụ nwa ọhụrụ ga-anọ bụ́ nke ya na Theresa kwadebere n’ụlọ ha. Ọ kwakọkwaara obere ịnyịnya e ji osisi pịa e ji egwuri egwu, ihe ndina ụmụaka, ákwà ndị a dụkọtara adụkọta nke yiri anụmanụ, ma bute ha n’ụlọ anyị.

Ihe Nyewooro Anyị Aka Idi Ya

Mgbe onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị n’ụzọ ọdachi dị otú ahụ, ọtụtụ ajụjụ na mmetụta ndị dị mgbagwoju anya na-ebilite. O nweela oge ndị mụ onwe m dị ka onye Kraịst bụ́ okenye gbalịworo ịkasi ndị ọzọ na-eche ajụjụ na mmetụta ndị dị otú ahụ ihu obi na inyere ha aka. Ma mgbe ọ bụ gị onwe gị na-eru újú, mmetụta uche pụrụ ikpuchi echiche ziri ezi.

Dị ka ihe atụ, ebe anyị maara ọnọdụ Theresa, marakwa na anyị agaghị anọ n’ụlọ ruo otu izu, ekpere m ekpere ka Jehova chebe ya. Mgbe a hụrụ ya ebe e gburu ya, aghaghị m ikweta na o juru m anya ná mmalite ihe mere na a zaghị ekpere m. Otú ọ dị, amaara m na Jehova ekweghị ndị ya nkwa ichebe ha n’otu n’otu n’ụzọ ọrụ ebube. Anọgidere m na-ekpe ekpere maka nghọta. Enwetawo m nkasi obi site n’ịmara na Jehova na-echebe ndị ya n’ụzọ ime mmụọ—ya bụ, ọ na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji chebe mmekọrịta anyị na ya. Nchebe dị otú ahụ kachasị mkpa, n’ihi na ọ pụrụ imetụta ọdịnihu ebighị ebi anyị. N’echiche dị otú ahụ, Jehova chebere Theresa; ọ nọ na-ejere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya. Obi dị m ụtọ ịmara na atụmanya ya nke ịdị ndụ n’ọdịnihu dị n’aka ịhụnanya Ya.

Ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-enye m nnọọ nkasi obi. Ndị a bụ ụfọdụ ndị nyewooro m aka idi ya:

“Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Ọ dịworị anya m kwenyere ná nkwa Bible ahụ banyere mbilite n’ọnwụ baa na paradaịs elu ala, ma ugbu a, olileanya ahụ bụ nnọọ ihe ga-eme eme ọbụna karị nye m. Nanị ịmata na m ga-enwe ike ijide Theresa aka ọzọ enyewo m ike ịtachi obi kwa ụbọchị.

“Onyenwe anyị . . . abụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ: n’ihi na ọ bụ n’ebe ọ nọ ka mmadụ nile dị ndụ.” (Luk 20:37, 38) Nkasi obi dị ukwuu dị n’ịmara na otu ụbọchị a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, ọbụna ugbu a, “mmadụ nile dị ndụ” n’ebe Jehova nọ. N’ihi ya, n’ile ihe anya dị ka o si ele ya, Theresa anyị hụrụ n’anya ka dị nnọọ ndụ.

Vicki ga-achọ ikwu akụkụ ụfọdụ n’ime Bible bụ́ ndị kasị ewusi ya ike:

“‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Ndị Hibru 6:18; Taịtọs 1:2) N’ihi na Jehova apụghị ikwu okwu ụgha, amaara m na ọ ga-emezu nkwa ya bụ́ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

“‘Ka ihe a ghara iju unu anya: n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili [ncheta NW] ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.’ (Jọn 5:28, 29) Okwu bụ́ ‘ili ncheta’ na-egosi na Jehova na-echeta Theresa ruo mgbe ọ ga-eme ka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, kpọlite ya n’ọnwụ. Amaara m na ọ dịghị ebe dịịrị ya nchebe ịnọ karịa n’ikike ncheta ihe nke zuru òkè nke Jehova.

“‘N’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.’ (Ndị Filipaị 4:6, 7) Karịsịa, ana m ekpe ekpere ka mmụọ Jehova nye m ume. Mgbe o wutewere m nke ukwuu, ana m ejekwuru Jehova sị, ‘achọkwuru m mmụọ gị,’ ọ na-enyekwara m aka ịgabiga ụbọchị ahụ. Mgbe ụfọdụ anaghịdị m enwe ike ikwupụta ya, ma ọ na-enye m ume iji gaa n’ihu.”

N’ezie Jehova enyeworo anyị aka idi oké ọdachi a. Ewo, anyị ka na-eru újú maka Theresa anyị hụrụ n’anya. Ọ dị anyị ka a gaghị ehichapụcha iru újú anyị ruo mgbe anyị ga-enwe ike ịmakụ ya ọzọ n’ime ụwa ọhụrụ Jehova. Ka ọ dịgodị, anyị ekpebisikwuola ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Jonathan ekpebisiwo ike ime ihe nile o nwere ike ime iji zụlite Oscar ịhụ Jehova n’anya na ijere ya ozi, mụ na Vicki ga-enyekwara ya aka n’ụzọ ọ bụla o kwere mee. Ọ bụ ọchịchọ sitere n’obi anyị ịnọ ya n’ime ụwa ọhụrụ Chineke ịnabataghachi Theresa ma gosi ya nwa ya nwoke ọ na-ekutụghị.

[Foto dị na peeji nke 27]

Nwa anyị nwanyị bụ́ Theresa, ka ọ na-ege ọkụkụ nke obi nwa ya

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Oké nkwado ahụ e nyere anyị n’ememe olili ozu ahụ metụrụ anyị n’ahụ

[Foto dị na peeji nke 31]

Mụ na nwunye m, bụ́ Vicki, n’agbamakwụkwọ Theresa

[Foto dị na peeji nke 31]

Nwa nwa anyị bụ́ Oscar