Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-akpata Ịkpọasị

Ihe Ndị Na-akpata Ịkpọasị

Ihe Ndị Na-akpata Ịkpọasị

ỊKPỌASỊ bidoro ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ihe ndekọ Bible dị na Jenesis 4:8 na-ekwu, sị: “O ruo, mgbe ha nọ n’ọhịa, na Ken biliri imegide Ebel, bụ́ nwanne ya, we gbuo ya.” “Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o gburu ya?” ka Jọn bụ́ onye so dee Bible jụrụ. “N’ihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma ọrụ nke nwanne ya ziri ezi.” (1 Jọn 3:12) E gburu Ebel n’ihi otu n’ime ihe ndị kasị akpata ịkpọasị: ekworo. “Ekworo bụ ọnụma nke nwoke,” ka Ilu 6:34 na-ekwu. Taa, ekworo n’ihi ọkwá, akụ̀ na ụba, ihe onwunwe, na ihe ndị ọzọ bara uru na-arakọta ndị mmadụ na ibe ha.

Amaghị nke A Na-akọ na Egwu

Ma ekworo bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ihe na-akpata ịkpọasị. Ọtụtụ mgbe, amaghị nke a na-akọ na egwu na-emekwa ka ịkpọasị ka njọ. “Tupu m mụtadị ịkpọ asị, amụtara m ịtụ egwu,” ka otu onye na-eto eto so n’òtù na-akpa ókè agbụrụ na-eme ihe ike, kwuru. Ọ bụ amaghị nke a na-akọ na-akpatakarị egwu dị otú ahụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, ndị nwere ajọ mbunobi na-enwekarị echiche ndị “a na-enwe n’atụleghị ihe àmà e nwere. . . . Ndị nwere ajọ mbunobi na-agbagọkarị, na-agwagbu, na-akọwahie, ma ọ bụ ọbụna na-eleghara ihe ndị bụ́ eziokwu anya bụ́ ndị na-emegide echiche ha buru ụzọ nwee.”

Olee ebe e si enweta echiche ndị a? Otu ebe e si enweta ihe ọmụma n’Internet na-ekwu, sị: “Ọ bụ akụkọ ihe mere eme mere e ji nwee ọtụtụ ọdịnala ndị yiri ibe ha, ma nzụlite anyị na-akpatakwa ọtụtụ n’ime echiche anyị ndị gbagọrọ agbagọ.”

Dị ka ihe atụ, na United States, ahịa ohu akpatawo iro n’etiti ọtụtụ ndị ọcha na ndị sitere n’agbụrụ Africa—iro nke dịruworo taa. Ọtụtụ mgbe, nne na nna na-ebufere ụmụ ha echiche na-ezighị ezi banyere otu agbụrụ. Otu onye ọcha nke kwupụtara n’onwe ya na ya na-akpa ókè agbụrụ kwetara na ya si otú ahụ nwee echiche na-ezighị ezi banyere ndị isi ojii “ọbụna n’esotụghịdị [ha] mekọrịta ihe.”

E nwekwara ndị kweere nnọọ na ndị na-adịghị ka ha abụghị ndị ezigbo mmadụ. A pụrụ ịmalite inwe echiche a n’ihi mmeso ọjọọ si n’aka otu onye si n’agbụrụ ma ọ bụ obodo ọzọ. N’ihi ya, ha na-ekpebi nnọọ na onye bla si n’agbụrụ ma ọ bụ obodo ahụ aghaghịkwa ịdị na-akpa àgwà ọjọọ.

Ọ bụ ezie na mmadụ ikwesi olu ike dị nnọọ njọ, mgbe ọ bụ mba ma ọ bụ agbụrụ n’ozuzu ya na-eme otú ahụ, ọ pụrụ ịdị na-egbu egbu. Echiche bụ́ na mba mmadụ, ụcha akpụkpọ ahụ, ọdịbendị, ma ọ bụ asụsụ ya na-eme ka mmadụ ka ndị ọzọ mma pụrụ ịkpata nkwesi olu ike na ịtụ onye ọbịa ụjọ (ilelị onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla si mba ọzọ). Na narị afọ nke 20, e gosipụtara nkwesi olu ike dị otú ahụ mgbe mgbe n’ụzọ ime ihe ike.

Ọ dị mma ịmara na ịkpọasị na nkwesi olu ike adịghị abụcha n’ihi ụcha akpụkpọ ahụ ma ọ bụ mba mmadụ si na ya. Onye nchọpụta bụ́ Clark McCauley nke Mahadum Pennsylvania na-ede na “ịnọkata kewaa ndị mmadụ n’otu n’otu gaa n’ìgwè abụọ, ọbụna site n’ịtụli mkpụrụ ego elu, ezuola ime ka mmadụ nwee mmasị n’ìgwè o so na ya karịa n’ìgwè ọzọ.” Otu onye nkụzi klas nke atọ gosipụtara nke a mgbe, dị ka akụkụ nke nnwale a ma ama, o kewara klas ya gaa n’ìgwè abụọ—ụmụaka anya ha na-acha anụnụ anụnụ na ndị anya ha na-acha nchara nchara. Obere oge, ìgwè abụọ ahụ malitere ibuso onwe ha iro. Ọbụna ihe ndị ọ na-adịghị ihe ha bụ dị ka ìgwè abụọ inwe mmasị dịrịtara iche n’ebe otu òtù egwuregwu nọ pụrụ ịkpata ọgụ.

N’ihi Gịnị Ka Ime Ihe Ike Ji Baa Ụba?

Ma n’ihi gịnị ka e ji egosipụtakarị nnọọ ibu iro dị otú ahụ site n’ime ihe ike? Ndị nchọpụta elebawo nnọọ anya n’okwu ndị ahụ, ruokwa ugbu a nanị ihe ha pụrụ ime bụ ịkọ uche ha. Clark McCauley mere ndekọ sara mbara nke nnyocha e mere banyere ime ihe ike na mmadụ ịchọ okwu. O hotara otu nnyocha nke na-egosi na “mpụ ime ihe ike na ịlụ na imeri n’agha nwere njikọ.” Ndị nchọpụta ahụ chọpụtara na “mba ndị keere òkè n’Agha Ụwa Mbụ na Agha Ụwa nke Abụọ, karịsịa mba ndị meririnụ n’agha ndị a, nwere mmụba nke igbu ọchụ mgbe a lụsịrị agha ahụ.” Dị ka Bible si kwuo, anyị na-ebi n’oge agha. (Matiu 24:6) Ọ̀ ga-abụ na agha ndị dị otú ahụ esowo kpata n’ụzọ ụfọdụ ịrị elu nke ụdị ime ihe ike ndị ọzọ?

Ndị nchọpụta ọzọ na-achọ ma ọ̀ dị ihe ụmụ mmadụ bu pụta ụwa mere ha ji achọ okwu. Otu nnyocha e mere gbalịrị ijikọta ụdị ịchọ okwu ụfọdụ na “ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala nke mmiri ọgwụ bụ́ serotonin dị n’ụbụrụ.” Nchepụta ọzọ na-ewu ewu bụ na ịchọ okwu dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị. “Akụkụ dị ukwuu nke [ịkpọasị] pụrụ ọbụna ịbụ nke e bu pụta ụwa,” ka otu ọkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru.

Bible n’onwe ya na-ekwu na ụmụ mmadụ na-ezughị okè bu àgwà ọjọọ na ezughị okè pụta ụwa. (Jenesis 6:5; Deuterọnọmi 32:5) Otú ọ dị, okwu ndị ahụ metụtara mmadụ nile. Ma ọ bụghị mmadụ nile na-akpọ ndị ọzọ asị na-enweghị isi. Ọ ghaghị ịbụ nke a na-amụta amụta. N’ihi ya, ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ a ma ama bụ́ Gordon W. Allport, chọpụtara na ụmụ ọhụrụ “adịghị egosikebe . . . ihe àmà nke àgwà mbibi ihe ebumpụta ụwa. . . . Nwa ọhụrụ na-enwe nchekwube, na-agakwuru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ihe ọ bụla na-akpali akpali, na ụdị mmadụ ọ bụla.” Nchọpụta dị otú ahụ na-akwado echiche bụ́ na ịchọ okwu, ajọ mbunobi, na ịkpọasị bụ n’ụzọ bụ́ isi àgwà nda na-amta amta! Ndị na-akụzi ịkpọasị na-eji nnọọ ikike ịmụta ịkpọasị bụ́ nke o doro anya na ụmụ mmadụ nwere eme ihe.

Imebi Obi Ndị Mmadụ

Ndị na-ebute ụzọ bụ ndị ndú nke òtù na-akwalite ịkpọasị, dị ka ndị isi agbọ ncha na-akwado Nazi na ndị Ku Klux Klan. Òtù ndị a na-elekwasịkarị ndị ntorobịa ihe na-amasị ngwa ngwa anya bụ́ ndị si n’ezinụlọ ndị nwere nsogbu iji nweta ndị òtù. Ndị ntorobịa bụ́ ndị nwere mmetụta nke anọghị ná nchebe na nke erughị eru pụrụ iche na òtù ndị na-akwalite ịkpọasị na-eme ka ha nwee mmetụta nke ịbụ ndị a chọrọ.

Internet karịsịa bụ ngwá ọrụ dị ike nke ụfọdụ ndị jiworo kwalite ịkpọasị. Dị ka ngụkọ e mere na nso nso a si gosi, a pụrụ inwe ihe ruru 1,000 ebe a na-edebe ihe ọmụma bụ́ ndị na-akpọsa ịkpọasị n’Internet. Magazin bụ́ The Economist na-ehota otu onye nwe ebe a na-edebe ihe ọmụma banyere ịkpọasị n’Internet, dị ka onye turu ọnụ, sị: “Internet emewo ka anyị nwee ohere ịgwa ọtụtụ narị puku ndị mmadụ echiche anyị.” Ebe ọ na-edebe ihe ọmụma n’Internet nwere “Akụkụ nke Ụmụaka.”

Mgbe ndị nọ n’afọ iri na ụma na-achọgharị egwú n’Internet, ha pụrụ ịhụ na mberede ebe ndị ga-eduga ha n’ebe ndị ha ga-enweta egwú na-akwalite ịkpọasị n’Internet. Egwú dị otú ahụ na-adasikarị ụda ike, na-enwekwa okwu ndị na-egosi echiche ndị siri ike nke ịkpa ókè agbụrụ. Ebe ndị a a na-edebe ihe ọmụma n’Internet, n’aka nke ha, nwere ebe ndị na-eduga n’ebe ígwè na-ekerịta akụkọ, ebe mkparịta ụka, ma ọ bụ ebe ndị ọzọ a na-edebe ihe ọmụma n’Internet bụ́ ndị na-akwalite ịkpọasị.

Ebe ụfọdụ a na-edebe ihe ọmụma banyere ịkpọasị n’Internet nwere akụkụ ndị pụrụ iche nwere egwuregwu na ihe omume maka ndị na-eto eto. Otu ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Internet nke òtù na-akwado Nazi nwe na-agbalị iji Bible akwado ịkpa ókè agbụrụ na imegide ndị Juu. Òtù ahụ emepụtawokwa ebe ha na-edebe ihe ọmụma n’Internet bụ́ nke nwere egwuregwu crossword puzzle nke e dere okwu ịkpa ókè agbụrụ na ya. Gịnị bụ nzube ya? “Iji nyere ndị na-eto eto n’etiti ndị ọcha aka ịghọta ọgụ anyị na-alụ.”

Ma, ọ bụghị ndị nile na-akwalite ịkpọasị nwere àgwà nke imebiga ihe ókè. Ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze onye dere banyere esemokwu e nwere n’oge na-adịbeghị anya n’ógbè Balkan kwuru banyere ụfọdụ ndị nwere aha ọma ndị na-ede akwụkwọ na ndị ọnụ na-eru n’okwu, sị: “O riri m ọnụ ịhụ ka [ha] gbasoro ụdị ide ihe na-emeju ọchịchọ ndị kasị retọọ eretọọ nke ndị ha na ha si n’otu mba, na-akpali oké ịkpọasị ha, na-eme ka ha ghara ime mkpebi amamihe dị na ya site n’ịgba ha ume ịghara inwe àgwà ọ bụla ha ga-ele anya dị ka nke rụrụ arụ . . . , na-akọwahiekwa ihe mere eme.”

N’ihe banyere nke a, e kwesịghị ileghara òkè ndị ụkọchukwu na-ekere anya. N’akwụkwọ ya bụ́ Holy Hatred: Religious Conflicts of the ’90’s, onye dere ya bụ́ James A. Haught kwuru ihe a na-awụ akpata oyi n’ahụ: “Ọnọdụ na-emegide nnọọ onwe ya nke afọ ndị 1990 bụ na okpukpe—ihe e chere na ọ bụ isi iyi nke obiọma na nchebara echiche—bụ ihe kasị akpata ịkpọasị, agha, na iyi ọha egwu.”

N’ihi ya a pụrụ ịhụ na ihe ndị na-akpata ịkpọasị dị ọtụtụ, dịkwa mgbagwoju anya. Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị ụzọ ọ bụla ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi kwụsị imeghachi omume nzuzu ha meworo n’oge gara aga bụ́ ndị jupụtara n’ịkpọasị? Ọ̀ dị ihe ọ bụla ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa ndị nile nọ n’ụwa pụrụ ime iji kwụsị nghọtahie ahụ, amaghị nke a na-akọ, na egwu ahụ bụ́ ndị na-akpata ịkpọasị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ajọ mbunobi na ịkpọasị bụ àgwà ndị a na-amụta amụta!

[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]

Anyị ebughị ịkpọasị . . .

. . . na ikwesi olu ike pụta ụwa

[Foto dị na peeji nke 7]

Òtù na-akwalite ịkpọasị na-eji Internet enweta ndị ntorobịa

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọtụtụ mgbe okpukpe afụnyewo esemokwu ọkụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto AP