Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Afọ Ofufo nke Nwere Abamuru Na-adịgide Adịgide

Ọrụ Afọ Ofufo nke Nwere Abamuru Na-adịgide Adịgide

 Ọrụ Afọ Ofufo nke Nwere Abamuru Na-adịgide Adịgide

JISỌS KRAỊST rụụrụ ndị nọ ná mkpa ezi ọrụ mgbe nile. Dị ka ihe atụ, o nyere ndị agụụ na-agụ nri ma gwọọ ndị ọrịa. (Matiu 14:14-21) Otú ọ dị, olee ihe omume nke o butere nnọọ ụzọ? Otu ihe nke mere ná mmalite nke ije ozi Jisọs na-enye azịza ya. E dekọrọ ya n’isi mbụ nke Oziọma Mak.

Mgbe Jisọs nọ na Kapanaum, na nso Osimiri Galili, a kpọgara ya n’ụlọ Saịmọn, ma ọ bụ Pita. N’ebe ahụ, “nne nwunye Saịmọn na-edina n’ahụ ọkụ,” Jisọs gwọkwara ya. (Mak 1:29-31) E mesịa, ìgwè mmadụ, gụnyere ọtụtụ “ndị ahụ na-adịghị mma n’ọrịa dị iche iche” malitere ịgbakọta n’ọnụ ụzọ ụlọ Pita, Jisọs gwọkwara ha. (Mak 1:32-34) E mesịa, chi jiri, onye ọ bụla alakpuokwa ụra.

N’echi ya, “n’ezi abalị,” Jisọs ji nwayọọ bilie ma si n’ụlọ ahụ pụọ “jee n’ebe bụ́ ọhịa,” bụ́ ebe ọ “nọ na-ekpe ekpere.” N’oge na-adịghị anya, ndị na-eso ụzọ ya tetakwara, lepụ anya n’èzí, ma hụ otu ìgwè mmadụ buru ibu na-eche n’ọnụ ụzọ. Ma gịnị ka ha ga-eme? Jisọs anọghị ya! Ngwa ngwa Pita na ndị ha na ya so chọtara Jisọs ma kwuo, sị: “Mmadụ nile na-achọ Gị.” (Mak 1:35-37; Luk 4:42) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, o yiri ka hà na-agwa Jisọs, sị: ‘Gịnị ka ị na-eme ebe a? N’anyasị gara aga ọgwụgwọ ị gwọrọ ndị ọrịa gara nnọọ nke ọma. Taa, i nweekwala ohere ọzọ dị ukwuu!’

Ma ugbu a, rịba nzaghachi Jisọs ama: “Ka anyị gaa ebe ọzọ n’obodo nile so nke a, ka M kwusaakwa n’ebe ahụ.” Nzaghachi a kwesịrị nrịba ama. Jisọs alaghachighị n’ụlọ Pita iji gwọọ ndị ọzọ. O gosipụtara ihe kpatara nke ahụ mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụ ime nke a [ya bụ, ime nkwusa] ka M pụtara.” (Mak 1:38, 39; Luk 4:43, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Gịnị ka Jisọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya? Ịrụ ọrụ ọma dị mkpa nye ya, ma ikwusa na izi okwu Chineke bụ ọrụ bụ́ isi nke Jisọs.—Mak 1:14.

Ebe ọ bụ na Bible na-agba ndị Kraịst ume ‘ịgbaso ijeụkwụ [Jisọs] nile,’ ezi ndị Kraịst taa nwere nduzi doro anya ma a bịa n’isetịpụ ihe ndị ka mkpa n’ọrụ afọ ofufo. (1 Pita 2:21) Dị ka Jisọs, ha na-enyere ndị nọ ná mkpa aka—dị ka isiokwu bu nke a ụzọ na-egosi. Dịkwa ka Jisọs, ha na-ebute ọrụ nke izi ozi Bible banyere ozi ọma nke Alaeze Chineke ụzọ. * (Matiu 5:14-16; 24:14; 28:19, 20) Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka iwepụta onwe onye n’afọ ofufo iji zie ndị mmadụ ozi Bible kwesịrị iji bute ụdị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ ụzọ?

 Ihe Mere Mmụta Bible Ji Aba Uru na Otú O si Eme Otú Ahụ

Otu Ilu Esia na-arụtụ aka n’azịza ya. Ọ na-asị: “Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ maka otu afọ, kụọ mkpụrụ. Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ maka afọ iri, kụọ osisi. Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ maka otu narị afọ, kụziere ndị mmadụ ihe.” N’ezie, a bịa n’ihe banyere iweta ihe ngwọta ndị na-adịgide adịgide, mmụta dị nnọọ mkpa n’ihi na ọ na-ewulite ikike mmadụ nwere ime mkpebi ndị ga-eme ka ndụ ya  ka mma. Ọ bụ ya mere na taa ihe karịrị nde isii nke ndị ọrụ afọ ofufo oge nile nakwa ndị nke nwa oge na-eji oge, ikike, na akụ̀ ha eme ihe iji kụziere ọha na eze ihe ọmụma Bible n’efu. Ọrụ afọ ofufo a Ndịàmà Jehova na-arụ bụ́ nke dịworo irè eri oge, na-enwe mmetụta n’ógbè dị iche iche gburugburu ụwa. N’ụzọ dị aṅaa?

Ka a na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta na ịgbaso ndụmọdụ dị irè nke Bible, ha na-aka enwe ike ime ihe banyere nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ. Ha na-enweta ikike dị mkpa nke omume iji merie àgwà ndị dị njọ. Nelson, bụ́ onye na-eto eto nọ na Brazil, na-emesi abamuru ọzọ nke mmụta Bible ike, sị: “Kemgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, enwewo m ọṅụ n’ihi na enweziri m nzube ná ndụ.” (Eklisiastis 12:13) Ọtụtụ narị puku ndị ọzọ—ma ụmụaka ma ndị agadi—bụ́ ndị malitere ịmụ Okwu Chineke na nso nso a, nwekwara echiche dị ka nke Nelson. Tụkwasị n’inyere ndị a na-amụrụ ihe aka ịchọta nzube na-enye afọ ojuju ná ndụ, ozi nke Alaeze Chineke na-enye olileanya na-akpali akpali maka ọdịnihu—olileanya nke na-eme ka ndụ dị ụtọ obibi, ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị kasị sie ike. (1 Timoti 4:8)—Lee igbe bụ́ “Abamuru Ndị Alaeze Chineke Ga-eweta.”

Site n’ịkụzi ihe ọmụma Bible, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ afọ ofufo nke nwere abamuru ndị na-adịgide adịgide. Ruo ókè hà aṅaa ka ọ na-adịgideru adịgide? Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ma nke a bụ ndụ ebighebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Cheedị echiche banyere ikere òkè n’ihe omume nwere abamuru na-adịru ebighị ebi—nke ahbụ ụdị ọrụ afọ ofufo nke na-abara ndị ọzọ uru n’ezie! Nke ahụ ọ́ bụghị ụdị ihe omume ị ga-achọ ịmụtakwu banyere ya? Ọ bụrụ otú ahụ, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ịnakwere ọkpụkpọ òkù a ga-abụ nzọụkwụ ị na-agaghị akwara ụta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ndịàmà Jehova na-ele ọrụ nkwusa ha anya n’otu ụzọ ahụ Pọl onyeozi si lee ya—dị ka ihe ezi ndị Kraịst na-aghaghị ime. Pọl kwuru, sị: “N’ihi na a sị na ana m ezisa ozi ọma, enweghị m ihe ịnya isi; n’ihi na mkpa na-akpa m.” (1 Ndị Kọrint 9:16) Ma, ọrụ nkwusa ha bụ nke afọ ofufo n’ihi na ha ejiriwo aka ha họrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, na-amara nke ọma ibu ọrụ ndị na-eso ihe ùgwù dị otú ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

“Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ maka otu afọ, kụọ mkpụrụ. Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ maka afọ iri, kụọ osisi. Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ maka otu narị afọ, kụziere ndị mmadụ ihe”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ọ Na-enye Aka, Na-ewetakwa Olileanya

Nadine, nọọsụ dị afọ 43, bụ́ onye France nke bụ́ ọkachamara n’ọrịa ndị a na-arịa n’ebe okpomọkụ, bụ otu n’ime ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ ndị rụworo ọrụ n’Etiti Africa. “Ndị mmadụ na-ajụ m ihe mere m ji eme ihe a,” ka o kwuru n’ajụjụ ọnụ a gbara ya na nso nso a. “Ekwere m na Chineke, ahụrụ m ndị mmadụ n’anya, achọkwara m itinye oge n’inyere ndị ọzọ aka. Ịbụkwa otu n’ime Ndịàmà Jehova na-akwali m iwetara ndị na-ata ahụhụ ma ihe ngwọta ma olileanya.” Ka ọ na-arụ ọrụ afọ ofufo n’Africa, Nadine na-eke oge ya eke n’etiti ịrụ ọrụ enyemaka na ikere òkè n’ọrụ ịkụzi Bible nke Ndịàmà nọ n’ebe ahụ na-arụ.

[Foto]

Nadine ka ọ nọ n’Africa

[Igbe dị na peeji nke 26]

Abamuru Ndị Alaeze Chineke Ga-eweta

Biko gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na Bible gị, ma hụ otú Chineke si ekwe nkwa igbo mkpa ụmụ mmadụ n’akụkụ ndị a na-esonụ:

Ahụ Ike “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”Mkpughe 21:4; Aịsaịa 33:24; 35:5, 6.

Mmụta “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”Aịsaịa 11:9; Habakuk 2:14.

Ọrụ “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: . . . Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”Aịsaịa 65:21-23.

Nri “Ala emewo ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.”Abụ Ọma 67:6; 72:16; Aịsaịa 25:6.

Ọnọdụ Mmadụ na Ibe Ya “Jehova anyajiwo mkpanaka nke ndị na-emebi iwu . . . Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ.”Aịsaịa 14:5, 7.

Ikpe Ziri Ezi “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze, ndị isi kwa, n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi.”Aịsaịa 11:3-5; 32:1, 2.