Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nke Mbụ Otu Narị Afọ Gara Aga

Nke Mbụ Otu Narị Afọ Gara Aga

Nke Mbụ Otu Narị Afọ Gara Aga

E dekọrọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ nke Watch Tower Bible and Tract Society n’akwụkwọ iwu kwadoro na Pennsylvania, U.S.A., na December 15, 1884. * Ọ bụ n’ebe ahụ ka e guzobere isi ụlọ ọrụ òtù a. Mgbe e mesịrị, n’April 23, 1900, e nwetara ala maka alaka ụlọ ọrụ mbụ na London, England. Ọ dị na 131 Gipsy Lane, Forest Gate, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ London, dị ka e gosiri ya n’ebe a.

MGBE e guzobere alaka mbụ ahụ, otu narị afọ gara aga, England nwere ngụkọta nke Ndị Mmụta Bible 138, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Ka afọ abụọ gasịrị, na 1902, e meghere alaka nke abụọ na Germany; ka ọ na-erule na 1904, e guzobewokwa alaka ndị ọzọ n’Australia na Switzerland.

Na 1918, afọ ahụ Agha Ụwa Mbụ biri, e nwere Ndị Mmụta Bible 3,868 nyere akụkọ ozi n’ụwa nile. N’afọ sochiri ya e guzobere alaka nke ise nke Watch Tower Society—nke a bụ na Canada. Mgbe ahụ, ka mkpọsa nke ozi Bible na-agbasawanye, e mepere alaka ọhụrụ n’ọtụtụ mba dị iche iche, isii na 1921 nanị.

Ka ọ na-erule na 1931, bụ́ mgbe Ndị Mmụta Bible nakweere aha ahụ dabeere na Bible bụ́ Ndịàmà Jehova, e nwewo alaka ụlọ ọrụ 40 n’ụwa nile. (Aịsaịa 43:10-12) N’afọ atọ ọzọ sochiri ya, ọnụ ọgụgụ ahụ mụbaruru 49! Ka ọ na-erule 1938 e nwewo ọnụ ọgụgụ kasị elu nke Ndịàmà 59,047 na-eme nkwusa ná mba 52, ma n’oge ahụ ajọ mmegide amalitela iyi ọrụ ha dị ka ndị Kraịst egwu n’ọtụtụ ebe.

Ka ọchịchị aka ike na-agbasa site ná mba ruo ná mba, Agha Ụwa nke Abụọ amalitekwa na September 1939, e mechiri alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ mba. Ka ọ na-erule na 1942, ọ bụ nanị 25 ka na-arụ ọrụ. Otú ọ dị, n’ụzọ na-eju anya, n’oge agha ahụ kasị bibie ihe n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Ndịàmà Jehova nọgidere na-eje ozi n’ụwa nile ma nwee otu n’ime mmụba ndị kasị elu n’akụkọ ihe mere eme ha nke oge a.

Ọbụna ka Agha Ụwa nke Abụọ na-ebi na 1945—ọtụtụ akụkụ nke ụwa abụrụkwa mkpọmkpọ ebe—e megheghachiri alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Ndịàmà ma guzobe ndị ọhụrụ. Ka ọ na-erule na 1946 e nwewo 57 n’ụwa nile. Ọ̀ bụkwa Ndịàmà ole na-ejechi ozi anya ka e nwere? Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 176,456! Nke ahụ fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu atọ karịa nke e nwere na 1938!

Otú E Si Wusawanye Alaka Ndị Mbụ Ahụ

Na 1911 e bufere alaka mbụ nke Watch Tower Society, dị na London, England, na 34 Craven Terrace, bụ́ ebe e nwekwuru ọfịs na ụlọ obibi. Mgbe ahụ n’April 26, 1959, a raara alaka ụlọ ọrụ dị na Mill Hill, London, nye. Ka e mesịrị e wusawanyere ebe obibi ndị e nwere, n’ikpeazụ (na 1993) a rakwaara ebe obibi akwụkwọ na ebe nlekọta dị square mita 18,500, bụ́ nke dị nso, nye. N’ebe ahụ a na-ebi ihe karịrị nde Ụlọ Nche na Teta! 90 kwa afọ n’asụsụ 23.

Mwusawanye nke alaka nke abụọ nke Society dị ọbụna ịrịba ama karị. Na 1923 e bufere alaka Germany na Magdeburg. Ụlọ Nche nke July 15, 1923, bụ nke mbụ ígwè obibi akwụkwọ nke Society biri. N’ime afọ ole na ole sochirinụ, a zụtara ala dịdewere ya, e wukwuru ụlọ, a zụtakwara ígwè e ji ekwe akwụkwọ na ígwè obibi akwụkwọ ndị ọzọ. Na 1933 ndị Nazi jichiri alaka ahụ, a machibidoro Ndịàmà iwu, ka oge na-aga, a kpọgakwara puku abụọ n’ime ha n’ogige ịta ahụhụ.

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri na 1945, e nyeghachiri ihe onwunwe ahụ dị na Magdeburg, bụ́ akụkụ East Germany mgbe ahụ, e guzobeghachikwara alaka ahụ. Ma n’August 30, 1950, ndị uwe ojii nke Ndị Ọchịchị Kọmunist wabatara n’ihe owuwu ahụ ma jide ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ, a machibidokwara Ndịàmà nọ na East Germany iwu. Ka ọ dịgodị, na 1947 a zụtara ala na Wiesbaden, West Germany. N’ime ọtụtụ iri afọ sochirinụ, e wusawanyere ọtụtụ ugboro ihe owuwu alaka ahụ e wuru n’ebe ahụ iji na-ebipụtazu akwụkwọ a chọrọ.

N’ihi na e nwekwaghị ohere maka mwusawanye na Wiesbaden, a zụtara ala ruru ihe dị ka hekta 30 n’ebe dịdewere Selters na 1979. Mgbe ihe dị ka afọ ise nke owuwu ya gasịrị, a raara alaka buru ibu nye n’April 21, 1984. E wusawanyewo ya kemgbe ahụ, ka o wee nwee ike ịba ihe karịrị nnọọ otu puku ndị na-arụ ọrụ n’alaka ahụ. N’ọnwa ọ bụla a na-eji nnukwu ígwè obibi akwụkwọ offset bụ́ ndị dị na Selters ebi ihe karịrị nde magazin 16 n’ihe karịrị asụsụ 30; n’otu afọ na-adịbeghị anya, e jikwa ígwè ahụ e ji ekwe akwụkwọ mepụta ihe karịrị nde akwụkwọ 18, gụnyere Bible.

Alaka Ndị Ọzọ Buru Ibu Na-ebi Akwụkwọ

E guzobere alaka na nke mbụ ya na Kobe, Japan, na 1927, ma oké mkpagbu a kpagburu Ndịàmà n’oge Agha Ụwa nke Abụọ belatara ọrụ ha. Otụ́ ọ dị, nwa obere oge mgbe agha ahụ bisịrị, e guzobeghachiri alaka ahụ na Tokyo. Mgbe a na-enwekwaghị ohere maka mwusawanye n’ebe ahụ, e wuru alaka ọhụrụ na Numazu. A raara ya nye na 1973. Mgbe a mụbara karịa ihe owuwu ahụ n’oge na-adịghị anya, e wuru nke ọhụrụ buru ibu n’Ebina, a rakwaara ya nye na 1982. Na nso nso a ka e wusawanyechara ihe owuwu dị n’ebe ahụ bụ́ nke pụrụ ịba ndị ọrụ 900. Nanị n’asụsụ Japanese, e biri ihe karịrị nde Ụlọ Nche na Teta! 94 na 1999, dịkwa ka e biri ọtụtụ nde akwụkwọ.

Mwusawanye nke alaka ụlọ ọrụ abụwo otu ihe ahụ n’ọtụtụ mba. E guzobere alaka na Mexico City, Mexico, na 1929. Mgbe ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ruziri 60,000, e wuru ihe owuwu ọhụrụ buru ibu ná mpụga obodo ahụ. A raara ya nye na 1974, mwusawanye ndị e mere na ya bịara ná ngwụsị na 1985 nakwa na 1989. Ọ fọrọ nke nta ugbu a ka e wuchaa ebe ọhụrụ buru ibu a na-ebi akwụkwọ nakwa ebe obibi e wusawanyere ewusawanye. N’ihi ya, n’oge na-adịghị anya alaka Mexico ga-enwe ike ịba ndị ọrụ 1,200. Alaka ahụ enyewelarị ihe karịrị Ndịàmà 500,000 na ọtụtụ nde ndị ọzọ nọ na Mexico nakwa ndị bi ná mba ndị dị ya nso magazin na akwụkwọ.

Na 1923 a haziri alaka ụlọ ọrụ na Rio de Janeiro, Brazil, mgbe e mesịrị e wukwara ọmarịcha ụlọ ọhụrụ dị iche iche n’ebe ahụ. Ma ebe ọ bụ na São Paulo bụ ebe bụ́ isi e nwere azụmahịa na usoro njem na Brazil, na 1968 e wuru alaka ọhụrụ n’obodo ahụ. Ka ọ na-erule n’etiti afọ ndị 1970, e nwere ihe dị ka 100,000 Ndịàmà na Brazil. Otú ọ dị, a pụghị iwusawanyekwu ihe na São Paulo, n’ihi ya a zụtara ala dị hekta 115 na Cesário Lange, bụ́ ebe dị ihe dị ka kilomita 150 ná mpụga São Paulo. Na March 21, 1981, a raara alaka ụlọ ọrụ ahụ dị n’ebe ọhụrụ ahụ nye. N’ihi mwusawanye e mere n’ebe ahụ, alaka ahụ pụrụ iba ihe dị ka mmadụ 1,200. A na-ebi magazin na akwụkwọ na Brazil maka ọtụtụ ebe na Ndịda America nakwa maka akụkụ ndị ọzọ nke ụwa.

E wuchara nnukwu alaka ọzọ ná mmalite afọ ndị 1990, n’ebe dịdewere Bogotá, Colombia. A na-ebi Ụlọ Nche na Teta! maka ikesa ha n’akụkụ nile nke ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Ndịda America.

Alaka ndị ọzọ na-ebi ọtụtụ nde magazin kwa afọ dị n’Argentina, Australia, Canada, Finland, Itali, Korea, Nigeria, Philippines, South Africa, na Spain. Alaka dị n’Itali na-emepụtakwa ọtụtụ nde akwụkwọ, gụnyere Bible, n’ọtụtụ asụsụ n’afọ ọ bụla. Otú ọ dị, a ka na-ebi ihe ka ukwuu n’akwụkwọ ndị a na-ebi kwa afọ, nke na-akarị nde akwụkwọ 40 na ihe karịrị otu ijeri magazin, n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society dị na Brooklyn, New York, nakwa n’ebe obibi akwụkwọ ya dị n’ebe ugwu New York.

N’ezie, ọ bụ ihe dị ịrịba ama na ọnụ ọgụgụ alaka ụlọ ọrụ amụbawo site n’otu n’ime otu narị afọ gara aga ruo 109 taa bụ́ ndị na-egbo mkpa Ndịàmà Jehova n’ala 234. Ọ dịkwa ịrịba ama ịhụ na ihe dị ka ndị Kraịst 13,000 bụ́ ndị raara onwe ha nye, na-arụ ọrụ n’ebe ndị ahụ n’afọ ofufo! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọrụ ha na nke ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo 5,500 nọ n’isi ụlọ ọrụ Society ekerewo òkè ná mmezu nke amụma Jisọs Kraịst bụ́ na ‘a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi, tupu ọgwụgwụ ihe nile eruo.’—Matiu 24:14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Nke a na-akpọ Zion’s Watch Tower Tract Society mgbe ahụ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Tom Hart, bụ́ onye e chere na ọ bụ Onye Mmụta Bible mbụ e nwere n’England

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Alaka London dị na 34 Craven Terrace (na foto dị n’aka nri)

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ihe owuwu e ji eme ihe ugbu a na London