Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Mmụta Kasị Mma?

Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Mmụta Kasị Mma?

 Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Mmụta Kasị Mma?

“Mmụta bụụrụ mkpụrụ obi ihe ịtụ ihe bụụrụ nkume marble.”—Joseph Addison, 1711.

Ị̀ GARA akwụkwọ? Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ pụrụ ịza ee—ma ọ bụghị onye ọ bụla pụrụ ime otú ahụ. Ka anyị na-abanye na narị afọ nke 21, ọtụtụ nde ụmụaka adịghị agapụcha akwụkwọ. Nke a adịwo otú a eri ogologo oge, nke mere na ka ọ dị ugbu a ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ijeri ndị toworo eto amaghị akwụkwọ.

Ma, ezi mmụta bụ mkpa bụ́ isi. Kama ile ya anya dị ka ihe okomoko aka na-agaghị eru, ọtụtụ ndị taa na-ele ya anya dị ka ihe ruuru ma ụmụaka ma ndị toworo eto. Ma olee otú a pụrụ isi nweta ezi mmụta ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ndị dị mkpa? Gịnị ma ọ bụrụ na e nweghị ndị nkụzi ruru eru, akwụkwọ, na ụlọ akwụkwọ zuru ezu?

N’ezie, olee ebe ndị mmadụ pụrụ inweta ezi mmụta bụ́ nke na-eme ka ha na-ekere òkè n’ihe a na-akụzi, na-eme ka ha matakwuo banyere ihe ndị dị ha gburugburu, ma mee ka ha nwee ụkpụrụ ime mmụọ nke pụru inwogha ndụ ha? Nkụzi dị aṅaa na-emesi ụkpụrụ omume ndị dị mma ike, na-egosi ụzọ isi bie ndụ ka mma, ma mee ka e nwee olileanya siri ike maka ọdịnihu? È nwere nkụzi dị otú ahụ n’ezie maka onye ọ bụla?

Ihe Ndabere Maka Nkụzi Kasị Mma

N’agbanyeghị na ọ pụrụ iyi ihe ijuanya, anyị pụrụ iji obi ike zaa ee, na e nwere ezi nkụzi maka mmadụ nile. Nke a bụ n’ihi na e nwere ihe dị ike e ji akụzi ihe bụ́ nke pụrụ ịbụ ihe ndabere maka ya. Ọ bụ otu “akwụkwọ ọgụgụ” a na-akwanyere ùgwù eri ogologo oge bụ́ nke e nwere n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị asụsụ 2,200 a na-asụ n’ụwa. N’ụzọ bụ́ isi, onye ọ bụla nọ n’ụwa pụrụ inweta ya n’asụsụ nke ọ pụrụ ịghọta. Olee akwụkwọ nke a bụ?

Ọ bụ Bible, akwụkwọ ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwusi ike na ọ bụ ya kasị mkpa n’akwụkwọ nile e detụrụla. “A pụrụ n’ezie ịkpọ onye ọ bụla nwere ihe ọmụma zuru ezu nke Bible onye gụrụ akwụkwọ,” ka onye ọkà mmụta ná mmalite narị afọ nke 20 bụ́ William Lyon Phelps dere. “Ọ dịghị mmụta ma ọ bụ nkụzi ọzọ, n’agbanyeghị ókè ọ saruru na mbara ma ọ bụ dị mma, pụrụ . . . ịnọchi ya.”

Bible bụ nchikọta akwụkwọ ndị e dere n’ime ihe dị ka afọ 1,600. Phelps kwukwara banyere ọbá akwụkwọ a dị mkpa, sị: “Echiche anyị, amamihe anyị, nkà ihe ọmụma anyị, akwụkwọ anyị, nkà anyị, ụkpụrụ anyị, sitere na Bible karịa ka ha sitere n’akwụkwọ ndị ọzọ nile. . . . Ekwere m na inwe ihe ọmụma Bible n’agaghị mahadum bara uru karịa ịga mahadum n’enweghị ihe ọmụma Bible.”

Taa, ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ nkụzi dị ukwuu bụ́ nke dabeere na Bible n’ụwa nile. Nkụzi dị otú ahụ karịrị ihe ndị bụ́ isi n’ịgụ na ide ihe. Ọ na-eme ka e nwee uto nke uche na ọganihu nke omume. N’ụzọ dị mma, ọ na-emetụta echiche ndị mmadụ banyere ọdịnihu, na-eme ka e nwee ihe ndabere maka ezi olileanya na ihe dị n’ihu ga-aka nnọọ ihe gaworo aga mma.

Biko mata banyere usoro mmụta a na-adịru oge ndụ nile site n’ịgụ isiokwu na-esonụ.