Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

JỌJIA

Achọrọ M Ịgbanwe Otú M Si Ebi Ndụ

Davit Samkharadze

Achọrọ M Ịgbanwe Otú M Si Ebi Ndụ
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1967

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1989

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụbu onye nlekọta sekit. Kemgbe afọ 2013, ọ na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ ndị nzukọ Jehova na-ahazi.

N’AFỌ 1985, mgbe m dị afọ iri na asatọ, ndị ọchịchị Sọviet Yunịọn kpọrọ m ka m bịa banye amị. Mgbe m malitere ọrụ amị, otú e si na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ ebe ahụ nyere m nsogbu n’obi. Ihe a mere ka m gwa onwe m, sị: ‘Achọghị m ịdị ka ha.’ Ma mgbe ụfọdụ, anaghị m akpacha àgwà otú m chọrọ. Achọrọ m ịgbanwe otú m si ebi ndụ.

Mgbe m kwụsịrị ọrụ amị, alọtara m ụlọ. N’otu abalị anyị nwechara oriri na nkwari, arịọrọ m Chineke ka o nyere m aka ka m gbanwee otú m si ebi ndụ. N’echi ya, mgbe m na-aga ọrụ, m gara na nke nwanne papa m bụ́ Onyeàmà Jehova. Mgbe m ruru, ya na Ndịàmà Jehova ole na ole nọ na-enwe ọmụmụ ihe. Ha nabatara m nke ọma, n’ihi ya, mụ esorozie ha mụọ ihe.

Ha gwara m ka ha mụwara m Baịbụl, mụ ekweta. Mgbe ọnwa isii gachara, e mere m baptizim. Jehova nyeere m aka mụ aghọọ ezigbo mmadụ, bụkwanụ ihe m na-agaghị emeli n’onwe m.