Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

JỌJIA

“N’ebe Chineke Nọ, Ihe Niile Kwere Omume”

Natela Grigoriadis

“N’ebe Chineke Nọ, Ihe Niile Kwere Omume”
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1960

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1987

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụbu onyeisi n’otu ụlọ ọrụ na-ere ngwá ahịa. Obere oge e mechara ya baptizim, o ji ihe ndị ọ mụtara n’ụlọ ọrụ ha nye aka mgbe anyị na-ebi akwụkwọ anyị na nzuzo. Ndị ọ matara n’oge ahụ nyekwaara ya aka.

N’AGBATA afọ 1987 na afọ 1989, ọ na-abụ anyị mụwa Ụlọ Nche n’ọmụmụ ihe, ọ bụ naanị nwanna na-eduzi ya na-enwe Ụlọ Nche ahụ. Ọ na-abụkarị nke e ji aka dee. Otu ụbọchị, m gakwuuru otu n’ime ndị okenye anyị aha ya bụ Genadi Gudadze ma gwa ya na ọ ga-adị mma ka anyị jiri aka anyị biwa Ụlọ Nche.

Tupu mgbe ahụ, ụmụnna anyị na-eji ígwè kọpị kọpị ha mere n’onwe ha na-ebipụta akwụkwọ anyị ụfọdụ, ma nke ha na-ebipụta ebughị ibu. Ka e nwee ike ịna-ebipụta ha mgbe niile, e kwesịrị inwe ígwè kọpị kọpị na-arụ ọrụ nke ọma, taịpraịta, onye ma otú e si eji taịpraịta ede ihe nke ọma, nakwa ịna-enweta akwụkwọ e ji ebi akwụkwọ mgbe niile. Ma, ihe niile e ji ebi akwụkwọ dị gọọmenti n’aka, ọ bụkwa ndị uwe ojii pụrụ iche na-ahụ maka ya.

Esi m n’aka otu onye mụ na ya na-azụkọ ahịa zụta taịpraịta ndị gọọmenti na-anaghị ejizi arụ ọrụ. Nwanne m nwaanyị ma otú e si eji taịpraịta ede ihe nke ọma, o nwekwara ike inyere anyị aka. Ụmụnna anyị rụrụ ígwè kọpị kọpị ọhụrụ, chọtakwa ebe anyị ga na-azụta ihe ndị e ji ebi akwụkwọ. Mgbe anyị nwetachara ihe niile anyị chọrọ, o gbughị oge anyị ebipụta Ụlọ Nche mbụ n’asụsụ Jọjin.

Ma, e nwere nsogbu anyị bịara nwee. Otu ụbọchị, Nwanna Genadi gwara m, sị, “Anyị kwesịrị ịchọ ebe ọzọ anyị ga na-azụta ihe ndị anyị ga-eji na-ebi akwụkwọ.” Ọ hụrụ ihe ndị e ji ebi akwụkwọ n’ọfis gọọmenti, ma o nweghị ike ịzụta ha ebe ọ bụ na a na-enyo ya enyo. Oleekwanụ otú anyị ga-esi zụta ha? M gwara Nwanna Genadi na ihe a agaghị ekwe omume. Ya agwa m, sị: “Ekwuzila na ọ gaghị ekwe omume. ‘N’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.’”​—⁠Mat. 19:⁠26.

N’echi ya, m ji ụjọ gawa n’ọfis gọọmenti ahụ, na-eche ihe ahụ ọ gwara m. Jehova mere ka m hụ otu nwaanyị na-eji taịpraịta edere ha ihe. Ọ bụ ezigbo mmadụ. O nyeere m aka gwa onyeisi ha na m chọrọ ịna-azụ ihe ndị e ji ebi akwụkwọ n’aka ha. Onyeisi ha ahụ bụ di ya. O kwetakwara. Ọ bụzi ebe ahụ ka m na-abịa azụta ihe ndị anyị ji ebi akwụkwọ. Si mgbe ahụ gawa, inweta ihe ndị e ji ebi akwụkwọ enyeghịzi anyị nsogbu.