Gaa n'Isiokwu

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Mụ na Papa M Dịghachiri ná Mma

Mụ na Papa M Dịghachiri ná Mma
  • AFỌ A MỤRỤ M: 1954

  • EBE M SI: Filipinz

  • NDỤ M BIRI: Mụ na papa m kwụsịrị imekọ ihe n’ihi na ọ na-emekpọ anyị ọnụ

NDỤ M BIRI NA MBỤ

 Ọtụtụ ndị na-abịa elegharị anya n’ebe e nwere mmiri si n’okwute na-asọda nke dị nso na Pagsanjan dị na Filipinz. Ọ bụ ebe a ka Nardo Leron nna m, nọ tolite. Ọ hụghị tụrụ rachaa n’oge ahụ. Nrụrụ aka ndị ọchịchị, ndị uwe ojii, nakwa ndị ọrụ ibe ya na-arụrụ wutere ya, ọ na-ewekwa ya ezigbo iwe.

 Mama m na papa m gbara mbọ zụlite anyị ụmụ asatọ ha mụrụ. Ha na-anọkarị n’ugwu na-elekọta ihe ha kọrọ n’ubi, n’ihi ya, ọ na-esi ike tupu e nweta ha n’ụlọ. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ mụ na Rodelio nwanne m nwoke ga-achọta ihe anyị ga-eri, agụụ na-adịkwa echi anyị ọnụ n’ala. Anyị anaghị enwecha efe egwu egwu ka ụmụaka ndị ọzọ. Onye ọ bụla n’ime anyị ruhaala afọ asaa, ya aga rụwa ọrụ n’ugbo akị bekee. Anyị na-adị eburu akị bekee na-anyị ezigbo aro na-aga n’ụzọ dị n’ugwu dị ezigbo elu. Ibu ahụ siere anyị ike mbuli, a na-amanye anyị ka anyị dọkpụrụ ya adọkpụ.

 Papa anyị na-eti anyị ihe. Ma nke na-aka agbawa anyị obi bụ ịhụ ya ka ọ na-eti mama anyị ihe. Mbọ niile anyị gbara ịkwụsị ya ihe ahụ ọ na-eti mama anyị enweghị isi. Mụ na nwanne m Rodelio gbara izu igbu papa anyị mgbe anyị tolitere. M nọ na-eche ma papa anyị ọ̀ ga-emekata ghọọ nna hụrụ ụmụ ya n’anya.

 Iwe na ọnụma juru m obi n’ihi ọnụ papa m na-emekpọ anyị mere ka m hapụ ụlọ mgbe m dị afọ iri na anọ. M bitụrụ n’okporo ámá, malitekwa ịṅụ ìgbó. Ka oge na-aga, m bidoro ịkwọ ụgbọ epeepe, m na-eji ụgbọ epeepe na-ebuga ndị si mba ọzọ bịa ile ebe mmiri si n’okwute na-asọda.

 Mgbe afọ ole na ole gachara, m banyere mahadum dị na Manila. Ma, ebe ọ bụ na m na-alaghachi Pagsanjan ná ngwụcha izu ka m nwee ike ịru ọrụ, anaghị m enwecha ohere ịgụ akwụkwọ. Ụwa gwụrụ m ike, ìgbó m na-aṅụ anaghịzi eme ka m chefuo ụwa m. M malitere ịṅụ ọgwụ ike a na-akpọ methamphetamines, wiiwi, na koken. Ịṅụ ọgwụ ike na ịkwa iko na-agakọ. Ebe ọ bụla m lere anya, ihe m na-ahụ bụ ịda ogbenye, mmegbu, na nhụjuanya. M kpọro ndị ọchịchị asị n’ihi na m chere na ọ bụ ha na-akpata ihe ndị a. M jụrụ Chineke, sị, “Gịnị mere ndụ ji dị otú a?” Ma, o nweghị okpukpe ọ bụla m jụrụ ajụjụ a nweliri ike ịza m ya. M ṅụwakwuru ọgwụ ọjọọ ka m nwee ike ichefu ụwa m.

 N’afọ 1972, ụmụ akwụkwọ nọ na Filipinz mere ngagharị iwe ọtụtụ ugboro n’ihi otú ndị ọchịchị si eme ihe. E nwere otu nke m so mee, bụ́ nke mechara kpata ezigbo ọgba aghara. A nwụchiri ọtụtụ ndị so mee ngagharị iwe a. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, ndị agha tiri iwu mere ka ọgba aghara ahụ kwụsị.

 M malitekwara biwe n’okporo ámá ọzọ. Ma na nke ugbu a, ọ bụ ndị ọchịchị ka m na-agbara ọsọ n’ihi ngagharị iwe ahụ m so mee. Ka m nwee ike inweta ego m ga-eji na-aṅụ ọgwụ ọjọọ m, m malitere zuwa ohi, mechaakwa na-achọtara ụfọdụ ndị aka ji akụ́ na ndị mbịarambịa ndị ha na ha ga na-eme omume rụrụ arụ. E nweghịkwa ihe m ji ndụ m kpọrọ.

 Mgbe ihe ndị a nọ na-eme, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ mama m na nwanne m nwoke nke m tọrọ Baịbụl. Ihe a were papa m iwe, ya akpọọ akwụkwọ ndị ha ji amụ Baịbụl ọkụ. Ma ha siri ọnwụ na-amụ Baịbụl ha na-amụ, e mee ha baptizim, ha aghọọ Ndịàmà Jehova.

 E nwere otu ụbọchị otu Onyeàmà Jehova gwara papa m na Baịbụl kwere nkwa na e nwere mgbe mmegbu na-agaghịzi adị n’ụwa niile. (Abụ Ọma 72:12-14) Nkwa a Baịbụl kwere masịrị papa m nke ukwuu nke na o kpebiri na ya ga-achọpụta n’onwe ya ma ọ̀ bụ eziokwu. Mgbe papa m nọ na-amụ Baịbụl, ọ mụtara na Chineke kwere nkwa na ọ bụghị naanị na a ga-enwe ọchịchị na-anaghị emegbu onye ọ bụla, kama na Chineke nwekwara otú ọ chọrọ ka ndị bụ́ di na-emeso nwunye ha nakwa otú ọ chọrọ ka ndị bụ́ nna si na-emeso ụmụ ha. (Ndị Efesọs 5:28; 6:4) Mgbe obere oge gachara, ya na ụmụnne m niile ghọrọ Ndịàmà Jehova. Ma, ebe ọ bụ na anọghị m nso n’ụlọ, amaghị m gbasara ihe a niile.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M

 N’afọ 1978, m kwagara Ọstrelia. N’agbanyeghị na udo dị n’obodo a, ma bụrụkwa obodo bara ọgaranya, obi anaghị eru m ala. M ka nọkwa na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-aṅụkwa oké mmanya. N’afọ ahụ kwa, Ndịàmà Jehova bịara na nke m. Ihe ha gosiri m na Baịbụl gbasara ụwa nke udo ga-adị na ya masịrị m. Ma, mụ na ha ịmụwa Baịbụl akaghị m obi.

 Obere oge ihe a mechara, m gaghachiri Filipinz nọọ izu ole na ole. Ụmụnne m gwara m na papa anyị aghọọla ezigbo mmadụ, ma m ka na-ewere ya iwe nke na achọdịghị m iji anya ahụ ya.

 Nwanne m nwaanyị nke nta gosiri m na Baịbul ihe mere ahụhụ na mmegbu ji ju ebe niile. O juru m anya na nwatakịrị na-enweghị oké ihe ọ ma nwere ike ịza m ajụjụ m. Tupu mụ alaghachi, papa m nyere m akwụkwọ aha ya bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. a Ọ gwara m, sị: “Ihe ị na-achọ n’uko elu dị n’uko ala. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịchọta ihe ị na-achọ.” Ọ gwara m ka m gbalịa chọta Ndịàmà Jehova ma m laghachi Ọstrelia.

 M mere ihe ahụ papa m gwara m. M chọtara otu Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị nso n’ebe m bi na Brisbane. Mụ na Ndịàmà Jehova mụchiwere Baịbụl anya. Amụma ndị dị na Baịbụl, dị ka nke dị na Daniel isi asaa na Aịzaya isi itoolu, mere ka m mata na ọchịchị Chineke, nke ihe ọjọọ na-agaghị adị na ya, ga-achị anyị n’ọdịnihu. Amụtakwara m na anyị ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. M chọrọ ka ihe m dị Chineke mma. Ma, achọpụtara m na m kwesịrị ịna-ejide onwe m, kwụsị ịṅụ oké mmanya na ọgwụ ọjọọ nakwa ndụ rụrụ arụ m na-ebi. M hapụrụ nwa agbọghọ mụ na ya bi, kwụsịkwa omume ọjọọ ndị ahụ riri m ahụ́. Ka m na-amụtakwu ịtụkwasị Jehova obi, m rịọrọ ya ka o nyere m aka ime mgbanwe ndị ọzọ.

 M ji nwayọọ nwayọọ bịa ghọta na ihe m na-amụ nwere ike ịgbanwe mmadụ n’eziokwu. Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na anyị agbasie mbọ ike, anyị nwere ike iyiri “mmadụ ọhụrụ.” (Ndị Kọlọsị 3:9, 10) Ka m na-agba mbọ ime ihe a Baịbụl kwuru, m bịara ghọta na o nwere ike ịbụ eziokwu na papa anyị agbanweela àgwà ya, otú ahụ m nụrụ. Kama ịnọ na-eburu ya iwe n’obi, m chọrọ ka mụ na ya kpezie. N’ikpeazụ, m gbaghaara papa m ma kwụsị ịkpọ ya asị otú ahụ m kpọrọ ya kemgbe m bụ nwata.

URU NDỊ M RITERELA

 N’oge m bụ nwa okorobịa, m so ndị ọzọ bie ndụ ọjọọ ọtụtụ mgbe. Ihe Baịbụl kwuru mezuru n’isi m. Ndị enyi ọjọọ dufuru m. (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ma, mụ na ụfọdụ Ndịàmà Jehova aghọọla ezigbo enyi. Ha enyekwarala m aka ịbụ ezigbo mmadụ. Ọ bụkwa otu onye n’ime ha, bụ́ ọmarịcha nwaanyị aha ya bụ Loretta, ka m lụrụ. Mụ na ya na-akụziri ndị mmadụ otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka.

Ebe mụ na nwunye m na ndị enyi anyị na-eri nri

 O bi dị m ụtọ na Chineke nyere anyị Baịbụl. O mere ka papa m gbanwee otú m na-echetụghị n’echiche. Ọ ghọọla di hụrụ nwunye ya n’anya, bụrụzie onye Kraịst na-eme udo, nke dịkwa umeala n’obi. Mgbe mụ na ya hụrụ mgbe e mechara m baptizim n’afọ 1987, ọ makụrụ m na nke mbụ ya ná ndụ m.

 Kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ na ise ugbu a, papa m na mama m anọgidela na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị Baịbụl kwuru ga-eme n’ọdịnihu. Papa m ghọrọ nwoke na-agbasi mbọ ike. Ndị mmadụ makwa ya ka onye na-enyere ndị ọzọ aka. M bịara hụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù n’oge ndị ahụ. Obi dịkwa m ụtọ na m bụ nwa ya. Ọ nwụrụ n’afọ 2016. Ma, obi na-adị m ụtọ ma m cheta ya n’ihi na mụ na ya gbanwere ndụ ọjọọ anyị biburu ma ghọzie ezigbo mmadụ, n’ihi na anyị mere ihe anyị mụtara na Baịbụl. Anaghịdị m echeta na e nwere mgbe m kpọrọ ya asị. Obi dịkwa m ụtọ na m matara Nna m nke eluigwe bụ́ Jehova Chineke, onye kwere nkwa na ọ ga-ewepụ ihe niile na-akpata nsogbu n’ezinụlọ n’ebe niile.

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ma a naghịzi ebipụta ya.