Aịzaya 9:1-21
9 Ma, ọchịchịrị ahụ agaghị agbachi otú ọ gbachiri n’oge mbụ mgbe a kparịrị Zebulọn na Naftalaị, taakwa ha ahụhụ.+ Kama, ka oge na-aga, Chineke ga-eme ka e bido ịsọpụrụ ebe ndị a na-akparịbu. Ebe ndị ahụ dị na Galili ndị mba ọzọ bi, n’ụzọ e si aga n’oké osimiri, ná mpaghara Osimiri Jọdan.
2 Ndị nọbu na-agagharị n’ọchịchịrịAhụla ezigbo ìhè.
Ìhè nwukwaaraNdị bi n’obodo gbara oké ọchịchịrị.+
3 I meela ka mba a mụbaa.
I meela ka ha na-aṅụrị sọ ọṅụ.
Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihu gịOtú ndị mmadụ si aṅụrị ọṅụ n’oge a na-ewe ihe ubiNakwa otú ndị mmadụ si aṅụrị ọṅụ ma ha na-eke ihe ha kwatara n’agha.
4 N’ihi na ị kụjisiela osisi ha ji ebu ibu,Kụjisiekwa mkpara na-adị ha n’ubu, ya bụ, mkpara onyeisi ha,Otú i mere ndị Midian n’ụbọchị e meriri ha.+
5 Akpụkpọ ụkwụ ọ bụla ndị agha na-azọ n’ala, nke na-eme ka ala maa jijiji,Nakwa uwe ọ bụla ha tụrụrụ n’ọbara,Ga-ere ọkụ.
6 N’ihi na a mụụrụ anyị otu nwa,+E nyere anyị otu nwa nwoke.
Ọchịchị* ga-adị n’aka ya.*+
A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chi Bụ́ Dike,+ Nna Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi, Onyeisi Udo.
7 Ọchịchị ya ga-eru ebe niile.
Udo agaghịkwa akwụsị ịdị+N’ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya.
A ga-eme ka alaeze ya sie ike+ ma dịgideMalite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi,N’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi,+ na-emekwa ezi omume.+
Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ihe a.
8 Jehova kwuru ihe ga-eme Jekọb.
Ihe ahụ o kwuru mekwara Izrel.+
9 Mmadụ niile ga-amakwa gbasara ya,Ma ndị Ifrem ma ndị bi na Sameria.
Ebe ọ bụ na ha dị mpako, ha ji nganga na-ekwu, sị:
10 “Ụlọ brik adaala.
Ma, anyị ga-eji nkume a wara awa rụọ ụlọ.+
E gbutusịala osisi sịkamọ,Ma, anyị ga-eji osisi sida dochie ha.”
11 Jehova ga-agba nkịtị ka ndị iro Rizin lụso Ifrem agha.
Ọ ga-emekwa ka ndị iro ya mesie ya ike.
12 Ndị Siria ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa, ndị Filistia esi n’ebe ọdịda anyanwụ* bịa.+
Ha ga-emeghe ọnụ ripịa ndị Izrel.+
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+
13 N’ihi na ha alaghachikwurughị Chineke, onye na-eti ha ihe.
Ha achọwaghịkwa Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
14 N’otu ụbọchị, Jehova ga-ebepụIsi na ọdụ nakwa ome na ahịhịa toro eto* n’Izrel.+
15 Ndị agadi na ndị a na-akwanyere ezigbo ùgwù bụ isi.
Ndị amụma, ndị na-ekwu ka e mee ihe na-adịghị mma, bụ ọdụ.+
16 Ndị na-edu ndị a na-edufu ha.
E tigharịakwala ndị e du edu anya.
17 Ọ bụ ya mere na ihe ụmụ okorobịa obodo a agaghị amasị Jehova.
Ọ gaghịkwa emere ụmụ na-enweghị nna* na ụmụ nwaanyị isi mkpe obodo a ebere,N’ihi na ha niile akwụsịla ife Chineke, mewe ihe ọjọọ.+
Ha niile na-ekwukwa okwu nzuzu.
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+
18 N’ihi na ihe ọjọọ agbasaala ebe niileOtú ọkụ si agbasa repịa osisi ogwu na ahịhịa.
Ọkụ a gbawa obere osisi ndị dị n’oké ọhịa,Irighiri ihe ndị si n’ọkụ a ga-eso anwụrụ ọkụ na-akwụgo elu.
19 A mụnyere obodo a ọkụN’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha eweela iwe.
Ọkụ ga-eregbukwa ndị bi n’obodo a.
E nweghị onye ga-emetere ibe ya ebere, ya sọkwa ya ya bụrụ nwanne ya.
20 Mmadụ ga-egbutu ihe dị n’aka nri rie,Ma agụụ ka ga na-agụ ya.
Mmadụ ga-erikwa ihe dị n’aka ekpe,Ma afọ agaghị eju ya.
Onye ọ bụla ga-ata uru ahụ́ dị n’aka ya,
21 Manase ga-eri Ifrem,Ifrem erie Manase.
Ha ga-agbakọ aka rie Juda.+
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+

