Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Oriri Asaa” Ezi Ala ahụ Na-emepụta

“Ihe Oriri Asaa” Ezi Ala ahụ Na-emepụta

“Ihe Oriri Asaa” Ezi Ala ahụ Na-emepụta

BAỊBỤL kwuru na ala Izrel nwere ọtụtụ ugwu na ndagwurugwu, nwee ala dị larịị ndị dị nso n’oké osimiri nakwa ọtụtụ ogbu mmiri na iyi. A na-akọpụta ụdị nri dị iche iche ná mba Izrel n’ihi ụdị ala dị iche iche e nwere na ya. E nwere ọzara n’ebe ndịda, nwee ugwu ndị snoo kpuchiri elu ha n’ebe ugwu. Mgbe Mozis na-akọrọ ụmụ Izrel banyere “ezi ala” nke ha na-aga inweta, ọ sịrị na ọ bụ “ala ọka wit na ọka bali na mkpụrụ vaịn na mkpụrụ fig na mkpụrụ pọmigranet, ala mmanụ oliv na mmanụ aṅụ.” Ihe ndị a bụ ihe oriri asaa ala ahụ na-emepụta.​—Diuterọnọmi 8:7, 8.

Taa, a ka na-akpọ ihe ndị ala Izrel na-emepụta “ihe oriri asaa.” E nweela oge ndị e sere ihe oriri ndị ahụ ná mkpụrụ ego ndị Izrel nakwa na stampụ ndị e ji ezipụ akwụkwọ ozi iji gosi na ala ahụ na-emepụta nri nke ọma. Olee otú e si emepụta ihe oriri ndị ahụ n’oge Baịbụl? Olee ihe ndị Izrel na-eji ha eme? Ka anyị hụ.

“Ọka Wit na Ọka Bali” Ọ bụ eziokwu na a na-agha ọka wit na ọka bali n’oge mgbụsị akwụkwọ, ọka bali na-eji otu ọnwa ebu ọka wit ụzọ acha. N’Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, bụ́ nke a na-eme n’ọnwa Mach ma ọ bụ Eprel, a na-esi n’ọka bali mbụ e gbutere n’ubi weta otu ùkwù ọka bali a ga-eji achụrụ Jehova àjà. Ma n’Ememme Izu ma ọ bụ Ememme Pentikọst, bụ́ nke a na-eme n’ọnwa Mee, a na-eji ogbe achịcha abụọ e ji ọka wit mee achụrụ ya àjà.—Levitikọs 23:10, 11, 15-17.

Ndị ọrụ ugbo n’Izrel na-eji uwe ha yi n’ahụ́ ekporo mkpụrụ wit na bali ha chọrọ ịgha ma jirizie aka kporo ha na-aghasa n’ubi ha. Otú a ka e si eme ya kemgbe ọtụtụ narị afọ, ma ọ dịbeghị anya ha kwụsịrị ime otú ahụ. A ghaa ọka bali n’ubi, ọ dịghị mkpa iji ájá kpochie ya. Ma, ọ bụrụ ọka wit, a na-ekpochi ya ájá. Otú ha si ekpochi ya bụ ime ka anụmanụ e ji akọ ihe gagharịa n’ebe ahụ a ghara ha ma ọ bụkwanụ ha akọgharịa ubi ahụ.

Ọtụtụ ebe na Baịbụl kwukwara banyere ịgha mkpụrụ, ịghọrọ mkpụrụ, ịzọcha mkpụrụ, ịfụcha mkpụrụ, na igwe ya egwe. Ihe a niile bụ ọrụ e ji ike ọkpụkpụ aka arụ. Kwa ụbọchị, a na-anọ n’ụlọ gwee ọka ndị e wetara n’ubi ma jiri ha mee achịcha mmadụ niile n’ezinụlọ ga-ata. Nke a na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Jizọs ji gwa anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka “achịcha anyị ga-eri n’ụbọchị.” (Matiu 6:11, King James Version) N’oge Baịbụl, ihe ndị mmadụ na-erikarị bụ achịcha e ji naanị ntụ ọka wit ma ọ bụ ntụ ọka bali mee.—Aịzaya 55:10.

“Mkpụrụ Vaịn na Mkpụrụ Fig na Mkpụrụ Pọmigranet” Mgbe Mozis duru ụmụ Izrel n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ, ọ gwara ha na e nwere ihe ọma na-eche ha, ya bụ, na ha ga-eri mkpụrụ osisi ndị e nwere n’Ala Nkwa ahụ. Afọ iri anọ tupu mgbe ahụ, mgbe e zipụrụ ndị nledo ka ha gaa n’Ala Nkwa ahụ, gịnị ka ha wetaara ụmụ Izrel bụ́ ndị mara ụlọikwuu n’ala ịkpa iji gosi ha na Ala Nkwa ahụ na-eme nri? Ha wetara “otu alaka osisi vaịn nke mịrị otu ụyọkọ mkpụrụ vaịn.” Ọ dị arọ nke na ‘mmadụ abụọ n’ime ndị ikom ahụ ji okporo osisi buru ya.’ Ha wetakwara mkpụrụ fig na mkpụrụ pọmigranet. Mkpụrụ osisi ahụ tọgburu ụmụ Izrel atọgbu! Nke ahụ gosiri ha na ọtụtụ ihe ọma na-eche ha!—Ọnụ Ọgụgụ 13:20, 23.

Ilekọta ubi vaịn adịghị mfe. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọ na-eme nke ọma, ị ga na-elekọta ya anya mgbe niile, ya bụ, ịkwacha alaka ya, ịgba ya mmiri, na ịghọ mkpụrụ ya. Ubi vaịn na-adịkarị n’akụkụ ugwu, a na-agbakwa ya ogige, dozie ala ya nke ọma, ọ na-enwekwa ụlọ ndò ebe onye nche ga-anọ na-eche ya nche. Ndị Izrel maara ọrụ dị n’ilekọta ubi vaịn, ha makwa ihe ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ elekọtaghị ubi vaịn ya.—Aịzaya 5:1-7.

A na-amalite iji mkpụrụ vaịn eme mmanya n’oge ịghọ mkpụrụ vaịn. A na-awụnye mkpụrụ vaịn n’ime ebe a na-azọcha mkpụrụ vaịn ma zọwa ya ụkwụ ma ọ bụ a wụnye ya n’ígwè e ji apịpụta mmiri ya. A na-esizi mmiri ya ahụ n’ọkụ ka ọ ghọọ ihe dị ka shuga dị mmiri mmiri ma ọ bụkwanụ a hapụ ya ka ọ gbaa ụka ghọọ mmanya. Ala Izrel bụ nnọọ ebe osisi vaịn na-eme nke ọma, bụrụkwa ebe dị mma ịnọ eme mmanya. *

Ọtụtụ ndị na-ebighị n’ebe a na-akụ fig ahụtụbeghị mkpụrụ fig ndụ, naanị nke ha na-ahụ bụ nke kpọrọ nkụ ma ọ bụ nke a pịchara mmiri dị na ya. Ma, fig a ghọrọ ọhụrụ na-enwe mmiri n’ime ya, na-atọkwa ụtọ. A ghọchaa ya chọọ ichekwa ya, a na-amịkpọ ya n’anwụ ma kechie ya n’ihe. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ebe e kwuru okwu “mbadamba achịcha mkpụrụ fig.”—1 Samuel 25:18.

Ọ bụrụ na mmadụ apịwaa mkpụrụ pọmigranet chara acha, ọ ga-ahụ ọtụtụ mkpụrụ n’ime ya. A na-aracha mkpụrụ ndị a aracha ma ọ bụ taa ha ataa, ha na-atọkwa ezigbo ụtọ ma na-edozi ahụ́. Ndị Izrel ji mkpụrụ pọmigranet kpọrọ ihe. Ihe gosiri nke a bụ na n’oge gara aga, a na-akpanye mkpụrụ pọmigranet n’ọnụ ọnụ ala otu n’ime uwe nnukwu onye nchụàjà, a kpụkwara ya n’ogidi ndị dị n’ụlọ nsọ Sọlọmọn wuru.—Ọpụpụ 39:24; 1 Ndị Eze 7:20.

“Mmanụ Oliv na Mmanụ Aṅụ” Na Baịbụl ụfọdụ, e kwuru okwu osisi oliv ma ọ bụ mkpụrụ oliv ihe dị ka ugboro iri isii. A na-eji mkpụrụ oliv esi nri, na-ejikwa ya emepụta mmanụ. Osisi oliv ka dị n’ọtụtụ ebe n’Izrel. (Diuterọnọmi 28:40) N’ọtụtụ obodo n’Izrel, ọnwa Ọktoba ka bụ oge ndị ezinụlọ na-abịakọta aghọ mkpụrụ oliv ha. Otú ha si aghọ ya bụ na ha na-eji ihe na-akụ n’alaka osisi oliv, mkpụrụ ya ana-adapụsị, ha atụtụọ ha. A na-echekwa mkpụrụ oliv, jiri ya na-esi nri ezinụlọ ga-eri n’afọ ma ọ bụkwanụ e buru ya gaa n’ebe ndị obodo na-azọchapụta mmanụ. Ndị ọkachamara n’ihe ndị mgbe ochie egwupụtadịla ebe dị iche iche a na-azọchapụta mmanụ n’oge ochie. Taa, ọ na-atọ ụtọ ikiri ebe mmanụ a na-azọchapụta na-asọba n’ihe. Ezinụlọ nwe ya ga-eji ya sie nri otu afọ ma ọ bụkwanụ ha eree ya eree. E wezụga iji mmanụ oliv esi nri, a na-ete ya ete n’ahụ́, na-ejikwa ya amụ ọkụ.

Mmanụ aṅụ Mozis kwuru okwu ya nwere ike ịbụ nke si n’aṅụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ nke a na-enweta ma e sie mmiri a pịpụtara ná mkpụrụ osisi det ma ọ bụ mkpụrụ vaịn n’ọkụ. A ka na-eji mmanụ a na-enweta ná mkpụrụ osisi ndị ahụ eme ka ihe tọọ ụtọ. Ma, o doro anya na mmanụ aṅụ Baịbụl kwuru okwu ya n’akụkọ Samsịn na nke Jọnatan bụ mmanụ aṅụ si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ọhịa. (Ndị Ikpe 14:8, 9; 1 Samuel 14:27) Na nso nso a, a chọpụtara ebe a na-akpa aṅụ n’obodo Tel Rehov nke dị n’ebe ugwu Izrel. Ebe ahụ a na-akpa aṅụ nwere ihe karịrị ụlọ aṅụ iri atọ. Nke a na-egosi na a na-akpa aṅụ n’Izrel oge ochie, ọbụnadị n’oge Sọlọmọn.

Taa, ọ bụrụ na mmadụ agagharịa n’otu n’ime ahịa ndị dị n’Izrel, bụ́ ebe a na-ere achịcha na mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri dị iche iche, ọ ga-ahụ “ihe oriri asaa” ahụ n’ụdị dị iche iche. Ma, ihe oriri asaa ahụ bụ naanị ihe oriri ole na ole n’ime ọtụtụ ihe oriri ala ahụ na-emepụta. Ụzọ ọgbara ọhụrụ e si akọpụta ihe emeela ka e nwee ike ịkụ mkpụrụ akụ́kụ́ ndị e si mba ọzọ weta. Ụdị ihe oriri dị iche iche jupụtara n’ala Izrel gosiri n’eziokwu na ọ bụ “ezi ala.”—Ọnụ Ọgụgụ 14:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 A na-amịkpọkwa mkpụrụ vaịn amịkpọ.—2 Samuel 6:19.

[Foto dị na peeji nke 11]

ỌKA WIT

[Foto dị na peeji nke 11]

ỌKA BALI

[Foto dị na peeji nke 12]

MKPỤRỤ VAỊN

[Foto dị na peeji nke 12, 13]

MKPỤRỤ FIG

[Foto dị na peeji nke 12]

MKPỤRỤ PỌMIGRANET

[Foto dị na peeji nke 13]

MMANỤ AṄỤ

[Foto dị na peeji nke 13]

MKPỤRỤ OLIV