Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee otú Ndịàmà Jehova si ele ngwakọta ofufe anya?

Olee otú Ndịàmà Jehova si ele ngwakọta ofufe anya?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Olee otú Ndịàmà Jehova si ele ngwakọta ofufe anya?

▪ Akwụkwọ bụ́ World Christian Encyclopedia kwuru na e nwere ihe dị ka “puku okpukpe iri dị iche iche n’ụwa dum.” Ebe ọ bụ na esemokwu na-adị n’etiti ha emebiela ọtụtụ ihe, ọtụtụ ndị okpukpe na-eche na ngwakọta ofufe ga-eme ka udo dị. Ha kweere na ọ ga-eweta udo na ịdị n’otu n’ụwa nke kewasịrị ekewasị.

Baịbụl gbara anyị ume ka anyị dị n’otu. Pọl onyeozi ji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere ahụ́ mmadụ, ebe akụkụ ahụ́ nke ọ bụla na-abụ “nke e jikọrọ ọnụ n’otu, nke e mekwara ka o kwenyekọọ.” (Ndị Efesọs 4:16) N’otu aka ahụ, Pita onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Unu niile, nweenụ otu obi.”—1 Pita 3:8.

E nwere omenala na okpukpe dị iche iche n’oge Ndị Kraịst mbụ. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe Pọl na-ede banyere okpukpe dị iche iche ịgwakọta ọnụ, ọ jụrụ, sị: “Olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere?” Ọ dọziri Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ‘si n’etiti ha pụọ.’ (2 Ndị Kọrịnt 6:15, 17) O doro anya na Pọl na-ekwu na anyị kwesịrị izere ngwakọta ofufe. Olee ihe mere o ji kwuo otú ahụ?

Onyeozi ahụ kọwara na ezi Onye Kraịst na onye na-abụghị ezi Onye Kraịst ifekọ ofufe ọnụ bụ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. (2 Ndị Kọrịnt 6:14) Ọ ga-emebi okwukwe Onye Kraịst ahụ. Nchegbu Pọl yiri nke nna maara na ụfọdụ ụmụaka bi n’ógbè ha na-akpa àgwà ọjọọ. Ebe ọ hụrụ nwa ya n’anya, o ji amamihe gwa ya ndị ya na ha nwere ike igwuri egwu na ndị o kwesịrị izere. Ihe ahụ ọ gwara nwa ya nwere ike ghara ịdị ndị ọzọ mma. Ma, n’ọnọdụ ahụ, nwa ya izere ụmụaka ọjọọ ahụ ga-eme ka ọ ghara ịmụta àgwà ọjọọ. N’otu aka ahụ, Pọl maara na ọ bụrụ na Ndị Kraịst ezere okpukpe ndị ọzọ, ọ ga-eme ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ ha.

Na nke a, Pọl ṅomiri Jizọs. N’agbanyeghị na Jizọs bụ onye kacha akwado ka ụmụ mmadụ dịrị n’udo, o tinyeghị aka ná ngwakọta ofufe. E nwere ọtụtụ òtù okpukpe, dị ka ndị Farisii na ndị Sadusii, n’oge Jizọs na-eje ozi n’ụwa. N’ezie, okpukpe ndị a gbakọrọ aka megide Jizọs, ọbụna kpaa nkata gbuo ya. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha “lezie anya . . . maka ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.”—Matiu 16:12.

Olee maka taa? Iwu ahụ Baịbụl nyere megide ngwakọta ofufe ọ̀ ka dị irè? Ee, ọ ka dị. N’ihi na ngwakọta ofufe agaghị eme ka nkwenkwe okpukpe dị iche iche ghọọ otu dị nnọọ ka itinyekọta mmiri na mmanụ n’ite na-agaghị emeli ka ha gwakọta. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị okpukpe dị iche iche bịakọtara ọnụ ikpe ekpere maka udo, olee chi nke ha na-arịọ arịrịọ? Ọ̀ bụ chi Atọ n’Ime Otu nke ndị Krisendọm? Brama ndị Hindu? Chi Buda? Ka ọ̀ bụ onye ọzọ?

Maịka onye amụma buru amụma na “n’oge ikpeazụ,” ndị si ná mba niile ga-ekwu, sị: “Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.” (Maịka 4:1-4) Nke ahụ ga-eme ka e nwee udo na ịdị n’otu ga-ezu ụwa ọnụ, ọ bụghị n’ihi na e jikọtara okpukpe niile ọnụ, kama ọ bụ n’ihi na mmadụ niile nabatara otu ezi ofufe.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ebe ndị si n’okpukpe ndị bụ́ isi n’ụwa nọ ná nzukọ ngwakọta ofufe n’afọ 2008

[Ebe E Si Nweta Foto]

REUTERS/Andreas Manolis