Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị Echefuola na E Nwere Ihe Bụ́ Mmehie?

Ànyị Echefuola na E Nwere Ihe Bụ́ Mmehie?

Ànyị Echefuola na E Nwere Ihe Bụ́ Mmehie?

N’OGE ndị na-adịbeghị anya, ndị na-aga ụka na-anụkarị ka ụkọchukwu ha nọ n’elu ọlta jiri oké olu na-akatọ ihe a na-akpọ njọ ogbugbu, ndị dị ka agụụ ihe ọjọọ, ịkpọku ndị mmụọ, oké ọchịchọ, ite ime, ife arụsị, anyaụfụ, na ịṅụ iyi ụgha. Mgbe mgbe, ụkọchukwu ahụ na-ekwu ihe ọjọọ mmehie na-ebute ma gbaa ndị na-ege ya ntị ume ka ha chegharịa. Otu onye edemede kwuru, sị: “Ihe ka ukwuu n’okwuchukwu ndị a na-ekwu ugbu a anaghị akatọ mmehie maka na ọ na-agbakasị ndị mmadụ ahụ́, kama ha na-elekwasị anya n’isiokwu ndị ‘ga-atọ ndị mmadụ ụtọ.’”

Ndị na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ achọpụtala otu ihe ahụ. Lee ihe ụfọdụ akwụkwọ akụkọ kwuru:

▪ “A naghịzi ekwute okwu mmehie, nchegharị na mgbapụta, ihe a na-ekwuzi bụ ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, otú onwe ha ga-esi ju ha afọ, na otú ha ga-esi hụ onwe ha n’anya.”—Star Beacon, Ashtabiula, Ohayo.

▪ “O nweghịzi onye weere onwe ya dị ka onye mmehie.”—Newsweek.

▪ “Anyị anaghịzi ajụ ‘Olee ihe Chineke chọrọ n’aka m,’ ihe anyị na-ajụzi bụ, ‘Olee ihe Chineke ga-emere m?’”—Chicago Sun-Times.

N’ụwa taa gwara ọgwa, ebe onye ọ bụla na-eme ihe dị ya mma, ọnụ anaghịzi esi ndị mmadụ ike ịkatọ ndị ọzọ. A na-agwa anyị na ime otú ahụ adịghị mma. O yiri ka mmehie kacha njọ ọ̀ bụ mmadụ ịkatọ ihe onye ọzọ mere. N’ihi ya, ihe ndị mmadụ chere bụ: ‘Ihe i kweere nwere ike ịgaziri gị, ma i kwesịghị ịmanye onye ọzọ ikwere echiche gị. N’oge a, ndị mmadụ na-ahazi ndụ ha dabere n’ihe dị iche iche ha kweere. O nweghị onye ga-asị na ọ bụ naanị ya maara ihe ziri ezi. Ihe ndị ọzọ kweere dịkwa mma otú nke gị dị.’

Ụdị echiche a emeela ka ndị mmadụ gbanwee okwu ha na-ekwu. Ugbu a, o siri ike ịnụ okwu bụ́ “mmehie” n’ọnụ ndị mmadụ mgbe ha na-ekwu ihe dị mkpa. Ọ ghọọrọla ọtụtụ ndị okwu egwuregwu. A naghịzi asị na nwoke na nwaanyị bi n’alụghị alụ “na-eme mmehie”; naanị ihe a na-ekwu bụ na ha “bi.” A naghịzi asị na ha “na-akwa iko”; ihe a na-asị bụ na ha “na-eme enyi.” “Nwoke idina nwoke” na “nwaanyị idina nwaanyị” abụghịzi arụ; a na-asịzi na “ọ bụ otú ha chọrọ ya.”

O doro anya na ihe ndị mmadụ weere dị ka “ihe ziri ezi” ma ọ bụ ihe ha kpọrọ “mmehie” agbanweela. Ma, olee ihe mere otú ndị mmadụ si ele ihe anya ji gbanwee? Mmehie ọ̀ laala? Ò nwekwaranụ ihe ihe i kweere mere?