Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Mụ Onwe M Bụ́ Jehova Chineke Unu Dị Nsọ”

“Mụ Onwe M Bụ́ Jehova Chineke Unu Dị Nsọ”

Bịaruo Chineke Nso

“Mụ Onwe M Bụ́ Jehova Chineke Unu Dị Nsọ”

Levitikọs Isi nke 19

“NSỌ, nsọ, nsọ ka Jehova Chineke . . . dị.” (Mkpughe 4:8) Ihe a Baịbụl kwuru na-egosi na Jehova dị nsọ, nke pụtara na ọ bụ ya kacha dị ọcha. O nweghị ihe jikọrọ Chineke na ime mmehie; o nweghị otú e nwere ike isi jiri mmehie merụọ ya ma ọ bụ mee ka ọ gharazie ịdị nsọ. Nke a ọ̀ pụtara na o nweghị otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè na Chineke a kacha dị nsọ ga-esi dị ná mma? Mbanụ! Ka anyị leba anya n’ihe e dere na Levitikọs isi nke 19, bụ́ nke na-eme nnọọ ka anyị nwee olileanya.

Jehova gwara Mozis, sị: “Gwa nzukọ ụmụ Izrel dum okwu.” Ihe ọzọ o kwuru gbasara onye ọ bụla nọ ná mba ahụ. Olee ihe Mozis ga-agwa ha? Chineke kwuziri, sị: “Sị ha, ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke unu dị nsọ.’” (Amaokwu nke 2) Onye ọ bụla n’Izrel ga-adị nsọ. Okwu bụ́ “unu ga-adị” gosiri na ihe e kwuru abụghị aro, kama na ọ bụ iwu. Chineke ọ̀ na-agwa ha ka ha mee ihe ha na-agaghị emeli?

Buru n’obi na ihe mere Jehova ji kwuo na ya dị nsọ abụghị na ọ chọrọ ka ha dịruo nsọ ka ya, kama, o kwuru ya iji gwa ha ihe mere ha ga-eji dị nsọ. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Jehova anaghị agwa ndị na-efe ya n’Izrel bụ́ ndị na-ezughị okè ka ha dịruo nsọ ka ya. Ha agaghị emeli ya. O nweghị onye a ga-eji tụnyere Jehova, bụ́ “Onye Kasị Nsọ,” n’ịdị nsọ. (Ilu 30:3) N’agbanyeghị nke ahụ, ebe Jehova dị nsọ, ọ na-atụ anya ka ndị na-efe ya ofufe dị nsọ, ya bụ, ka ha dịruo nsọ otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike ịdị. Olee otú ha nwere ike isi dị nsọ?

Mgbe Jehova nyechara ha iwu ka ha dị nsọ, o si n’ọnụ Mozis nye ha iwu ndị metụtara ihe niile ha na-eme ná ndụ. A chọrọ ka onye Izrel ọ bụla rube isi n’iwu ndị dị ka ndị a: ịkwanyere nne na nna na ndị agadi ùgwù kwesịịrị ha (amaokwu nke 332); ichebara ndị ntị chiri, ndị ìsì, na ndị ọzọ nọ n’ahụhụ echiche (amaokwu nke 9, 1014); ịkwụwa aka ọtọ na ịghara ile onye ọ bụla anya n’ihu mgbe ọ na-emeso ndị ọzọ ihe (amaokwu nke 11-13, 1535, 36); ịhụ onye ya na ya na-efe Chineke n’anya dị ka onwe ya. (Amaokwu nke 18) Ọ bụrụ na onye Izrel erube isi n’iwu ndị a na iwu ndị ọzọ e nyere ha, ọ ga-abụ ‘onye dị nsọ nye Chineke ya.’—Ọnụ Ọgụgụ 15:40.

Iwu ahụ Chineke nyere banyere ịdị nsọ na-eme nnọọ ka anyị ghọta echiche na ụzọ Jehova Chineke. Otu ihe anyị mụtara bụ na ihe ga-eme ka anyị na ya dị n’ezigbo mma bụ anyị ịgbalị ike anyị niile ibi ndụ otú iwu ya dị nsọ kwuru. (1 Pita 1:15, 16) Ọ bụrụ na anyị ana-agbaso iwu ndị ahụ, ndụ anyị ga-abụ ụdị ndụ kacha mma mmadụ nwere ike ibi.—Aịzaya 48:17.

Iwu ahụ Jehova nyere ka ndị na-efe ya dị nsọ na-egosikwa na o nwere obi ike n’ebe ha nọ. O nweghị mgbe Jehova ga-achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. (Abụ Ọma 103:13, 14) Ọ maara na anyị, bụ́ ụmụ mmadụ o kere n’oyiyi ya, nwere ike ịmụta ịdị nsọ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo n’ókè ụfọdụ. (Jenesis 1:26) Nke a ọ̀ na-eme ka ị chọọ ịmụtakwu otú i nwere ike isi bịaruo Chineke ahụ dị nsọ, bụ́ Jehova, nso?

[Foto dị na peeji nke 9]

Anyị nwere ike ịmụta ịdị nsọ