Ọnụ Ọgụgụ 15:1-41
-
Iwu ndị na-achị àjà dị iche iche (1-21)
-
Otu iwu ga na-achị nwa afọ na onye mbịarambịa (15, 16)
-
-
Àjà a na-achụ maka mmehie e mere n’amaghị ụma (22-29)
-
Ahụhụ a ga-ata onye kpachaara anya mehie (30, 31)
-
E gburu onye dara iwu Ụbọchị Izu Ike (32-36)
-
Ndị Izrel ga-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe ha (37-41)
15 Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị:
2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu mechara bata n’ala m na-enye unu ka unu biri na ya,+
3 unu achọọ isi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* unu na-achụrụ Jehova,+ ma ọ̀ bụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ̀ bụ àjà mmadụ chọrọ iji mezuo nkwa pụrụ iche o kwere ma ọ̀ bụ onyinye si ya n’obi+ ọ chọrọ inye ma ọ bụ onyinye a na-enye n’oge ememme unu dị iche iche,+
4 onye na-eweta onyinye ya ga-ewetakwara Jehova àjà ọka, ya bụ, otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma,+ nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ.
5 Unu ga-ejikwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya chụọ àjà mmanya mgbe unu na-achụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ bụ mgbe unu ji nwa ebule ọ bụla na-achụ àjà.
6 Ma ọ bụ, mgbe unu na-achụ ebule n’àjà, unu ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin mmanụ chụọ àjà ọka.
7 Unu ga-ewetakwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin mmanya ka ọ bụrụ àjà mmanya. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.
8 “‘Ma ọ bụrụ na unu chọrọ iji oké ehi chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ bụ àjà udo+ ma ọ bụ àjà unu ji emezu nkwa pụrụ iche+ unu kwere,
9 unu ga-ewetakọta oké ehi ahụ na àjà ọka,+ ya bụ, ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara ọkara otu hin mmanụ.
10 Unu ga-ewetakwa ọkara otu hin mmanya ka ọ bụrụ àjà mmanya.+ Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.
11 Ọ bụ ihe a ka a ga-eme mgbe unu na-achụ oké ehi ọ bụla ma ọ bụ ebule ọ bụla ma ọ bụ nwa ebule ọ bụla ma ọ bụ ewu ọ bụla n’àjà.
12 N’agbanyeghị ole unu na-achụ n’àjà, ọ bụ ihe a ka unu ga-eme mgbe unu na-achụ nke ọ bụla n’àjà.
13 Ọ bụ otú a ka nwa afọ Izrel ọ bụla ga-esi na-achụ àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.
14 “‘Ọ bụrụ na onye mbịarambịa nke binyeere unu ma ọ bụ onye bi n’obodo unu kemgbe ọtụtụ afọ chọrọ ịchụ àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova, o kwesịrị ịchụ ya otú unu si achụ ya.+
15 Ọ bụ otu iwu ga na-achị ununwa ndị so n’ọgbakọ a na onye mbịarambịa binyeere unu. Ọ ga-abụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. Unu na onye mbịarambịa ga-abụ otu n’ihu Jehova.+
16 Otu iwu na otu ntụziaka ga na-achị unu na onye mbịarambịa binyeere unu.’”
17 Jehova gwakwara Mosis, sị:
18 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-abata n’ala m na-akpọga unu,
19 unu ewee rie nri* ala ahụ mepụtara,+ unu ga-enye Jehova onyinye.
20 Unu ga-eji ntụ ọka* si ná mkpụrụ mbụ+ unu wetara n’ubi mee achịcha ndị dị okirikiri ma jiri ha nye onyinye. Unu ga-enye ha n’onyinye otú unu si enye ihe si n’ebe unu na-azọcha ọka.
21 Unu ga na-enye Jehova ụfọdụ ntụ ọka si ná mkpụrụ mbụ unu wetara n’ubi ka ọ bụrụ onyinye a na-enye ya n’ọgbọ unu niile.
22 “‘Ọ bụrụ na unu emehie ma ghara ime ihe a niile Jehova nyere Mosis n’iwu,
23 ya bụ, ihe niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye unu n’iwu, malite n’ụbọchị Jehova nyere ha n’iwu ruo n’ọgbọ unu niile,
24 ọ bụrụ na e mere ihe ahụ n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na nzukọ unu amaghị banyere ya, nzukọ unu niile ga-achụ oké ehi n’àjà ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Unu ga-achụkwa àjà ọka na àjà mmanya ha na ya na-agakọ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha,+ jirikwa otu nwa ewu chụọ àjà mmehie.+
25 Onye nchụàjà ga-ekpuchiri nzukọ Izrel niile mmehie ha, a ga-agbagharakwa ha mmehie ha,+ n’ihi na e mere ya n’amaghị ụma, ha wetakwara onyinye ha ka e jiri ha chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, wetakwa àjà mmehie ha n’ihu Jehova n’ihi ihe ha mere n’amaghị ụma.
26 A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị mbịarambịa binyeere ha n’ihi na ha niile mere mmehie ahụ n’amaghị ụma.
27 “‘Ọ bụrụ na onye* ọ bụla emehie n’amaghị ụma, ọ ga-eweta nne ewu na-agafebeghị otu afọ ka ọ bụrụ àjà mmehie.+
28 Onye nchụàjà ga-ekpuchiri onye* ahụ mehiere n’amaghị ụma mmehie ya nke o mere n’ihu Jehova, ka e wee kpuchie mmehie ahụ. A ga-agbagharakwa ya.+
29 Otu iwu ga na-achị ụmụ afọ Izrel na onye mbịarambịa binyeere ha ma a bịa n’ihe gbasara mmehie mmadụ mere n’amaghị ụma.+
30 “‘Ma onye* kpachaara anya mehie,+ ma ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa, ọ na-ekwulu Jehova. A ga-egbu ya.*
31 A ga-egburịrị onye* ahụ maka na o leghaara okwu Jehova anya, mebiekwa iwu ya.+ Mmehie ya ga-adị ya n’isi.’”+
32 Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, ha hụrụ otu nwoke ka ọ na-akpa nkụ n’Ụbọchị Izu Ike.+
33 Ndị hụrụ ka ọ na-akpa nkụ kpọọrọ ya bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ ahụ niile.
34 Ha jichiri ya+ n’ihi na e kwubeghị ihe a ga-eme ya.
35 Jehova wee gwa Mosis, sị: “A ga-egburịrị nwoke ahụ.+ Nzukọ ahụ niile ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ya ma tụọ ya nkume.”+
36 Nzukọ ahụ niile wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ ya ma were nkume tụgbuo ya, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
37 Jehova gwaziri Mosis, sị:
38 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha na ha ga na-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha n’ọgbọ ha niile. Ha ga-adụnyekwa eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ahụ a dụnyere ihe ahụ dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha.+
39 ‘Unu ga-adụnye ihe ahụ dị yọrị yọrị ka unu na-ahụ ya wee na-echeta ihe niile Jehova nyere n’iwu ma na-eme ha.+ Unu esokwala obi unu na anya unu, bụ́ ihe ndị na-eme ka unu kpaa àgwà ka ndị akwụna hapụ m fewe chi ọzọ.+
40 Iwu a ga-eme ka unu na-echeta ihe niile m nyere n’iwu. Unu ga-emekwa ha ma bụrụ ndị dị nsọ n’anya Chineke unu.+
41 Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Na Hibru, “achịcha.”
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Na Hibru, “A ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”