Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Ihe E Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, nke Mere Ka E Nwee Okwukwe

Ihe E Mere Otu Narị Afọ Gara Aga, nke Mere Ka E Nwee Okwukwe

“Mgbe m na-ahụ Nwanna Russell na fim ahụ, ọ dị m ka ọ̀ bụ n’ìhè ka m na-ahụ ya!”—Ihe otu onye kiriri fim “Photo-Drama” n’afọ 1914 kwuru.

IHE a bụ otu narị afọ kemgbe e mepụtara fim bụ́ “Photo-Drama of Creation.” Ihe e kwo mepụta ya bụ ka o mee ka ndị mmadụ kweta na Baịbụl bụ Okwu Chineke. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị enweghị okwukwe na Chineke n’ihi ozizi evolushọn, n’ihi ndị na-akatọ Baịbụl, na n’ihi inyo ihe Baịbụl kwuru enyo. Ma, fim ahụ mere ka a ghọta na ọ bụ Jehova kere ihe niile.

N’oge ahụ, ọ bụ Charles T. Russell na-edu ndú n’etiti Ndị Mmụta Baịbụl. Ọ chọrọ ụzọ kacha mma a ga-esi mee ka ndị mmadụ nụ eziokwu dị na Baịbụl ngwa ngwa. Tupu mgbe ahụ, Ndị Mmụta Baịbụl ejirila akwụkwọ kụziere ndị mmadụ Baịbụl ruo ihe karịrị afọ iri atọ. Ma, ha chọpụtara ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-akụzi Okwu Chineke, ya bụ, fim.

E JI FIM KWUSAA OZI ỌMA

N’ihe dị ka afọ 1891, a malitere imepụta sinima a na-anaghị ekwu okwu na ya. N’afọ 1903, e gosiri fim kwuru gbasara okpukpe n’otu chọọchị dị na Niu Yọk Siti. A ka na-amụ imepụta fim amụ n’afọ 1912 mgbe Nwanna Russell malitere ịkwadebe otú ọ ga-esi emepụta fim bụ́ “Photo-Drama.” Ọ chọpụtara na iji fim akụzi ihe ga-eme ka ọtụtụ ndị nụ eziokwu Baịbụl karịa iji naanị akwụkwọ.

A na-egosikarị fim “Photo-Drama” ná nkebi anọ. Ọ na-ewekwa awa asatọ. E gosiwe fim a, a na-akpọnye okwu ndị dị nkenke si na Baịbụl. Ha niile dị iri itoolu na isii. Onye a na-anụ olu ya na fim ahụ bụ otu onye a ma ama olu ya na-ada ka ogele. E nwere ọtụtụ ebe a na-akpọnye egwú na fim ahụ. Ndị na-akpa aka n’ígwè na-eji gramafon akpọ ma egwú ma okwu ndị ahụ sitere na Baịbụl. Ha na-emekwa ka ụda a na-anụ na-adaba na foto ndị tụrụ àgwà nakwa n’akụkọ Baịbụl ndị a ma ama ha na-egosi.

“Foto ndị e gosiri na fim a bụ ihe ndị mere malite mgbe e kere kpakpando ruo n’oge Kraịst ga-achị ọchịchị dị ebube otu puku afọ.” —F. Stuart Barnes, ọ dị afọ 14 n’afọ 1914

A zụrụ ọtụtụ n’ime slaịd na ihe ndị ọzọ e ji mee fim ahụ azụ. Ọ bụ ndị aka ochie n’ise ihe na Filadelfịa, Niu Yọk, Paris, na Lọndọn ji aka see ihe ndị dị na slaịd nakwa na fim ahụ. Ndị na-ese ihe na Betel sere ọtụtụ n’ime ihe ndị e gosiri na fim ahụ. E nwee slaịd kụwara akụwa, ha na-ewere ọzọ dochie ya. E wepụ  fim ndị nke a zụrụ azụ, e nwere ndị nke ndị na-arụ ọrụ na Betel mere n’ebe a na-akpọ Yọnkas dị na Niu Yọk. Ha gara ebe ahụ mee ka Ebreham, Aịzik, nakwa mmụọ ozi ahụ mere ka Ebreham ghara iji nwa ya chụọ àjà.—Jen. 22:9-12.

Ọtụtụ ụmụnna gbasiri mbọ ike ka ndị mmadụ nwee ike kirie fim “Photo-Drama” ahụ

Onye ya na Nwanna Russell na-arụkọ ọrụ gwara ndị nta akụkọ na isi otú a ekwusa ozi ọma ga-eme ka “ọtụtụ puku mmadụ nwee mmasị n’Akwụkwọ Nsọ karịa ụzọ ọ bụla e sitụrụla mee ya.” Obi ọ̀ dị ndị ndú okpukpe ụtọ maka ụzọ ọhụrụ a e si ezi ndị chọrọ ịmata banyere Chineke ozi ọma? Mba. Ndị ndú okpukpe Krisendọm katọrọ fim ahụ. Ụfọdụ ji ụzọ aghụghọ mee ka ọhaneze ghara ikiri ya, ndị ọzọ ezoghị ezo mee nke ha. N’otu ebe a gbakọtara ikiri fim ahụ, ndị ndú okpukpe gara gwa ndị na-enye ọkụ eletrik, ha ewere ọkụ.

Ụmụnna nwaanyị ndị si n’ọgbakọ ndị dị na Niu Yọk nyere ndị bịara ikiri fim “Photo-Drama” ọtụtụ nde obere akwụkwọ e sere ihe ndị e gosiri na fim ahụ n’anaghị ha ego

E nyere ndị bịara ikiri fim ahụ ihe e sere Jizọs mgbe ọ dị obere ka ha tinye n’uwe ha. Ihe ahụ chetaara onye yi ya na o kwesịrị ịbụ “nwa nke udo”

N’agbanyeghị ihe niile ha mere, ọtụtụ ndị na-agbakọta n’ebe dị iche iche ele fim ahụ n’akwụghị ụgwọ. N’ụbọchị ọ bụla, a na-egosi fim ahụ n’ihe dị ka obodo iri asatọ n’Amerịka. Ọtụtụ ndị bịara kirie ya bụ nke mbụ ha na-ahụ ebe a ‘na-ekwu okwu na fim.’ Na fim ahụ, e nwere foto dị iche iche e gosiri otu otu. E ji ha gosi ebe nwa ọkụkọ ji nwayọọ si n’àkwá pụta nakwa ebe okooko osisi ji nwayọọ nwayọọ gbawaa. Ihe ndị gbasara sayensị e gosiri na fim ahụ gosiri na Jehova nwere amamihe na-enweghị atụ. Dị ka e kwuru ná mbido, mgbe otu onye hụrụ ebe Nwanna Russell na-ekwu okwu mmalite na fim ahụ, o kwuru na ọ dị ya ka ọ̀ bụ n’ìhè ka ọ na-ahụ ya.

IHE ỌHỤRỤ MERENỤ N’OTÚ E SI AKỤZI BAỊBỤL

Ebe mbụ e gosiri fim “Photo-Drama” bụ n’ọmarịcha ebe a a na-anọ eme egwuregwu na Niu Yọk Siti. E gosiri ya n’abalị iri na otu n’ọnwa Jenụwarị afọ 1914. Ọ bụ Òtù Ndị Mmụta Baịbụl nke Mba Niile nwe ebe a n’oge ahụ, ha na-anọkwa na ya arụ ọrụ

E nwere otu nwoke aha ya bụ Tim Dirks. Ọ na-ede akwụkwọ, na-akọkwa gbasara fim. O kwuru na fim “Photo-Drama” bụ fim mbụ wuru ewu ya na-ahụ ndị mepụtara ya mere ka ihe a kpọnyere na gramafon daba n’ihe a na-eme, ihe ndị e sere na ya ana-emegharị ahụ́, e jirikwa ígwè slaịd gosi ya. E mere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ na fim ndị e mepụtara tupu e mee ya, ma o nweghị nke e mere ihe niile ahụ, nke ka nke, fim ndị kwuru gbasara Baịbụl. E nweghịkwa fim ndị bịara kirie ya ruru ka ndị bịara kirie fim “Photo-Drama.” Naanị otu afọ e wepụtachara fim a, ihe dị ka nde mmadụ itoolu kiriri ya na Yurop, Ọstrelia, Niu Ziland nakwa n’Amerịka.

Ebe mbụ e gosiri fim “Photo-Drama” bụ na Niu Yọk Siti. E gosiri ya n’abalị iri na otu n’ọnwa Jenụwarị afọ 1914. Mgbe ọnwa asaa gachara, agha dara. E mechara kpọwa ya Agha Ụwa Mbụ. Ma agha ahụ emeghị ka ndị mmadụ ghara ịna-abịa ekiri fim a. Fim a kasiri ha obi mgbe ha hụrụ ebe ndị e gosiri ihe ọma Alaeze Chineke ga-eme. N’afọ 1914, e nweghị ihe mmadụ ga-eji tụnyere fim “Photo-Drama.”

Fim “Photo-Drama” e gosiri n’Amerịka dị iri abụọ