Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Otú E Si Jiri Okwu Ihu Ọha Kwusaa Ozi Ọma n’Ayaland

Otú E Si Jiri Okwu Ihu Ọha Kwusaa Ozi Ọma n’Ayaland

KA ỤGBỌ mmiri ahụ si n’ọdụ ụgbọ mmiri Belfast kwọpụ, mmadụ ole na ole guzo ọtọ na ya nọ na-ele ugwu ndị ahịhịa ndụ juru mgbe anyanwụ isi ụtụtụ na-acha. Ihe a mere n’ọnwa Mee afọ 1910. Njem a bụ nke ugboro ise otu nwoke aha ya bụ Charles T. Russel na-aga Ayaland. N’ihu Nwanna Russell, e nwere nnukwu ụgbọ mmiri abụọ a ka na-arụ arụ dị n’ebe a na-arụ ụgbọ mmiri. Aha ha bụ Olimpik, nakwa nwanne ya bụ́ Taịtanik, nke mechara kpọkaa n’Oké Osimiri. * A gafee ebe ahụ, e nwere ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl nọ n’ọdụ ụgbọ mmiri na-eche Nwanna Russell.

Ihe dị ka afọ iri abụọ tupu mgbe ahụ, Nwanna Russell chọrọ otú ọ ga-esi kwusaa ozi ọma n’ụwa niile. N’ihi ya, o kpebiri ịga mba dị iche iche na-abụghị Amerịka. Ebe mbụ ọ gara bụ obodo Ayaland, n’ọnwa Julaị afọ 1891. Mgbe ọ nọ n’ụgbọ mmiri, ọ hụrụ ka anyanwụ na-ada mgbe ọ fọrọ obere ka ha ruo ọdụ ụgbọ mmiri dị na Kwinstaụn. Ọ ga-abụkwa na o chetara ihe ndị mụrụ ya kọọrọ ya gbasara obodo ha. Ka ya na ndị ya na ha so nọ na-agafe obere obodo ndị mara ezigbo mma, ha chọpụtara na ebe a bụ ubi ‘ihe a kụrụ na ya charala maka owuwe ihe ubi.’

Nwanna Russell gara Ayaland ugboro asaa. Otú ndị mmadụ si bịa gere okwu ya ná nke mbụ ọ gara mere ka ọtụtụ narị mmadụ, mgbe ụfọdụkwa ọtụtụ puku mmadụ bịa gere okwu ya n’oge ndị ọzọ ọ gara Ayaland. Na njem nke abụọ ọ gara n’ọnwa Mee afọ 1903, a kpọsara okwu ihu o kwuru n’obodo Belfast nakwa na Dọblịn n’akwụkwọ akụkọ. Nwanna Russell kwuru na “ndị bịaranụ gere ya ntị nke ọma” mgbe ọ na-ekwu okwu banyere okwukwe Ebreham nwere na ihe ọma Chineke ga-emere ndị mmadụ n’ọdịnihu.

N’ihi otú ndị Ayaland si nwee mmasị n’ozi ọma, Nwanna Russell gaghachiri Ayaland na nke ugboro atọ ọ gara zie ozi ọma n’obodo ndị dị na Yurop. N’ụtụtụ otu ụbọchị n’ọnwa Eprel afọ 1908, ka ọ na-akpa ụkwụ n’ala n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Belfast, ụmụnna ise bịara kelee ya. Ná mgbede ụbọchị ahụ, ndị bịara gere okwu ihu ọha a kpọsara, dị “narị mmadụ atọ ụbụrụ na-aghọ nkọ.” Isiokwu ya bụ “Otú A Ga-esi Akwatu Ọchịchị Setan.” Otú Nwanna Russell si kọwaa Baịbụl nke ọma mere ka otu nwoke nọ na-agba ihe ndị ọ na-ekwu ụkwụ ghara inwezi ọnụ okwu. N’obodo Dọblịn, otu nwoke aha ya bụ O’Connor gbara mbọ ka o mee ka ihe karịrị otu puku mmadụ nọ na-ege ihe Nwanna Russell nọ na-ekwu megidewe Ndị Mmụta Baịbụl. Nwoke ahụ bụ odeakwụkwọ nke otu òtù ndị na-eto eto. Olee ihe mechara mee ná nnọkọ ahụ?

Ka anyị were uche anyị laa azụ n’ihe merenụ. Otu nwoke nke chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl bịara ka o gere okwu ihu ọha ahụ a kpọsara n’akwụkwọ akụkọ The Irish Times. N’ihi otú ndị mmadụ si ju ebe niile, o siiri ya ike inweta oche. O gere ntị nke ọma mgbe otu nwoke yi kootu ojii nọ na-ekwu okwu. Nwoke a nwere isi awọ, afọ ọnụ rujukwara ya ọnụ.  Ka ọ nọ na-ekwu okwu ya, ya ana-agagharị n’elu ikpo okwu, na-emegharị aka ya, ya gụọ Baịbụl, ya akọwaa, nwoke ahụ ana-aghọta eziokwu Baịbụl. N’agbanyeghị na e nweghị ígwè okwu, ndị niile nọ na-ege ntị nụrụ ihe o kwuru nke ọma ruo otu awa na ọkara. Mgbe o ruru oge ndị mmadụ malitere ịjụ ajụjụ, Maazi O’Connor na ndị enyi ya malitere ịgba ihe nwoke ahụ na-ekwu ụkwụ, ma nwoke ahụ ji Baịbụl mee ka eziokwu Baịbụl gbaa ka ọnwa. Nke a mere ka ndị nọ ebe ahụ kụọ ezigbo aka. Mgbe e mechara, nwoke ahụ nwere mmasị bịakwutere ụmụnna anyị ka ha kụzikwuoro ya ihe. Ndị nọ mgbe ihe niile a mere kwuru na ọtụtụ ndị si otú a mụta eziokwu.

N’ọnwa Mee afọ 1909, Nwanna Russell kpọ Nwanna Huntsinger, bụ́ odeakwụkwọ, si Niu Yọk banye ụgbọ mmiri aha ya bụ Mọritenịa gawa Ayaland na nke ugboro anọ ọ na-aga ebe ahụ. Ihe mere Nwanna Russell ji kpọrọ ya bụ ka o jiri oge ahụ na-agwa ya ihe ndị ga-agba n’Ụlọ Nche ka o detuo ha. Narị mmadụ anọ na iri ise bịara gere okwu ihu ọha Nwanna Russell kwuru na Belfas, ihe dị ka otu narị mmadụ n’ime ha guzo ọtọ n’ihi na ụlọ abaghị ha.

Mgbe Nwanna C. T. Russell nọ n’ụgbọ mmiri Lusitenịa

Ihe ndị mere n’oge ndị ahụ Nwanna Russell kwuru okwu ihu ọha n’Ayaland mekwara na nke ugboro ise ya anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a. Mgbe o kwuchara okwu ya, o ji Baịbụl zaa otu ọkà mmụta n’ihe banyere okpukpe, nke ya na Maazi O’Connor so bịa, ajụjụ ya nke ọma. Ihe a tọrọ ndị nọ ebe ahụ ụtọ. N’echi ya, Nwanna Russell na onye ya na ya so banyere ụgbọ mmiri na-agba oké ọsọ gawa Livapul. Mgbe ha ruru, ha banyere ụgbọ mmiri a ma ama aha ya bụ Lusitenịa gawa Niu Yọk. *

Okwu ihu ọha a kpọsara n’akwụkwọ akụkọ The Irish Times, n’abalị iri abụọ n’ọnwa Mee afọ 1910

A kpọsakwara okwu ihu ọha Nwanna Russell kwuru na nke ugboro isii na nke asaa ọ gara Ayaland n’afọ 1911. N’ọnwa Eprel afọ ahụ, Ndị Mmụta Baịbụl iri abụọ chọtara ebe a nọ gwa puku mmadụ abụọ okwu na Belfast. Isiokwu ya bụ “Ihe Na-eme Mmadụ ma Ọ Nwụọ.” Ná nke e kwuru n’obodo Dọblịn, Maazi O’Connor kpọkwa onye ọkà mmụta okpukpe ọzọ bịa, bụ́ onye nọ na-ajụ ajụjụ. Ma otú e si jiri Baịbụl zaa ya ajụjụ ya nke ọma mere ka ndị nọ ebe ahụ kụọ ezigbo aka. Nwanna Russell gakwara n’obodo ndị ọzọ kwuo okwu, ọtụtụ mmadụ bịakwara. Maazi O’Connor na otu narị mmadụ gbalịrị ka ha kwụsị nnọkọ e nwere na Dọblịn, ma ndị mmadụ nọgidere na-ege Nwanna Russell ntị.

Ọ bụ eziokwu na Nwanna Russell kacha ndị ọzọ kwuo okwu ihu ọha n’oge ndị ahụ, ma ọ ghọtara na “o nweghị onye a ga-asị ma ọ nọghị ya,” ihe agaghị aga aga, n’ihi na “ọrụ a abụghị ọrụ mmadụ; ọ bụ ọrụ Chineke.” Okwu ihu ọha a kpọsara mere ka e nwee ohere ndị magburu onwe ha iji kụziere ndị mmadụ eziokwu Baịbụl. Olee uru nke a barala? O mere ka e kwusaa ozi ọma ebe niile n’Ayaland, meekwa ka e hiwe ọgbakọ n’ọtụtụ obodo ndị dị n’Ayaland.—Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Briten.

^ para. 3 Ụgbọ mmiri Taịtanik kpọkara n’ime afọ abụọ.

^ para. 9 Ụgbọ mmiri Lusitenịa kpọkara n’ụsọ oké osimiri Ayaland n’ọnwa Mee afọ 1915.