Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Ka Ụmụ Gị Nwee Mmasị Ịgụ Ihe na Ịmụ Ihe

Mee Ka Ụmụ Gị Nwee Mmasị Ịgụ Ihe na Ịmụ Ihe

Mee Ka Ụmụ Gị Nwee Mmasị Ịgụ Ihe na Ịmụ Ihe

ỊGBA mbọ na-akụziri ụmụ gị otú ha ga-esi na-agụ ihe nakwa otú ha ga-esi na-amụ ihe bụ otu n’ime ụzọ kacha mkpa i nwere ike isi mee ka ihe dịrị ha mma n’ọdịnihu. Ịgụ ihe na ịmụ ihe na-emekwa ka mmadụ na-enwe nnukwu ọṅụ. Ihe kacha eme ndị ụfọdụ obi ụtọ bụ ma ha cheta otú ndị mụrụ ha si agụrụ ha ihe mgbe ha bụ ụmụaka. Otú ịgụ ihe si atọ ụtọ ka uru a na-erite na ya sikwa atọ. Nke a dị ndị ohu Chineke ezigbo mkpa karịchaa n’ihi na ịmụ Baịbụl na-eme ka ha na Jehova dịkwuo ná mma. Otu nna bụ́ Onye Kraịst sịrị: “Ihe ndị kacha anyị mkpa bụ ihe ndị metụtara ịgụ ihe na ịmụ ihe.”

Ụmụ gị na Chineke nwere ike ịdịkwu ná mma ma ha na-amụsi ihe ike. (Ọma 1:1-3, 6) Baịbụl na-egosi anyị na anyị nwere ike inweta nnukwu ngọzi ma anyị mara agụ ihe, ọ bụ ezie na ihe a ga-eji zọpụta mmadụ abụghị na onye ahụ ma agụ ihe. Dị ka ihe atụ, Mkpughe 1:3 sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-agụpụta na ndị na-anụ okwu amụma nke a.” Ihe ọzọ bụ na mmadụ itinye uche n’ihe ọ na-agụ, bụ́ otu n’ime ihe dị mkpa mgbe anyị na-amụ ihe, bara uru. Pọl onyeozi mere ka nke a doo anya mgbe o nyere Timoti ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ. Ọ sịrị: “Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha.” N’ihi gịnị? “Ka ọganihu gị wee pụta ìhè.”—1 Tim. 4:15.

Na mmadụ ma otú e si agụ ihe na otú e si amụ ihe apụtaghị na ha ga-abara ya uru. Ọtụtụ ndị bụ́ ndị ma otú e si agụ ihe na otú e si amụ ihe anaghị agụ ihe ma ọ bụ na-amụ ihe; kama ime nke a, ha na-eme ihe ndị na-adịchaghị mkpa. N’ihi ya, olee otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ka ịgụ ihe na ịmụ ihe na-amasị ụmụ ha?

Hụnụ Ha n’Anya, Na-esetịpụkwaranụ Ha Ihe Nlereanya

Ịmụ ihe na-atọ ụmụaka ụtọ ma e jiri ịhụnanya na-akụziri ha ya. Owen na Claudia, bụ́ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst, kwuru ihe ụmụ abụọ ha mụrụ na-eme, sị: “Ha na-atụsi anya ike ka oge anyị ji amụ ihe ruwe eruwe n’ihi na ọ na-abụrụ ha oge pụrụ iche. Ha na-atụsara ahụ́, ahụ́ na-erukwa ha ala. Ha lere nke a anya ka otu n’ime ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya.” Otú e si jiri ịhụnanya akụziri ụmụaka ihe n’ezinụlọ ga-eme ka ha nọgide na-enwe mmasị n’ịmụ ihe ọbụna mgbe ha ruru afọ iri na ụma, bụ́ oge ha na-enwe ọtụtụ nsogbu. Ụmụ Owen na Claudia bụ ndị ọsụ ụzọ ugbu a, ha ka na-erite uru n’otú nne ha na nna ha si kụziere ha ka ha nwee mmasị ịgụ ihe na ịmụ ihe.

Ezigbo ihe nke na-egosi na ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya bụ isetịpụrụ ha ezigbo ihe nlereanya. Ụmụaka ndị na-ahụkarị ka ndị mụrụ ha na-agụ akwụkwọ, na-amụkwa ihe, na-agbalịkarị ka ha na-eme ka ha. Ma, olee otú gị bụ́ nne ma ọ bụ nna nwere ike isi setịpụrụ ụmụ gị ezi ihe nlereanya ma ọ bụrụ na ịgụ ihe na-esiri gị ike? Nke a nwere ike ịpụta na ị ga na-ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ ma ọ bụkwanụ gbanwee otú i si ele ịgụ ihe anya. (Rom 2:21) Ọ bụrụ na ị na-agụ akwụkwọ kwa ụbọchị, ụmụ gị ga-eṅomi gị. Mbọ ị na-agba karịchaa n’ịgụ Baịbụl, n’ịkwadebe ọmụmụ ihe nakwa n’inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ga-eme ka ụmụ gị mara na ihe ndị a dị mkpa.

Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị nwee mmasị ịgụ ihe, i kwesịrị iji ịhụnanya na-akụziri ha nke a, kwesịkwa inwe mmasị ịgụ ihe. Ma, olee ihe ndị i nwere ike ime iji mee ka ha nwee mmasị ịgụ ihe?

Nyere Ụmụaka Aka Ka Ha Nwee Mmasị Ịgụ Ihe

Olee ihe ndị i nwere ike ime ka ụmụ gị wee malite inwe mmasị ịgụ ihe? Hụ na ha nwere akwụkwọ ha ga na-agụ malite n’oge ha ka dị obere. Otu okenye, bụ́ onye ndị mụrụ ya mere ka o nwee mmasị ịgụ ihe kwuru, sị: “Hụ na ụmụ gị nwere akwụkwọ ha ga na-agụ. Nke a ga-eme ka ịgụ akwụkwọ mara ha ahụ́.” Ọ bụ ya mere o ji amasị ọtụtụ ụmụaka ịgụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ndị dị ka Mụta Ihe Site nAka Onye Ozizi Ukwu Ahụ na Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. Ị na-eme ka ụmụ gị mara “ihe ime mmụọ na okwu ime mmụọ” ma ọ bụrụ na gị na ha na-agụkọ akwụkwọ ndị a ọnụ.—1 Kọr. 2:13.

Na-agụpụta ihe agụpụta mgbe ọ bụla gị na ha na-agụ ihe. Mee ka ịgụrụ ụmụ gị ihe kwa ụbọchị mara gị ahụ́. Nke a ga-akụziri ha otú e si akpọpụta okwu, meekwa ka ịgụ ihe mara ha ahụ́. Otú i si agụ ihe dịkwa mkpa. Ọ bụrụ na ịgụ ihe na-amasị gị, ọ ga na-amasịkwa ụmụ gị. Ụmụ gị nwere ike ịgwa gị ka ị gụọrọ ha otu akụkọ ugboro ugboro. Na-agụrụ ha ya! Ka oge na-aga, ha ga-agwa gị ka ị gụọrọ ha akụkọ ndị ọzọ. Ma, lezie anya ka ị ghara ịmanye ha ịgụrụ gị ihe. Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya na nke a site n’ịkụziri ndị na-ege ya ntị ihe “ruo n’ókè ha nwere ike ige ntị.” (Mak 4:33) Ọ bụrụ na ị naghị amanye ụmụ gị ka ha na-agụrụ gị ihe, ha ga-eji obi ụtọ na-atụ anya oge ọzọ unu ga-agụ ihe. Nke a ga-emekwa ka ọ dịrị gị mfe ime ka ha na-enwe mmasị ịgụ ihe.

Hụ na ụmụ gị na-etinye ọnụ, kwurịtakwanụ ihe unu gụrụ. Obi ga-adị gị ụtọ na n’oge na-adịghị anya ụmụ gị ga-ama ọtụtụ mkpụrụ okwu, mara otú e si akpọ ha, ghọtakwa ihe ha pụtara. Ụmụ gị ga na-enwe ọganihu ma gị na ha na-ekwurịta ihe unu gụrụ. Otu akwụkwọ nke kọwara otú e nwere ike isi nyere ụmụaka aka ka ha na-agụ ihe nke ọma kwuru na mkparịta ụka na-eme ka ụmụaka ‘mara mkpụrụ okwu ndị ha kwesịrị ịmata mgbe ha na-agụ ihe ma ghọta ha.’ Akwụkwọ ahụ kwukwara na ‘mkparịta ụka na-eme ka ụmụaka mara ka e si agụ ihe nke ọma. Ọ ga-akacha mma ma ọ bụrụ mkparịta ụka bara uru.’

Gwa ụmụ gị ka ha na-agụ ihe ka ị na-egere egere, gwakwa ha ka ha na-ajụ gị ajụjụ. I nwere ike ịjụ ha ajụjụ n’onwe gị, gwakwa ha ihe ndị nwere ike ịbụ azịza ajụjụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, ọ ga-eme ka ụmụaka mata na akwụkwọ na-enyere mmadụ aka ịmụta ihe nakwa na ihe ọ bụla ha na-agụ nwere ihe ọ pụtara. Nke a na-enye aka, karịchaa, mgbe unu na-agụ Okwu Chineke, bụ́ akwụkwọ kacha akwụkwọ niile baa uru.—Hib. 4:12.

Echefukwala na ịgụ ihe abụghị obere ọrụ. Tupu mmadụ amalite ịgụ ihe nke ọma, o kwesịrị iwepụta oge na-agụchi ihe anya. * Ya mere, gbaa ụmụaka nwere mmasị ịgụ ihe ume site n’ịja ha mma. Ọ bụrụ na ị na-aja ụmụ gị mma, obi ga na-adị ha ụtọ ịgụ ihe.

Ọ Bara Uru, Na-atọkwa Ụtọ

Ịkụziri ụmụ gị otú e si amụ ihe ga-eme ka ha ghọta na ịgụ ihe dị mkpa. Ịmụ ihe gụnyere mmadụ ịmata nke bụ́ eziokwu banyere ihe dị iche iche, nakwa ịghọta ihe jikọrọ ha. Onye na-amụ ihe aghaghị ịchịkọta ihe ọ na-amụ, cheta ya, ma mee ya eme. Ọ bụrụ na nwatakịrị amụta otú e si amụ ihe, ghọtakwa otú ọ ga-esi nyere ya aka ná ndụ, ọ ga-achọpụta na ịmụ ihe bara uru, na-atọkwa ụtọ.—Ekli. 10:10.

Mee ka ha ghọta ihe ndị ga-enyere ha aka ịmụ ihe nke ọma. Ofufe Ezinụlọ, ihe mmụta dịịrị ụbọchị na ọmụmụ ihe ndị ọzọ unu na-enwe ga-eme ka i nwee ike ịkụziri ụmụ gị otú e si amụ ihe. Ọ bụrụ na ha anọọ jụụ mụọ otu isiokwu ruo nwa oge, ha ga-amụta otú ha ga-esi mee ka uche ha dịrị n’ihe a na-amụ, bụ́ ihe na-enyere mmadụ ezigbo aka ịmụta ihe. I nwekwara ike ịgba nwa gị nwoke ume ka ọ gwa gị otú ihe ọ mụtara ugbu a si gbasa ihe ọ ma mbụ. Nke a ga-akụziri ya otú ọ ga-esi amata ihe dị iche n’otu ihe na ibe ya. I nwekwara ike ịgwa nwa gị nwaanyị ka o jiri okwu ole na ole kọwaa ihe ọ gụrụ. Nke a ga-enyere ya aka ịghọta ihe ọ gụrụ ma cheta ya. Ihe ọzọ i nwere ike ịkụziri ha nke ga-enyere ha aka icheta ihe ha gụrụ, bụ ịtụleghachi ihe, ya bụ, ikwughachi isi ihe ndị dị n’isiokwu ha gụrụ. I nwekwara ike ịkụziri ụmụ gị otú ha ga-esi na-edetu isi ihe ndị dị n’ihe unu na-amụ n’ezinụlọ ma ọ bụkwanụ isi ihe ndị a na-amụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ. N’eziokwu, nke a nwere ike inye aka mee ka uche ha dịrị n’ihe a na-amụ. Iji ụzọ ndị a dị mfe akụziri ụmụaka ihe ga-eme ka ọmụmụ ihe ahụ na-atọ gị na ha ụtọ ma baara unu uru.

Nweenụ ebe dị mma unu ga-anọ na-amụ ihe. Ọ ga-adị mfe uche ụmụ unu ịdị n’ihe unu na-amụ ma ọ bụrụ na ebe unu na-anọ amụ ihe dị jụụ, ikuku ana-abata ya, ìhè adịrịkwa na ya. Ndị nne na nna kwesịrị iji ọmụmụ ihe kpọrọ ihe. Otu nne kwuru, sị: “Iwepụta oge a ga-eji na-agụ ihe ma na-amụchi ihe anya dị ezigbo mkpa. Ime otú a ga-eme ka ndụ ụmụ gị kpakọọ ọnụ. Ha ga-aghọta ihe ha kwesịrị ime nakwa mgbe ha kwesịrị ime ya.” Ọtụtụ ndị nne na nna anaghị ekwe ka ụmụ ha na-eme ihe ọzọ n’oge ha ji amụ ihe. Otu nwoke kwuru na nke a bụ ụzọ bụ́ isi a ga-esi na-akụziri ụmụaka otú ha ga-esi na-amụ ihe nke ọma.

Mee ka ha mata uru ịmụ ihe bara. N’ikpeazụ, nyere ụmụ gị aka ka ha mata otú ha ga-esi na-eme ihe ha mụtara. Ihe bụ́ isi mekwaranụ e ji amụ ihe bụ ka a na-eme ihe a mụtara. Otu nwanna bụ́ nwa okorobịa kwuru, sị: “Ịmụ ihe na-esiri m ike ma ọ bụrụ na amaghị m uru ọ ga-abara m. Ma, ọ bụrụ na ọ ga-abara m uru, m na-agbalịsi ike ịghọta ya.” Ọ bụrụ na ndị na-eto eto achọpụta na ọmụmụ ihe bara ezigbo uru, ha agaghị eji ya na-egwu egwu. Ha ga na-enwe mmasị ịmụ ihe otú ha si enwe mmasị ịgụ ihe.

Uru Kachanụ

E nwere ọtụtụ uru dị n’ịkụziri ụmụ gị otú ha ga-esi na-enwe mmasị ịgụ ihe. Ụfọdụ uru ịmụ ihe bara bụ na ọ na-eme ka mmadụ na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụkwanụ n’ebe ọ na-arụ ọrụ, meekwa ka ya na ndị ọzọ na-adị ná mma. Ọ na-emekwa ka onye ahụ mara otú ọ ga-esi na-eme ihe n’ụwa a anyị bi na ya, meekwa ka ụmụaka na ndị mụrụ ha dịkwuo ná mma. Uru ọzọ bụ na ịgụ ihe na ịmụ ihe na-atọ ụtọ.

Nke ka nke bụ na ọ bụrụ na ụmụ gị nwere mmasị ịmụ ihe, o nwere ike inyere ha aka ife Jehova. Inwe mmasị ịmụ ihe bụ isi ihe ga-eme ka ha ghọta “ihe bụ́ ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” nke eziokwu Baịbụl. (Efe. 3:18) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ọtụtụ ihe ha ga-akụziri ụmụ ha. Ka ndị nne na nna na-ewepụta oge na-akụziri ụmụ ha ihe ma na-eme ike ha niile ka ụmụ ha wee na-eme nke ọma ná ndụ, ha na-enwe olileanya na ụmụ ha ga-emecha kpebie ife Jehova. Ọ bụrụ na ị na-akụziri ụmụ gị otú ha ga-esi na-amụ ihe nke ọma, ọ ga-eme ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ, meekwa ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ya mere, ka ị na-agba mbọ ime ka ụmụ gị na-enwe mmasị ịgụ ihe na ịmụ ihe, kpesie ekpere ike ka Jehova nyere gị aka ka i nwee ihe ịga nke ọma.—Ilu 22:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ịgụ ihe na ịmụ ihe na-esiri ụmụaka ụbụrụ ha na-anaghị aghọ nkọ ike. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ha aka, gụọ Teta! (Bekee) nke Febụwarị 22, 1997, peeji nke 3-10.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]

Ịgụ ihe . . .

• Hụ na ụmụ gị nwere akwụkwọ ha ga na-agụ

• Na-agụpụta ihe agụpụta

• Hụ na ụmụ gị na-etinye ọnụ

• Na-ekwurịtanụ ihe unu gụrụ

• Gwa ụmụ gị ka ha na-agụ ihe ka ị na-egere egere

• Gwa ụmụ gị ka ha na-ajụ gị ajụjụ

Ịmụ ihe . . .

• Setịpụrụ ụmụ gị ihe nlereanya

• Kụziere ụmụ gị otú . . .

○ ha ga-esi eme ka uche ha dịrị n’ihe a na-amụ

○ ha ga-esi amata ihe dị iche n’otu ihe na ibe ya

○ ha ga-esi akọwa ihe ha mụtara

○ ha ga-esi atụleghachi ihe ha mụrụ

○ ha ga-esi edetu isi ihe a na-amụ

• Nweenụ ebe dị mma unu ga-anọ na-amụ ihe

• Mee ka ha mata uru ịmụ ihe bara