Ekliziastis 10:1-20
10 Otú ahụ ijiji nwụrụ anwụ si emebi mmanụ na-esi ísì ọma, ya esiwezie ísì ọjọọ, ka obere nzuzu mmadụ zuzuru si eme ka e werezie ya ka onye na-amaghị ihe, meekwa ka a kwụsị ịkwanyere ya ùgwù.+
2 Obi onye ma ihe na-eduga ya n’ezigbo ụzọ,* ma obi onye nzuzu na-eduga ya n’ụzọ ọjọọ.*+
3 Ebe ọ sọkwara onye nzuzu ya gaa, ọ naghị enwe uche.+ Ọ na-emekwa ka mmadụ niile mata na ọ bụ onye nzuzu.+
4 Ọ bụrụ na onye na-achị achị ewesa gị iwe ọkụ, esila n’ebe ị nọ pụọ,+ n’ihi na ịnọ nwayọọ na-eme ka mmehie e mere ghara ịdị oké njọ.+
5 E nwere ihe na-ewute ewute m hụrụla n’ụwa,* ihe na-adịghị mma ndị na-achị achị na-eme:+
6 A na-ebugo ndị nzuzu n’ọkwá, ma a na-ahapụ ndị ọgaranya* n’ọkwá dị ala.
7 Ahụla m ka ndị ohu nọ n’elu ịnyịnya, ma ndị isi ejiri ụkwụ na-aga ka ndị ohu.+
8 Onye na-egwu olulu nwere ike ịdaba n’ime ya.+ Agwọ nwekwara ike ịta onye na-akụpu mgbidi e ji nkume rụọ.
9 Nkume nwere ike imerụ onye na-awa nkume ahụ́. Nkụ nwekwara ike imerụ onye na-awa nkụ ahụ́.*
10 Ọ bụrụ na ngwá ọrụ anyụọ nkọ, ma onye ji ya arụ ọrụ amụghị ya, ọ ga-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Ma, amamihe na-enyere mmadụ aka ka ihe gaziere ya.
11 Ọ bụrụ na agwọ ataala mmadụ tupu e jiri ọgwụ rata agwọ ahụ, e nweghịzi uru onye ji ọgwụ arata agwọ bara.
12 Ihe onye ma ihe ji ọnụ ya ekwu na-eme ka ihe ya masị ndị mmadụ,+ ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya ala onwe ya n’iyi.+
13 Okwu mbụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ okwu nzuzu,+ okwu ikpeazụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ okwu onye ara, nke na-akpata nsogbu.
14 Okwu na-adị onye nzuzu n’ọnụ mgbe niile.+
Mmadụ anaghị ama ihe ga-emenụ. Ònye ga-akọrọ ya ihe ga-eme mgbe ọ na-anọghịzi?+
15 Ọrụ onye nzuzu na-arụsi ike na-eme ka ike gwụ ya, n’ihi na ọ maghịdị otú ọ ga-esi achọta ụzọ ọ ga-esi aga n’obodo.
16 Ọ bụrụ na eze obodo bụ nwatakịrị,+ ndị isi obodo amalitekwa n’isi ụtụtụ na-eri oriri, nnukwu nsogbu ga-adị n’obodo ahụ.
17 Ndị obodo na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na eze ha bụ nwa ndị a ma ama, ndị isi obodo ana-erikwa nri n’oge kwesịrị ekwesị ka ha wee nweta ume, ọ bụghị ka ha ṅụfee mmanya ókè.+
18 Ọ bụrụ na mmadụ dị umengwụ, osisi ndị e ji kụọ elu ụlọ ya ga-adakasị, ụlọ ya ga na-ehikwa mmiri maka na ọ na-anọ nkịtị.+
19 Nri na-eme ka mmadụ na-achị ọchị, mmanya na-emekwa ka ndụ na-atọ mmadụ ụtọ.+ Ma ego na-egbo mkpa niile.+
20 Akpọla eze iyi,* akpọdịla ya iyi n’obi gị.*+ Anọkwala n’ime ụlọ gị kpọọ ọgaranya iyi; n’ihi na nnụnụ nwere ike ime ka a nụ ihe i kwuru, anụ na-efe efe nwekwara ike ikwughachi ihe i kwuru.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “dị n’aka nri ya.”
^ Na Hibru, “dị n’aka ekpe ya.”
^ Na Hibru, “n’okpuru anyanwụ.”
^ Ma ọ bụ “ndị ruru eru.”
^ O nwere ike ịbụ, “Onye na-awa nkụ kwesịrị ịkpachapụ anya.”
^ Ma ọ bụ “Abụla eze ọnụ.”
^ O nwere ike ịbụ, “n’elu àkwà gị.”