Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:

• Gịnị mere o ji dị mkpa ka Mesaya nwụọ?

Ọnwụ Jizọs gosiri na mmadụ zuru okè nwere ike ịnọgide na-asọpụrụ Chineke n’agbanyeghị ule ndị siri ike bịaara onye ahụ. Jizọs kwụkwara ụgwọ mmehie nke ụmụ Adam ketara ma mee ka ha nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.—12/15, peeji nke 22-23.

• Gịnị nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ ghara ịṅụbiga mmanya ókè?

Ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl nwere ike inye aka. Onye ahụ kwesịrị ịmụta ijide onwe ya ma nọgide n’ihe o kpebiri, kwesịkwa ịhọrọ ezigbo ndị enyi. Onye kpebiri ịṅụ mmanya na-aba n’anya kwesịrị ikpebi ole ọ ga-aṅụru ma mụta ịjụ ịṅụtụkwu.—1/1, peeji nke 7-9.

• Olee otú gị na ụmụaka ga-esi na-akparịta ụka nke ọma?

Mkparịta ụka nke dị mma karịrị ịgwa ụmụ gị ihe ha ga na-eme. I kwesịkwara ịjụ ha ajụjụ ma nwee ndidi ka i wee nụ ihe ha ga-aza gị. Ọtụtụ ndị achọpụtala na oge nri bụ oge dị mma iji nwee mkparịta ụka bara uru.—1/15, peeji nke 18-19.

• Ebe ọ bụ na Jehova zuru okè, oleezi otú o si enwe mwute?

Mgbe ụfọdụ, Chineke na-agbanwe otú o si emeso ndị mmadụ ihe. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị otu ugboro, ụmụ Izrel hapụrụ Jehova ma fewe chi ọzọ. Nke a mere ka Jehova kwụsị ichebe ha. Ma, mgbe ihe ha mere wutere ha, ha arịọ Chineke maka enyemaka, ya agbanwee obi ya, ma ọ bụ, ya ‘ewute’ ya. (Ikpe 2:18)—2/1, peeji nke 21.

• Olee ihe nwere ike ime ka e chewe echiche imegharị mmadụ baptizim?

E nwere ike ichewe echiche imegharị mmadụ baptizim ma ọ bụrụ na onye ahụ ka na-eme mmehie ná nzuzo ruo ụbọchị ahụ e mere ya baptizim, bụ́ nke nwere ike ime ka a chụọ ya n’ọgbakọ.—2/15, peeji nke 22.

• Olee ihe atọ na-abụghị eziokwu, bụ́ ndị ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ya mere mmadụ ekwesịghị ịkwụwa aka ọtọ?

Ụfọdụ chere na o nweghị ihe o mere ma mmadụ zuo ohi n’ihi na ọ dara ogbenye. Ndị ọzọ na-egosi na ọ dịghị ihe o mere site n’ịsị “Onye ọ bụla na-eme ya.” Ụfọdụ ndị chọtara ihe dị oké ọnụ ahịa nke funahụrụ onye ọzọ na-asị na ha “na-edozi” ya edozi. O nweghị nke ọ bụla Baịbụl na-akwado n’ihe ndị a.—3/1, peeji nke 12-14.

• N’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere ọka wit na ata, gịnị ka ịgha mkpụrụ ọma ahụ na-anọchi anya ya?

Nwa nke mmadụ, bụ́ Jizọs, kwadebere ala mgbe o jere ozi n’ụwa. Malite na Pentikọst 33 O.A. gawa n’ihu, a ghara mkpụrụ ọma ahụ mgbe e ji mmụọ nsọ tee Ndị Kraịst mmanụ ha aghọọ ụmụ Chineke, ya bụ, ụmụ Alaeze Chineke.—3/15, peeji nke 20.

• Olee otú e si na-achịba ọka wit ahụ Jizọs ji mee ihe atụ n’ụlọ nkwakọba ihe nke Jehova? (Mat. 13:30)

A nọwo na-eme nke a kemgbe oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a malitere. A na-achịba ụmụ nke Alaeze Chineke, bụ́ ndị e tere mmanụ, ya bụ, ọka wit ihe atụ ahụ, n’ụlọ nkwakọba ihe nke Jehova mgbe a kpọbatara ha n’ọgbakọ Ndị Kraịst ebe ha na Chineke ga-adị ná mma, ma ọ bụkwanụ mgbe ha nwetara ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.—3/15, peeji nke 22.

• Olee ndị kpebiri akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst?

Ọ bụghị kansụl chọọchị, ma ọ bụ ndị isi chọọchị, ka ọ dị n’aka ikpebi. Kama nke ahụ, mmụọ nsọ mere ka ezi Ndị Kraịst mata akwụkwọ ndị so na Baịbụl n’eziokwu. Nke a kwekọrọ n’eziokwu ahụ bụ na otu n’ime onyinye ọrụ ebube e nyere n’ime iri afọ ole na ole ọgbakọ Ndị Kraịst malitere bụ “nghọta nke okwu si n’ike mmụọ nsọ.” (1 Kọr. 12:4, 10)—4/1, peeji nke 28.