Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Ọ̀ Kọọrọ Anyị Ihe Niile Banyere Jizọs?

Baịbụl Ọ̀ Kọọrọ Anyị Ihe Niile Banyere Jizọs?

 Baịbụl Ọ̀ Kọọrọ Anyị Ihe Niile Banyere Jizọs?

Ọ̀ ga-abụ na Jizọs anwụghị na Gọlgọta, dị ka Baịbụl kwuru na ọ nwụrụ, kama nke ahụ, ya abụrụ na ọ pụtara ebe ahụ ná ndụ? Ò nwere ike ịbụ na ọ lụrụ Meri Magdalin, ya amụtara ya ụmụ? Ka ọ̀ bụ onye na-ata ndụ ya ahụhụ nke kweere n’ihe omimi ma jụ ikporitụdị ndụ n’ụwa? Ọ̀ ga-abụ na ọ kụziri ihe ndị dị iche n’ihe ndị anyị na-agụ na Baịbụl?

ỤDỊ akụkọ ndị ahụ arịala ibe ha elu n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ihe so kpata ya bụ fim na akwụkwọ ọgụgụ ndị na-ewu ewu. E wezụga akụkọ ifo na-atọ ụtọ, e nwekwara ọtụtụ akwụkwọ na ihe odide ndị na-ekwu ihe ndị dị n’ihe odide apọkrịfa ndị e dere malite na narị afọ nke abụọ na narị afọ nke atọ O.A. (Oge Anyị), bụ́ ndị na-asị na ha na-akọ eziokwu ụfọdụ banyere Jizọs, bụ́ ndị Oziọma ndị dị na Baịbụl na-akọghị. Ihe ndị a ha kwuru hà bụ eziokwu? Ò nwere ihe ga-eme ka o doo anyị anya na Baịbụl kọọrọ anyị eziokwu niile banyere Jizọs?

Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị ahụ bụ ịtụle ihe atọ dị mkpa. Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa ịmata ihe ụfọdụ dị mkpa banyere ndị  ikom dere Oziọma ndị dị na Baịbụl na mgbe ha dere ha; nke abụọ, ọ dị mkpa ka anyị mara ndị kpebiri akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ na otú ha si kpebie ya; nke atọ, ọ dịkwa mkpa ka anyị mara ihe ụfọdụ banyere otú e si dee ihe odide apọkrịfa na otú ha si dị iche n’akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ. *

Olee Mgbe E Dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, Oleekwa Ndị Dere Ha?

Ụfọdụ ihe odide kwuru na e dere Oziọma Matiu afọ asatọ Kraịst nwụchara, ya bụ, n’ihe dị ka 41 O.A. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na e dere ya mgbe afọ ahụ gaferela, ma, ha niile kwekọrịtara na e dere akwụkwọ niile dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ime narị afọ mbụ O.A.

Ndị ji anya ha hụ mgbe Jizọs dị ndụ, mgbe ọ nwụrụ na mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ ka dị ndụ mgbe ahụ; ha ga-agbali akaebe na akụkọ ndị dị n’Oziọma ndị dị na Baịbụl bụ eziokwu. Ha nwekwara ike ịgba ihe ndị na-abụghị eziokwu n’anwụ. Prọfesọ F.  F. Brus kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ozi ọma ndịozi mbụ kwusara bụ na obi siri ha ike ịgbakwasị ụkwụ n’ihe ndị na-ege ha ntị maara; ọ bụghị naanị na ha kwuru, sị, ‘Anyị bụ ndị àmà nke ihe ndị a,’ kama ha sịkwara, ‘Dị ka unu onwe unu makwaara’ (Ọrụ 2:22).”

Olee ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst? Ụfọdụ n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs so na ha. Ha na ndị ọzọ so dee Baịbụl, dị ka Jems, Jud, na ikekwe Mak, nọ n’ụbọchị ememme Pentikọst nke afọ 33 O.A., bụ́ mgbe e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị niile ahụ so dee Akwụkwọ Nsọ Grik, tinyere Pọl, na ndị mbụ so n’òtù na-achị isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge gboo rụkọchiri ọrụ anya. Ndị so n’òtù ahụ na-achị isi bụ ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem.—Ọrụ 15:2, 6, 12-14, 22; Ndị Galeshia 2:7-10.

Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikwusa ozi ọma na izi ihe bụ́ nke ọ malitere. (Matiu 28:19, 20) O kwudịrị, sị: “Onye na-ege unu ntị na-egekwa m ntị.” (Luk 10:16) O kwekwara ha nkwa na mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, ga-enye ha ike ha ga-eji rụọ ọrụ ahụ. Ya mere, mgbe Ndị Kraịst oge gboo nwetara ihe odide si n’aka ndịozi ma ọ bụ ndị ha na ha rụkọchiri ọrụ anya, bụ́ ndị ikom gosiri nke ọma na Chineke ji mmụọ nsọ ya gọzie ha, ha nabatara ha nnọọ ka akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ.

Ụfọdụ ndị so dee Baịbụl gbara akaebe na ndị ha na ha so dee Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee ya. Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi kwuru banyere akwụkwọ ozi ndị Pọl dere, ma kwuo na ha so n’ihe “ndị ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ.” (2 Pita 3:15, 16) Pọl n’onwe ya kweere na Chineke nyere ndịozi na Ndị Kraịst ndị ọzọ bụ́ ndị amụma mmụọ nsọ ha ji dee ihe odide ha.—Ndị Efesọs 3:5.

N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere a ga-eji tụkwasị Oziọma ndị dị na Baịbụl obi dị ka ihe ndị mere eme. Ha abụghị akụkọ ifo nkịtị. Ha bụ akụkọ ihe mere eme a kpachapụrụ anya dee, nke ndị ji anya ha hụ mgbe ha mere gbara akaebe ha, bụ́ nke ndị ikom Chineke nyere mmụọ nsọ ya dere.

Olee Ndị Kpebiri Akwụkwọ Ndị So n’Akwụkwọ Nsọ?

Ụfọdụ ndị edemede kwuru na ọ bụ chọọchị ọchịchị dị n’aka, nke Eze Ukwu Kọnstantin bụ onyeisi ya, kpebiri akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst mgbe ọtụtụ narị afọ gachara. Ma, ihe àmà na-egosi na nke ahụ abụghị eziokwu.

Dị ka ihe atụ, legodị ihe otu ọkachamara n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Chọọchị bụ́ Ọska Skasaune kwuru: “Ọ bụtụdịghị kansụl chọọchị ma ọ bụ otu onye kpebiri ihe odide ndị ga-eso n’Agba Ọhụrụ na ndị na-agaghị eso . . . Ihe kpebiri ya doro anya ma kwesị nnọọ ekwesị: E weere ihe odide ndị e dere na narị afọ mbụ O.A., bụ́ ndị e weere na ọ bụ ndịozi ma ọ bụ ndị ha na ha rụkọrọ ọrụ dere, dị ka  ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ihe odide ndị ọzọ, akwụkwọ ozi, ma ọ bụ ‘oziọma,’ bụ́ ndị e dere mgbe narị afọ mbụ gachara esoghị na ha . . . E kpebichaala nke a ọtụtụ afọ tupu oge Kọnstantin, nakwa tupu chọọchị ya na-achị ọchịchị aka ike amalite. Ọ bụ chọọchị a kpagburu n’ihi okwukwe ha nyere anyị Agba Ọhụrụ, ọ bụghị chọọchị ahụ na-achị ọchịchị aka ike.”

Ken Beding, bụ́ osote prọfesọ nke na-akụzi ihe banyere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, kwuru banyere otú e si nweta akwụkwọ ndị so na Baịbụl, sị: “Ọ bụghị chọọchị ji aka ya họta akwụkwọ ndị so na Baịbụl; ọ ka mma ikwu na chọọchị nabatara akwụkwọ ndị Ndị Kraịst weere kemgbe dị ka Okwu Chineke nke e kwesịrị ịtụkwasị obi.”

Ma, ọ̀ bụ naanị Ndị Kraịst ahụ dị umeala n’obi dịrị ndụ na narị afọ mbụ họpụtara akwụkwọ ndị so na Baịbụl? Baịbụl kọọrọ anyị na e nwere ihe ka nnọọ mkpa—ma dị ike—nyere aka n’ịhọpụta ha.

Baịbụl kwuru na otu n’ime onyinye ọrụ ebube mmụọ nsọ nke e nyere n’ime iri afọ ole na ole ọgbakọ Ndị Kraịst malitere bụ “nghọta nke okwu si n’ike mmụọ nsọ.” (1 Ndị Kọrịnt 12:4, 10) Ya mere, e nyere ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst ahụ ikike karịrị nke mmadụ ịghọta ihe dị iche n’etiti okwu ndị si n’ike mmụọ nsọ Chineke n’ezie na ndị na-esighị. N’ihi ya, obi nwere ike isi Ndị Kraịst taa ike na e weere Akwụkwọ Nsọ ndị dị na Baịbụl dị ka ndị si n’ike mmụọ nsọ.

N’ihi ya, o doro anya na mmụọ nsọ mere ka a mata akwụkwọ ndị so na Baịbụl site n’oge gboo. Malite ná ngwụcha narị afọ nke abụọ O.A., ụfọdụ ndị edemede ekwuola na akwụkwọ ndị dị na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Ma, ọ bụghị ndị edemede a kpebiri akwụkwọ ndị so na Baịbụl; naanị ihe ha mere bụ ịgbara akwụkwọ ndị Chineke nabatarala site n’aka ndị nnọchianya ya, bụ́ ndị mmụọ nsọ ya duziri, akaebe.

Ihe odide oge ochie gbakwara nnọọ akaebe na akwụkwọ ọtụtụ ndị nabatara taa dị ka ndị so na Baịbụl so na Baịbụl n’ezie. E nwere ihe karịrị puku ihe odide ise nke Akwụkwọ Nsọ Grik e dere n’asụsụ Grik, tinyere ụfọdụ ndị e dere malite na narị afọ nke abụọ na nke atọ. Ọ bụ ihe odide ndị a, ọ bụghị ihe odide apọkrịfa, ka e weere dị ka akwụkwọ ndị so na Baịbụl na narị afọ ndị mbụ nke Oge Anyị, bụ́ nke mere e ji depụtaghachi ha ma kesaa ha ebe niile.

Ma, ihe e dere na Baịbụl bụ ihe akaebe kacha mkpa na-egosi akwụkwọ ndị so na Baịbụl. Ihe e dere na ha kwekọrọ ‘n’ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ’ bụ́ ndị anyị ga-ahụ n’akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl. (2 Timoti 1: 13) Ha na-agba ndị na-agụ ha ume ịhụ Jehova n’anya, ife ya, na ijere ya ozi, na-adọkwa ndị mmadụ aka ná ntị ka ha ghara itinye aka na nkwenkwe ụgha, ife ndị mmụọ ọjọọ, na ife ihe e kere eke. Akụkọ ndị dị na ha mere eme, amụma e dere na ha na-emezukwa. Ha na-agbakwa ndị na-agụ ha ume ịhụ mmadụ ibe ha n’anya. Ọ bụ ihe ndị a ka e ji mara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ihe odide apọkrịfa hà dị otú ahụ?

Olee Otú Ihe Odide Apọkrịfa Si Dị Iche?

Ihe odide apọkrịfa dị nnọọ iche n’akwụkwọ ndị so na Baịbụl. E dere akwụkwọ apọkrịfa malite n’ihe dị ka ọkara narị afọ nke abụọ, bụ́ ọtụtụ afọ e dechara akwụkwọ ndị so na Baịbụl. Otú ha si kọwaa Jizọs na Iso Ụzọ Kraịst ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ e si n’ike mmụọ nsọ dee.

Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ ihe dị ịtụnanya akwụkwọ apọkrịfa bụ́ Oziọma Tọmọs sịrị na Jizọs kwuru, dị ka ihe atụ, na ọ ga-eme ka Meri ghọọ nwoke, ka o nwee ike ịbanye n’Alaeze eluigwe. Oziọma Ụmụ Ọhụrụ Tọmọs kọwara na mgbe Jizọs bụ nwata na ọ bụ nwata obi fere azụ nke leziri anya gbuo nwata ọzọ. Ihe odide apọkrịfa bụ́ Ọrụ Pọl na Ọrụ Pita kwusiri okwu ike banyere izere mmekọahụ kpamkpam, kwuodị na ndịozi gbara ndị inyom ume ka ha hapụ di ha. Oziọma Judas kọrọ na Jizọs chịrị ndị na-eso ụzọ ya ọchị maka na ha kpegaara Chineke ekpere mgbe ha chọrọ iri nri. Echiche ndị a ekwekọghị n’ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị so na Baịbụl.—Mak 14:22; 1 Ndị Kọrịnt 7:3-5; Ndị Galeshia 3:28; Ndị Hibru 7:26.

Ọtụtụ n’ime ihe odide apọkrịfa kwuru echiche ndị Nọstik, bụ́ ndị kweere na Onye Okike, bụ́ Jehova, abụghị ezi Chineke. Ha kwekwaara na mbilite n’ọnwụ bụ ihe atụ, na ihe niile bụ́ ihe anụ ahụ́ bụ ihe ọjọọ, nakwa na alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ si n’aka Setan.

A sịrị na ọ bụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl dere ọtụtụ akwụkwọ apọkrịfa, ma, ọ bụghị eziokwu. Ọ̀ bụ eziokwu na a gbara mgba okpuru wepụ akwụkwọ ndị a na Baịbụl? Otu ọka mmụta banyere akwụkwọ apọkrịfa, bụ́ M. R. Jems, kwuru, sị: “O nweghị onye wepụrụ ha n’Agba Ọhụrụ: ha ji aka ha wepụ onwe ha.”

Ndị Dere Baịbụl Dọrọ Aka ná Ntị na A Ga-enwe Ndị Dapụrụ n’Ezi Ofufe

N’akwụkwọ ndị so na Baịbụl, a dọrọ anyị aka ná ntị ọtụtụ ugboro na a ga-enwe ndị ga-esi n’ezi ofufe dapụ n’oge na-adịghị anya, bụ́ ndị ga-emebi ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ezie, ndapụ n’ezi ofufe a amalitelarị na narị afọ mbụ, ma ndịozi gbochiri ya ịgbasa. (Ọrụ 20:30; 2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 6, 7; 1 Timoti 4:1-3; 2 Pita 2:1; 1 Jọn 2:18, 19; 4:1-3) Ịdọ aka ná ntị ndị ahụ mere ka anyị ghọta ihe ụfọdụ banyere ihe odide ndị a malitere ide mgbe ndịozi nwụchara, bụ́ ihe odide ndị megidere ozizi Jizọs.

N’ezie, ụfọdụ ndị ọkà mmụta na ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme nwere ike ịna-akwanyere ihe odide ndị ahụ ùgwù maka na ha emeela ochie. Ma, chegodị echiche: Ka e were ya na ndị ọkà mmụta chịkọtara ùkwù akwụkwọ adịgboroja e biri taa, ikekwe, ebe e si weta ihe ndị dị na ha bụ na magazin ndị na-akọ asịrị nakwa n’akwụkwọ òtù dị iche iche okpukpe ha na-agba ara dere, ma zoo ha n’ebe a na-edebe ihe. Ọ bụrụ na ihe odide ndị ahụ emee ochie, ọ̀ ga-eme ka ihe e dere na ha bụrụ eziokwu ma kwesị ka a tụkwasị ha obi? Mgbe otu puku afọ na narị asaa gachara, ụgha na okwu iberiibe ndị dị na ha hà nwere ike ịghọzi eziokwu naanị n’ihi na ha emeela ochie?

Mbanụ! Otú ahụ ka ọ dịkwa ihe ahụ e kwuru nke bụ́ na Jizọs lụrụ Meri Magdalin na akụkọ iberiibe ndị ọzọ a kọrọ n’akwụkwọ apọkrịfa. Olee ihe mere anyị ga-eji tụkwasị akwụkwọ ndị ahụ a na-ejighị n’aka obi, ebe ọ bụ na anyị nwere ndị nke e kwesịrị ịtụkwasị obi? Ihe niile Chineke chọrọ ka anyị mara banyere Ọkpara ya dị nnọọ na Baịbụl, bụ́ akwụkwọ anyị ga-atụkwasịli obi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 E nwere akwụkwọ iri isii na isii ọtụtụ ndị weere dị ka akwụkwọ ndị so na Baịbụl, bụ́ ndị a na-anaghị agbagha agbagha na ha bụ Okwu Chineke.

[Ihe Osise/Foto dị na peeji 26]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NDỤ JIZỌS MGBE E DERE AKWỤKWỌ BAỊBỤL MGBE E DERE IHE

NDỊ E DERE N’ASỤSỤ GRIK ODIDE APỌKRỊFA

2 T.O.A. 33 O.A. 41 98 130 300

[Ebe E Si Nweta Foto]

Kenet Garet/National Geographic Image Collection

[Foto dị na peeji nke 28]

Pọl onyeozi rụrụ ọrụ ebube, kpọlitedị mmadụ n’ọnwụ, bụ́ nke na-agba ezigbo akaebe na mmụọ Chineke kwadoro ya, kwadokwa ihe odide ya