Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Kwusaa Ntọhapụ Nye Ndị E Ji Eji’

‘Kwusaa Ntọhapụ Nye Ndị E Ji Eji’

‘Kwusaa Ntọhapụ Nye Ndị E Ji Eji’

JIZỌS kwuru ná mmalite nke ozi ya na ọrụ e nyere ya gụnyere “ikwusa ntọhapụ nye ndị a dọọrọ n’agha [ma ọ bụ, “ndị e ji eji”].” (Luk 4:18) Ezi Ndị Kraịst na-agbaso ihe nlereanya nke Nna ha Ukwu site n’ikwusara “ụdị mmadụ nile” ozi ọma Alaeze ahụ, na-atọhapụ ha n’agbụ ime mmụọ ma na-enyere ha aka ime ka ndụ ha ka mma.—1 Timoti 2:4.

Taa, ọrụ a na-agụnye ikwusara ndị e ji eji n’ụzọ nkịtị—ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi mpụ dịgasị iche ha mere, bụ́kwa ndị ọ na-agụ agụụ ka a tọhapụ ha n’ụzọ ime mmụọ—ozi ọma. Gụọ akụkọ a na-agba ume banyere ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụlọ mkpọrọ ndị dị na Ukraine na n’ebe ndị ọzọ na Europe.

Ndị Ọgwụ Ọjọọ Riri Ahụ́ Aghọọ Ndị Kraịst

Serhii * ejirila afọ 20 n’ime afọ 38 ọ dịrịla ndụ nọọ n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọdị n’ụlọ mkpọrọ gụchaa akwụkwọ. Ọ na-ekwu, sị: “A tụrụ m mkpọrọ ọtụtụ afọ gara aga maka igbu ọchụ, anọzubeghịkwa m afọ ole a sịrị na m ga-anọ. N’ụlọ mkpọrọ, ana m akpa àgwà dị ka onye ọchịchị aka ike, ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-atụkwa m ụjọ.” Nke a ò mere ka o nwere onwe ya? Ee e. Ruo ọtụtụ afọ, ọgwụ ọjọọ, ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, na ụtaba riri Serhii ahụ́.

Onye mkpọrọ ibe ya kụziziiri ya eziokwu Bible. Ọ dị nnọọ ka onye nọ n’ebe gbara ọchịchịrị nke a mụnyeere ọkụ. N’ime ọnwa ole na ole, ọ kwụsịrị iji ihe ndị ahụ riri ya ahụ́ eme ihe, ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma, e meekwa ya baptizim. Serhii jizi ọrụ n’aka n’ụlọ mkpọrọ, na-ejere Jehova ozi oge nile. O nyerela ndị omekome asaa aka ịgbanwe ndụ ha ma ghọọ ụmụnna ime mmụọ ya. A tọhapụla isii n’ime ha, ma Serhii ka nọ n’ụlọ mkpọrọ. Nke a adịghị ewute ya n’ihi na obi na-atọ ya ụtọ na ọ pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị a tọhapụrụ n’agbụ ime mmụọ.—Ọrụ 20:35.

Otu n’ime ndị Serhii mụụrụ ihe n’ụlọ mkpọrọ bụ Victor, bụ́ onye na-erebu ọgwụ ọjọọ na onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ́. Mgbe a tọhapụsịrị Victor n’ụlọ mkpọrọ, ọ nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ ma mesịa gaa Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na Ukraine. Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche na Moldova. Victor na-ekwu, sị: “Amalitere m ise siga mgbe m dị afọ 8, malite ịṅụbiga mmanya ókè mgbe m dị afọ 12, ma malite ịṅụ ọgwụ ọjọọ mgbe m dị afọ 14. Achọrọ m ịgbanwe ndụ m, ma mgbalị m nile kụrụ afọ n’ala. Na 1995, kpọmkwem mgbe mụ na nwunye m na-eme atụmatụ isi n’ebe ndị enyi ọjọọ m bi kwapụ, otu onye isi na-adịghị mma jizi mma magbuo nwunye m. Ndụ m ghasara. ‘Olee ebe nwunye m nọ ugbu a? Gịnị na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ?’ Ajụrụ m ọtụtụ ajụjụ ma ọ dịghị nke m nwetara azịza ya. Aṅụsiwekwuru m ọgwụ ọjọọ ike iji chefuo nsogbu m. E jidere m maka ire ọgwụ ọjọọ ma maa m ikpe ịga mkpọrọ afọ ise. N’ebe ahụ, Serhii nyeere m aka inweta azịza nye ajụjụ m. Agbalịrị m ọtụtụ ugboro ịhapụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ nanị ugbu a Bible na-enyere m aka ka m nwere ike ime ya. Okwu Chineke na-akpa ike dị egwu!”—Ndị Hibru 4:12.

Ndị Omekome Obi Fere Azụ Agbanwee

Vasyl aṅụtụghị ọgwụ ọjọọ, n’agbanyeghị nke ahụ, e jichiri ya. Ọ na-akọwa, sị: “Egwuregwu ịkụ ọkpọ na ịgba ụkwụ riri m ahụ́. Azụrụ m onwe m ịkụ ndị mmadụ ihe n’emerụghị ha ahụ́.” Vasyl ji ime ihe ike ya na-ezu ndị mmadụ ohi. “Agara m mkpọrọ ugboro atọ, nke mere ka nwunye m gbaa m alụkwaghịm. N’oge ikpeazụ m nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ ise, m matara banyere akwụkwọ Ndịàmà Jehova. Nke a kpaliri m ịgụ Bible, ma anọgidere m na-eme ihe ahụ na-amasị m nke ukwuu—ọgụ na-enweghị iwu na-achịkwa ya.

“Otú ọ dị, mgbe m gụsịrị Bible ruo ọnwa isii, otú m si ele ihe anya gbanwere. Imeri n’ọgụ anakwaghị atọ m ụtọ otú o sibu atọ m. N’ihi ya, amalitere m iji ihe e dere n’Aịsaịa 2:4 atụle ndụ m, aghọtakwara m na ọ gwụla ma m gbanwere otú m si eche echiche, m ga-eji ndụ m fọrọ afọ nọọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ihi ya, atụfuru m ngwá ọgụ m nile ma malite ịrụ ọrụ n’àgwà m. Ọ dịghịrị m mfe, ma site n’ịtụgharị uche na ikpe ekpere, eji m nwayọọ nwayọọ kwụsị àgwà ọjọọ ndị m nwere. Mgbe ụfọdụ, eji m anya mmiri ákwá rịọ Jehova ka o nye m ume imeri ihe a riri m ahụ́. N’ikpeazụ, emeriri m ya.

“Mgbe a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ, alaghachikwuuru m ezinụlọ m. Ugbu a, ana m arụ ọrụ n’ebe a na-egwu kol. Nke a na-enye m ohere mụ na nwunye m iso arụ ọrụ nkwusa na ịrụ ọrụ ndị dịịrị m n’ọgbakọ.”

Mykola na ndị enyi ya zuru ohi n’ọtụtụ ụlọ akụ̀ dị na Ukraine. Nke a mere ka a tụọ ya mkpọrọ afọ iri. Tupu a tụọ ya mkpọrọ, ọ bụ nanị otu ugboro ka ọ gara chọọchị—iji hụ otú ọ ga-esi zuo chọọchị ahụ ohi. Atụmatụ ya kụrụ afọ n’ala, ma chọọchị ahụ Mykola gara mere ka o chee na ihe juru na Bible bụ akụkọ ndị na-agwụ ike banyere ndị ụkọchukwu Ọtọdọks, kandụl na ememe okpukpe. Ọ na-ekwu, sị: “Amalitere m ịgụ Bible, ma amaghị m kpọmkwem ihe kpatara ya. Ọ tụrụ m anya mgbe m chọpụtara na Bible adịtụghị otú ahụ m chere!” Ọ rịọrọ ka a mụwara ya Bible, e mekwara ya baptizim na 1999. Ọ bụrụ na ị hụ ya ugbu a, ọ ga-esiri gị ike ikweta na ohu na-eje ozi a dị umeala n’obi bụbu oji égbè ezu ohi obi fere azụ nke na-ezu ohi n’ụlọ akụ̀!

A mara Vladimir ikpe ọnwụ. Ka ọ nọ na-echere oge a ga-egbu ya, o kpegaara Chineke ekpere ma kwe ya nkwa na ya ga-ejere Ya ozi ma ọ bụrụ na ọ napụta ya. Ka ọ dịgodị, a gbanwere iwu ahụ, a gbanwekwara ikpe ọnwụ a mara ya ịbụzi nga mkpụrụ ọka. Iji mezuo nkwa o kwere, Vladimir malitere ịchọ ezi okpukpe. O denyere aha ya n’otu ụlọ akwụkwọ a na-eji akwụkwọ ozi amụ ihe na ya ma nweta diplọma site n’aka ndị chọọchị Adventist, ma nke ahụ ejughị ya afọ.

Ma mgbe Vladimir gụrụ magazin Ụlọ Nche na Teta! dị n’ọ́bá akwụkwọ ụlọ mkpọrọ ahụ, o degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Ukraine akwụkwọ, na-arịọ ka a bịa leta ya. Mgbe ụmụnna ndị ebe ahụ letara ya, ọ malitelarị iwere onwe ya dị ka Onyeàmà, na-ekwusakwa ozi ọma n’ụlọ mkpọrọ ahụ. E nyeere ya aka iru eru ije ozi dị ka onye nkwusa Alaeze. Mgbe e dere isiokwu a, Vladimir na mmadụ asaa ndị ọzọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ na-eche ka e mee ha baptizim. Ma ha nwere otu nsogbu. Ebe ọ bụ na a na-edebe ndị a mara ikpe nga mkpụrụ ọka bụ́ ndị na-ekpe otu okpukpe n’otu ọnụ ụlọ, Vladimir na ndị ya na ha nọ n’otu ọnụ ụlọ na-ekpe otu okpukpe. N’ihi ya, ònye ka ha ga-ezi ozi ọma? Ha na-ezi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ ozi ọma, ha na-ejikwa akwụkwọ ozi ezi ozi ọma.

Nazar si Ukraine kwafee Czech Republic, bụ́ ebe ọ banyere n’òtù ndị ohi. Nke a mere ka a tụọ ya mkpọrọ afọ atọ na ọkara. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ na-anabata Ndịàmà Jehova na-esi obodo Karlovy Vary abịa ileta ndị mkpọrọ ebe ahụ, ọ mụtara eziokwu ahụ ma gbanwee ndụ ya kpamkpam. Mgbe otu n’ime ndị nche na-elekọta ụlọ mkpọrọ Nazar hụrụ nke a, ọ gwara ndị ha na Nazar nọ n’otu ọnụ ụlọ ụlọ mkpọrọ, sị: “Ọ bụrụ na unu nile ga-adị ka onye Ukraine a, maranụ na m ga-agbanwe ọrụ m.” Onye nche ọzọ kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova a bụ aka ochie. Mmadụ ga-abata n’ụlọ mkpọrọ dị ka omekome ma pụọ dị ka ezigbo mmadụ.” Ugbu a, Nazar alaghachila n’ụlọ ya. Ọ mụrụ ịkwa nkà ma lụọ nwanyị, ya na nwunye ya nọkwa n’ozi oge nile. Lee nnọọ obi ụtọ o nwere na Ndịàmà ahụ letara ụlọ mkpọrọ ahụ!

Ndị Isi Ụlọ Mkpọrọ Egosi Ekele Ha

Ọ bụghị nanị ndị mkpọrọ nwere obi ụtọ maka ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ. Miroslaw Kowalski, bụ́ ọnụ na-ekwuru otu n’ime ụlọ mkpọrọ ndị dị na Poland, kwuru, sị: “Ọbịbịa ha na-amasị anyị nke ukwuu. Ụfọdụ ndị mkpọrọ si n’ezinụlọ na-adịghị mma. O nwere ike ịbụ na ọ dịtụghị mgbe e mesoro ha ihe dị ka mmadụ. . . . Enyemaka [Ndịàmà ahụ] dị anyị nnọọ mkpa n’ihi na anyị nwere ụkọ ndị ọrụ na ndị nkụzi.”

Onye na-elekọta otu ụlọ mkpọrọ ọzọ dị na Poland degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi, na-arịọ ka Ndịàmà mụbakwuo ọrụ ha na-arụ n’ụlọ mkpọrọ ya. N’ihi gịnị? Ọ kọwara, sị: “Ọ bụrụ na ndị nnọchianya Watchtower ana-abịachikwu anya ebe a, o nwere ike ime ka ndị mkpọrọ ahụ malite ịdị na-akpaso ibe ha àgwà ọma, mee ka ha kwụsịtụ ịdị na-emeso ibe ha ihe ike.”

Otu akwụkwọ akụkọ ndị Ukraine kọrọ banyere otu onye mkpọrọ nke nwere nkụda mmụọ bụ́ onye nwara igbu onwe ya, ma ya emesịa nweta enyemaka site n’aka Ndịàmà Jehova. Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Ka ọ dị ugbu a, nwoke a enwetaghachiwela onwe ya. Ọ na-erube isi n’iwu ụlọ mkpọrọ, ọ bụkwa ihe nlereanya nye ndị mkpọrọ ndị ọzọ.”

Abamuru Ya Na-adịgide Ọbụna Mgbe A Tọhapụsịrị Ha

Abamuru nke ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ anaghị akwụsị n’ụlọ mkpọrọ. Abamuru ya na-adịgide ọbụna mgbe a tọhapụsịrị ndị mkpọrọ. Ndị Kraịst abụọ, ndị aha ha bụ Brigitte na Renate, anọwo na-enyere ndị mmadụ aka n’ụzọ dị otú a ruo afọ ụfọdụ. Otu akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Main-Echo Aschaffenburg, na-akọ banyere ha, sị: “Ha na-elekọta ndị mkpọrọ ruo ọnwa atọ ma ọ bụ ise a tọhapụsịrị ha, na-agba ha ume inweta obi ụtọ ná ndụ. . . . Gọọmenti anabatala ha dị ka ndị ọrụ na-enyocha ndị a tọhapụrụ ọhụrụ n’ụlọ mkpọrọ. . . . Mmekọrịta ha na ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ na-enyekwa aka ma na-agba ume.” Ọtụtụ mmadụ ararawo ndụ ha nye Jehova n’ihi enyemaka obiọma a.

Ọbụna ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ na-erite uru site n’ọrụ nkụzi Bible nke Ndịàmà Jehova na-arụ. Dị ka ihe atụ, Roman bụ onye mejọ na ọkà n’akparamàgwà mmadụ n’otu ụlọ mkpọrọ dị na Ukraine. Mgbe Ndịàmà bịara n’ụlọ ya, o kwetara ịmụ Bible. Ọ mataziri na a dịghị ekwe ka Ndịàmà leta ndị mkpọrọ n’ebe ọ na-arụ ọrụ. N’ihi ya, ọ rịọrọ onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ ka o kwe ka ya na-eji Bible eme ihe mgbe ya na ndị mkpọrọ na-ekwurịta okwu. E kwetara ka ọ na-eme otú ahụ, ihe dịkwa ka ndị mkpọrọ iri gosiri mmasị. Roman kụziiri ndị mkpọrọ a ihe ndị ọ na-amụta na Bible n’ụzọ chiri anya, mgbalị ya rụpụtakwara ihe ndị magburu onwe ha. Mgbe a tọhapụsịrị ha, ụfọdụ nọgidere na-enwe ọganihu ma ghọọ Ndị Kraịst e mere baptizim. Mgbe Roman hụrụ ike Okwu Chineke na-akpa, o jiri ọmụmụ ihe ya kpọrọkwuo ihe. Ọ hapụrụ ọrụ agha ma nọgide n’ọrụ nke ịkụziri ndị mmadụ Bible. Ugbu a, ya na onye bụbu onye mkpọrọ na-eso aga ozi ọma.

Otu onye mkpọrọ dere, sị: “Ihe ji anyị ndụ ebe a bụ Bible, akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, na ọmụmụ Bible.” Ihe a o kwuru na-egosi otú akwụkwọ ndị e ji amụ Bible dịruru ụlọ mkpọrọ ụfọdụ ná mkpa. Otu ọgbakọ dị na Ukraine na-akọ banyere ọrụ nkụzi Bible ha na-arụ n’otu ụlọ mkpọrọ dị n’ókèala ha, sị: “Ndị nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ na-ekele anyị maka akwụkwọ ndị anyị na-eweta. Anyị na-enye ha mkpụrụ 60 nke magazin Ụlọ Nche na Teta! nke ọ bụla.” Ọgbakọ ọzọ na-ede, sị: “Anyị na-elekọta otu ụlọ mkpọrọ nwere obere ọ́bá akwụkwọ 20. Anyị tinyere akwụkwọ anyị ndị bụ́ isi n’ọ́bá akwụkwọ nke ọ bụla. Akwụkwọ nile anyị tinyere ebe ahụ dị katọn 20.” N’otu ụlọ mkpọrọ, ndị nche hụrụ na e tinyere mbipụta ọ bụla nke magazin anyị n’ọ́bá akwụkwọ ha ka ndị mkpọrọ nwee ike ịgụ ha.

Na 2002, alaka ụlọ ọrụ dị na Ukraine hiwere Ngalaba Na-ahụ Maka Ndị Mkpọrọ. Ka ọ dị ugbu a, ngalaba ahụ akpọtụrụla otu narị ụlọ mkpọrọ na iri abụọ ma kenye ọgbakọ dị iche iche ịhụ maka ha. Kwa ọnwa, a na-anata ihe dị ka akwụkwọ ozi 50 ndị mkpọrọ dere, ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-arịọ ka e wetara ha akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ma ọ bụ ka a bịa mụwara ha Bible. Alaka ụlọ ọrụ na-ezigara ha akwụkwọ ukwu, magazin na broshuọ ruo mgbe ụmụnna ndị ebe ahụ ga-aga leta ha.

Pọl onyeozi degara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Na-echetanụ ndị nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ.” (Ndị Hibru 13:3) Ọ na-ekwu banyere ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Taa, Ndịàmà Jehova na-echeta ndị e ji eji, na-eleta ndị mkpọrọ, ma ‘na-ekwusa ntọhapụ nye ndị e ji eji.’—Luk 4:18.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A gbanwere aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 9]

Mgbidi ụlọ mkpọrọ dị na L’viv, Ukraine

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Mykola

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Vasyl na nwunye ya, bụ́ Iryna

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Victor