Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-akwụghachi Ndị Na-edebe Ụzọ Ya Ụgwọ Ọrụ n’Ụba

Jehova Na-akwụghachi Ndị Na-edebe Ụzọ Ya Ụgwọ Ọrụ n’Ụba

Akụkọ Ndụ

Jehova Na-akwụghachi Ndị Na-edebe Ụzọ Ya Ụgwọ Ọrụ n’Ụba

DỊ KA ROMUALD STAWSKI SI KỌỌ

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere na September 1939, a nọ na-alụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’ebe ugwu Poland. Dị ka nwatakịrị dị afọ itoolu nke chọrọ ịmatacha ihe nile, agara m n’ọgbọ agha dị nso iji kirie ihe na-emenụ. Ihe m hụrụ dị egwu—ozu juru ebe nile, anwụrụ ọkụ jupụtakwara n’ikuku. Ọ bụ ezie na ihe ka m mkpa m nọ na-eche bụ otú m ga-esi laruo n’udo, ajụjụ ụfọdụ gbatara m n’obi, ndị dị ka: “Gịnị mere Chineke ji kwere ka ihe ndị dị otú a dị egwu na-eme? Ole ndị ka ọ dụnyeere úkwù?”

MGBE ọ fọrọ ntakịrị ka agha ahụ bie, a manyere ụmụ okorobịa ịrụrụ ndị ọchịchị Germany ọrụ. A na-akwụgbu onye ọ bụla nwara anwa jụ ịrụ ọrụ ahụ n’osisi ma ọ bụ n’àkwà mmiri, nyawakwa ya ihe e dere “onye sabo” n’olu. Obodo anyị, bụ́ Gdynia, dị n’agbata mba abụọ ahụ na-alụrịta agha. Mgbe anyị gara n’ime obodo ikute mmiri, mgbọ égbè na bọmbụ nọ na-efefe n’isi anyị, e gbukwara nwanne m nwoke nke m tọrọ bụ́ Henryk. N’ihi ọnọdụ dị egwu dị mgbe ahụ, mama m kpọgara anyị anọ n’ọnụ ụlọ dị n’okpuru ala ka ọ ghara inwe ihe ga-eme anyị. N’ebe ahụ, ọrịa akpịrị na-efe efe gburu nwanne m nwoke dị afọ abụọ, bụ́ Eugeniusz.

Ọzọ, ajụkwara m onwe m, sị: “Olee ebe Chineke nọ? Gịnị mere o ji kwere ka ahụhụ a nile dịrị?” Ọ bụ ezie na m na-anụrụ okpukpe Katọlik ọkụ n’obi ma na-agachi chọọchị anya, enwetaghị m azịza nke ajụjụ ndị ahụ.

Anatara M Eziokwu Bible

Enwetara m azịza nye ajụjụ m site n’ebe m na-atụghị anya ya. Agha ahụ biri na 1945, ná mmalite 1947 kwa, otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ anyị na Gdynia. Mama m sooro Onyeàmà ahụ kwurịta okwu, anụkwara m ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru. Ihe ndị ahụ yiri eziokwu, n’ihi ya, anyị nakweere òkù ọ kpọrọ anyị ịga nzukọ Ndị Kraịst. Nanị otu ọnwa ka nke ahụ gasịrị, esonyeere m ìgwè Ndịàmà nọ ebe ahụ ma kwusaara ndị ọzọ banyere ụwa ka mma nke agha na arụrụala na-agaghị adị na ya, ọ bụ ezie na aghọtachabeghị m eziokwu Bible nke ọma. Nke a nyere m ọṅụ dị ukwuu.

Na September 1947, e mere m baptizim ná mgbakọ sekit e nwere na Sopot. N’ọnwa May nke afọ sochirinụ, abanyere m n’ozi ọsụ ụzọ oge nile, na-eji ihe ka ukwuu n’oge m ezi ndị ọzọ ozi Bible. Ndị ụkọchukwu ji obi ọjọọ megide ọrụ anyị ma kpalie ndị mmadụ imeso anyị ihe ike. N’otu oge, ìgwè iwe ji wakporo anyị, tụọ anyị nkume ma tie anyị ihe nke ukwuu. N’oge ọzọ, ndị nọn na ndị ụkọchukwu kpaliri otu ìgwè mmadụ ịwakpo anyị. Anyị gbabara n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ka ha chebe anyị, ma ìgwè ahụ gbara ụlọ ọrụ ndị uwe ojii gburugburu, na-aba mba na ha ga-eti anyị ihe. N’ikpeazụ, a kpọtakwuru ndị uwe ojii, ọtụtụ n’ime ha ewee duru anyị pụọ.

N’oge ahụ, e nweghị ọgbakọ n’ógbè anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ehi n’èzí n’oké ọhịa. Obi dị anyị ụtọ na anyị pụrụ ịrụ ọrụ nkwusa ahụ n’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Taa, e nwere ọgbakọ ndị siri ike n’ógbè ahụ.

Ije Ozi Betel na Njide E Jidere M

Na 1949, a kpọrọ m ịbịa jee ozi n’Ebe Obibi Betel dị na Łódź. Lee ihe ùgwù ọ bụ ije ozi n’ebe dị otú ahụ. N’ụzọ dị mwute, anọghị m ogologo oge n’ebe ahụ. Na June 1950, otu ọnwa tupu ndị ọchịchị amachibido ọrụ anyị iwu, e jidere mụ na ụmụnna ndị ọzọ nọ na Betel. A kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ, n’ihi ya kwa, e ji obi ọjọọ gbaa m ajụjụ ọnụ.

N’ihi na papa m na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri na-ejekarị New York, ndị uwe ojii na-agba m ajụjụ ọnụ gbalịrị ime ka m kweta na papa m bụ onye nledo ndị United States. Ha ji obi ịta mmiri gbaa m ajụjụ ọnụ. Tụkwasị na nke ahụ, ndị uwe ojii anọ jikọrọ aka gbalịa ime ka m gbaa àmà megide Nwanna Wilhelm Scheider, bụ́ onye na-elekọta ọrụ anyị n’oge ahụ na Poland. Ha ji osisi ndị buru ibu na-akụ m n’ikiri ụkwụ. Ka m tọgbọ n’ala, ọbara ana-agbakwa m, echere m na apụghị m idi ya, etiri m mkpu, sị, “Jehova, nyere m aka!” O juru ndị ahụ na-akpagbu m anya, ha kwụsịkwara iti m ihe. Minit ole na ole ka nke ahụ gasịrị, ụra buuru ha. Enwetara m onwe m. Nke a mere ka m kwenyesie ike na Jehova na-eji ịhụnanya azaghachi ndị ohu ya raara onwe ha nye ya mgbe ha kpọkuru ya maka enyemaka. O mere ka okwukwe m sie ike ma kụziere m ịtụkwasị Chineke obi kpamkpam.

Ihe e mesịrị dee banyere ajụjụ ọnụ ahụ a gbara m gụnyere àmà ụgha ndị a sị na m gbara. Mgbe m sịrị na ekwughị m ihe ndị ahụ, otu onye uwe ojii gwara m, sị, “Ị ga-akọwa nke ahụ mgbe anyị ruru n’ụlọikpe!” Otu onye nwere omume enyi nke mụ na ya nọ n’otu ọnụ ụlọ ụlọ mkpọrọ gwara m ka m ghara ichegbu onwe m ebe ọ bụ na ọkàiwu ndị agha ga-enyocha ihe ndekọ ahụ, bụ́ nke ga-enye m ohere ịgbagha akaebe ụgha ahụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka o si mee.

Ọrụ Sekit na Ịga Mkpọrọ Ọzọ

A tọhapụrụ m na January 1951. Otu ọnwa ka e mesịrị, amalitere m ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. N’agbanyeghị mmachibido iwu ahụ, mụ na ụmụnna ndị ọzọ rụrụ ọrụ iji wusie ọgbakọ dị iche iche ike ma nyere Ndịàmà ibe anyị ndị uwe ojii chụsasịrị aka. Anyị gbara ụmụnna ndị ahụ ume ịnọgide na-eje ozi. N’afọ ndị sochirinụ, ụmụnna a ji obi ike kwado ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, rụọkwa ọrụ ibipụta na ikesa akwụkwọ ndị dabeere na Bible na nzuzo.

Otu ụbọchị n’April 1951, mgbe m si otu nzukọ Ndị Kraịst na-alọta, ndị uwe ojii bụ́ ndị nọworo nnọọ na-enyo m jidere m n’okporo ámá. N’ihi na ajụrụ m ịza ajụjụ ndị ha jụrụ m, ha kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ dị na Bydgoszcz ma malite ịgba m ajụjụ ọnụ n’otu abalị ahụ. Ha manyere m iguzo n’ahụ́ ájá ruo ụbọchị isii ehihie na abalị n’erighị nri, n’aṅụghịkwa mmiri, anwụrụ ọkụ siga ndị uwe ojii ahụ nọ na-ese jupụtakwara ebe ahụ. Ha tiri m okpiri, reekwa m ọkụ siga. Mgbe m tụbọrọ, ha wụrụ m mmiri ma maliteghachi ịgba m ajụjụ ọnụ. Arịọrọ m Jehova ka o nye m ume iji nagide ya, ọ kwadokwara m.

Ọnụnọ m nọrọ n’ụlọ mkpọrọ Bydgoszcz baara m uru. N’ebe ahụ, esooro m ndị a na-agaraghị enwe ike inweta kerịta eziokwu Bible. N’ezie, enwetara m ọtụtụ ohere iji gbaa àmà. N’ihi ọnọdụ dị mwute na nke enweghị olileanya ha nọ na ya, ndị mkpọrọ na-adịkarị njikere ige ntị n’ozi ọma ahụ.

Mgbanwe Abụọ Dị Mkpa

Oge na-adịghị anya ka a tọhapụsịrị m na 1952, ezutere m Nela, bụ́ onye ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi. Ọ nọwo na-asụ ụzọ n’ebe ndịda Poland. Ka e mesịrị, ọ rụrụ ọrụ “n’ebe a na-eme bred,” bụ́ ebe nzuzo anyị na-anọ ebi akwụkwọ anyị. Ọ bụ ọrụ siri ike nke chọrọ mmadụ ịdị nkọ na ịchụ onwe ya n’àjà. Anyị lụrụ na 1954, anyị nọgidekwara n’ozi oge nile ruo mgbe a mụrụ nwa anyị nwanyị, bụ́ Lidia. Mgbe ahụ, anyị kpebiri na ka m wee nwee ike ịga n’ihu n’ọrụ njegharị m, Nela ga-akwụsị ozi oge nile ya, laghachi ụlọ ma lekọta nwa anyị nwanyị.

Mkpebi ọzọ dị mkpa chekwara anyị ihu n’otu afọ ahụ. A gwara m ka m jee ozi dị ka onye nlekọta distrikti n’ebe ruru otu ụzọ n’ụzọ atọ nke Poland. Anyị ji ekpere tụlee okwu ahụ. Amaara m na ọ dị mkpa ka e wusie ụmụnna anyị a machibidoro iwu ike. A nọ na-ejide ọtụtụ ụmụnna anyị n’oge ahụ, ya mere, agbamume ime mmụọ dị ha oké mkpa. Site ná nkwado Nela, anaara m ọrụ ahụ. Jehova nyeere m aka ije ozi a ruo afọ 38.

Ilekọta “Ebe Ndị A Na-eme Bred”

N’oge ahụ, ọ bụ ndị nlekọta distrikti na-elekọta “ebe ndị a a na-eme bred,” bụ́ ndị dị n’ebe ndị zoro ezo. Ndị uwe ojii nọ na-achụgharị anyị, na-agbalị ịchọta na imechi ebe ndị a anyị na-ebi akwụkwọ. Mgbe ụfọdụ, ha na-achọta ya, ma ọ dịghị mgbe nri ime mmụọ ndị dị anyị mkpa kọrọ anyị. O doro nnọọ anya na Jehova na-elekọta anyị.

Tupu a kpọọ mmadụ òkù ịrụ ọrụ obibi akwụkwọ bụ́ nke siri ike na nke dị ize ndụ, onye ahụ aghaghị ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe, onye dị nkọ, onye nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nakwa onye na-erube isi. Ọ bụ àgwà ndị ahụ na-eme ka “ebe a na-eme bred” nọgide na-arụ ọrụ n’enweghị nsogbu. O sikwara ike ịchọta ebe kwesịrị ekwesị ịnọ ebi akwụkwọ na nzuzo. Ebe ụfọdụ yiri ka hà kwesịrị ekwesị, ma ụmụnna ndị nọ n’ebe ndị ahụ adịchaghị akọ. N’ebe ndị ọzọ, e nweghị ebe kwesịrị ekwesị ma ụmụnna ndị nọ n’ebe ndị ahụ dị akọ. Ụmụnna dị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Eji m nnọọ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị m nwere ihe ùgwù iso rụkọọ ọrụ kpọrọ ihe.

Ịgbachitere Eziokwu Ahụ

N’oge ndị ahụ siri ike, a na-ebo anyị ebubo mgbe nile na anyị na-arụ ọrụ iwu na-akwadoghị nakwa nke na-akwatu ọchịchị, a kpụpụkwara anyị n’ụlọikpe. Nke a bụụrụ anyị nsogbu n’ihi na anyị enweghị ndị ọkàiwu ga-ekpechite ọnụ anyị. Ụfọdụ ndị ọkàiwu meteere anyị ebere, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-atụ egwu ọha na eze, ha achọghịkwa imejọ ndị ọchịchị. Otú ọ dị, Jehova maara mkpa anyị, mgbe oge ya rukwara, o mere ihe iji dozie okwu ahụ.

E mekpọrọ Alojzy Prostak, bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị si Kraków, ọnụ n’oge a na-agba ya ajụjụ ọnụ nke na a kpọgara ya n’ụlọ ọgwụ ndị mkpọrọ. Otú o si guzosie ike n’agbanyeghị ahụhụ a tara ya n’ụzọ anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ mmetụta uche mere ka ndị mkpọrọ ibe ya nọ n’ụlọ ọgwụ na-akwanyere ya ùgwù ma nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Otu n’ime ha bụ ọkàiwu aha ya bụ Witold Lis-Olszewski, bụ́ onye obi ike Nwanna Prostak gosipụtara kpaliri. Ya na ya kwurịtara okwu ugboro ugboro, o kwekwara Nwanna Prostak nkwa, sị: “Ozugbo a tọhapụrụ m ma kwe ka m malite ọrụ, aga m adị njikere ịgbachitere Ndịàmà Jehova.” O mere ihe o kwuru.

Maazị Olszewski nwere òtù ndị ọkàiwu nke ya, bụ́ ndị kpebisiri ike imezu nkwa ahụ o kwere. N’oge ahụ e nwere mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ha kpechiteere ụmụnna n’ihe dị ka ikpe 30 kwa ọnwa—otu ikpe kwa ụbọchị! Ebe ọ bụ na ọ dị mkpa na Maazị Olszewski ga-ama nke ọma ihe banyere ikpe nke ọ bụla, e kenyere m ịdị na-akpọtụrụ ya. Mụ na ya rụkọrọ ọrụ afọ asaa n’afọ ndị 1960 na ndị 1970.

Amụtara m ọtụtụ ihe banyere ọrụ iwu n’oge ndị ahụ. Ana m anọkarị mgbe a na-ekpe ikpe, na-anụ ihe ndị ọkàiwu na-ekwu—ma ndị nke ọma ma ndị nke ọjọọ—na-anụkwa otú e si eme ngọpụ n’ụzọ iwu, nakwa akaebe nke ndị kwere ekwe ibe m e boro ebubo. Ihe a nile bara uru nke ukwuu n’inyere ụmụnna anyị aka, karịsịa ndị a kpọrọ ka ha bịa gbaa akaebe, ịma ihe ha ga-ekwu na mgbe ha ga-agbachi nkịtị n’ụlọikpe.

N’oge ndị e nwere ikpe, Maazị Olszewski na-ehikarị n’ụlọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụghị n’ihi na ọ gaghị akwụli ụgwọ ụlọ na họtel, kama dị ka o kwuru n’otu oge, “Achọrọ m inwetatụ mmụọ unu tupu ikpe ebido.” N’ihi enyemaka ya, ọtụtụ ikpe laara anyị. O kpechiteere m ugboro ugboro, ọ dịtụghịkwa mgbe ọ nara m ego. N’oge ọzọkwa, o kweghị ka a kwụọ ya ụgwọ maka ikpe 30 o kpere. N’ihi gịnị? O kwuru, sị, “Achọrọ m ịkwado ọrụ unu, ọ bụrụgodị obere.” Ego a gaara akwụ ya abụghịkwa obere ego. Ndị ọchịchị matara maka ọrụ ahụ ndị òtù Maazị Olszewski na-arụrụ anyị, ma nke ahụ emeghị ka ọ kwụsị inyere anyị aka.

Ọ dịchaghị mfe ịkọwa ezi àmà nile ụmụnna anyị gbara n’oge ndị ahụ a na-ekpe ikpe. Ọtụtụ na-abịa n’ụlọikpe iji hụ otú e si ekpe ikpe ndị ahụ nakwa iji wusie ụmụnna ha ndị e boro ebubo ike. N’oge e nwere ọnụ ọgụgụ okwu ikpe kasị elu, agụtara m ihe ruru iri puku mmadụ atọ bịara iwusi ụmụnna ha ike n’otu afọ. Nke ahụ bụ nnọọ oké ìgwè nke Ndịàmà!

Ọrụ Ọhụrụ

Ka ọ na-erule 1989, a kagbuola iwu ahụ a machibidoro ọrụ anyị. Afọ atọ ka nke a gasịrị, e wuru alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ma rara ya nye. A kpọrọ m òkù iso Ụlọ Ọrụ Na-enye Ihe Ọmụma Maka Ụlọ Ọgwụ rụkọọ ọrụ, ejikwa m obi ụtọ nakwere ya. N’ịrụ ọrụ dị ka otu òtù nke mmadụ atọ mejupụtara, anyị kwadoro ụmụnna anyị na-eche okwu metụtara ọbara ihu ma nyere ha aka ịgbachitere okwukwe ha dabeere n’akọ na uche Ndị Kraịst ha.—Ọrụ 15:29.

Mụ na nwunye m nwere nnọọ ekele maka ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi site n’ikwusa ozi ọma. Nela na-akwado m ma na-agba m ume mgbe nile. Obi na-adị m ụtọ mgbe nile na ọ dịtụghị mgbe o mere mkpesa na m hapụrụ ya na-arụ ọrụ ọchịchị Chineke, ma ọ bụ mgbe a tụrụ m mkpọrọ. N’oge ndị siri ike, ọ kasiri ndị ọzọ obi kama inwe nkụda mmụọ.

Dị ka ihe atụ, na 1974, e jidere mụ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ndị ọzọ. Ụfọdụ ụmụnna ndị matara ihe merenụ chọrọ iji akọ kọọrọ ya nwunye m. Mgbe ha hụrụ ya, ha gwara ya, sị, “Nwanna Nwanyị Nela, nke ka njọ emeela.” Na mbụ, ezigbo ụjọ jidere ya n’ihi na o chere na m anwụọla. Mgbe ọ matara ihe merenụ n’ezie, o kudara ume ma kwuo, sị: “Ọ dịdị ndụ! Nke ahụ abụghịnụ nke mbụ ọ na-aga mkpọrọ.” Ụmụnna ahụ mesịrị gwa m na obi ike ya masịrị ha nke ukwuu.

Ọ bụ ezie na anyị nwere ahụmahụ ụfọdụ na-egbu mgbu n’oge ndị gara aga, Jehova akwụghachiwo anyị ụgwọ n’ụba n’ihi ije ije n’ụzọ ya. Lee obi ụtọ anyị nwere na nwa anyị nwanyị bụ́ Lidia na di ya, bụ́ Alfred DeRusha, egosipụtawo na ha bụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị nṅomi. Ha zụlitere ụmụ ha ndị nwoke, bụ́ Christopher na Jonathan, ịghọ ndị ohu Chineke raara onwe ha nye, nke ahụ na-ewetakwuru anyị obi ụtọ. Nwanne m nwoke, bụ́ Ryszard, na nwanne m nwanyị, bụ́ Urszula, abụwokwa Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ.

Ọ dịbeghị mgbe Jehova gbahapụrụ anyị, anyị chọkwara iji obi anyị dum nọgide na-ejere ya ozi. Anyị achọpụtawo n’onwe anyị na okwu ahụ dị n’Abụ Ọma 37:34 bụ eziokwu, bụ́ nke na-asị: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, Ọ ga-ebulikwa gị inweta ala.” Anyị ji obi anyị nile na-atụ anya oge ahụ.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ná mgbakọ e nwere n’ogige otu nwanna nke dị na Karaków, 1964

[Foto dị na peeji nke 18]

Mụ na nwunye m, bụ́ Nela, na nwa anyị nwanyị, bụ́ Lidia, 1968

[Foto dị na peeji nke 20]

Anyị na otu nwata nwoke bụ́ Onyeàmà tupu a waa ya obi n’ejighị ọbara

[Foto dị na peeji nke 20]

Mụ na Nela, 2002

[Foto dị na peeji nke 20]

Mụ na Dr. Wites, bụ́ onyeisi ndị dọkịta na-awa ụmụaka obi n’ejighị ọbara, n’otu ụlọ ọgwụ dị na Katowice