Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Okwu ahụ bụ́ “ma eleghị anya” nke dị na Zefanaịa 2:3 ọ̀ pụtara na ndị ohu Chineke ejighị n’aka na ha ga-enweta ndụ agwụghị agwụ?

Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-agụ, sị: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” Gịnị mere amaokwu a ji sị “ma eleghị anya”?

Iji ghọta otú Jehova ga-esi mesoo ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi n’Amagedọn, ọ dị mkpa icheta ihe Bible na-akụzi banyere ihe Chineke ga-emere ndị nwụrụ tupu oge ikpe ahụ. A ga-akpọlite ụfọdụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ ịbụ ndị mmụọ n’eluigwe, ebe a ga-akpọlite ndị ọzọ n’ụwa n’atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs. (Jọn 5:28, 29; 1 Ndị Kọrint 15:53, 54) Ọ bụrụ na Jehova ga-echeta ma kwụghachi ndị ya na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị nwụrụ tupu Amagedọn ụgwọ, ọ ga-akwụghachirịrị ndị ohu ya bụ́ ndị dị ndụ n’ụbọchị iwe ya ụgwọ.

Okwu Pọl onyeozi dere n’ike mmụọ nsọ bụkwa ihe na-agba ume. O dere, sị: “[Chineke] chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ mgbe o wetara iju mmiri n’elu ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke; sitekwa n’ime ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, ọ mara ha ikpe, . . . ọ gbapụtakwara onye ezi omume bụ́ Lọt, . . . Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa, ma na-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee gbupụ ha.” (2 Pita 2:5-9) Ọ bụ ezie na Jehova bibiri ndị ajọ omume n’oge ndị gara aga, o chebere ma Noa ma Lọt, bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere ya ozi. Jehova ga-anapụtakwa ndị na-asọpụrụ ya mgbe ọ ga-ebibi ndị ajọ omume n’Amagedọn. “Oké ìgwè mmadụ” nke ndị ezi omume ga-alanahụ.—Mkpughe 7:9, 14.

Mgbe ahụ, o yiri ka ọ̀ bụ na e jighị “ma eleghị anya” mee ihe na Zefanaịa 2:3 iji gosi na e jighị n’aka na Chineke ga-echebeli ndị nwere ihu ọma ya. Kama nke ahụ, mmadụ ịbụ onye e chebere n’ụbọchị iwe Jehova na-aghọ ihe pụrụ ime eme nanị mgbe onye ahụ malitere ịchọ ezi omume na umeala n’obi. A ga-echebe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-achọ umeala n’obi na ezi omume.—Zefanaịa 2:3.

[Foto dị na peeji nke 31]

“Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa”