Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Otú Bible Si Gbanwee Nwoke A

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Otú Bible Si Gbanwee Nwoke A

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

Tupu Ya Amalite na Mgbe Ọ Malitesịrị—Otú Bible Si Gbanwee Nwoke A

EGWÚ bụ ihe kachasị Rolf-Michael mkpa ná ndụ. Ọgwụ ọjọọ riri ya ahụ́. Dị ka onye ntorobịa na Germany, ọ na-aṅụ oké mmanya ma na-eji ọgwụ LSD, cocaine, hashish, na ọgwụ ndị ọzọ na-akpaghasị uche eme ihe n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa.

E jichiri Rolf-Michael ka ọ na-agbalị ibubata ọgwụ ọjọọ n’otu mba Africa, ọ nọkwara ọnwa 13 n’ụlọ mkpọrọ. Oge ndị ahụ ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ nyere ya ohere iche echiche banyere ihe bụ́ nzube nke ndụ n’ezie.

Rolf-Michael na nwunye ya, bụ́ Ursula, chọsiri ihe bụ́ nzube nke ndụ nakwa eziokwu ahụ ike. N’agbanyeghị ahụmahụ na-adịghị mma ndị ha nwere na chọọchị ndị a sị na ha bụ nke Ndị Kraịst, ha nwere ọchịchọ siri ike ịmata banyere Chineke. Ma ha nwere ọtụtụ ajụjụ, ha enwetaghịkwa azịza ndị na-eju afọ site n’òtù okpukpe dịgasị iche iche. Ọzọkwa, okpukpe ndị a emeghị ka ha nwee mkpali siri ike iji gbanwee ndụ ha.

Rolf-Michael na Ursula mesịrị zute Ndịàmà Jehova. Mgbe Rolf-Michael malitesịrị ịmụ Bible, ndụmọdụ ahụ bụ́: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso,” kpaliri ya nnọọ nke ukwuu. (Jems 4:8) O kpebisiri ike ‘iyipụ ụdị mmadụ ochie ahụ bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ o si eme omume n’oge gara aga ma yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’—Ndị Efesọs 4:22-24.

Olee otú Rolf-Michael pụrụ isi yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ? E gosiri ya site na Bible na ‘a pụrụ isite n’ezi ihe ọmụma’ mee ka àgwà mmadụ “dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị,” ya bụ, Jehova Chineke.—Ndị Kọlọsi 3:9-11.

Ka Rolf-Michael na-anara ezi ihe ọmụma, ọ gbalịrị ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke. (Jọn 17:3) O siiri Rolf-Michael ike ịkwụsi iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ma ọ hụrụ abamuru nke ịgakwuru Jehova n’ekpere na inweta enyemaka ya. (1 Jọn 5:14, 15) O nwetakwuru enyemaka site n’iso ndị ghọworo Ndịàmà Jehova bụ́ ndị na-agbalịsi ike ime uche Chineke na-akpachi anya.

Ịmata na ụwa na-agabiga, nakwa na ndị na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi nyekwaara Rolf-Michael aka. O nyeere ya aka ịhọrọ, ọ bụghị ịhụnanya ụwa nke na-agaghị adịte aka, kama ngọzi na-adịru ebighị ebi nke iso Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova na-enwe mkpakọrịta chiri anya. (1 Jọn 2:15-17) Okwu dị n’Ilu 27:11 bụ́: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu” metụrụ Rolf-Michael n’ahụ́ nke ukwuu. O jiri ekele kwuo, sị: “Amaokwu a na-egosi otú Jehova hụruru ụmụ mmadụ n’anya, ebe o nyere ụmụ mmadụ ohere ime ka obi ya ṅụrịa.”

Dị ka Rolf-Michael, nwunye ya na ụmụ ha atọ, ọtụtụ narị puku mmadụ eritewo uru site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible. A pụrụ ịchọta mmadụ ndị dị otú ahụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. N’ụzọ dị mwute, ná mba ụfọdụ a na-ebo Ndịàmà ebubo ụgha ịbụ òtù dị ize ndụ nke na-ekewa ezinụlọ. Ahụmahụ Rolf-Michael gosiri na nke ahụ abụghị eziokwu.—Ndị Hibru 4:12.

Rolf-Michael na-ekwu na Matiu 6:33, bụ́ nke na-agba anyị ume ibute nchụso ihe ime mmụọ ụzọ, bụ “ihe nduzi” ezinụlọ ya, nke na-eduzi ha ịga n’ụzọ ziri ezi. Ya na ezinụlọ ya nwere ekele miri emi n’ebe Jehova nọ n’ihi ndụ ezinụlọ obi ụtọ ha na-anụ ụtọ ya dị ka Ndị Kraịst. Ha na-enwe mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “M̀ ga-esi aṅaa nyeghachi Jehova mmeso ọma Ya nile O mesoworo m?”—Abụ Ọma 116:12.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Chineke na-enye ụmụ mmadụ ohere ime ka obi ya ṅụrịa

[Igbe dị na peeji nke 9]

Ụkpụrụ Bible Ndị Nọ n’Ọrụ

Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ụkpụrụ Bible ndị kpaliworo ọtụtụ ndị ịkwụsị iji ihe ndị na-emerụ emerụ na-eri ahụ́ eme ihe:

“Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) Mgbe e mesịrị ka mmadụ mata ịdị njọ nke omume ndị na-akpata ọnwụ, ya azụlitekwa ezi ịkpọasị maka ha, ọ pụrụ ịdịkwuru ya mfe ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.

“Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Iji zere iji ọgwụ ọjọọ na ihe ndị ọzọ na-eri ahụ́ eme ihe, ọ dị mmadụ mkpa iji nlezianya họrọ ndị ya na ha ga na-akpakorịta. Ịghọ enyi Ndị Kraịst bụ́ ndị ga-akwado mkpebi ya ga-aba uru n’ezie.

“Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) A pụghị iji ihe ọ bụla ọzọ tụnyere udo nke obi na nke uche dị otú ahụ. Ịdaberekwa n’ebe Jehova nọ site n’ekpere na-enyere mmadụ aka ịnagide nsogbu nke ndụ n’ejighị ọgwụ na-eri ahụ́ eme ihe.