Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Dị Ukwuu Karịa Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Ijipt

Ihe Dị Ukwuu Karịa Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Ijipt

Ihe Dị Ukwuu Karịa Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Ijipt

MOZIS so ná ndị kasị ukwuu ná ndị nile a kọrọ banyere ha n’akụkọ ihe mere eme. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nanị banyere otú Chineke si mesoo ndị Izrel ihe n’okpuru idu ndú Mozis ka a kọrọ n’akwụkwọ anọ nke Bible—site n’Ọpụpụ ruo Deuterọnọmi. Ọ bụ ya duziri Ọpụpụ ụmụ Izrel site n’Ijipt, bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ma duruo ha n’ọnụ Ala Nkwa ahụ. A zụlitere Mozis n’ezinụlọ Fero, ma ọ ghọrọ onye a họpụtara ịbụ onye ndú nke ndị Chineke nakwa onye amụma, onyeikpe, na onye edemede Chineke nyere mmụọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ ‘ọ dịkwa umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.’—Ọnụ Ọgụgụ 12:3.

Ihe ka ukwuu n’ihe Bible kọrọ banyere Mozis metụtara afọ 40 ikpeazụ nke ndụ ya, site mgbe a tọhapụrụ Izrel n’ịbụ ohu ruo mgbe Mozis nwụrụ ka ọ dị afọ 120. Malite mgbe ọ dị afọ 40 ruo 80, ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ na Midian. Ma, ka otu akwụkwọ na-ekwu, “ikekwe akụkụ kasị akpali mmasị ná ndụ ya, ma bụrụkwa nke a kasị kọọ ihe dị nta banyere ya,” bụ afọ 40 mbụ ya, malite mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ gbapụrụ n’Ijipt. Gịnịdị ka anyị pụrụ ịghọta banyere oge ahụ? Olee otú ọnọdụ ndị a zulitere Mozis na ha pụrụ isiwo metụta ụdị mmadụ o mesịrị bụrụ? Ihe ndị dị aṅaa pụrụ inwewo mmetụta n’ebe ọ nọ? Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ọ na-aghaghị ichewo ihu? Gịnịkwa ka ihe a nile pụrụ ịkụziri anyị?

Ịbụ Ohu n’Ijipt

Akwụkwọ Ọpụpụ na-akọ na otu Fero malitere ịtụ ndị Izrel bi n’Ijipt egwu n’ihi mmụba ha. N’iche na ọ na-eme ihe dị ka ‘onye maara ihe,’ ọ nwara ibelata ọnụ ọgụgụ ha site n’iji obi ọjọọ na-amanye ha ịrụ ọrụ dị ka ndị ohu n’okpuru nlekọta nke ndị isi ọrụ ji ụtarị achịkwa ha—ha na-ebu ibu arọ, na-akpụ ụrọ, ma na-akpụzu brik ole a chọrọ n’aka ha kwa ụbọchị.—Ọpụpụ 1:8-14; 5:6-18.

Nkọwa a e nyere banyere Ijipt, bụ́ ebe a mụrụ Mozis, kwekọrọ nnọọ n’ihe àmà nke akụkọ ihe mere eme. Papaịrọs oge ochie nakwa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ihe e sere n’otu ili, kọwara otú ndị ohu si jiri ụrọ na-akpụ brik na narị afọ iri nke abụọ T.O.A. ma ọ bụ tupu mgbe ahụ. Ndị isi ọrụ ọ bụ ọrụ ha inye brik na-ahazi ọtụtụ narị ndị ohu gaa n’ìgwè dị iche iche nke ihe mejupụtara ha bụ site na mmadụ 6 ruo 18 nke otu onye isi ọrụ ma ọ bụ onye nduzi na-elekọta. A ghaghị igwupụta ụrọ e ji akpụ brik ma buru okporo ọka buga n’ebe a na-anọ akpụ brik. Ndị ọrụ si ná mba dị iche iche na-ekute mmiri, ma jiri ọgụ na-agwakọta ya na ụrọ na okporo ọka. A na-eji ihe nwere akụkụ anọ e ji akpụ brik akpụpụta imerime brik. Ndị ọrụ na-ejizi yok buru brik ndị kpọrọ akpọ gaa n’ebe a na-ewu ihe owuwu, bụ́ ebe e si ebe kpọdara akpọda aga mgbe ụfọdụ. Ndị nlekọta bụ́ ndị Ijipt, ndị ji mkpara, na-anọdụ ala ma ọ bụ na-agagharị agagharị ka ha na-elekọta ọrụ ahụ.

Otu akwụkwọ e ji agbakọ ihe n’oge ochie zoro aka na brik 39,118 nke ndị ọrụ 602 kpụrụ, bụ́ nke pụtara na ná nkezi, otu onye kpụrụ brik 65 tupu onye ọzọ agbanwee ya. Otu akwụkwọ e dere na narị afọ nke 13 T.O.A. na-ekwukwa, sị: “Ndị ahụ na-akpụpụta . . . brik ole ha kwesịrị ịkpụpụta kwa ụbọchị.” Ihe a nile kwekọrọ nnọọ n’ọrụ e nyere ndị Izrel iwu ịrụ dị ka e dekọrọ ya n’akwụkwọ Ọpụpụ.

Mmegbu ebelatalighị ọnụ ọgụgụ ndị Hibru. Kama nke ahụ, “ka [ndị Ijipt] na-eweda ha ala, otú a ka ha na-aba ụba . . . Ike wee gwụsịa ha n’ihi ụmụ Israel.” (Ọpụpụ 1:10, 12) N’ihi ya, Fero bu ụzọ nye ndị Hibru na-ele nwa iwu igbu nwa ọhụrụ ọ bụla bụ́ nwoke bụ́ onye Izrel, e mesịa, ya enyekwa ndị ya nile iwu ime otu ihe ahụ. N’ọnọdụ a na-eyi egwu, Jokebed na Amram mụrụ ọmarịcha nwa nwoke, bụ́ Mozis.—Ọpụpụ 1:15-22; 6:20; Ọrụ 7:20.

E Zoro Ya, Chọta Ya, Ma Kuchie Ya

Ndị mụrụ Mozis leghaara iwu igbu ọchụ nke Fero anya ma zoo nwa ha nwoke. Hà mere otú ahụ n’agbanyeghị na ndị nledo na-agagharị site n’ụlọ ruo n’ụlọ ịma ma ha ga-ahụ ụmụ ọhụrụ? Anyị ejighị nke ahụ n’aka. Otú o sina dị, mgbe ọnwa atọ gasịrị, ndị mụrụ Mozis apụghịzi izo ya. N’ihi ya, nne ya obi koro n’elu jiri papaịrọs mee nkata, were pitch tee ya ka mmiri ghara ịba ya, ma kunye nwa ya n’ime ya. N’otu echiche, Jokebed rubere isi n’ihe e kwuru n’iwu Fero, ma ọ bụrụ na ọ bụghịdị ihe mere e ji nye iwu ahụ, bụ́ ka a tụnye nwa ọhụrụ Hibru ọ bụla bụ́ nwoke n’ime Naịl. Miriam, bụ́ nwanne Mozis nke nwanyị tọrọ ya, anọrọzie nso iji na-eche ya nche.—Ọpụpụ 1:22–2:4.

Anyị amaghị ma Jokebed ò bu n’uche ka ada Fero hụ Mozis mgbe ọ ga-abịa ná mmiri ahụ ịsa ahụ́, ma nke ahụ bụ ihe merenụ. Adaeze ahụ matara na nwata ahụ bụ nwa ndị Hibru. Gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ ga-enye iwu ka e gbuo ya n’irubere nna ya isi? Ee e, o mere ihe ọtụtụ ndị inyom ga-eme. O mere ihe n’ụzọ ọmịiko.

N’oge na-adịghị anya, Miriam bịakwutere ya. ‘M̀ ga-eje kpọọrọ gị nwanyị Hibru ka o nyere gị nwa a ara?’ ka ọ jụrụ. Ụfọdụ ndị weere ajụjụ a dị ka ajụjụ aghụghọ. Ihe nwanne nwanyị Mozis jụrụ dị iche n’ihe Fero zubere, bụ́ onye ya na ndị ndụmọdụ ya kpara nkata imeso ndị Hibru ihe dị ka “ndị maara ihe.” N’ezie ọ bụ nanị mgbe adaeze ahụ kweere atụmatụ nwanne nwanyị Mozis ka e jidere n’aka na ọ ga-adịrị Mozis ná mma. “Jee,” ka ada Fero zaghachiri, ozugbo ahụ, Miriam gara kpọọ nne ya. Mgbe ha nwesịrị nkwekọrịta dị ịrịba ama, e goro Jokebed ọrụ ịzụlite nwa ya n’okpuru nchebe nke eze.—Ọpụpụ 2:5-9.

N’ezie, ọmịiko nke adaeze ahụ dị nnọọ iche n’obi ọjọọ nke nna ya. Ọ bụghị na ọ maghị banyere nwa ahụ ma ọ bụ na a ghọgburu ya. Ọmịiko sitere n’obi kpaliri ya ikuchi ya, ya ikwerekwa ka a kpọọ onye Hibru na-enye nwa ara gosiri na o nweghị ajọ mbunobi nke nna ya.

Nzụlite na Agụmakwụkwọ

Jokebed “wee kuru nwa ahụ, nye ya ara. Nwa ahụ wee too etoo, nne ya wee mee ka ọ bịakwute nwa nwanyị Fero, o wee ghọọrọ ya nwa nke ya.” (Ọpụpụ 2:9, 10) Bible ekwughị ogologo oge Mozis na ndị mụrụ ya biri. Ụfọdụ chere na ọ ghaghị ịbụ, ma ọ dịkarịa ala, ruo mgbe a napụrụ ya ara—afọ abụọ ma ọ bụ atọ—ma ọ pụrụ ịkarịwo otú ahụ. Akwụkwọ Ọpụpụ sịrị nanị na ‘o toro’ n’aka nne na nna ya, bụ́ nke pụrụ ịpụta iru afọ ndụ ọ bụla. Otú o sina dị, obi abụọ adịghị ya na Amram na Jokebed ji oge ahụ mee ka nwa ha nwoke mara na ọ bụ onye Hibru ma kụziere ya banyere Jehova. Ọ bụ nanị ka oge na-aga ka a ga-amata otú ha nweruru ihe ịga nke ọma n’ịkụnye okwukwe na ịhụnanya maka ezi omume n’obi Mozis.

Mgbe a kpọghachiiri ada Fero Mozis, a kụziiri ya ihe “n’amamihe nile nke ndị Ijipt.” (Ọrụ 7:22) Nke ahụ pụrụ ịbụ ọzụzụ e nyere iji mee ka Mozis ruo eruo maka ọkwá ọchịchị. Ọtụtụ ihe ndị a na-amụ n’Ijipt gụnyere mgbakọ na mwepụ, otú e si atụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ịtụ ụkpụrụ ụlọ, iwu ihe owuwu, na nkà na ihe ọmụmụ sayensị ndị ọzọ. Eleghị anya, ezinụlọ eze gaara achọwo ka a kụziere ya ihe banyere okpukpe ndị Ijipt.

Ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ Mozis na ụmụ eze ndị ọzọ nwetara ihe ùgwù agụmakwụkwọ. Ndị so rite uru n’agụmakwụkwọ ndị oké ozu dị otú ahụ bụ “ụmụ nke ndị eze ala ọzọ bụ́ ndị e zitere ma ọ bụ kpọta n’Ijipt dị ka ndị e ji eji, iji ‘zụọ ha’ ma kpọghachizie ha ịchị dị ka ndị eze nọ n’okpuru” Fero. (The Reign of Thutmose IV, nke Betsy M. Bryan dere) O yiri ka ụlọ akwụkwọ ọta akara ndị bụ́ maka ndị na-arụ n’obí eze ọ̀ kwadebere ndị ntorobịa ịrụ ọrụ n’obí eze. * Ihe ndị e dere n’oge e nwere Alaeze Etiti na Alaeze Ọhụrụ n’Ijipt na-ekpughe na ọtụtụ n’ime ndị ozi Fero na ndị nọ n’ọkwá dị elu n’ọchịchị nọgidere na-aza utu aha dị ùgwù bụ́ “Nwa Ụlọ Akwụkwọ Ọta Akara” ọbụna mgbe ha toworo ogo mmadụ.

Ụdị ndụ a na-ebi n’obí eze ga-anwale Mozis. Ọ na-eme ka mmadụ nwee akụ̀ na ụba, ike, ma na-ebi ndụ okomoko. O nwekwara ihe ndị pụrụ imebi omume ọma. Olee otú Mozis ga-esi emeghachi omume? Ònye ka ọ ga-eguzosi ike n’ihe nye? Ọ̀ bụ n’ezie onye na-efe Jehova, nwanne ndị Hibru a na-emegbu emegbu, ka ọ̀ họọrọ ịnọ na-enweta ihe nile ọ pụrụ inweta n’Ijipt na-ekpere arụsị?

Mkpebi Dị Mkpa

Mgbe Mozis dị afọ 40, bụ́ mgbe ọ gaara aghọwo ezigbo onye Ijipt, ọ ‘pụrụ iji lee ibu ụmụnne ya na-ebu.’ Ihe ndị o mesịrị mee gosiri na ihe ọ gara abụghị nanị ịga lee ha; ọ gụsiri ya agụụ ike inyere ha aka. Mgbe ọ hụrụ ka onye Ijipt na-eti onye Hibru ihe, o tinyere aka, ma gbuo onye mmegbu ahụ. Ihe ahụ Mozis mere gosiri na obi ya dị n’ebe ụmụnne ya nọ. Eleghị anya, nwoke ahụ nwụrụ anwụ bụ onye isi ọrụ, onye e gburu ka ọ na-arụ ọrụ ya. N’anya ndị Ijipt, Mozis nwere ọtụtụ ihe mere ọ ga-eji guzosie ike n’ihe nye Fero. Ma, ihe kpaliri Mozis bụkwa ịhụnanya maka ikpe ziri ezi, bụ́ àgwà o gosipụtakwuru n’echi ya mgbe ọ jụrụ onye Hibru na-eti nwanne ya ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ihe o ji eme otú ahụ. Mozis chọrọ ịtọhapụ ndị Hibru n’ajọ ịgba ohu, ma mgbe Fero matara banyere nnupụisi ya ma nwaa igbu ya, a manyere Mozis ịgbaga Midian.—Ọpụpụ 2:11-15; Ọrụ 7:23-29. *

Oge Mozis chọrọ ịtọhapụ ndị Chineke ekwekọghị na nke Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, omume ya kpughere na o nwere okwukwe. Ndị Hibru 11:24-26 na-ekwu, sị: “Site n’okwukwe, Mozis, mgbe o tolitere, jụrụ ịbụ onye a kpọrọ nwa ada Fero, na-ahọrọ ịbụ onye a na-emeso ya na ndị Chineke n’ụzọ ọjọọ kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge.” N’ihi gịnị? “N’ihi na o weere nkọcha nke Kraịst ahụ dị ka akụ̀ dị ukwuu karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt; n’ihi na o legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.” Ojiji a e ji okwu bụ́ “Kraịst ahụ,” bụ́ nke pụtara “onye e tere mmanụ,” mee ihe n’ụzọ pụrụ iche kwesịịrị Mozis n’echiche na o mesịrị nata ọrụ pụrụ iche kpọmkwem site n’aka Jehova.

Cheedị banyere nke ahụ! A zụlitere Mozis n’ụzọ e si azụlite nanị ndị Ijipt si n’ezinụlọ ndị oké ozu. Ọnọdụ ya nyere ohere inwe ọrụ bụ́ ịgba na ihe ụtọ ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche, ma ọ jụrụ ha nile. Ọ pụghị ịhụ njikọ dị n’etiti ọrụ ya n’obí eze Fero na ịhụnanya o nwere maka Jehova na ikpe ziri ezi. Ịmara banyere nkwa Chineke kwere ndị nna nna ya bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb na ịtụgharị uche na ha, dugara Mozis n’ịhọrọ inweta ihu ọma Chineke. N’ihi ya, Jehova jiri Mozis rụọ ọrụ dị oké mkpa iji mezuo nzube Ya.

Anyị nile nwere nhọrọ ime banyere ihe ndị kasị mkpa. Dị ka Mozis, eleghị anya i nwere mkpebi siri ike ime. Ị̀ pụrụ ịhapụ omume ụfọdụ ma ọ bụ uru ndị o doro anya na ị ga-enweta, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu? Ọ bụrụ na nke ahụ bụ nhọrọ na-eche gị ihu, cheta na Mozis weere ịbụ enyi Jehova dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa karịa akụ̀ nile dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt, ọ kwaghịkwa ụta.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Ọ pụrụ ịbụ na ọzụzụ a yiri nke ahụ Daniel na ndị enyi ya nwetara iji rụọ ọrụ ọchịchị na Babilọn. (Daniel 1:3-7) Tụlee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, isi nke 3, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 20 Mozis gosikwuru na ya na-anụ ọkụ n’obi maka ikpe ziri ezi site n’ịnapụta ndị inyom bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-apụghị ịzọ onwe ha pụọ ná mmegbu na Midian, bụ́ ebe ọ gbagara.—Ọpụpụ 2:16, 17.

[Igbe dị na peeji nke 11]

Nkwekọrịta nke Inye Nwa Ara

Dị ka o kwesịrị, ndị nne na-enye nwa ha ara. Otú ọ dị, ka ọkà mmụta bụ́ Brevard Childs na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ Journal of Biblical Literature, “n’ọnọdụ ụfọdụ, n’etiti ezinụlọ ndị oké ozu [ná nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ], a na-ego onye na-enye nwa ara ego. A na-emekarịkwa nke a n’ebe nne na-enweghị ike ịzụ nwa ya ma ọ bụ n’ebe a na-amaghị onye bụ́ nne nwa ahụ. Onye ahụ na-elekọta nwa na-ewere ibu ọrụ nke ịzụlite nwa ahụ na inye ya ara ruo oge ụfọdụ a kpọrọ aha.” Ọtụtụ papaịrọs e ji dejupụta nkwekọrịta inye nwa ara adịgidewo n’ihe mgbe ochie ndị a na-ahụ na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Akwụkwọ ndị a na-agba akaebe banyere ihe a na-eme n’ọtụtụ ebe malite n’oge ndị Sumer ruo n’oge ọchịchị ndị Gris n’Ijipt. Ihe ndị a na-ede n’akwụkwọ ndị a na-abụkarị ihe ndị ndị o metụtara kwuru, oge nkwekọrịta ahụ ga-ewe, ihe ndị a ga-arụ, ihe ụfọdụ banyere otú a ga-esi azụ nwa ahụ, nhá a ga-eri maka imebi nkwekọrịta ahụ, ego ole a ga-akwụ, na otú a ga-esi kwụọ ya. ‘Ilekọta nwa na-ewekarị ihe karịrị afọ abụọ ma ọ bụ atọ,’ ka Childs na-akọwa. “Onye ahụ na-enye nwa ara na-azụlite nwa ahụ n’ụlọ ya, ma mgbe ụfọdụ, a na-achọ ka ọ kpọghachiri onye nwe nwa ahụ nwa ya ka o mee nnyocha.”

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Ịkpụ brik n’Ijipt agbanwechabeghị site n’otú ọ dị n’oge Mozis, dị ka e gosiri n’otu ihe e sere n’oge ochie

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

N’elu: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.; n’okpuru: Erich Lessing/Art Resource, NY