Daniel 1:1-21

  • Ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem (1, 2)

  • E nyere iwu ka a zụọ ụmụaka si n’ezinụlọ eze (3-5)

  • A nwalere ụmụaka Hibru anọ (6-21)

1  N’afọ nke atọ n’ọchịchị Jehoyakim+ Eze Juda, Nebukadneza Eze Babịlọn bịara Jeruselem nọchibido ya.+  Ka oge na-aga, Jehova nyefere Jehoyakim Eze Juda n’aka Nebukadneza.+ Nebukadneza bukwaara ụfọdụ n’ime arịa ndị dị n’ụlọ* ezi Chineke ma buga ha na Shaịna,*+ n’ụlọ chi ya. O busara arịa ndị ahụ n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ chi ya.+  Eze wee gwa Ashpenaz, onyeisi ndị na-eje ozi n’obí ya, ka ọ kpọta ụfọdụ n’ime ndị Izrel, ma ndị si n’ezinụlọ eze ma ụmụ ndị a ma ama.+  Ha ga-abụ ụmụaka na-enweghị nkwarụ ọ bụla, ndị mara mma, ndị ma ihe nke ọma, ndị nwere ọgụgụ isi, ndị na-aghọtakwa ihe.+ Ha ga-abụkwa ndị nwere ike ije ozi n’obí eze. Ọ ga-akụziri ha otú e si ede na otú e si asụ asụsụ ndị Kaldia.  Eze nyekwara iwu ka e si n’ihe oriri a na-enye eze nakwa ná mmanya ọ na-aṅụ na-enye ụmụaka ndị ahụ nri na mmanya kwa ụbọchị. A ga-azụ ha afọ atọ. Afọ atọ ahụ gwụ, ha ga-amalite ijere eze ozi.  Ụfọdụ n’ime ụmụaka ahụ si n’ebo Juda.* Ha bụ Daniel,*+ Hananaya,* Mishel,* na Azaraya.*+  Onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze gbanwere aha ha.* Ọ gụrụ Daniel Belteshaza,+ gụọ Hananaya Shedrak, gụọ Mishel Mishak, gụọ Azaraya Abednego.+  Ma Daniel kpebisiri ike n’obi ya na ya agaghị eri nri eze ma ọ bụ ṅụọ mmanya ọ na-aṅụ maka na ha ga-emerụ ya. N’ihi ya, ọ rịọrọ onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze ka o kwe ka ya ghara iri ihe ndị ahụ ga-emerụ ya.  Ezi Chineke wee mee ka onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze nweere Daniel obiọma ma meere ya amara.+ 10  Ma onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze sịrị Daniel: “M na-atụ onyenwe m eze egwu. O kwuru ihe unu ga na-eri na ihe unu ga na-aṅụ. Ọ bụrụkwanụ na ọ hụ na unu adịghị mma n’anya otú ụmụaka ndị ọgbọ unu dị? Eze ga-ewerezi m ka onye ikpe mara.” 11  Ma Daniel gwara onye na-elekọta ha, ya bụ, onye onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze họpụtara ka ọ na-elekọta Daniel, Hananaya, Mishel, na Azaraya, sị: 12  “Biko, ka a na-enye anyị akwụkwọ nri* ka anyị na-eri nakwa mmiri ka anyị na-aṅụ, ka a hụzie ihe ga-eme ná ngwụcha ụbọchị iri. 13  Ụbọchị iri gachaa, jiri otú anyị dị tụnyere otú ụmụaka ndị na-eri nri eze dị, jirizie ihe ị ga-ahụ kpebie ihe ị ga-eme anyị.” 14  Onye ahụ na-elekọta ha kwetara ihe ha kwuru ma nye ha ụbọchị iri ka ọ hụ ihe ga-eme. 15  Mgbe ụbọchị iri ahụ gachara, ahụ́ dị ha mma, ha bukwara ibu karịa ụmụaka niile ndị nọ na-eri nri eze. 16  Onye ahụ na-elekọta ha wee na-enye ha akwụkwọ nri kama inye ha nri na mmanya eze kwuru ka a na-enye ha. 17  Ezi Chineke mere ka ụmụaka anọ a nwee ọgụgụ isi, ka ha na-aghọta ihe dị iche iche e dere ede* nakwa ka ha mara ihe. Daniel na-aghọtakwa ụdị ọhụụ ọ bụla na nrọ ọ bụla.+ 18  Mgbe oge eze kwuru ka a kpọta ha n’ihu ya ruru,+ onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze kpọtara ha n’ihu Nebukadneza. 19  Mgbe ha na eze kwuru okwu, e nweghị onye n’ime ha niile dị ka Daniel, Hananaya, Mishel, na Azaraya.+ Ha wee na-ejere eze ozi. 20  Mgbe ọ bụla eze jụrụ ha ihe a ga-eme n’okwu ọ bụla e kwesịrị iji amamihe na nghọta leba anya, ọ na-achọpụta na ihe ha na-aza na-eji okpukpu iri aka ihe ndị dibịa anwansi niile na ndị dibịa afa niile+ nọ n’ebe niile ọ na-achị na-aza mma. 21  Daniel nọgidekwara n’ebe ahụ ruo n’afọ nke mbụ n’ọchịchị Eze Saịrọs.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ụlọ nsọ.”
Ya bụ, Babịlonia.
Hananaya pụtara “Jehova Emeela Amara.”
Azaraya putara “Jehova Enyela Aka.”
O nwere ike ịbụ na Mishel pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”
Daniel pụtara “Chineke Bụ Onyeikpe M.”
Na Hibru, “bụ ụmụ Juda.”
Ya bụ, ọ gụrụ ha aha ndị Babịlọn.
O nwere ike ịbụ na okwu Hibru a sụgharịrị “akwụkwọ nri” pụtakwara ụdị mkpụrụ osisi dị iche iche na mkpụrụ ndị ọzọ a na-eri eri.
Ma ọ bụ “otú dị iche iche e si ede ihe.”