Chineke nke Hụrụ Anyị n’Anya Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi
Ị̀ chọrọ ibi n’ụwa nke a na-agaghị enwe agha, tigbuo zọgbuo na esemokwu na ya?
Ị̀ na-achọ ka ọrịa, ahụhụ na ọnwụ kwụsị?
Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịdị ndụ mgbe ị na-agaghịzi na-echegbu onwe gị?
Ị̀ chọrọ ibi ebe ọdachi ndị na-emere onwe ha na-agaghịzi akpa mkpamkpa ọ bụla?
Chineke, onye hụrụ anyị n’anya, na Onye kere ụwa anyị a mara mma kwere anyị nkwa na ya ga-eme ka anyị biri n’udo, obi ana-atọkwa anyị ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Nkwa a abụghị nkwa elu ọnụ.
N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-achọ ka ị tụlee:
Ihe gosiri na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya
Ihe Okwu Chineke gwara anyị
Ihe ndị amụma Chineke kwuru gbasara ihe ọma Chineke na-emere anyị na ndị ọ ga-emere anyị
Otú Chineke ga-esi enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ ugbu a nakwa n’ọdịnihu
Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ndi Chineke na-emere anyị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya.