Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke ji ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi dee Akwụkwọ Nsọ, otú ahụ onye ọchụnta ego na-eji odeakwụkwọ ya ede akwụkwọ ozi

Otú Chineke Si Mee Ka Anyị Mata Ọmarịcha Nkwa Ndị O Kwere Anyị

Otú Chineke Si Mee Ka Anyị Mata Ọmarịcha Nkwa Ndị O Kwere Anyị

Kemgbe Chineke kere mmadụ n’ụwa, o sila n’aka ndị mmụọ ozi na ndị amụma gwa ụmụ mmadụ okwu. O mekwara ka e dee okwu ya na nkwa ndị o kwere anyị edee. Chineke kwere anyị nkwa na anyị ga-enwe obi ụtọ n’ọdịnihu. N’ihi ya, olee ebe i nwere ike ịchọta nkwa ndị ahụ Chineke kwere anyị?

Nkwa ndi ahụ Chineke kwere anyị dị n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Timoti 3:16) Olee otu Chineke si jiri ndị amụma dee okwu ya? (2 Pita 1:21) Chineke gwara ndị dere okwu ya ihe ndị ọ chọrọ ka ha dee, ha edee ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye ọchụnta ego gwara odeakwụkwọ ya ka o deere ya akwụkwọ ozi, ọ bụ onye ọchụnta ego ahụ nwe akwụkwọ ozi ahụ. Otú ahụ ka ọ dị Chineke. Ọ bụ eziokwu na o ji ụmụ mmadụ dee okwu ya, ọ bụ uche ya ka e dere na ya.

OKWU CHINEKE ERUOLA ỌTỤTỤ NDỊ AKA TAA

Okwu Chineke dị ezigbo mkpa nke na ọ chọrọ ka mmadụ niile na-agụ ya ma na-aghọta ya. Taa, a na-ekwusara “mba niile na ebo niile na asụsụ niile,” “ozi ọma ebighị ebi” ya. (Mkpughe 14:⁠6) Chineke emeela ka e bipụta Akwụkwọ Nsọ n’ihe karịrị asụsụ puku atọ, ma ndị zuru ezu ma ndị na-ezughị ezu. E nweghị akwụkwọ ọzọ e bipụtarala otú a.