Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke nke Hụrụ Anyị n’Anya Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Chineke nke Hụrụ Anyị n’Anya Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi
  • Ị̀ chọrọ ibi n’ụwa nke a na-agaghị enwe agha, tigbuo zọgbuo na esemokwu na ya?

  • Ị̀ na-achọ ka ọrịa, ahụhụ na ọnwụ kwụsị?

  • Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịdị ndụ mgbe ị na-agaghịzi na-echegbu onwe gị?

  • Ị̀ chọrọ ibi ebe ọdachi ndị na-emere onwe ha na-agaghịzi akpa mkpamkpa ọ bụla?

Chineke, onye hụrụ anyị n’anya, na Onye kere ụwa anyị a mara mma kwere anyị nkwa na ya ga-eme ka anyị biri n’udo, obi ana-atọkwa anyị ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Nkwa a abụghị nkwa elu ọnụ.

N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-achọ ka ị tụlee:

  • Ihe gosiri na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya

  • Ihe Okwu Chineke gwara anyị

  • Ihe ndị amụma Chineke kwuru gbasara ihe ọma Chineke na-emere anyị na ndị ọ ga-emere anyị

  • Otú Chineke ga-esi enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ ugbu a nakwa n’ọdịnihu

Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ndi Chineke na-emere anyị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya.