Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịmata Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịmata Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

N’isiokwu ndị bú nke a ụzọ, anyị mụtara na ndị mmadụ chere na ọ bụ akara aka, ịgụ oké akwụkwọ, inwe ego, ma ọ bụkwanụ ịbụ ezigbo mmadụ ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’ọdịnihu. Ma, mmadụ ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ka ihe nwee ike dịrị ya ná mma n’ọdịnihu dị ka mmadụ ịhapụ ụzọ tinye isi n’ọhịa. Ma, ihe a ọ̀ pụtara na e nweghị ihe ọ bụla ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu? Mbanụ.

IHE SI N’AKA ONYE KACHA ANYỊ MARA IHE

Anyị chọọ ikpebi ihe anyị ga-eme, anyị na-agakarị ka onye tọrọ anyị, kakwa anyị mara ihe, nyere anyị aka. Ọ bụkwa ihe anyị kwesịrị ime ma anyị chọọ ịmata ihe ga-enyere anyị aka ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu. E nwere Onye tọgburu anyị atọgbu, kakwa anyị mara ihe e dere ihe o kwuru n’akwụkwọ e bidoro ide ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga. Aha akwụkwọ ahụ bụ Baịbụl.

Gịnị mere anyị ga-eji ekweta n’ihe Baịbụl kwuru? Ọ bụ maka na Onye o si n’aka tọrọ ndị niile nọ n’eluigwe na n’elu ụwa, kakwa ha mara ihe. Baịbụl kpọrọ ya “Onye Ochie ahụ,” sịkwa na ọ na-adị ndụ “ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 7:9; Abụ Ọma 90:2) Ọ bụ ya bụ “Onye kere eluigwe, Onye bụ́ ezi Chineke, Onye kere ụwa.” (Aịzaya 45:18) Ọ gwara anyị na aha ya bụ Jehova.—Abụ Ọma 83:18.

Baịbụl anaghị ekwu na otu agbụrụ ka ibe ya mma, n’ihi na ọ bụ Onye kere mmadụ niile ka o si n’aka. Ihe Baịbụl kwuru na-aba uru mgbe niile. O nyekwarala ọtụtụ ndị aka. E nwere ya n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ndị ọzọ, ọ bụkwa ya ka a kacha ekesa n’ụwa niile. * Ihe a mere na ndị nọ n’ebe ọ bụla n’ụwa nwere ike ịgụ ya, meekwa ihe e kwuru na ya. Ihe ndị a gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị:

“Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”—ỌRỤ NDỊOZI 10:34, 35.

Otú ahụ nne ma ọ bụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya si enyere ha aka, ka Jehova Chineke, bụ́ Nna hụrụ anyị n’anya, si eji Okwu ya bụ́ Baịbụl enyere anyị aka. (2 Timoti 3:16) Anyị kwesịrị ikweta n’ihe Baịbụl kwuru, n’ihi na ọ bụ Jehova kere anyị, ọ makwa ihe ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ.

Gịnị ka ị ga-eme ka ihe ọma ndị a ga-eme n’ọdịnihu ruo gị aka? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

^ par. 6 Ị chọọ ịmatakwu otú e si asụgharị Baịbụl na otú e si ekesa ya, gaa na jw.org, pịa IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie AKỤKỌ MERE EME NA BAỊBỤL.

^ par. 16 Ị chọọ ịmatakwu amụma ndị Baịbụl buru mezurunụ, gụọ isi nke 9 n’akwụkwọ The Bible—God’s Word or Man’s? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.jw.org. Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.