ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jenụwarị 2018

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Febụwarị 26 ruo Eprel 1, 2018.

HA JI OBI HA WEPỤTA ONWE HA

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Madagaska

Ihe a bụ ụfọdụ ụmụnna ndị wepụtara onwe ha iji kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile na Madagaska.

“Ọ Na-eme Ka Onye Ike Gwụrụ Nwee Ike”

Ka ọgwụgwụ na-eru nso, ihe ga na-esikwu ike. Isiokwu afọ 2018 na-echetara anyị ka anyị tụkwasị Jehova obi ka o nye anyị ike.

Ncheta Ọnwụ Jizọs Na-eme Ka Anyị Na-adị n’Otu

Olee otú Ncheta Ọnwụ Jizọs si eme ka ndị Chineke na-adịkwu n’otu? Olee mgbe a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ikpeazụ?

Gịnị Mere Anyi Ga-eji Enye Jehova Chineke Onyinye?

Otu ụzọ anyị si egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya bụ inye ya onyinye. Olee uru iji ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa asọpụrụ Jehova baara anyị?

Olee Ụdị Ịhụnanya Na-eme Ka Mmadụ Na-enwe Ezigbo Obi Ụtọ?

Olee ihe dị iche n’ịhụ Chineke n’anya na inwe ụdị ịhụnanya e kwuru na 2 Timoti 3:​2-⁠4? Ịmata azịza ajụjụ a nwere ike ime ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ.

Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe Ya

Olee ihe dị iche n’àgwà ndị na-anaghị efe Chineke n’oge ikpeazụ a na-akpa na àgwà ndị na-efe Chineke na-akpa?

Ị̀ Maara?

À na-eji ihe ndị e kwuru n’Iwu Mozis na-edozi okwu ndị mmadụ na-ese kwa ụbọchị n’Izrel oge ochie?