Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ncheta Ọnwụ Jizọs Na-eme Ka Anyị Na-adị n’Otu

Ncheta Ọnwụ Jizọs Na-eme Ka Anyị Na-adị n’Otu

‘Lee ka o si dị mma, . . . ibikọta ọnụ n’ịdị n’otu!’—ỌMA 133:1.

ABỤ: 18, 14

1, 2. Olee ihe a ga-eme n’afọ 2018 nke kacha eme ka anyị dịrị n’otu? N’ihi gịnịkwa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

N’ABALỊ iri atọ na otu n’ọnwa Mach afọ 2018, mgbe anyanwụ na-achọ ịda, Ndịàmà Jehova na ọtụtụ ndị ọzọ ga-ezukọta maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs ha na-eme kwa afọ. Ha ga-eme ya mgbe anyanwụ dachara. N’afọ ọ bụla, Ncheta Ọnwụ Jizọs kacha eme ka ndị Chineke n’ụwa niile na-adị n’otu.

2 Obi na-atọ Jehova na Jizọs ezigbo ụtọ ka ha na-ahụ ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs, ndị a mechaa pụọ, ndị ọzọ emee ruo ngwụcha ụbọchị ahụ. Baịbụl kwuru na “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta,” ga-eti mkpu, sị: “Nzọpụta anyị si n’aka Chineke anyị, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, nakwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpu. 7:9, 10) Ọ magburu onwe ya na kwa afọ, Ncheta Ọnwụ Jizọs na-eme ka ọtụtụ ndị na-asọpụrụ Jehova na Jizọs maka ihe ọma niile ha na-emere ha.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 E nwere ajụjụ ụfọdụ ndị a ga-aza n’isiokwu a. Ha bụ: (1) Olee  otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi akwadebe ma rite uru ma anyị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs? (2) Olee otú Ncheta Ọnwụ Jizọs si eme ka ndị Chineke na-adị n’otu? (3) Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme ka anyị na-adị n’otu? (4) Ò nwere mgbe a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ikpeazụ ya? Ọ bụrụ na o nwere, olee mgbe ọ ga-abụ?

OTÚ ANYỊ GA-ESI AKWADEBE MA RITE URU MA ANYỊ GAA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

4. Gịnị mere anyị ga-eji gbalịsie ike iji gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

4 Ọ dị mma ka anyị chebara ihe mere anyị ji kwesị ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs echiche. Cheta na ọmụmụ ihe anyị na-aga bụ otu ụzọ anyị si efe Chineke. Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ọmụmụ ihe kacha mkpa n’afọ. O doro anya na Jehova na Jizọs na-ahụ onye ọ bụla na-agba mbọ aga ya. Anyị chọrọ ka ha mara na anyị ga-agbalịsi ike ịga ya, ọ gwụkwala ma ò nwere ihe karịrị anyị ike ga-egbochi anyị ịga ya. Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị ji ọmụmụ ihe anyị kpọrọ ihe, ọ ga-abụ ihe ọzọ Jehova ga-eji maka ya hapụ aha anyị ‘n’akwụkwọ ncheta,’ ya bụ, “n’akwụkwọ nke ndụ.” Akwụkwọ a bu aha ndị niile Jehova chọrọ inye ndụ ebighị ebi.—Mal. 3:16; Mkpu. 20:15.

5. Ncheta Ọnwụ Jizọs ruwe, olee otú anyị ga-esi ‘na-anwale ma ànyị nọ n’okwukwe ahụ’?

5 Ncheta Ọnwụ Jizọs ruwe, anyị nwere ike iwepụta oge na-ekpesi ekpere ike, ma na-echebara otú adịm ná mma anyị na Jehova siruru n’ike echiche. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 13:5.) Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst, sị: “Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ.” Olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ kweere n’eziokwu na nzukọ a bụ naanị nzukọ Jehova ji na-emezu uche ya? M̀ na-eme ihe niile m nwere ike ime iji zie ozi ọma Alaeze Chineke ma na-akụziri ya ndị ọzọ? Ihe ndị m na-eme hà na-egosi n’eziokwu na m kweere na anyị na-ebi n’oge ikpeazụ nakwa na oge Setan ga-akwụsị ịchị ụwa a dị nso? Otú m si tụkwasị Jehova na Jizọs obi ugbu a, ọ̀ bụ otú m si tụkwasị ha obi mgbe ahụ m nyefere Jehova Chineke onwe m?’ (Mat. 24:14; 2 Tim. 3:1; Hib. 3:14) Ichebara azịza ajụjụ ndị a echiche ga-enyere anyị aka ịnwapụta ihe anyị onwe anyị bụ.

6. (a) Olee naanị ihe ga-eme ka anyị nwee ndụ ebighị ebi? (b) Olee otú otu okenye si akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ? Oleekwa otú i nwere ike isi na-eme ka ya?

6 Otu ụzọ anyị ga-esi akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ịgụ isiokwu ndị kọwara ihe ọ pụtara na ichebara ha echiche. (Gụọ Jọn 3:16; 17:3.) Naanị ihe ga-eme ka anyị nwee ndụ ebighị ebi bụ “ịmata” Jehova na ‘inwe okwukwe’ na Jizọs, bụ́ Ọkpara ọ mụrụ naanị ya. Iji kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị nwere ike ịgụ ụfọdụ isiokwu ndị ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova na Jizọs nso. Ọ bụ ihe a ka otu nwanna bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ na-eme. Kemgbe ọtụtụ afọ, o dokọrọ Ụlọ Nche ndị kwuru gbasara Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa otú Jehova na Jizọs si gosi na ha hụrụ anyị n’anya. Izu ụfọdụ tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, ọ na-agụgharị isiokwu ndị ahụ ma chee echiche nke ọma gbasara ihe mere Ncheta Ọnwụ Jizọs ji dị ezigbo mkpa. Mgbe ụfọdụ, ọ na-etinyekwu otu Ụlọ Nche ma ọ bụ abụọ kwuru gbasara ya ná ndị mbụ ahụ o dokọrọ. Nwanna a achọpụtala na ịgụgharị ha na ịgụ Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa ichebara ha echiche na-eme ka ọ na-amụta ihe ọhụrụ kwa afọ. Nke kacha mkpa bụ na ịgụgharị ihe ndị ahụ na-eme ka ọ na-ahụkwu Jehova na Jizọs n’anya kwa afọ. Ime ihe a nwanna a na-eme nwere ike ime ka ị hụkwuo Jehova na Jizọs n’anya, na-ekelekwa ha maka ihe ọma ndị ha na-emere anyị. O nwekwara ike ime ka Ncheta Ọnwụ Jizọs bakwuoro gị uru.

 NCHETA ỌNWỤ JIZỌS NA-EME KA ANYỊ NA-ADỊ N’OTU

7. (a) Gịnị ka Jizọs rịọrọ nna ya n’abalị ahụ ọ malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị? (b) Gịnị gosiri na Jehova zara Jizọs ekpere a?

7 N’abalị ahụ Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, o kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya niile dịrị n’otu otú ahụ ya na Nna ya dị n’otu. (Gụọ Jọn 17:20, 21.) O doro anya na Jehova zara ekpere a Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya kpere. Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova nke kacha egosi na ha dị n’otu n’eziokwu. N’ụbọchị a na-eme ya, ọtụtụ nde mmadụ si ná mba dị iche iche na agbụrụ dị iche iche n’ụwa na-ezukọta n’ebe dị iche iche ma gosi na ha kweere na Jehova zitere Ọkpara ya. N’ebe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịhụ ndị si n’agbụrụ dị iche iche ka ha zukọtara maka ife Chineke. Ha zukọtakwanụ, ndị ọzọ na-ele ya anya ka ihe na-ekwesịghị ekwesị. Ma Jehova na Jizọs na-ele ya anya ka ihe kwesịrị ekwesị. Otú anyị si adị n’otu n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na-atọ ha ezigbo ụtọ.

8. Olee ihe Jehova gwara Ezikiel gbasara ịdị n’otu?

8 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, ọ naghị eju anyị anya na anyị na ụmụnna anyị dị n’otu. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova kwuru na ọ ga-adị otú ahụ. Chegodị gbasara ihe ọ gwara Ezikiel onye amụma banyere ijikọta osisi abụọ ka ha bụrụ otu, ya bụ “nke Juda” na “nke Josef.” (Gụọ Ezikiel 37:15-17.) Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Julaị afọ 2016 kwuru, sị: “Jehova si n’ọnụ Ezikiel buo amụma na ndị ya ga-alaghachite n’Ala Nkwa nakwa na ha ga-abụ otu mba otú ha bụbu. O bukwara amụma na ndị na-efe Chineke n’oge ikpeazụ a ga-adị n’otu ma bụrụ otu ndị.”

9. Olee otú amụma Ezikiel na-esi emezu ma anyị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ ọ bụla?

9 Malite n’afọ 1919 gaa n’ihu, Jehova bu ụzọ jiri nwayọọ nwayọọ hazigharịa ndị e tere mmanụ ma mee ka ha dịrị n’otu. Ha dị ka osisi “nke Juda.” Ọtụtụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa malitere iso ha. Ndị a nwere olileanya ịdị ndụ n’ụwa dị ka osisi “nke Josef.” Jehova kwere nkwa na ya ga-ejikọta osisi abụọ a “ka ha ghọọ otu osisi” n’aka ya. (Ezik. 37:19) O mere ka ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ghọọ “otu ìgwè atụrụ.” (Jọn 10:16; Zek. 8:23) Taa, ìgwè abụọ a dị n’otu ma na-efekọ Jehova ọnụ. Ha nwere otu Eze bụ́ Jizọs Kraịst, onye Chineke kpọrọ n’amụma Ezikiel “ohu m Devid.” (Ezik. 37:24, 25) N’afọ ọ bụla anyị gara Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-achọpụta na ìgwè abụọ ahụ dị n’otu otú ahụ Chineke kwuru n’amụma Ezikiel. Ma, olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme ka anyị nọgide na-adị n’otu?

IHE ONYE Ọ BỤLA N’IME ANYỊ GA-EME KA ANYỊ NA-ADỊ N’OTU

10. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka ndị Chineke na-adị n’otu?

10 Otu ụzọ anyị ga-esi eme ka ndị Chineke na-adị n’otu bụ ịdị umeala n’obi. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha dịrị umeala n’obi. (Mat. 23:12) Anyị dịrị umeala n’obi, anyị agaghị ebuli onwe anyị elu otú ndị ụwa si eme. Kama, ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ndị na-elekọta nzukọ Jehova. Ime otú ahụ ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Nke ka nke bụ na, anyị dịrị umeala n’obi, ọ ga-eme ka obi na-atọ Chineke ụtọ n’ihi na ọ “na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.”—1 Pita 5:5.

11. Olee otú ichebara ihe achịcha na mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara echiche ga-esi eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrịkwuo n’otu?

11 Ụzọ nke abụọ anyị ga-esi eme ka anyị na-adị n’otu bụ iche echiche gbasara ihe achịcha na mmanya ahụ e ji eme  Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara. Tupu ụbọchị ahụ, ma karịchaa n’abalị ahụ a ga-eme ya, anyị kwesịrị ichesi echiche ike gbasara ihe achịcha ahụ na-ekoghị eko na ihe mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara nọchiri anya ha. (1 Kọr. 11:23-25) Achịcha ahụ nọchiri anya ahụ́ Jizọs zuru okè nke o ji chụọ àjà, mmanya ahụ anọchiekwanụ anya ọbara ya ọ wụsara. Ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịmata ihe mmanya na achịcha ndị ahụ nọchiri anya ha. Cheta na àjà Kraịst ji ndụ ya chụọ nwere ihe abụọ ọ na-egosi. Ọ na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya nye anyị Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị, na-egosikwa na Jizọs hụrụ anyị n’anya ma jiri obi ya niile nwụọ n’ihi anyị. Ichebara otú a ha si hụ anyị n’anya echiche kwesịrị ime ka anyị hụkwa ha n’anya. Otú a anyị si hụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrịkwuo ná mma, dịrịkwuokwa n’otu.

Ọ bụrụ na anyị ana-agbaghara ụmụnna anyị, ọ ga-eme ka anyị na-adị n’otu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12. N’ihe atụ Jizọs mere gbasara otu eze na ndị ohu ya, olee otú o si mee ka o doo anya na Jehova chọrọ ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ?

12 Ụzọ nke atọ anyị ga-esi eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’otu bụ ịna-agbaghara ha kpamkpam. Anyị gbaghara ndị mejọrọ anyị, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ na Chineke na-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi àjà mgbapụta Kraịst. Iji gosi ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ, Jizọs mere otu ihe atụ gbasara otu eze na ndị ohu ya. Biko gụọ Matiu 18:23-34 ma jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agbalị ime ihe a Jizọs kụziri? M̀ na-enwere ụmụnna m ndidi ma na-aghọta ha nke ọma? M̀ na-adị njikere ịgbaghara ndị mejọrọ m? Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere mmehie ndị ka ibe ha njọ. E nwekwara mmehie ndị na-anaghị adịrị anyị mfe ịgbaghara. Ma, ihe atụ ahụ Jizọs mere na-akụziri anyị ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme. (Gụọ Matiu 18:35.) Jizọs mere ka o doo anya na Jehova agaghị agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị agbagharaghị ụmụnna anyị ma ha chegharịa n’eziokwu. Anyị kwesịrị ichebara ihe a echiche. Ka anyị na ụmụnna anyị nwee ike ịna-adị n’otu, anyị ga na-agbaghara ha otú Jizọs kụziri ka anyị na-eme.

13. Ọ bụrụ na anyị ana-eme udo, olee otú ọ ga-esi eme ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’otu?

13 Anyị gbaghara ndị ọzọ, anyị na-egosi na anyị bụ ndị na-eme udo. Cheta na  Pọl onyeozi kwuru na anyị kwesịrị ‘ịna-agbasi mbọ ike ka anyị nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.’ (Efe. 4:3) N’oge a a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, karịchaa n’abalị ahụ a ga-eme ya, chebara otú i si emeso ndị ọzọ ihe echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si eme ihe, ọ̀ na-egosi n’eziokwu na anaghị m eburu ndị ọzọ iwe n’obi? Ndị mmadụ hà ma m ka onye na-eme ihe niile o nwere ike ime iji mee udo?’ Anyị kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche n’oge a.

14. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị ‘ji ịhụnanya na-ediri ibe anyị ihe’?

14 Ụzọ nke anọ anyị ga-esi eme ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’otu bụ ịhụ ha n’anya ka Jehova, bụ́ Chineke nke ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Anyị ekwesịtụdịghị ikwu gbasara ụmụnna anyị, sị: “M nwere ike ịhụ ha n’anya n’ihi na ha bụ ụmụnna m, ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ha anaghị amasị m.” Ikwu otú ahụ adabaghị n’ihe Pọl kwuru, bụ́ na anyị kwesịrị ‘iji ịhụnanya na-ediri ibe anyị ihe.’ (Efe. 4:2) Buru n’obi na ihe o kwuru abụghị naanị na anyị kwesịrị ‘ịna-ediri ibe anyị ihe.’ O kwukwara na anyị kwesịrị ‘iji ịhụnanya’ na-eme otú ahụ. E nwere ihe dị iche. E nwere ụdị mmadụ dị iche iche n’ọgbakọ anyị, Jehova dọtakwara ha. (Jọn 6:44) Ebe ọ bụ Jehova dọtara ha, ọ hụrụ ọtụtụ ihe ọma n’ahụ́ ha mere o ji hụ ha n’anya. Ebe Jehova hụrụ ụmụnna anyị n’anya otú a, gịnị mere anyị ga-eji sị na anyị ekwesịghị ịhụ ha n’anya? Anyị kwesịrị ịhụ ha n’anya otú Jehova kwuru ka anyị na-eme.—1 Jọn 4:20, 21.

OLEE MGBE A GA-EME NCHETA ỌNWỤ JIZỌS NKE IKPEAZỤ?

15. Olee otú anyị si mara na a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ikpeazụ?

15 Otu ụbọchị, a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ikpeazụ ya. Olee otú anyị si mara? N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ na ọ bụrụ na ha ana-echeta ọnwụ Jizọs kwa afọ, ha “na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.” (1 Kọr. 11:26) Jizọs kwukwara na ya “na-abịa” n’amụma o buru banyere mgbe ikpeazụ. Jizọs kwuru banyere oké mkpagbu, bụ́ nke ji ọsọ na-abịa, sị: “Ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụta n’eluigwe, mgbe ahụkwa, ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu. Ọ ga-ejikwa ụda oké opi zipụ ndị mmụọ ozi ya, ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa chịkọta ndị ọ họọrọ, site n’otu nsọtụ eluigwe ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.” (Mat. 24:29-31) Jizọs ‘ga-achịkọta ndị ọ họọrọ’ mgbe ọ ga-akpọrọ Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ka nọ n’ụwa gaa eluigwe. Nke a ga-eme mgbe agba nke mbụ nke oké mkpagbu ahụ gachara, tupu a lụọ agha Amagedọn. N’agha a, Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-alụso ndị eze niile nọ n’ụwa agha ma merie ha. (Mkpu. 17:12-14) Ncheta Ọnwụ Jizọs ikpeazụ anyị ga-eme tupu Jizọs ‘abịa’ chịkọta ndị e tere mmanụ gaa eluigwe ga-abụ nke ikpeazụ.

16. Gịnị mere i ji kpebisie ike na ị ga-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a?

16 Ka anyị kpebisie ike ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs a ga-eme n’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Mach afọ 2018. Ka anyị na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị na-eme ihe anyị kwesịrị ime ka ndị Chineke na-adị n’otu. (Gụọ Abụ Ọma 133:1.) Cheta na otu ụbọchị, anyị ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ikpeazụ. Tupu mgbe ahụ, ka anyị gbalịsie ike hụ na anyị na-aga ya. Ebe ọ na-enyere anyị aka ịdị n’otu kwa afọ, ka anyị niile jiri ya kpọrọ ihe.