Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Madagaska

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Madagaska

OTU ọsụ ụzọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na asaa aha ya bụ Sylviana kwuru, sị: “Ndị enyi m kọwa ụdị obi ụtọ ha nwere mgbe ha gara ozi ebe a chọkwuru ndị ọsụ ụzọ, m na-achọkwa inwe ụdị obi ụtọ ahụ. Ma echeghị m na m ga-ejeli ụdị ozi a.”

Ọ̀ na-adị gị otú ahụ ọ dị Nwanna Nwaanyị Sylviana? Ọ̀ na-agụkwa gị agụụ ije ozi ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ma gị a na-eche ma ị̀ ga-emeli ya? Ya bụrụ otú ahụ, adala mbà. Jehova enyerela ọtụtụ ụmụnna anyị aka imeri nsogbu ndị na-egbochi ha ijekwuru ya ozi. Iji hụ otú Jehova si nyere ụfọdụ n’ime ha aka, anyị ga-aga Madagaska. Madagaska bụ agwaetiti nke anọ kacha n’agwaetiti niile e nwere n’ụwa.

Kemgbe ihe karịrị afọ iri ugbu a, ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ karịrị iri asaa abịala na-ekwusa ozi ọma n’obodo a dị n’Afrịka nke ọtụtụ ndị bi na ya chọrọ ịnụ ozi ọma. Ha si mba iri na otu. * Ọtụtụ ndị Madagaska ji Baịbụl kpọrọ ihe. Ọtụtụ ndị nkwusa e nwere na Madagaska akwagakwala n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’agwaetiti a ka ha nwee ike izi ndị niile bi na ya ozi ọma Alaeze Chineke. Ka anyị kọọrọ gị gbasara ụfọdụ n’ime ha.

OTÚ HA SI KWỤSỊ ỊTỤ ỤJỌ NA ỊDA MBÀ N’OBI

Perrine na Louis

Otu di na nwunye aha ha bụ Louis na Perrine si Frans kwaga Madagaska. Ha akarịala afọ iri atọ. Kemgbe ọtụtụ afọ, ha nọ na-eche otú ha ga-esi jekwuoro Jehova ozi ná mba ọzọ, ma obi akachaghị Perrine ịga. O kwuru, sị: “M na-eche otú m ga-esi ahapụ ndị ezinụlọ anyị, ọgbakọ anyị, ebe anyị bi, ebe ndị m ma nke ọma, nakwa ihe ndị m na-emekarị. Ọ bụ ihe ndị a na-echegbu m bụ nsogbu kachanụ m kwesịrị imeri.” N’afọ 2012, Perrine katara obi, ya na Louis di ya akwaga Madagaska. Olee otú obi dị ya maka ya? O kwuru, sị: “Ịhụ otú Jehova sirila nyere anyị aka emeela ka okwukwe anyị sikwuo ike.” Di ya bụ́ Louis kwuru, sị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ na mmadụ iri n’ime ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs mbụ anyị so mee na Madagaska.”

 Gịnị nyeere ha aka ịnọgide na-eje ozi ha mgbe nsogbu bịaara ha? Ha rịọsiri Jehova arịrịọ ike ka o nye ha ike idi nsogbu ha. (Fil. 4:13) Louis kwuru, sị: “Anyị hụrụ na Jehova zara ekpere anyị ma nye anyị ‘udo nke Chineke.’ Nke a mere ka anyị lekwasị anya n’ọṅụ anyị na-enweta n’ozi anyị. Ndị enyi anyị nọ n’ụlọ ziteere anyị ozi iimel, detakwara anyị akwụkwọ ozi iji gbaa anyị ume ka anyị ghara ịda mbà.”—Fil. 4:6, 7; 2 Kọr. 4:7.

Jehova gọziri Louis na Perrine maka ezigbo ndidi ha nwere. Louis kwuru, sị: “N’ọnwa Ọktoba afọ 2014, anyị gara Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye * na Frans. Ịga ụlọ akwụkwọ a bụ onyinye anyị na-agaghị echefu echefu Jehova nyere anyị.” Obi tọgburu di na nwunye a atọgbu mgbe ha gụchara akwụkwọ, e zighachi ha Madagaska.

“ANYỊ GA-EJI UNU NA-EME ỌNỤ”

Nadine na Didier

Mgbe Didier na Nadine, bụ́ di na nwunye si Frans, kwagara Madagaska n’afọ 2010, ha akarịala afọ iri ise. Didier kwuru, sị: “Anyị sụrụ ụzọ mgbe anyị na-amụbeghị ụmụ, mechaa mụọ ụmụ atọ. Mgbe ha tochara, anyị chewara ma ànyị ga-aga jewe ozi ná mba ọzọ.” Nadine kwukwara, sị: “M chechaa otú m ga-esi hapụ ụmụ m kwagaa ebe ọzọ, ike agwụ m. Ma ha gwara anyị, sị: ‘Unu kwaga ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, anyị ga-eji unu na-eme ọnụ.’ Ihe a ha kwuru gbara anyị ume, anyị akwaga Madagaska. Ọ bụ eziokwu na anyị na ụmụ anyị anọghị nso, obi dị anyị ụtọ na anyị na ha na-ekwurịta okwu mgbe mgbe.”

Otu ihe siiri Didier na Nadine ike bụ ịmụ asụsụ Malagasi. Nadine mụmụrụ ọnụ ọchị ma kwuo, sị: “Anyị abụghịzi ụmụaka afọ iri abụọ.” Gịnị nyeere ha aka? Ha bu ụzọ nọrọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ French amụ ihe. Mgbe ha mechara chee na ha adịla njikere ịmụ asụsụ Malagasi, ha gafere n’ọgbakọ na-eji asụsụ Malagasi amụ ihe. Nadine sịrị: “Ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma chọrọ ịmụ Baịbụl. Ọtụtụ mgbe, ha na-ekele anyị maka ịbịa zie ha ozi ọma. Ná mmalite, ọ dị m ka m̀ nọ ná nrọ. Ịsụ ụzọ ebe a na-atọgbu m atọgbu. Ọ na-abụ m teta ụra n’ụtụtụ cheta na m ga-aga ozi ọma, obi na-abụ m sọ aṅụrị.”

Didier nọ na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe ọ na-akọ otu ihe mere mgbe ọ malitere ịmụ asụsụ Malagasi. O kwuru, sị: “Otu ụbọchị m nọ na-eduzi ọmụmụ ihe n’ọgbakọ, anaghị m aghọta ihe ụmụnna na-aza. Naanị ihe m na-eme bụ onye zachaa, mụ asị ya, ‘I meela.’ Mgbe m kelechara otu nwanna nwaanyị, ndị nọ n’oche nọ ya n’azụ bidoro ifere m aka iji gwa m na ọ zataghị ya. Ozugbo ahụ, mụ akpọọ otu nwanna nwoke, ya azata ya. Echere m na ọ zatara ya.”

O JI OBI ỤTỌ KWETA ỊBỊA

Ná mgbakọ e nwere n’afọ 2005, Thierry na Nadia nwunye ya lere ihe nkiri isiokwu ya bụ, “Chụsoo Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ.” Ihe nkiri ahụ bụ gbasara Timoti. O metụrụ ha n’ahụ́, meekwa ka ha chọsie ike ịga kwusawa ozi  ọma Alaeze Chineke n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Thierry kwuru, sị: “Mgbe anyị nọ na-akụ aka mgbe ihe nkiri ahụ gwụrụ, m takwunyeere nwunye m, sị: ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Nwunye m agwa m na ya nọkwa na-eche otu ihe ahụ.” Ozugbo ha lara, ha bidoro ime ihe ndị ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ịkwaga mba ọzọ. Nadia kwuru, sị: “Anyị ji nwayọọ nwayọọ ree ihe ndị anyị nwere, nke na ihe fọrọnụ bara n’akpa anọ.”

Ndị nọ n’isi aka ekpe: Nadia na Marie-Madeleine; Onye nọ ná mpụta aka nri: Thierry

Ha kwagara Madagaska n’afọ 2006. Obi tọkwara ha ụtọ malite n’ụbọchị mbụ ha gara ozi ọma ebe ahụ. Nadia kwuru, sị: “Otú ndị mmadụ si ege ozi ọma n’obodo a na-atọ anyị ezigbo ụtọ.”

Ma e nwere nsogbu bịaara di na nwunye a mgbe afọ isii gachara. Nne Nadia bi na Frans aha ya bụ Marie-Madeleine dara ma gbajie aka, merụọkwa ahụ́ n’isi. Mgbe ha na dọkịta na-agwọ ya kwurịtachara, ha gwara mama ha ka ọ bịa ka ha na ya biri na Madagaska. N’agbanyeghị na ọ dị afọ iri asatọ n’oge ahụ, o ji obi ụtọ kweta ịbịa. Olee otú obi dị ya maka ibi ná mba ọzọ? O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ naghị adịrị m mfe, ma n’agbanyeghị ihe ndị mụ na ha na-alụ, m ma na m ka bara uru n’ọgbakọ. Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ na otú a mụ na ụmụ m bizi mere ka ha nọgide n’ozi a ha ji na-enyere ọtụtụ ndị aka n’obodo a.”

“AHỤRỤ M AKA JEHOVA MGBE M CHỌRỌ ENYEMAKA”

Ebe Riana na-ekwu okwu ihu ọha n’asụsụ Tandroy

E nwere otu nwanna nwoke aha ya bụ Riana. Ọ dị afọ iri abụọ na abụọ. O toro n’obodo Alaotra Mangoro. Obodo a dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Madagaska, ala ya na-emekwa nri nke ọma. Mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ na-eme nke ọma, ọ chọkwara ịga ụlọ akwụkwọ dị elu. Ma ọ gbanwere obi ya mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl. O kwuru, sị: “Mgbe m lechara ule ikpeazụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m kwere Jehova nkwa na ‘ọ bụrụ na mụ emee nke ọma, m ga-ebido ịsụ ụzọ.’” O mere nke ọma n’ule ahụ. Ọ gara ya na otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ ebiri, ya achọta ọrụ ọ na-arụ ụbọchị ụfọdụ n’izu, bidozie ịsụ ụzọ otú ahụ o kwuru. O kwuru, sị: “Ọ bụ mkpebi kacha mma m metụrụla.”

Ma ndị ezinụlọ ya aghọtaghị ihe mere Riana achọghị ịga ụlọ akwụkwọ dị elu. O kwuru, sị: “Papa m, nwanne papa m nke nwoke, na nwanne nne papa m nke nwaanyị nọ na-agwa m ka m gaa ụlọ akwụkwọ dị elu. Ma achọghị m ka ihe ọ bụla mee ka m kwụsị ịsụ ụzọ.” O teghị anya, Riana achọwa ịga kwusawa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Olee ihe so mee ka ije ụdị ozi a gụwa ya agụụ? O kwuru, sị: “Ndị ohi bịara n’ebe anyị bi zuru ọtụtụ ihe m. Ohi a ha zuru m mere ka m chebara ihe Jizọs kwuru gbasara mmadụ ‘ịkpakọbara onwe ya akụ̀ n’eluigwe’ echiche. M kpebiri ịrụsikwu ọrụ ike ka m kpakọbara onwe m akụ̀ n’eluigwe. (Mat. 6:19, 20) Ọ kwagara n’ebe ndịda ndịda obodo Madagaska. Oké ọkọchị na-akọkarị ebe a, ọ dịkwa ihe dị ka otu puku na narị kilomita atọ ma e si ebe o bi gawa ya. Ọ bụ ndị a na-akpọ ndị Antandroy bi n’ebe ahụ. Gịnị mere o ji gawa ebe ahụ?

Riana bidoro ịmụrụ ụmụ nwoke abụọ bụ́ ndị Antandroy Baịbụl otu ọnwa tupu e zuo ya ohi ahụ. Ọ mụtara otú e si ekwu ihe ụfọdụ n’asụsụ ndị Antandroy. Ọ bịara chewe gbasara ọtụtụ ndị Antandroy na-anụbeghị ozi ọma Alaeze Chineke. O kwuru, sị: “M rịọrọ Jehova ka o nyere m aka ka m kwagaa ebe a na-asụ asụsụ Tandroy.”

Riana kwagara ebe ahụ, ozugbo ahụ, ihe esiwere ya ike. Ọ hụghị ọrụ ọ ga-arụ. Otu nwoke jụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji kwata ebe a? Ndị mmadụ na-esi ebe a akwaga ebe ahụ i si bịa iji chọta ọrụ.” Mgbe izu abụọ gachara, Riana si ebe ahụ gawa mgbakọ ukwu n’obodo ọzọ. Ọ bụ naanị obere ego fọrọ ya n’akpa, ọ nọkwa na-eche ihe ọ ga-eme. N’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ, otu nwanna bịara tinye ihe n’akpa kootu o yi. Ọ bụ ego ga-ezuru ya ịgba ụgbọ laghachi Antandroy, nweekwa ike ịmalite ire yogọt obere obere. Riana kwuru, sị: “Ahụrụ m aka Jehova mgbe m chọrọ enyemaka. M nweziri ike ịnọgide n’Antandroy na-enyere ndị chọrọ ịmụta banyere Jehova aka.” E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọ ga na-arụ n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “M na-ekwu okwu ihu ọha ugboro abụọ n’ọnwa. Jehova ji ọgbakọ ya na-azụ m.” Riana ka na-ezi ọtụtụ ndị na-asụ Tandroy chọrọ ịmụta banyere Jehova ozi ọma Alaeze Chineke.

 CHINEKE NKE EZIOKWU GA-AGỌZI YA

Jehova bụ́ Chineke nke eziokwu mesiri anyị obi ike na ya ga-agọzi “onye ọ bụla . . . nke na-arịọ ngọzi.” (Aịza. 65:16, Bible Nsọ Ọhụụ) Ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ imeri ihe ndị na-achọ igbochi anyị ijekwuru Jehova ozi, Jehova ga-agọzi anyị. Ka anyị legodị ihe mere Nwanna Nwaanyị Sylviana anyị kwuru gbasara ya ná mmalite isiokwu a. Ọ bụ onye Madagaska. Ì chetara na o kwuru na ya echeghị na ọ ga-ejeli ozi ebe a chọkwuru ndị ọsụ ụzọ? Gịnị mere o ji na-eche otú ahụ? O kwuru, sị: “Ụkwụ aka nri m ka nke aka ekpe ogologo. N’ihi ya, m na-ete ụkwụ, ọ na-emekwa ka ike na-agwụ m ngwa ngwa.”

Sylviana (ọ bụ ya nọ n’aka ekpe) na Sylvie Ann (ọ bụ ya nọ n’aka nri) nakwa Doratine n’ụbọchị Doratine mere baptizim

Ma, n’afọ 2014, Sylviana na otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sylvie Ann kpebiri ịkwaga n’otu obere obodo dị kilomita iri asatọ na ise ma e si obodo ha gawa ya. Sylvie Ann bụ onye ọsụ ụzọ ya na Sylviana nọ n’ọgbakọ. N’agbanyeghị nsogbu ya na Sylviana na-alụ, o mechara mezuo ihe ahụ na-agụ ya agụụ, Jehova agọziekwa ya. O kwuru, sị: “Mgbe naanị otu afọ gara anyị kwagara ebe ahụ, otu nwaanyị m na-amụrụ Baịbụl aha ya bụ Doratine mere baptizim ná mgbakọ sekit anyị.”

“M GA-ENYERE GỊ AKA”

Ihe ndị a na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma kwuru na-egosi na ọ bụrụ na anyị agbalịa imeri ihe ndị na-egbochi anyị ijekwuru Jehova ozi, anyị ga-eji aka anyị chọpụta na Jehova na-emezu ihe o kwere ndị ya ná nkwa. Ọ sịrị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.” (Aịza. 41:10) Ọ ga-eme ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma. Ihe ọzọ bụ na iwepụta onwe anyị gaa na-ekwusa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, ma ọ̀ bụ n’obodo anyị ma ọ̀ bụ ná mba ọzọ, ga na-akwadebe anyị maka ọrụ ndị anyị ga-arụ n’ụwa ọhụrụ. Didier, anyị kwuburu gbasara ya kwuru, sị: “Ije ozi ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma na-azụ anyị maka ọdịnihu.” Anyị na-agba ndị niile ọ na-agụsi agụụ ike ume ka ha bido ịnara ọzụzụ a n’egbughị oge.

^ para. 4 Mba ndị ahụ ha si bụ Kanada, Chek Ripọblik, Frans, Jamanị, Gụadilop, Lọksembọg, Niu Kaledonia, Swidin, Swizaland, Briten, nakwa Amerịka.

^ para. 8 Ihe a na-akpọzi ya bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ndị ozi oge niile nọ ná mba ọzọ ruru eru, nwere ike itinye akwụkwọ ka ha gaa ya n’obodo ha ma ọ bụ n’obodo ọzọ a na-enwe ụlọ akwụkwọ a n’asụsụ ha.